Isi 5
Inye Ìhè Maka “Ọgwụgwụ Oge A”
1. Maka “ọgwụgwụ oge a,” alụmdi na nwunye dị aṅaa kwesịrị ịrịba ama ka “Onyeisi Udo” ahụ buru n’amụma, ọ̀ bụkwa n’ilu dị aṅaa?
BANYERE “ọgwụgwụ oge a,” “Onyeisi Udo” ahụ kwuru na Matiu 24:38 na a ga “na-alụ nwunye, na-enyekwa n’ọlụlụ di.” Ma n’otu oge ahụ otu alụmdi na nwunye kasị ukwuu na-amalite n’eluigwe. Ọ bụ alụmdi na nwunye ahụ e zoro aka na ya n’ilu Jisọs nke ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke, ndị chị ọwa.—Matiu 24:3; 25:1-12.
2. (a) N’oge dị aṅaa nke ụbọchị ka agbamakwụkwọ nke a bụ ilu weere ọnọdụ? (b) Gịnị sochiri agbamakwụkwọ ahụ, oleekwa otú e si mee ka e nwee ìhè?
2 Ebe a nọ lụọ di na nwunye a bụ n’Ebe Etiti Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. O weere ọnọdụ n’abalị, na-abanye n’etiti abalị. Agbamakwụkwọ nke nwoke ahụ na-alụ nwunye na nwanyị ya a na-alụ ọhụrụ bu ụzọ were ọnọdụ, ihe sochiri ya bụ ịkwụ n’ahịrị gaa n’ụlọ oriri. Ihe na-enye ìhè n’ụzọ ahụ abụghị ọkụ ndị e gwunyere n’ụzọ. Ìhè e nwere bụ nke sitere n’aka ndị so n’ahịrị obi ụtọ ahụ, ndị guzo n’akụkụ ụzọ pụrụ ikiri ndị ahụ kwụ n’ahịrị ka ha na-agafe, na-ekwu ka obi ụtọ dịrị ndị ahụ lụrụ di na nwunye ọhụrụ.
3, 4. (a) Olee ndị gosiri mmasị ha ná njem ịkwụ n’ahịrị naesonụ, nkwadebe ndị dị aṅaa ka ha mekwara? (b) Mmezu nke ilu a na-eme ka e nwekwuo nnwapụta nke eziokwu dị aṅaa? (ch) Anyị pụrụ inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị emee gịnị?
3 Dị nnọọ ka ọchịchọ obi ha dị ka ndị inyom, ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke nwere mmasị n’agbamakwụkwọ ahụ. Ya mere, n’ogologo ụzọ ịzọ njem ahụ, ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke cheere ruo mgbe ndị ahụ kwụ n’ahịrị agbamakwụkwọ rutere ebe ha nọ. Ọchịchọ ha bụ ime ka ìhè dị n’oge ihe omume ahụ, n’ihi nke a kwa ha nile wetara ọwa a mụnyere ọkụ, ndị a na-ebu n’aka, ma ọ bụ nanị ise n’ime ha ji mmanụ ọkụ a pụrụ iji mee ihe ma e nwee ihe dapụtara ná mberede. Ise ndị a bụ ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche. Mmezu nke ilu a kwesịrị ịmasị anyị taa, n’ihi na dị ka Jisọs Kraịst kwuru, ọ bụ ihe na-emesikwu ya ike na anyị nọ ná mgbe ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie nke a.—Matiu 25:13.
4 Anyị pụrụ inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị nwere uche ma ghọta ihe agbamakwụkwọ nke a kasị agbamakwụkwọ nile pụtara, gụnyere ihe ndị mere na ya! Olee ndị taa nwere ihu ọma nke ịbụ ndị a nabatara n’oriri ahụ? Ọ̀ dị onye ọ bụ n’ime anyị? Ka anyị hụ!
5. Gịnị mere ka e nwee ọdịiche n’etiti ndị ahụ mejupụtara ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke, gịnịkwa mere n’oge ahụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọrọ ọdụ?
5 Ihe atụ ahụ Jisọs nyere banyere ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke metụtara “alaeze eluigwe,” ọchịchị zuru ụwa maka ngọzi nke agbụrụ mmadụ nile. Ya mere Jisọs Kraịst gara n’ihu ikwu, sị: “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere ụmụ agbọghọ iri, ndị chịịrị ọwa ha, pụọ izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Ma ise n’ime ha bụ ndị nzuzu, ise bụkwa ndị nwere uche. N’ihi na ndị nzuzu ahụ, mgbe ha chịịrị ọwa ha, ha ejighị mmanụ n’aka ha: ma ndị ahụ nwere uche ji mmanụ n’arịa ha tinyere ọwa ha. Ma mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-anọ ọdụ dị anya, ha nile robere ụra wee rahụ.”—Matiu 25:1-5.
6. (a) Olee ndị ka ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke sere onyinyo ha? (b) N’ihi gịnị ka a na-akpọtụghị nwanyị a na-alụ ọhụrụ aha n’ilu ahụ?
6 Ugbu a olee ndị ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke bụ ihe atụ ha? Ha bụ ihe atụ nke ndị gaje ịbụ ndị òtù nke nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ nke Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ, Jisọs Kraịst. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na n’ihi nke a a kpọtụghị nwanyị a na-alụ ọhụrụ aha n’ilu Jisọs; nanị ihe pụtara bụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Otú a, e nweghị ihe mgbagwoju anya ọ bụla banyere nkọwa ya, dị ka à ga-asị na ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ka nwere òtù ọzọ ha sere onyinyo ya.
7. N’oge dị aṅaa ka o yiri ka Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ ọ nọwo ọdụ n’ịbịa kpọrọ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
7 Njikọ nke ndị ahụ so n’òtù nke nwanyị a na-alụ ọhụrụ na Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ nke gaje ịlụ ha n’eluigwe ewereghị ọnọdụ, dị ka a tụrụ anya ya, n’ọgwụgwụ nke “oge nke mba ọzọ” na 1914. (Luk 21:24) N’ụzọ ezi uche dị na ya, nye ha, o yiri ka Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ anọwo ọdụ ịbịa, ọ bụ ezie na ọnụnọ ya n’Alaeze eluigwe weere ọnọdụ na 1914. Afọ iru újú ndị ahụ nke Agha Ụwa Mbụ yiri nnọọ abalị dị ezi oji n’ahụmahụ nke òtù ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke.
8. (a) Olee otú o si bụrụ na n’ụzọ ihe atụ, e nwere iro ụra na ihi ụra n’akụkụ nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke? (b) Ọ̀ bụ n’ihi nzube dị aṅaa ka Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ jiri bịa n’ụlọ nsọ ahụ, n’ihi gịnịkwa ka nke a jiri metụta òtù nke nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ?
8 N’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, iro ụra na ihiri ụra n’akụkụ nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke weere ọnọdụ. Nkwusa ihu ọha nke ozi ọma nke ọchịchị puku afọ na-abịanụ nke Kraịst maka ngọzi nke agbụrụ mmadụ nile fọrọ nke nta ka ọ kwụsị. Site n’afọ ikpeazụ nke Agha Ụwa Mbụ, oge dị oké mkpa nke ikpe malitere maka ụmụ agbọghọ ihe atụ ahụ na-amaghị nwoke. Nke a bụ n’ihi na Eze ahụ na-achị achị bụ́ Jisọs Kraịst abịawo n’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ. Mgbe ọ bịarutere n’ebe ahụ, ọ malitere ikpe ikpe iji mee ka ndị ahụ a họpụtara ije ozi n’ụlọ nsọ Jehova Chineke dị ọcha. (Malakaị 3:1-3) Nke a bụ oge maka mpụta ìhè ya mgbe, dị ka Onye Na-alụ Nwunye Ọhụrụ n’eluigwe, o ruru ka ọ nata n’eluigwe nye onwe ya ndị a nwapụtara anwapụta so n’òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, ndị nwụworo anwụ n’oge ahụ.
9. Olee mgbe oge ya ruru maka ịkpọte òtù nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke site n’ụra nke arụghị ọrụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
9 Na 1919, mgbe ntọhapụ nke mmadụ asatọ a ma ama bụ́ ndị òtù nke Watch Tower Bible and Tract Society site ná mkpọrọ na-ezighị ezi a tụrụ ha gasịrị, oge ruru ka a kpọtee ndị òtù nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ka dị ndụ n’elu ala n’ụra arụghị ọrụ ha. Ọrụ inye ìhè zuru ụwa dị n’ihu. N’iji ọwa na-enwu ọkụ, ọ bụ oge maka ha izute Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ, onye bịaworo n’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ. Nke a bụ ka ndị si ná mba nile nwee ike ịdịrị n’ìgwè banye ‘n’ụlọ Jehova’ bụ́ nke e buliworo elu karịa ugwu nile, dị ka a pụrụ ikwu ya.—Aịsaịa 2:1-4.
Ime Ka Ọwa Ha Dịrị n’Ọnọdụ Dị Mma
10. Gịnị ka mmanụ ahụ e wetara site n’arịa nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche na-ese onyinyo ya?
10 Ndị nwere uche n’òtù nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ewerewo n’arịa mmanụ ha mmanụ ọkụ a pụrụ iji mee ihe ma e nwee ihe mberede. Ha egbughị oge n’ịgbajughachi ọwa ha. Mmanụ ọkụ ahụ e ji eme ka e nwee ìhè sere onyinyo Okwu na-enye ihe nke Jehova na mmụọ nsọ ya. Ya mere, gịnị ka mmanụ e wetara site n’arịa ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche na-ese onyinyo ya? Ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ nke mmụọ Jehova e debere iji mee ihe n’ọdịnihu nke na-eme ka ìhè mụkwasị Okwu ya e dere ede bụ́ nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ nke ndị ahụ e ji mmụọ nsọ mụọ bụ́ ndị na-eso ụzọ nke Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ nwere n’ime onwe ha mgbe ọrụ inye ìhè ahụ zuru ụwa banyere “alaeze eluigwe” bụ́ nke a ga-arụ mgbe agha ahụ gasịrị gaje ịmalite dị ka e si kaa ya aka.
11. Gịnị ka arịa ihe atụ ndị ahụ e ji tinye mmanụ ahụ bụ?
11 Arịa ndị ahụ sere onyinyo ụmụ agbọghọ ihe atụ ahụ na-amaghị nwoke n’onwe ha, ndị nwere uche dị ka ndị nwere mmanụ ihe atụ ahụ nke inye ìhè. Nke a apụtaghị na e bu ụzọ jiri mmụọ Jehova tee ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke mmanụ mgbe ahụ. Ee e, ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke adịghị eji mmụọ ya ete onwe ha mmanụ. Ọ bụ ya na-ete ha!—Aịsaịa 61:1, 2; Luke 4:16-21.
12. (a) Olee amụma Joel nke oge ya ruru ịbụ nke e mezuru n’isi ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche? (b) Olee mgbe oge ya ruru ka ha mee ka ìhè nwuo site n’ọwa ha?
12 N’ịkwado na ha bụ ndị e kenyere ọrụ buru ibu nke inye ìhè gburugburu ụwa banyere “alaeze eluigwe,” ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ́ ndị nwere uche, nwere ihu ọma nke ịbụ ndị e mezuru Joel 2:28, 29 n’isi ha. Otú a ka onyeozi bụ́ Pita si hota amaokwu ndị ahụ: “Ọ ga-erukwa na mgbe ikpeazụ, ka Chineke kwuru, M ga-awụsa ụfọdụ n’ime mmụọ m n’ahụ anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ: ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ, ndị okenye unu ga-arọkwa nrọ.” (Ọrụ 2:17) Ya mere, site na 1919 gaa n’ihu ndị ahụ nwere uche n’òtù nke ụmụ agbọghọ ihe atụ ahụ na-amaghị nwoke ga-eweli ihe ha ji enye ìhè, ọwa ihe atụ ha—ha onwe ha. Nke a ka ha mere iji nye ndị nile ka nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ ihe ọmụma. N’ihi ụdị ndụ ha na-adị n’okpuru ike nke Okwu Chineke na mmụọ ya, ha ghọrọ “ndị na-enye ìhè n’ụwa.” (Ndị Filipaị 2:15) Otú a ha malitere ije ije ná nzọụkwụ nke Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ ka ọ na-akwadebe ịnara nye onwe ya n’Alaeze eluigwe ndị nile so n’òtù nke nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ mgbe ha nwụsịrị n’elu ụwa.—Matiu 5:14-16.
Ihe Ndị Si n’Ịdị Nzuzu Ime Mmụọ Pụta
13. Olee otú ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche si zaghachi n’arịrịọ nke ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke?
13 Ugbu a, gịnị banyere ndị dị nzuzu n’òtù nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke? Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị nzuzu wee sị ndị nwere uche, Nye anyị ụfọdụ ná mmanụ unu; n’ihi na ọwa anyị na-anyụ anyụ. Ma ndị nwere uche zara, sị, Ee e, eleghị anya ọ gaghị ezuru anyị na unu: kama jekwurunụ ndị na-ere, zụrụ nye onwe unu.”—Matiu 25:8, 9.
14. N’ihi gịnị ka ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ́ ndị jụrụ ka e kee mmanụ ha jiri bụrụ ndị nwere uche kama ịbụ ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị?
14 Ndị ahụ jụrụ isoro ndị nzuzu ahụ kerịta ihe abụghị ndị na-achọ ọdịmma nanị ha, ha bụ nanị ndị nwere uche. Ha na-anọgidesi ike n’imezu nzube mbụ ha nke ichere mmadụ echiche ọma, bụ́ ime ka ìhè dịrị na gburugburu ebe nile ahụ gbara ọchịchịrị n’ihi Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ. Ọ dịghị n’ụzọ ọ bụla ha kwere ka a manye ha imebi okwukwe ha, igbubilata ọ̀tụ̀tụ̀ nke mmụọ nsọ Jehova ha nwere, iji menyere ndị ahụ dị nzuzu n’ime mmụọ. Ụdị ndị nzuzu ahụ adịghị mgbe ha kwadebere onwe ha ịbanye n’egbughị oge n’ihe ùgwù ije ozi na-emeghepụrụ ha na 1919.
15. (a) Mgbe oge udo ahụ rutere, olee ndị n’etiti ndị òtù nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke malitere igosipụta omume nke ịdị nzuzu n’ime mmụọ? (b) N’ihi gịnị ka ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche n’enweghị ike inyere ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke aka, bụ́ ndị dị nzuzu n’ime mmụọ?
15 Mgbe oge nke udo meghepụrụ, ụfọdụ n’ime ndị ahụ kwuru na ha bụ ndị òtù raara onwe ha nye e mere baptism, malitere igosi nzuzu ime mmụọ. Mgbe ọnwụ onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society bụ Charles Taze Russell gasịrị, ha esoroghị ngwá ọrụ a na-ahụ anya nke Jehova Chineke n’okpuru onye isi oche ọhụrụ ya, J. F. Rutherford, banye n’ụzọ zuru ezu ná mmụọ nke ihe ndị na-emenụ. Obi ha anabataghị n’ezie ụzọ e si na-eme ihe. Ha gosipụtara enweghị ekele maka ụzọ Jehova si na-emeso ndị ya. Otú a, ndị ahụ yiri ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche apụghị inye ndị a dị nzuzu, ndị na-aga n’ihu na-ekewapụ onwe ha ezi mmụọ nke nkwado si n’ala ala obi.
16. Olee otú e si mee ka ịdị nzuzu n’ime mmụọ pụta ìhè n’akụkụ nke ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke?
16 E si otú a mee ka nzuzu ime mmụọ pụta ìhè. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịda inwe mmanụ ihe atụ ahụ n’oge ahụ dị oké mkpa mgbe e nwere ezi mkpa maka inye ìhè ime mmụọ ka ihe omume ọhụrụ dị iche iche na-aga n’ihu, na-egosi na Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ erutewo. Ya mere ọ bụ oge onye ọ bụla iburu ọwa ya nke na-enwu ọkụ nke ọma pụọ ije zute ya, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ. Ma kama nke ahụ, ndị ahụ yiri ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke, ndị ọwa ha na-anyụ anyụ, kewapụrụ onwe ha n’ebe ndị ahụ nwere uche nọ.
17. Mfu dị aṅaa a na-apụghị imezi emezi funarịrị ndị ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke sere onyinyo ha, dị ka e gosiri na Matiu 25:10?
17 Lee ihe mfu a na-apụghị imezi emezi ọ bụ mgbe onye na-ekwu na ya bụ onye a gụnyere ná ndị òtù nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke tụfuru ihe ùgwù a na-apụghị inweta ọzọ na ohere nke ịnabata Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ Jisọs Kraịst! Mfu dị otú ahụ mere ndị nzuzu ahụ so n’ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke nke oge a, dị ka e gosiri n’okwu ndị ọzọ nke ilu Jisọs: “Ma mgbe ha na-eje ịzụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịara; ndị e doziworo wee so ya baa n’oriri ọlụlụ nwunye: e wee mechie ụzọ.”—Matiu 25:10.
18. (a) Ihe ùgwù dị aṅaa ka ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke nke narị afọ a dara ada inwe? (b) N’ihi gịnị ka ndị nzuzu ahụ ji bụrụ ndị bịara n’azụ oge nke na ha esonyeghị ná njem ịkwụ n’ahịrị nke agbamakwụkwọ ahụ na maka ịbanye n’oriri ahụ?
18 Lee ahụmahụ ọdachi ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke nke oge a nwere! N’oge nke a kasị oji n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, ha esoghị na-ekere òkè n’ọrụ nke inye ndị nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ ìhè, bụ́ ndị nọ n’onyinyo nke ọnwụ ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile’! (Mkpughe 16:14) Ebe ọ na-adịghị mmanụ dị n’ọwa ihe atụ ha iji mee ka ìhè dịrị n’ụzọ ha, ha hapụrụ wee jee ije n’ọchịchịrị nke etiti abalị. N’ihi nke a ha abịaghị n’oge iji jee ije ná nzọụkwụ nke Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ n’ahịrị obi ụtọ ahụ gabiga ọnụ ụzọ ahụ banye n’oriri agbamakwụkwọ ahụ ebe ìhè dị na ya nke ọma. Ha atụfuwo ihe e ji amata ha dị ka ụmụ azụ ya, ndị a gaje ijikọ ha na ya n’alụmdi na nwunye n’Alaeze eluigwe. A chọtaghị ha dị ka ndị “e doziworo” n’oge ahụ a kara aka. Lee ihe atụ ịdọ aka ná ntị ha bụ!
19. Ahụmahụ dị aṅaa na-echere anyị maka ịchụso okwu a ruo ná ngwụsị ya?
19 E gosiri eziokwu a na-egbu mgbu n’obi n’akụkụ ikpeazụ nke ilu Jisọs Kraịst, bụ́ Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ, karịsịa nye anyị bụ́ ndị na-ebi ‘n’ọgwụgwụ oge a.’ Ya mere ka anyị gakwuo n’ihu n’okwu ahụ! Inye ìhè na-akpali ọṅụ na-echere anyị n’ihi ime nke a, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu sonụ.
[Foto dị na peeji nke 45]
Ndị yiri ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke agaghị abanye n’oriri agbamakwụkwọ ahụ