Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/15 p. 8-9
  • Ụmụ Agbọghọ Ndị Maara Ihe na Ndị Nzuzu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụ Agbọghọ Ndị Maara Ihe na Ndị Nzuzu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inye Ìhè Maka “Ọgwụgwụ Oge A”
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Jizọs Ejiri Ihe Atụ Ụmụ Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Kụzie Gbasara Ịmụrụ Anya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ịmụrụ Anya n’Oge “Ọgwụgwụ Oge A”
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Ihe Ịrịba Àmà Mgbe Ikpeazụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/15 p. 8-9

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

Ụmụ Agbọghọ Ndị Maara Ihe na Ndị Nzuzu

JISỌS anọwo na-azaghachi arịriọ ndị ozi ya rịọrọ maka ihe àmà nke ọnụnọ ya n’ike Alaeze. Ugbu a, o nyekwuru akụkụ atọ ndị ọzọ nke ihe àmà ahụ n’ilu ma ọ bụ ihe atụ atọ dị iche iche.

Ndị dị ndụ n’oge ọnụnọ ya ga-ahụ mmezu nke nke ọ bụla n’ime ihe atụ ndị ahụ. Ọ malitere nke mbụ site n’ikwu, sị: “Mgbe ahụ a ga-eji alaeze eluigwe tụnyere ụmụ agbọghọ iri, ndị chịịrị ọwa ha, pụọ izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Ma ise n’ime ha bụ ndị nzuzu, ise bụkwa ndị nwere uche.”

Site n’okwu ahụ bụ “a ga-eji alaeze eluigwe tụnyere ụmụ agbọghọ iri,” ihe Jisọs na-ekwu abụghị na ọkara n’ime ndị ga-eketa Alaeze eluigwe ahụ bụ ndị nzuzu ebe ọkara nke ọzọ bụ ndị nwere uche! Ee e, kama ihe o bu n’uche bụ na n’ihe bayere Alaeze nke eluigwe, na e nwere otu akụkụ ya yiri nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ma ọ bụ na okwu ndị metụtara Alaeze ahụ ga-eyi ihe nke a ma ọ bụ ihe nke ọzọ.

Ụmụ agbọghọ iri ahụ nọchiri anya ndị Kraịst nile ndị nwere olileanya, ma ọ bụkwanụ na-ekwupụta na ha nwere olileanya, maka Alaeze eluigwe ahụ. Ọ bụ na Pentikọst nke afọ 33 O.A. ka e kwere ọgbakọ ndị Kraịst nkwa ọlụlụ nye Onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilite, meekwa ka ọ dị ebube, bụ́ Jisọs Kraịst. Ma alụmdi na nwunye ahụ gaje iwere ọnọdụ n’eluigwe n’otu oge a na-akaghị aka n’ọdịnihu.

N’ihe atụ ahụ, ụmụ agbọghọ iri ahụ pụrụ, na-enwe nzụbe nke ịnabata onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ wee sonye n’ịkwụ n’ahịrị maka alụmdi na nwunye ahụ. Mgbe ọ bịarutere, ha ga-eji ọwa ha mee ka e nwee ìhè n’okporo ụzọ ahịrị ahụ ga-esi gabiga, wee si otú a na-akwanyere ya ùgwù mgbe ọ na-akpọlata nwanyị ọhụrụ ya n’ụlọ nke ọ kwadebeworo nye ya. Otú ọ dị, Jisọs kọwara, sị: “Ndị nzuzu ahụ, mgbe ha chịịrị ọwa ha, ha ejighị mmanụ n’aka ha: ma ndị ahụ nwere uche ji mmanụ n’arịa ha tinyere ọwa ha. Ma mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-anọ ọdụ dị anya, ha nile rubere ụra wee rahụ.”

Ogologo ịnọ ọdụ nke onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ na-egosi na ọnụnọ Kraịst dị ka Eze na-achị achị ga-abụ n’ọdịnihụ dị anya site na mgbe ahụ. O mesịrị bịa n’ocheeze ya n’afọ 1914. N’ogologo anyasị nke dịrị tupu mgbe ahụ, ụmụ agbọghọ nile ahụ malitere ihi ụra. Ma a katọghị ha n’ihi nke a. Nkatọ a katọrọ ụmụ agbọghọ ahụ bụ́ ndị nzuzu bụ n’ihi na ha ejighị mmanụ n’arịa ha. Jisọs kọwara ụzọ ụmụ agbọghọ ahụ si teta n’ụra tupu onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ abịarute:

“Ma n’etiti abalị iti mkpu dara, Lee, onye na-alụ nwunye ọhụrụ! Pụtanụ izute ya. Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ ahụ nile biliri, wee dozie ọwa ha. Ndị nzuzu wee sị ndị nwere uche, Nye anyị ụfọdụ ná mmanụ unu; n’ihi na ọwa anyị na-anyụ anyụ. Ma ndị nwere uche zara, sị, Ee e, eleghị anya ọ gaghị ezuru anyị na unu: kama jekwurunụ ndị na-ere, zụrụ nye onwe unu.”

Mmanụ ahụ nọchiri anya ihe ahụ na-eme ka ezi ndị Kraịst nọgide na-enwu enwu dị ka ihe na-enye ìhè, ya bụ, Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ ya, bụ́ nke ha na-ejidesi aka ike, ya na mmụọ nsọ ahụ, nke na-enyere ha aka ịghọta Okwu ahụ. Mmanụ ime mmụọ ahụ na-eme ka ụmụ agbọghọ ahụ nwere uche nwee ike inye ìhè mgbe ha na-anabata onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ n’oge a na-aga njem ahụ ije oriri alụmdi na nwunye. Ma òtù ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ enweghị n’ime onwe ha, bụ́ n’ime arịa ha, mmanụ ime mmụọ ahụ dị mkpa. Ya mere Jisọs kọwara ihe merenụ, sị:

“Ma mgbe [ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ] na-eje ịzụ [mmanụ], onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịara; ndị e doziworo wee soo ya baa n’oriri ọlụlụ nwunye: e wee mechie ụzọ. E mesịa ụmụ agbọghọ fọdụrụ bịakwa, na-asị, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ. Ma ọ zara, sị, N’ezie asị m unu, amataghị m unu.”

Mgbe Kraịst bịarutesịrị n’Alaeze eluigwe ya, òtù ụmụ agbọghọ ahụ nwere uche nke ndị Kraịst e tere mmanụ tetara n’ụra n’ihe banyere ihe ùgwù ha nke inye ìhè n’ime ụwa nke a nọ n’ọchịchịrị n’inye Onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ nke lọghachiworonụ otuto. Ma ndị ahụ ndị ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ sere onyinyo ha adịghị njikere inye otuto nnabata nke a. Ya mere mgbe oge ruru, Kraịst adịghị emeghere ha ụzọ oriri ọlụlụ di na nwunye ahụ n’eluigwe. Ọ na-ahapụ ha n’èzí n’ọchịchịrị kasị dị omimi nke anyasị nke ụwa, isoro ndị ọzọ nile na-arụ ọrụ mmebi iwu lakọọ n’iyi. Jisọs kwubiri, sị, “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge awa ahụ.” Matiu 25:1-13.

◆ Ole ndị ka ụmụ agbọghọ iri ahụ sere onyinyo ha?

◆ Olee mgbe e kwere nkwa ọlụlụ ahụ nye onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ, ma olee mgbe ọ bịarutere ịkpọrọ nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ jee oriri alụmdi na nwunye ahụ?

◆ Gịnị ka mmanụ ahụ nọchiri anya ya, gịnịkwa ka inwe ya mere ka ụmụ agbọghọ ahụ nwere uche nwee ike ime?

◆ Olee ebe a nọ nwee oriri alụmdi na nwunye ahụ?

◆ Oké ụgwọ ọrụ dị aṅaa funahụrụ ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ, gịnịkwa bụ ọnọdụ ha?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya