Isi nke 17
Omume Dị Iche n’Ebe Nrubeisi Dị
1. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwe ka ndị Babilọn bibie Jerusalem?
RUO ọtụtụ afọ tupu ndị Babilọn ebibie Jerusalem, Jehova dọrọ ndị Juu aka ná ntị banyere ihe na-abịanụ na ihe kpatara ya. Ha na-agbaso ọchịchọ nile nke obi ha mere etili kama irubere Chineke isi.—Jeremaịa 25:8, 9; 7:24-28.
2. (a) N’uzọ ezi uche dị na ya, uru dịgasị aṅaa dabeere n’irubere Chineke isi? (b) Olee otú Israel na Jehova si banye ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ?
2 Jehova adịghị amanye onye ọ bula ife ya ofufe, kama, dị ka o kwesịrị, ọ na-achọ nrubeisi n’aka ndị nile chọrọ ihu ọma ya na ngọzi nile nke ndụ nke na-eso ya. Ka ọ napụtasịrị Israel site n’Ijipt, Jehova gwara ha: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karị ndị nile: n’ihi na ọ bụ mụ nwe ụwa nile: unu onwe unu ga-abụkwara m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ. (Ọpụpụ 19:5, 6) Mgbe Chineke kwupụtasịrị ihe nile ọ chọrọ ha n’aka, ha wee gee nti n’ọgụgụ nke akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, ha sitere n’ọchịchọ nke aka ha nakwere ibu ọrụ nke na-eso mmekọrịta dị otú ahụ nke ha na Chineke.—Ọpụpụ 24:7.
3. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Israel si gosipụta mmụọ nnupụisi n’ebe Jehova nọ mgbe nke a gasịrị? (b) Gịnị mere e ji dekọọ ihe nile ahụ merenụ na Bible?
3 Otú ọ dị, ọ bụ nanị ka nwa oge gasịrị ka mmụọ nnupụisi malitere ịpụta. Ụmụ Israel apụtaghị ìhè n’ịgọnarị okwukwe ha nwere na Jehova; ma, n’ụzọ na-emebi iwu ya, ọtụtụ n’ime ha nwara ịgwakọta omume ndị Ijipt n’ofufe Jehova. (Ọpụpụ 32:1-8) E mesịa, ụfọdụ hụtakwara amaghị eme ná ndị Jehova ji na-eme ihe dị ka ndị nnọchianya ya a na-ahụ anya. (Ọnụ Ọgụgụ 12:1-10; 16:1-3, 31-35) Dị ka otu mba, Israel gosipụtara enweghị okwukwe iji mee ihe n’okwu Chineke n’ihi egwu mmadụ. (Ọnụ Ọgụgụ 13:2, 31-33; 14:1-4; Ndị Hibru 3:17-19) Mgbe e mere mmehie n’amaghị ama, a pụrụ ịgbaghara ndị ji obi umeala chegharịa. Ma n’ogologo oge nke narị afọ itoolu, mba ahụ kpachaara anya na-elefuru ihe ndị a chọrọ ha n’aka n’otu n’otu anya, ọtụtụ mgbe ha na-elefuru ọtụtụ n’ime iwu ndị ahụ anya. Ihe ha mere na ihe ọ pụtaara ha ka e dekọrọ na Bible dị ka ihe atụ ịdọ aka ná nti nye anyị.—2 Ihe Emere 32:15-17; 1 Ndị Kọrint 10:6-11.
4. (a) Òle ndị bụ ndị Rikab? (b) Iwu dịgasị aṅaa ka Jehonadab nyere ha?
4 N’oge Jeremaia, mgbe e nyesịworo ọtụtụ idọ aka ná nti nke ihe ọjọọ ụzọ ndụ ha na-eduga na ya, Jehova setipụụrụ ndị Juu ahụ ihe nlereanya—ndị Rikab. Ndị a abụghi ndị Israel, ha bụ ụmụ ụmụ Jehonadab, onye gosiwororịị nkwado ya zuru ezu nye Jehu mgbe ọ na-ekwo ekworo banyere Jehova. Jehonadab nke a (ma ọ bụ, Jonadab) dị ka nna ochie nke agbụrụ ndị Rikab, enyewo ha iwu ka ha ghara ịṅụ mmanya ruo mgbe ebighị ebi, nakwa ka ha ghara ibi n’ụlọ ma ọ bụ rụọ ọrụ ubi, kama ka ha na-ebi n’ụlọ ntú dị ka ndị njegharị. N’ụzọ dị otú a, ha ga-ebi ndụ udo na nke dị mfe, nwere onwe ha pụọ n’ịchọ ihe ụtọ onwe onye na ihe ọjọọ nile nke ndụ a na-adị n’obodo ukwu, mgbe ha na-eso ndị Israel na-efe Jehova, bụ́ ndị ha bi n’etiti ha.
5. Olee otú ndị Rikab si bụrụ ihe nlereanya ná nrubeisi?
5 Ebe ndị Juu jụrụ ige Jehova nti, bụ́ Eze Eluigwe na Ala, à pụrụ ịtụ anya na ndị Rikab ga-erubere nna ha bụ mmadụ efu isi? Ha rubeere ya isi n’ụzọ kwesịrị nṅomi. N’agbanyeghi na ndị Rikab chọrọ ebe mgbaba na Jerusalem mgbe ndị agha Babilọn na Siria bịakwasịrị Juda, ha nọgidere na-ebi n’ụlọ ntú. Ma olee otú mkpebi ha ịghara imetụ mmanya aka siruru n’ike, n’agbanyeghi na e kwere ka ndị ha bi n’etiti ha na-aṅụ ya? Jehova mere ka Jeremaia kpọta ndị Rikab n’otu ụlọ iri nri dị n’ụlọ nsọ ahụ, debesịa iko mmanya wee kpọọ ha òkù ka ha ṅụọ. Ha jụrụ ajụ. N’ihi gịnị? Ọ pụtara ìhè na ha ghọtara ịdị elu nke nrara nna ha ochie raara onwe ya nye Jehova, ha ghọtara nchegbu ịhụnanya o nwere maka ọdịmma ha, n’ihi ya ha rubere isi n’iwu ya. Jehova nwere obi ụtọ n’ihe nlereanya nke a nke nrubeisi, nke mere ka enweghị nrubeisi nke ndị Juu gosipụtara pụta ìhè.—Jeremaịa 35:1-11.
6. (a) Òle ndị taa dị ka ndị Rikab? (b) Òle ndị taa gosiputara onwe ha ibụ ihe atụ nke Israel ahụ nụpụrụ isi?
6 E nwere ndị mmadụ taa, ndị dị ka ndị Rikab. Ndị a bụ atụrụ ọzọ nke Onyenwe anyị. Ma hà ga-aṅụ mmanya ma ọ bụ na ha agaghi aṅụ abụghi ihe na-ese okwu taa. (Tụlee 1 Timoti 5:23.) Nke a bụ ihe dịịrị mmadụ n’onwe ya, ọ bụrụhaala na ha aghọghị ndị aṅụrụma ma ọ bụ na-anụgbiga ya òkè. (Ilu 23:20; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ma nrubeisi nye Chineke dị mkpa. N’adịghị ka Krisendọm, nke bụ ihe nnọchianya nke Israel ahụ si n’ezi ofufe dapụ, ndị òtù Rikab nke oge a na-egosi site n’omume ha na ha matara uru nke irubere Chineke isi. Olee otú nke a ga-esi bara ha uru?
7. (a) Nkwa dị aṅaa nke na-agba ume ka Jehova kwere ndị Rikab? (b) Olileanya dị aṅaa ka nke ahụ na-esetipụrụ ndị òtù Rikab nke oge a?
7 N’ihi nrara ha raara onwe ha nye ya, Jehova kwere ndị Rikab ahụ nkwa nke nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ amụma n’oge anyị a, na-asi: N’ihi na unu egewo ntị ihe Jonadab, bụ́ nna unu, nyere n’iwu, unu wee debe ihe nile o nyere n’iwu, wee mee dị ka ihe nile si dị nke o nyere unu n’iwu; n’ihi nke a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Chineke nke Israel, ji sị otú a: A gaghị ebipụ n’ụlọ Jonadab nwa Rikab onye nwe iguzo n’ihu m ụbọchị nile. (Jeremaịa 35:18, 19) Ha so ná ndị lanarịrị mbibi nke Jerusalem na 607 T.O.A. Òtù nke ha sere onyinyo ya ga-alanarịkwa mbibi na-abịa nke Krisendọm ya na ndị ọzọ nile nke ụwa, ndị na-agbaso ụzọ nke aka ha, na-ajụ ikwenyere ọkaaka nke Jehova.
IHE NRUBEISI PỤRỤ IJI GHARA ỊDỊ MFE
8. N’ihi gịnị ka nrubeisi ji esiri ọtụtụ ndị ike?
8 Ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe ihe isi ike ịmụta irube isi. Ha etolitewo n’ime ụwa ebe onye ọ bụla ’na-eme ihe nke ya.’ Ha pụrụ inwe mmasị n’ihe ha mụtara banyere ndụ n’okpụru Alaeze Chineke. Ma ọ bụrụ na mpako ekpuchie echiche ha, ha pụrụ ila azụ n’ụfọdụ ihe Chineke chọrọ ha n’aka ma ọ bụ hụta emezighị emezi n’ụzọ e si na-akọwapụta ha. (Ilu 8:13; 16:18) Neaman, ọchịagha nke ndị agha Siria n’oge onye amụma bụ Elaisha, nwere nsogbu ahụ.
9. (a) Olee otú o si dapụta na Neaman jere ihụ Elaisha? (b) Gịnị ka ọ tụrụ anya inweta, ma gịnị mere n’ezie?
9 Neaman na-arịa ọrịa ekpenta. Ma n’ihi na otu nwata onye Israel a dọtara n’agha jiri obi ike kwupụta okwukwe ya nke bụ na a ga-agwọ Neaman nanị ma ọ bụrụ na ọ ga-ejekwuru onye amụma Jehova bụ Elaisha, Neaman gara Israel. O jiri ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ agha bịarute n’ụlọ Elaisha. Ma Neaman bụ onye a ma ama, ọ na-atụkwa anya ka Elaisha pụta ịbịa zute ya wee meere ya ememe, na-akpọku aha Jehova, na-efegharịkwa aka ya n’elu ahụ ya ruo mgbe ọ dịrị ya mma. Kama nke ahụ, Elaisha zigaara ya nanị onye ozi ịgwa ya ka o jee n’Osimiri Jọdan wee saa ahụ ugbo asaa.—2 Ndị Eze 5:1-12.
10. (a) Neaman ò si aṅaa meghachi omume? (b) Gịnị mesịrị kwalie ya irube isi? (ch) Gịnị si na nke a pụta?
10 E mejọrọ mpako Neaman. O ji ọnụma laghachi azụ. Ma mgbe ya na ndị na-ejere ya ozi rụrịtasịrị ụka, o wedara onwe ya ala n’okwukwe. O wee rịda, sụnye onwe ya n’ime Jọdan ugbo asaa, dị ka okwu onye nke Chineke si dị: anụ ahụ ya wee laghachi dị ka anụ ahụ nwa okoro nta, o wee dị ọcha. E wee mee ka Neaman kwenye na Jehova bụ nanị ezi Chineke, o wee matakwa na n’agbanyeghị omume mbụ ya, ntụziaka nile nke Elaisha sitere n’aka Chineke n’ezie.—2 Ndị Eze 5:13-15.
11. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Neaman si see onyinyo atụrụ ọzọ ahụ? (b) Olee ihe mmụta ndị dị mkpa anyị nile na-aghaghị inweta?
11 Ị̀ na-ahụ ma eleghị anya ụfọdụ omume nke Neaman n’ime onwe gi? Dị ka ọ bụ eziokwu banyere ndị ọzọ na-abụghị ndị Israel ndị gosipụtara okwukwe, e ji Neaman mee ihe n’Akwụkwọ nsọ ise onyinyo nke atụrụ ọzọ ahụ, ndị na-esonye n’ezi ofufe. Ndị a nile, ebe a mụrụ ha ná mmehie, bụ ndị ọrịa ime mmụọ na-arịa na mbụ. Ha nile ejewo ịchọ enyemaka nke òtù ndị ozi Jehova e tere mmanụ ma mee ihe ná nrubeisi n’ihe ohu a kụziwooro ha site n’Okwu Chineke. (Matiu 24:45) Ụfọdụ amatachaghị uru ndụmọdụ Akwụkwọ nsọ a na-enye ha bara na mbụ—dị ka mkpa ọ dị ijechi ọmụmụ ihe ọgbakọ anya, mkpa nke ịnọpụ iche n’ụwa ma ọ bụ nke ime baptism ime mmiri nke ndị Kraist. Ha pụrụ ịlaghachiwo azụ n’ime nraranye n’ihi na obi ha megidere ’ịjụ onwe onye’ iji wee bụrụ onye na-eso ụzọ Kraist. N’ọnọdụ ụfọdụ, ha na-akatọ ụzọ a na-esi enye ha ndụmọdụ site n’aka ndị ọ dị n’ubu ha n’ime ọgbakọ. Ma mgbe oge na-aga, ndị nile ga-abụ n’ezie atụrụ ọzọ nke Onyenwe anyị aghaghị ịmụta mkpa nke inwe obi umeala na nke iji ịhụnanya na-erube isi.—Jemes 4:6; Matiu 16:24.
IWU NDỊ NA-ABARA ANYỊ URU
12, 13. (a) N’ihi gịnị ka nrubeisi nye iwu nile nke Jehova ji abara anyị uru? (b) Olee otú a pụrụ isi mee ihe atụ nke a?
12 Ka anyị na-amata Jehova na ụzọ ya nile, anyị na-aghọtakarị eziokwu nke okwu ndị ahụ ọ gwara ndị ohu ya n’oge gara aga, sị: Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gi, onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile m nyere n’iwu! (Aisaia 48:17, 18) Ọchịchọ nke sitere Jehova n’obi bụ ka ndị ya zere ọdachi, ma nweta ọṅụ ná ndụ site n’iṅa ntị n’iwu ya nile. Ọ maara otú e si mee anyị na ihe ga-ewetara anyị ezi obi ụtọ. Ọ na-adọ anyị aka ná ntị banyere omume ndị nwere ike iwetu anyị ala ma ọ bụ mebie mmekọrịta anyị na ndị ọzọ.
13 Ndị ṅaworo ntị n’ịdọ aka ná ntị ya megide ikwa iko abụrụwo ndị a napụtaworo site ná mgbakasị uche, ọrịa na ịmụ ụmụ a kwatara n’iko nke ihe ndị a na-arụpụta. (1 Ndị Kọrint 6:18; Ndị Hibru 13:4) Site n’itinye ndụmọdụ dị ka nke dị na 2 Ndị Kọrint 7:1 n’ọrụ, ha enwerewo onwe ha pụọ n’ịbụ ndị ụtaba ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ riri ahụ, bụ́ ndị na-emebi ahụ ike mmadụ nweekwa ike ịkpata nnwuchu ọnwụ. Iwu ya nke ‘izere ọbara’ enyeworo ndị ozi ya aka imesi ndabere ha dabeere na ya ike dị ka Onye ọ bụ n’aka ya ka olileanya nile nke ndụ ọdịnihu dị, o chebewokwa ha pụọ n’ọrịa ọjọọ dị iche iche ndị a pụrụ ibute site ná mmịnye ọbara.—Ọrụ 15:28, 29.
14. Olee otú ibu ụzọ chọọ Alaeze ahụ kama imikpu onwe anyị n’ụzọ na-enweghị isi n’ime ụwa si abara anyị uru?
14 Ebe anyị ka nọ n’ime ụwa, anyị na ya aghaghị inwe mmekọrịta ruo n’ókè ụfọdụ. Jehova na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara itinye olileanya anyị na ya, ka anyị gbara ịbụ akụkụ ya. Ọ maara ihe dịirị ụwa n’ọdịnihu. Lee ka o si bụrụ nzuzu nye mmadụ iji ndụ ya mee ihe n’iwulite ihe Chineke ga-etikpọsị! Ọbụna nke ka njọ, ndị na-eme otú ahụ ga-ahụ na ha ga-ekere òkè n’ihe ga-abịakwasị ụwa nke ha raaraworo ndụ ha nye. Ya mere, lee ka o si baa uru, bụ́ ndụmọdụ ahụ Ọkpara Chineke nyere, sị: Chọọ Alaeze Chineke! Tinye ya n’ihe mbụ ná ndụ gi!—1 Jọn 2:17; Matiu 6:33.
15. (a) Ka anyị wee soro ná ndị ga-enweghachi ihe ahụ Adam tụfuru, gịnị ka anyị na-aghaghị ịmụta ime? (b) Olee otú Jehova ga-esi gwa anyị okwu n’ime Puku Afọ ahụ?
15 Ebe ọ matazuru ihe nile dị anyị mkpa, Jehova na-akwadebe ndị ya maka ndụ n’ime usoro ihe ọhụrụ ya nke ezi omume. Nnupụisi nke Adam dubara n’ezughị okè mmadụ, ntụfu nke ndụ ebighị ebi na nchụpụ site na Paradaịs. N’ezie, ọ bụrụ na anyị ga-eso ná ndị e ji ihe ahụ Adam tụfuru gọzie, anyị aghaghị igosi ihe àmà nke bụ na anyị na-aṅa nti mgbe Chineke na-ekwu okwu. Oleekwa otú ọ ga-esi gwa anyị okwu n’ime Puku Afọ ahụ nke na-abịanụ, mgbe ọ na-eweta ụmụ mmadụ n’izu okè? Ọ bụ site n’Alaeze Mesaia ahụ. Ọchịchị ahụ ọ̀ ga-enwe ndị nnọchianya n’elu ụwa, bú ndị a na-ahụ anya? Ee. Eze ahụ ga-enwe ndị na-ejere ya ozi, bụ́ ndị isi n’ụwa nile. (Abụ Ọma 45:16; tụlee Aisaia 32:1, 2.) Site ná nrubeisi na ịhụnanya nye ndị isi ndị a, ụmụ mmadụ ga-egosipụta na ha doro onwe ha n’okpuru Eze eluigwe ha.
16. N’ihi gịnị ka nrubeisi nye ndị okenye ọgbakọ ji bụrụ ihe nchebe ugbu a, ò sikwa aṅaa bụrụ nkwadebe dị mma maka ndụ n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke?
16 N’ịkwadebe maka oge ahụ, Jehova na-enye ọzụzụ ugbu a site ná nzụkọ ọchịchị Chineke ya a na-ahụ anya. N’ime ọgbakọ nile, o welitewo ndị tozuworo okè n’ime mmụọ, ma ọ bụ ndị okenye. Ha na-enye nlekọta dị mkpa maka nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ, na-ebutekwa ụzọ ná nkwusa ozi Alaeze ahụ. Ha na-enyere ndị nile chọrọ ife Jehova aka ịmụta otú ha ga-esi tinye ụkpụrụ Bible nile n’ọrụ ná ndu ha, jirikwa ịhụnanya na-enye ịdọ aka ná ntị banyere ọnyà ndị pụrụ imebi mmekọrịta mmadu na Chineke. Ndịàmà Jehova n’ụwa nile amatawokwa na iso nduzi ndị okenye arụpụtawo nchebe nke ndụ mgbe mgbe n’oge oké ifufe, ala ọma jijiji na ntiwapụ nke ime ihe ike. Ọgbakọ abụghị nke ndị okenye; ọ bụ nke Chineke. Ndị okenye adịghị asị na ha nwere ike mmuọ nsọ. Ma, dị ka Akwụkwọ nsọ gosiri, Chineke na-eji ha eme ihe n’idu ndú, nrubeisi nye ha na-egosikwa nkwanye ùgwù maka ndokwa Jehova ji na-eme ihe iji kwadebe ndị na-ejere ya ozi maka nlanarị baa n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ ya.—Ọrụ 20:28; Ndị Hibru 13:17.
17. Gịnị kwesịrị ikwali anyị irube isi?
17 Otú ọ dị, ọ bụghị ọchịchọ nkitị nke ịbụ otu n’ime ndị ga-alanarị mbibi ụwa na-abịanụ ga-akwali mmadụ gaa ná nrubeisi dị otú ahụ. E nwere ihe karịrị nke ahụ. Ọ̀ bụ gịnị? Inwe ekele maka ndụ na ndokwa nile Chineke mere iji kwadoo ya. Inwe ekele maka onyinye ya nile ndị na-eme ka ndụ anyị baa ụba—ike iche echiche, inwe ọṅu n’ihe mara mma na ịmata uru nke ihe ime mmuọ, ike ịmata na ife Onye Kere anyị ofufe. Ọzọ, ịmata ịhụnanya dị ukwuu Chineke nwere n’onwe ya, nke kwaliri ya inye Ọkpara nke ya ka ọ tọgbọ ndụ ya n’àjà ka anyị wee nwee ike inwe ohere nke ibi ndụ ebighị ebi.
18. Mgbe anyị matara Chineke nke ọma, olee otú anyị si ele nrubeisi ya na nzukọ ya anya?
18 Nye ndị ahụ mataworo Chineke nke ọma, irube isi abụghị ọrụ na-adịghị enye ọṅụ. Inwe ezi nghọta nke nzube ya nile na ihe ndị ọ chọrọ mmadu n’aka, tinyere inwe ahụmahụ nke ezi ihe na-esi n’itinye ha n’ọrụ apụta, na-ewepụ ịrụ ụka ọ bụla n’uche ha na ime ihe n’uzọ nke Chineke bụ nanị ụzọ ezi uche dị na ya. Ha na-ahụ ya dị ka nchebe. Ọ bụkwa ụzọ nke igosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ. Ha na-achọta obi ụtọ dị ukwuu n’irubere ya isi.—1 Jọn 5:3; Abụ Ọma 119:129.
[Foto ndị dị na peeji nke 135]
Ọ dị ụfọdụ ndị mkpa imeri mpako, dị ka Neaman onye ekpenta mere