Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 5/15 p. 8-9
  • Nwa Agbọghọ Nta nke Ji Obi Ike Kwuo Okwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwa Agbọghọ Nta nke Ji Obi Ike Kwuo Okwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Obi Ike Ikwulite Okwu
  • Ịgwọ Neaman
  • Ihe Mmụta Nye Anyị
  • Ọ Masịrị Ya Inyere Onye Ọzọ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Nwatakịrị Nwaanyị Nyeere Otu Dike Aka
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • O Nupụrụ Isi ma Mechaa Mee Ihe A Gwara Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Otu Nwa Agbọghọ Nta Enyere Otu Dike Aka
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 5/15 p. 8-9

Ha Mere Uche Jehova

Nwa Agbọghọ Nta nke Ji Obi Ike Kwuo Okwu

NA NARỊ afọ nke iri T.O.A., mmekọrịta dị n’etiti ndị Israel na ndị Siria adịchaghị mma. A na-enwekarị ntiwapụ nke ịlụ agha nke na mgbe a na-emeghị ihe ike ruo afọ atọ, ọ ghọrọ ihe kwesịrị ndetu.—1 Ndị Eze 22:1.

Ihe kasị eyi egwu n’oge ndị ahụ bụ ìgwè ndị Siria na-apụnara mmadụ ihe, nke ihe mejupụtara ụfọdụ bụ ọtụtụ narị ndị soja. Ndị agha a ga-awakpo ma kwakọrọ ngwongwo ndị Israel, na-atọrọ ma na-ejide ọtụtụ ndị n’ohu—ọbụna ụmụaka.

N’otu mwakpo, e ji obi ịta mmiri kewapụ “otu nwa agbọghọ nta” n’ebe ezinụlọ ya na-atụ egwu Chineke nọ. (2 Ndị Eze 5:2) N’ịbụ onye a kpọgara Siria, a manyere ya ibi n’etiti ndị ọ gaara atụworị ụjọ, ndị ọ na-amabughịkwa—ndị na-efe anyanwụ, ọnwa, kpakpando, osisi, ihe ọkụkụ, na ọbụna okwute. Lee ka ha si dị iche n’ebe ezinụlọ na ndị enyi ya nọ, bụ́ ndị na-efe otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova! Otú ọ dị, ọbụna na gburugburu ebe a ọ na-amabughị, nwatakịrị nwanyị a gosipụtara obi ike dị ịrịba ama banyere ofufe Jehova. Dị ka ihe si na ya pụta, ọ gbanwere ndụ nke otu onye isi a ma ama nke na-eje ozi n’okpuru eze Siria. Ka anyị lee otú o si mee.

Obi Ike Ikwulite Okwu

A kpọghị nwa agbọghọ nta ahụ aha n’ihe ndekọ Bible. Ọ ghọrọ ohu nwanyị nke nwunye Neaman, bụ́ onye isi agha dị ike n’okpuru Eze Ben-hedad nke Abụọ. (2 Ndị Eze 5:1) Ọ bụ ezie na a na-akwanyere ya ùgwù nke ukwuu, Neaman nwere ọrịa ahụ na-asọ oyi bụ́ ekpenta.

Ikekwe àgwà nkwanye ùgwù nke nwa agbọghọ ahụ kpaliri nwunye Neaman ịkọrọ ya izu nzuzo ya. Nwanyị ahụ pụrụ ịjụworị nwa agbọghọ ahụ, sị, ‘Gịnị ka a na-emere ndị ekpenta n’Israel?’ Nwa agbọghọ a bụ́ onye Israel emeghị ihere iji nkwuwa okwu kwuo, sị: “A sị na onyenwe m nọ n’ihu onye amụma nke nọ na Sameria! mgbe ahụ ọ ga-eme ka o si n’ekpenta ya dị ọcha.”—2 Ndị Eze 5:3.

E wezụgaghị okwu nwa agbọghọ a n’ụsọ dị ka okwu ụmụaka. Kama nke ahụ, a kọọrọ ha Eze Ben-hedad, bụ́ onye zipụrụ Neaman na ndị ọzọ na njem dị 150 kilomita gaa Sameria ịga chọọ onye amụma a.—2 Ndị Eze 5:4, 5.

Ịgwọ Neaman

Neaman na ndị ikom ya gakwuuru Eze Jehoram nke Israel, na-eji akwụkwọ ozi nkọwa sitere n’aka Ben-hedad na onyinye ego butụrụ ibu. N’ụzọ na-abụghị ihe ijuanya, Eze Jehoram nke na-efe nwa ehi egosighị ụdị okwukwe ahụ nke nwa agbọghọ ahụ bụ odibo gosipụtara n’ebe onye amụma Chineke nọ. Kama nke ahụ, o chere na Neaman bịara iji kpalite esemokwu. Mgbe onye amụma Chineke bụ́ Elaịsha nụrụ banyere ụjọ nke ji Jehoram, o zipụrụ ozi ozugbo ka eze ahụ zite Neaman n’ụlọ ya.—2 Ndị Eze 5:6-8.

Mgbe Neaman bịarutere n’ụlọ Elaịsha, onye amụma ahụ zipụrụ onye ozi nke gwara ya, sị: “Jee, saa ahụ ugboro asaa n’ime Jọdan, anụ ahụ gị ga-alaghachikwutekwa gị, ị ga-adịkwa ọcha.” (2 Ndị Eze 5:9, 10) Iwe were Neaman nke ukwuu. N’ịtụ anya ọgwụgwọ ọrụ ebube na oké ngosipụta, ọ jụrụ, sị: “Abana na Fapa, bụ́ osimiri Damaskọs, hà adịghị mma karịa mmiri Israel nile? m̀ gaghị asa ahụ n’ime ha, dị ọcha?” Neaman si n’ụlọ Elaịsha tụgharịa lawa n’iwe. Ma mgbe ndị odibo Neaman sooro ya tụgharịa uche, n’ikpeazụ o kwetara. Mgbe ọ sasịrị ahụ ugboro asaa n’ime Osimiri Jọdan, “anụ ahụ ya wee laghachi dị ka anụ ahụ nwa okoro nta, o wee dị ọcha.”—2 Ndị Eze 5:11-14.

N’ịlaghachikwute Elaịsha, Neaman sịrị: “Biko, lee, amawo m na ọ dịghị Chineke dị n’ụwa nile, ọ bụ nanị n’Israel.” Neaman kwere nkwa na ya “agaghị emere chi ọzọ àjà nsure ọkụ ma ọ bụ àjà ọzọ site n’ugbu a, ma ọ bụ nanị Jehova.”—2 Ndị Eze 5:15-17.

Ihe Mmụta Nye Anyị

Neaman agaraghị ejekwuru Elaịsha onye amụma ma a sị na nwatakịrị nwanyị bụ odibo ejighị obi ike kwulite okwu. Taa, ọtụtụ ndị ntorobịa na-eme ihe n’ụzọ yiri ya. N’ụlọ akwụkwọ, ha pụrụ ịbụ ndị ụmụ akwụkwọ na-enweghị mmasị n’ijere Chineke ozi gbara gburugburu. Ka o sina dị, ha na-ekwulite okwu banyere ihe ndị ha kwere. Ụfọdụ n’ime ha na-amalite ime otú ahụ n’oge ha dị nnọọ ntakịrị.

Tụlee banyere Alexandra, bụ́ nwatakịrị nwanyị dị afọ ise nọ n’Australia. Mgbe ọ malitere akwụkwọ, nne ya yiri oge ịkọwara onye nkụzi ya ihe ndị Ndịàmà Jehova kwere na ha. Ma nne Alexandra nwetara ihe ijuanya. “Amarala m ọtụtụ n’ime ihe ndị unu kwere, tinyekwara ihe Alexandra ga-eme na nke ọ na-agaghị eme n’ụlọ akwụkwọ,” ka onye nkụzi ahụ kwuru. O juru nne Alexandra anya, ebe ọ bụ na ọ dịghị nwatakịrị ọ bụla ọzọ bụ Onyeàmà nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. “Alexandra agwachaala anyị,” ka onye nkụzi ahụ kọwara. Ee, nwa agbọghọ nta a esorolarị onye nkụzi ya nwee mkparịta ụka e ji akọ mee.

Ndị na-eto eto dị otú ahụ na-eji obi ike ekwu okwu. Ha si otú a na-eme ihe kwekọrọ n’Abụ Ọma 148:12, 13: “Ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ; ndị agadi, ha na ụmụ ntakịrị: ka ha too aha Jehova; n’ihi na e mewo ka aha Ya dị elu, nanị ya: ebube Ya dị n’elu ụwa na eluigwe.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya