ISI NKE 51
Nwatakịrị Nwaanyị Nyeere Otu Dike Aka
E nwere otu nwatakịrị nwaanyị Izrel bi na Siria. Siria dị anya n’Izrel. Ndị agha Siria dọọrọ ya n’agha laa n’obodo ha, ya agbawara nwunye onyeisi ndị agha aha ya bụ Neeman odibo. Nwatakịrị nwaanyị a na-efe Jehova, n’agbanyeghị na ndị ya na ha bi anaghị efe ya.
E nwere ọrịa ọjọọ Neeman na-arịa n’akpụkpọ ahụ́ ya nke na-eme ka ahụ́ na-afụ ya ụfụ mgbe niile. Nwatakịrị nwaanyị a chọrọ ka Neeman gbakee. Ọ gwara nwunye Neeman, sị: ‘Ama m onye ga-emeli ka di gị gbakee. E nwere onye amụma Jehova n’Izrel aha ya bụ Ịlaịsha. Ọ ga-agwọli di gị.’
Nwunye Neeman gwara di ya ihe nwatakịrị nwaanyị a kwuru. Neeman chọrọ ime ihe ọ bụla a gwara ya ka o nwee ike ịgbake. N’ihi ya, ọ gara n’ụlọ Ịlaịsha n’Izrel. Neeman chere na Ịlaịsha ga-anabata ya ka onye ukwu. Ma, Ịlaịsha apụtadịghị hụ ya, kama ọ gwara onye na-ejere ya ozi ka ọ gaa kelee Neeman ma gwa ya ihe ọ ga-eme, sị: ‘Gaa mikpuo onwe gị ugboro asaa n’Osimiri Jọdan. Ị ga-agbake.’
Ihe a were Neeman ezigbo iwe. O kwuru, sị: ‘Eche m na ihe onye amụma a gaara eme ka m gbakee bụ ịkpọ aha Chi ya ma fegharịa aka ya n’elu isi m. Kama, ọ gwara m ka m gaa n’osimiri a dị n’Izrel. Anyị nwere osimiri ndị ka ya mma na Siria. Gịnị mere na agaghị m aga na ha mikpuo onwe m?’ Iwe were Neeman, ya esi n’ụlọ Ịlaịsha lawa.
Ndị na-ejere Neeman ozi nyeere ya aka ka o chee echiche nke ọma. Ha sịrị ya: ‘È nwere ihe a ga-asị gị mee ka ị gbakee ị na-agaghị eme? Ihe a onye amụma a gwara gị mee esighị ike. Biko, meenụ ya.’ Neeman gere ha ntị. Ọ gara n’Osimiri Jọdan mikpuo onwe ya ugboro asaa. Mgbe ọ pụtara na nke ugboro asaa, ọrịa ya lara kpamkpam. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya agaghachi na nke Ịlaịsha ka o kelee ya. Ọ gwara Ịlaịsha, sị: ‘Amatala m ugbu a na Jehova bụ ezi Chineke.’ Olee otú i chere obi dị nwatakịrị nwaanyị Izrel ahụ mgbe Neeman lọtara, ya abụrụ na ahụ̀ adịla ya mma?
“I meela ka ọnụ ụmụaka na ụmụ ọhụrụ too gị.”—Matiu 21:16