Isi 111
Ihe Ịrịba Àmà Mgbe Ikpeazụ
Ọ BỤ ehihie ụbọchị Tuesday ugbu a. Ka Jisọs na-anọdụ n’elu Ugwu Olive, na-ele ụlọ ukwu ahụ nke dị na ndịda anya, Pita, Andru, Jemes, na Jọn bịakwutere ya iche. Ha nwere nchegbu banyere ụlọ ukwu ahụ ebe ọ bụ na Jisọs ka busịrị nnọọ n’amụma na a gaghị ahapụ otu nkume n’elu ibe ya n’ime ya.
Ma o yiri ka ha bu ihe karịrị nke ahụ n’uche mgbe ha na-abịakwute Jisọs. N’izu ole na ole gara aga, o kwuwo okwu banyere “ọnụnọ,” ya, bụ́ oge “a ga-ekpughe Nwa nke mmadụ.” N’otu oge gakwara aga, ọ gwawo ha banyere “ọgwụgwụ usoro ihe nke a.” Ya mere ndị ozi ahụ nwere ọtụtụ ajụjụ ha chọrọ ịmata azịza ha.
Ha kwuru sị, “Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ [nke ga-arụpụta mbibi nke Jerusalem na ụlọ ukwu ya]? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a?” (NW) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ajụjụ ha bụ nke nwere akụkụ atọ. Nke mbụ, ha chọrọ ịmara banyere ọgwụgwụ nke Jerusalem na ụlọ ukwu ya, mgbe ahụ banyere ọnụnọ Jisọs n’ike Alaeze, na n’ikpeazụ, banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe nile.
Ná nzaghachi ya dị ogologo, Jisọs zara akụkụ atọ nile nke ajụjụ ahụ. O nyere ihe àmà nke na-egosi mgbe usoro ihe nile nke ndị Juu ga-agwụ; ma o nyekwara ihe àmà ndị ọzọ. O nyekwara ihe àmà nke ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya n’ọdịnihu mara na ha na-ebi ndụ n’oge ọnụnọ ya, na ha na-ebikwa na nso nke ọgwụgwụ usoro ihe nile.
Ka afọ na-agabiga, ndị ozi ahụ hụrụ mmezu nke amụma Jisọs. Ee, kpọmkwem ihe ndị ahụ o buru n’amụma malitere imezu n’ụbọchị ha. Otú a, ndị Kraịst bụ́ ndị dịrị ndụ ruo 37 afọ n’ihu n’afọ 70 O.A., abụghị ndị mbibi nke usoro ihe ndị Juu na ụlọ ukwu ya bịara na mberede.
Otú ọ dị, ọnụnọ Kraịst na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a ewereghị ọnọdụ na 70 O.A. Ọnụnọ ya n’ike Alaeze weere ọnọdụ mgbe ogologo oge gasịrị. Ma olee mgbe ọ bụ? Ntụle nke amụma Jisọs na-ekpughe nke a.
Jisọs buru amụma na “agha dị iche iche na akụkọ agha dị iche iche” ga-adị. “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ,” a ga-enwekwa ụkọ nri, ala ọma jijiji, na ọrịa na-efe efe. A ga-akpọ ndị na-eso ụzọ ya asị, gbuokwa ha. Ndị amụma ụgha ga-ebili, duhiekwa ọtụtụ ndị. Mmebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi. N’otu oge ahụkwa, a ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi dị ka ihe àmà nye mba nile.
Ọ bụ ezie na amụma Jisọs nwere mmezu a kpaara ókè tupu mbibi nke Jerusalem na 70 O.A., akụkụ dị ukwuu nke mmezu ya na-ewere ọnọdụ n’oge ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. Iji nlezianya tụleghachi ihe ndị na-eme n’ụwa kemgbe 1914 na-ekpughe na amụma ahụ dị oké mkpa nke Jisọs buru anọwo na-enwe mmezu ka ukwuu kemgbe afọ ahụ.
Akụkụ ọzọ nke ihe àmà ahụ Jisọs nyere bụ mpụta nke “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.” N’afọ 66 O.A., ihe arụ nke a pụtara n’ụdị nke “usuu ndị agha” Rom gbara Jerusalem gburugburu, gwupuokwa mgbidi ụlọ ukwu ahụ. “Ihe arụ” ahụ na-eguzo n’ebe ọ na-ekwesịghị ịnọ.
Ná mmezu ka ukwuu nke ihe àmà ahụ, ihe arụ ahụ bụ òtù ụwa bụ League of Nations na nke nọchiri ya, bụ́ òtù United Nations. Krisendọm na-ele òtù udo ụwa nke a anya dị ka ihe nnọchianya nke Alaeze Chineke. Lee nnọọ ka o si bụrụ ihe arụ! Otú ọ dị, ka oge na-aga, ike ọchịchị dị iche iche nke nọ n’òtù UN ga-atụgharị megide Krisendọm (Jerusalem nke oge a), meekwa ka ọ tọgbọrọ n’efu.
Otú a Jisọs na-ebu amụma, sị: “Mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” Ọ bụ ezie na mbibi Jerusalem n’afọ 70 O.A. bụ n’ezie mkpagbu ukwu, nke a kọrọ na e gburu ihe karịrị otu nde mmadụ na ya, ọ bụghị mkpagbu ukwu karịa Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ n’ụbọchị Noa. Ya mere, a ka ga-enwe mmezu ka ukwuu nke akụkụ nke a nke amụma Jisọs.
Inwe Obi Ike Na Mgbe Ikpeazụ
Ka Tuesday, Nisan 11, na-abịaru ná njedebe, Jisọs gara n’ihu ná mkparịta ụka ya na ndị ozi ya banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya n’ike Alaeze na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. Ọ dọrọ ha aka ná ntị banyere ịgbaso Kraịst ụgha dị iche iche. O kwuru na a ga-eme mgbalị “iduhie ọbụna ndị a họpụtara, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.” Ma, dị ka ugo nke na-ahụ ihe dị n’ebe dị anya, ndị a a họpụtara ga-ezukọ n’ebe a pụrụ ịchọta ezi ihe oriri ime mmụọ, ya bụ, n’ebe ezi Kraịst nọ n’oge ọnụnọ ya nke a na-adịghị ahụ anya. A gaghị eduhie ha, a gaghị achịkọtakwa ha n’ebe Kraịst ụgha nọ.
Kraịst ụgha dị iche iche ga-apụta nanị n’ebe a ga-ahụ ha anya. Ma, n’ụzọ na-eyighị nke a, ọnụnọ Jisọs ga-abụ nke a na-adịghị ahụ anya. Ọ ga-ewere ọnọdụ n’oge dị oké egwu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, dị ka Jisọs kwuru, sị: “Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya.” Ee, nke a ga-abụ oge kasị gbaa ọchịchịrị n’ịdị adị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ ga-adị ka à ga-asị na e mewo ka anyanwụ gbaa ọchịchịrị n’oge ehihie, dịkwa ka à ga-asị na ọnwa adịghị enye ìhè ya n’anyasị.
Jisọs gara n’ihu ikwu sị, “A ga-emekwa ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ.” O si otú a gosi na eluigwe a na-ahụ anya ga-enwe ụdịdị na-atụ egwu. Mbara igwe agajeghị ịbụ nanị ebe obibi nke nnụnu dị iche iche, kama ha ga-ejupụta n’ụgbọ elu e ji ebu agha, rọketi, na ígwè dị iche iche e ji enyocha mbara igwe. Egwu na ime ihe ike nke ga-adị n’oge ahụ ga-akarị ihe ọ bụla a hụtụworo n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ tupu mgbe ahụ.
Jisọs kwuru na, n’ihi nke a, “mkpagbu nke mba dị iche iche ga-adịkwa, ndị nọ n’obi abụọ n’ihi mbigbọ nke oké osimiri na ebili mmiri; mmadụ na-atụbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi.” N’eziokwu, oge a kasị gbaa ọchịchịrị n’ịdị adị nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-eduje n’oge mgbe, dị ka Jisọs kwuru, “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi.”
Ma ọ bụghị mmadụ nile ga na-eti aka n’obi mgbe ‘Nwa nke mmadụ bịara n’ike’ ibibi ajọ usoro ihe nke a. “Ndị a họpụtara,” bụ́ 144,000 ndị ga-eso Kraịst kere òkè n’Alaeze eluigwe, agaghị eti aka n’obi, ndị enyi ha, bụ́ ndị ahụ Jisọs kpọwororịị “atụrụ ọzọ” nke ya agaghị etikwa aka n’obi. N’agbanyeghị na ha na-ebi n’ime oge kasị gbaa ọchịchịrị n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, ndị a na-anakwere agbamume Jisọs nke bụ: “Mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.”
Ka ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ga-adị ndụ n’oge mgbe ikpeazụ wee nwee ike ịmata ịdị nso nke ọgwụgwụ ahụ, Jisọs nyere ihe atụ nke a: “Leenụ osisi fig, na osisi nile: mgbe ọ bụla ha puru epu ugbu a, unu hụrụ ya marakwa n’onwe unu na mgbe okpomọkụ dị nso ugbu a. Otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ na alaeze Chineke dị nso. N’ezie asị m unu, Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe nile ga-eme.”
Otú a, mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ọtụtụ akụkụ dị iche iche nke ihe ịrịba ama ahụ ka ha na-emezu, ha kwesịrị ịghọta na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a dị nso, na Alaeze Chineke gajekwa ikpochapụ ajọ omume nile n’oge na-adịghị anya. N’eziokwu, ọgwụgwụ ahụ ga-abịa n’oge ndụ nke ndị hụrụ mmezu nke ihe ndị ahụ nile Jisọs buru n’amụma! Mgbe ọ na-enye ndị ahụ na-eso ụzọ, bụ́ ndị ga-adị ndụ n’oge ikpeazụ ndị a dị oké mkpa ndụmọdụ, Jisọs sịrị:
“Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà: n’ihi na otú a ka ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile. Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee kara n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”
Ụmụ Agbọghọ Ndị Maara Ihe na Ndị Nzuzu
Jisọs anọwo na-azaghachi arịrịọ ndị ozi ya rịọrọ maka ihe àmà nke ọnụnọ ya n’ike Alaeze. Ugbu a, o nyekwuru akụkụ atọ ndị ọzọ nke ihe àmà ahụ n’ilu ma ọ bụ ihe atụ atọ dị iche iche.
Ndị dị ndụ n’oge ọnụnọ ya ga-ahụ mmezu nke ihe atụ ndị ahụ n’otu n’otu. Ọ malitere nke mbụ site n’ikwu, sị: “Mgbe ahụ a ga-eji alaeze eluigwe tụnyere ụmụ agbọghọ iri, ndị chịịrị ọwa ha, pụọ izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Ma ise n’ime ha bụ ndị nzuzu, ise bụkwa ndị nwere uche.”
Site n’okwu ahụ bụ “a ga-eji alaeze eluigwe tụnyere ụmụ agbọghọ iri,” ihe Jisọs na-ekwu abụghị na ọkara n’ime ndị ahụ ga-eketa Alaeze eluigwe bụ ndị nzuzu ebe ọkara nke ọzọ bụ ndị nwere uche! Ee e, kama ihe o bu n’uche bụ na n’ihe banyere Alaeze nke eluigwe, na e nwere otu akụkụ ya yiri nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ma ọ bụ na okwu ndị metụtara Alaeze ahụ ga-eyi ihe nke a ma ọ bụ ihe nke ọzọ.
Ụmụ agbọghọ iri ahụ nọchiri anya ndị Kraịst nile ndị nwere olileanya, ma ọ bụkwanụ na-ekwupụta na ha nwere olileanya, maka Alaeze eluigwe ahụ. Ọ bụ na Pentikọst nke afọ 33 O.A. ka e kwere ọgbakọ ndị Kraịst nkwa ọlụlụ nye Onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilite, meekwa ka ọ dị ebube, bụ́ Jisọs Kraịst. Ma alụmdi na nwunye ahụ gaje iwere ọnọdụ n’eluigwe n’otu oge a na-akaghị aka n’ọdịnihu.
N’ihe atụ ahụ, ụmụ agbọghọ iri ahụ pụrụ, na-enwe nzube nke ịnabata onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ wee sonye n’ịkwụ n’ahịrị maka alụmdi na nwunye ahụ. Mgbe ọ bịarutere, ha ga-eji ọwa ha mee ka e nwee ìhè n’okporo ụzọ ndị ahụ na-akwụ n’ahịrị ga-esi gabiga, wee si otú a na-akwanyere ya ùgwù mgbe ọ na-akpọlata nwanyị ọhụrụ ya n’ụlọ nke a kwadebeworo nye ya. Otú ọ dị, Jisọs kọwara, sị: “Ndị nzuzu ahụ, mgbe ha chịịrị ọwa ha, ha ejighị mmanụ n’aka ha: ma ndị ahụ nwere uche ji mmanụ n’arịa ha tinyere ọwa ha. Ma mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-anọ ọdụ dị anya, ha nile robere ụra wee rahụ.”
Ogologo ịnọ ọdụ nke onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ na-egosi na ọnụnọ Kraịst dị ka Eze na-achị achị ga-abụ n’ọdịnihu dị anya site na mgbe ahụ. O mesịrị bịa n’ocheeze ya n’afọ 1914. N’ogologo anyasị nke dịrị tupu mgbe ahụ, ụmụ agbọghọ nile ahụ malitere ihi ụra. Ma a katọghị ha n’ihi nke a. Nkatọ a katọrọ ụmụ agbọghọ ahụ bụ́ ndị nzuzu bụ n’ihi na ha ejighị mmanụ n’arịa ha. Jisọs kọwara ụzọ ụmụ agbọghọ ahụ si teta n’ụra tupu onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ abịarute, sị: “Ma n’etiti abalị iti mkpu dara, Lee, onye na-alụ nwunye ọhụrụ! Pụtanụ izute ya. Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ ahụ nile biliri, wee dozie ọwa ha. Ndị nzuzu wee si ndị nwere uche, Nye anyị ụfọdụ ná mmanụ unu; n’ihi na ọwa anyị na-anyụ anyụ. Ma ndị nwere uche zara, sị, Ee e, eleghị anya ọ gaghị ezuru anyị na unu: kama jekwurunụ ndị na-ere, zụrụ nye onwe unu.”
Mmanụ ahụ nọchiri anya ihe ahụ na-eme ka ezi ndị Kraịst nọgide na-enwu enwu dị ka ihe na-enye ìhè. Nke a bụ Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ ya, bụ́ nke ha na-ejidesi aka ike, ya na mmụọ nsọ ahụ, nke na-enyere ha aka ịghọta Okwu ahụ. Mmanụ ime mmụọ ahụ na-eme ka ụmụ agbọghọ ahụ nwere uche nwee ike inye ìhè mgbe ha na-anabata onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ n’oge a na-aga njem ahụ ije oriri alụmdi na nwunye. Ma òtù ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ enweghị n’ime onwe ha, bụ́ n’ime arịa ha, mmanụ ime mmụọ ahụ dị mkpa. Ya mere Jisọs kọwara ihe merenụ, sị:
“Ma mgbe [ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ] na-eje ịzụ [mmanụ], onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịara; ndị e doziworo wee soro ya baa n’oriri ọlụlụ nwunye: e wee mechie ụzọ. E mesịa ụmụ agbọghọ fọdụrụ bịakwa, na-asị, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ. Ma ọ zara, sị, N’ezie asị m unu, amataghị m unu.”
Mgbe Kraịst bịarutesịrị n’Alaeze eluigwe ya, òtù ụmụ agbọghọ ahụ nwere uche nke ndị Kraịst e tere mmanụ tetara n’ụra n’ihe banyere ihe ùgwù ha nke inye ìhè n’ime ụwa nke a nọ n’ọchịchịrị n’inye Onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ nke lọghachiworonụ otuto. Ma ndị ahụ ndị ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ sere onyinyo ha adịghị njikere inye otuto nnabata nke a. Ya mere mgbe oge ruru, Kraịst adịghị emeghere ha ụzọ oriri ọlụlụ di na nwunye ahụ n’eluigwe. Ọ na-ahapụ ha n’èzí n’ọchịchịrị kasị dị omimi nke anyasị nke ụwa, isoro ndị ọzọ nile na-arụ ọrụ mmebi iwu lakọọ n’iyi. Jisọs kwubiri, sị, “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge hour ahụ.”
Ihe Atụ nke Talent Ndị ahụ
Jisọs gara n’ihu ịgwa ndị ozi ya okwu n’Ugwu Olive site n’inye ha ihe atụ ọzọ, nke bụ nke abụọ n’ime atọ ndị ọ tụụrụ ha. N’ụbọchị ole na ole gara aga, mgbe ọ ka nọ na Jeriko, o nyere ihe atụ nke maịna iji gosi na Alaeze ahụ ka dị anya mgbe ọ ga-abịa n’ọdịnihu. Ihe atụ nke ọ na-enye ugbu a, ọ bụ ezie na o nwere ọtụtụ ihe o ji yie ndị ọzọ, ọ na-akọwa ná mmezu ya ihe ndị ga-eme n’oge ọnụnọ Kraịst n’ike Alaeze. Ọ na-akọwa na ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ịrụ ọrụ mgbe ha ka nọ n’elu ala iji mụbaa “ihe nile o nwere.”
Jisọs malitere, na-asị: “N’ihi na ọ [ya bụ, ọnọdụ ndị metụtara Alaeze ahụ] dị ka mgbe mmadụ, mgbe ọ gaje ịnọdụ n’ala ndị ọzọ, ọ kpọrọ ndị ohu nke aka ya, rara ihe nile o nwere nye n’aka ha.” Jisọs bụ nwoke ahụ onye, tupu ọ gaa n’ala ọzọ n’eluigwe, nyere ndị ohu ya—ndị na-eso ụzọ ya nwere olileanya ịga n’Alaeze eluigwe—ihe nile o nwere. Ihe ndị a o nwere abụghị ihe onwunwe efu kama ha nọchiri anya ubi a rụrụ ọrụ na ya, nke o wuliteworo n’ime ya ikike nke iwepụta ndị na-eso ụzọ karị.
Jisọs nyefere ndị ohu ya ihe nile o nwere ná mkpirikpi oge tupu ọ rịgoo n’eluigwe. Ò si aṅaa mee nke ahụ? Site n’inye ha iwu ka ha nọgide na-arụ ọrụ n’ubi ahụ ọ rụrụ ọrụ na ya site n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ ruo ebe nile ụwa sọtụrụ. Dị ka Jisọs kwuru: “Otu ka o nyere talent ise, nke ọzọ talent abụọ, nke ọzọ otu talent; o nye onye ọ bụla dị ka ike nke aka ya hà; o wee jee ịnọdụ n’ala ndị ọzọ.”
Talent asatọ ahụ—ihe nile Kraịst nwere—ka e si otú a kesaa dị ka ike mmadụ nwere hà, ma ọ bụ ikike ime mmụọ ohu ndị ahụ pụrụ inwe. Ndị ohu ahu nọchiri anya òtù dị iche iche nke ndị na-eso ụzọ. Na narị afọ nke mbụ, ọ pụtara ìhè na òtù ahụ nke natara talent ise gụnyere ndị ozi. Jisọs gara n’ihu ịkọ na ndị ohu ahụ natara talent ise na talent abụọ mụbara ha okpukpu abụọ site na ikwusa Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ nke ha mere. Otú ọ dị, ohu ahụ nke natara otu talent zobere ya n’ime ala.
“Ma mgbe ogologo oge gasịrị,” ka Jisọs gara n’ihu ikwu, “onyenwe ndị ohu ahụ bịara, ya na ha wee pịazie.” Ọ bụghị mgbe ọzọ ma ọ bụghị na narị afọ nke iri abụọ, ihe dị ka 1,900 afọ n’ikpeazụ, ka Kraịst lọghachiri ime mpịazi, ya mere ọ bụ, n’ezie, “mgbe ogologo oge gasịrị.” Mgbe ahụ Jisọs kọwara, sị:
“Onye ahụ nke naara talent ise wee bịakwute ya weta talent ise ọzọ, sị, Onyenwe anyị, ị raara talent ise nye m n’aka: lee, eritara m talent ise ọzọ n’uru. Onyenwe ya sịrị ya, I mere nke ọma, ezi ohu nke kwesịrị ka a tụkwasị gị obi: i kwesịrị ka a tụkwasị gị obi n’ụmụ ihe ole na ole, m ga-eme gị onye isi ọtụtụ ihe: baa n’ọṅụ nke onyenwe gị.” Ohu ahụ nke natara talent abụọ n’otu aka ahụ mụbara talent ya okpukpu abụọ, ọ natakwara otu ịja mma na ụgwọ ọrụ ahụ.
Otú ọ dị, olee otú ndị ohu a kwesịrị ntụkwasị obi si na-aba n’ọṅụ nke Onyenwe ha? Leenụ, ọṅụ nke Onyenwe ha, Jisọs Kraịst, bụ nke ịnata Alaeze ahụ mgbe ọ gara njem n’ala ọzọ n’ebe Nna ya nọ n’eluigwe. Banyere ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge anyị, ha nwere oké ọṅụ n’ihi ịbụ ndị a mụbara ibu ọrụ dị iche iche nke ha nwere n’ebe Alaeze ahụ dị, mgbe ha na-ejesịkwa ozi ha n’elu ala, ha ga-enwe ọṅụ zuru ezu nke ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ gaa n’Alaeze eluigwe. Ma olee ihe banyere ohu nke atọ ahụ?
“Onyenwe anyị, amaara m gị na ị bụ mmadụ aka ike,” ka ohu nke a kpesara. “M wee tụọ egwu, wee jee zobe talent nke gị n’ala: lee, i nwere nke gị.” Ohu ahụ leziri anya jụ ịrụ ọrụ n’ubi ahụ a rụrụ ọrụ na ya site n’izi ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. Ya mere onyenwe ya kpọrọ ya “ajọ ohu nke dị ume ngwu” wee maa ya ikpe, sị: “Napụnụ ya talent ahụ. . . . Tụpụkwanụ ohu a na-abaghị n’ihe n’ọchịchịrị nke èzí: n’ebe ahụ ka ịkwa ákwá na ịta ikikere eze ahụ ga-adị.” Ndị mezuru òtù ajọ ohu nke a, n’ihi ịbụ ndị a chụpụrụ n’èzí, bụ ndị a napụrụ ọṅụ ime mmụọ nile.
Nke a bụ nnọọ ezi ihe mmụta nye ndị nile na-ekwupụta na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ka ha wee nata ịja mma na ụgwọ ọrụ ya, zerekwa ịbụ ndị a tụpụrụ n’ọchịchịrị nke èzí na e mesịa, mbibi, ha aghaghị ịrụ ọrụ maka mmụba nke ihe Onyenwe ha nke eluigwe nwere site n’ikere òkè zuru ezu n’ọrụ nkwusa ahụ. Ị̀ dị uchu n’akụkụ nke a?
Mgbe Kraịst Bịara n’Ike Alaeze
Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ka nọ n’elu Ugwu Olive. N’inye ha azịza n’arịrịọ ha rịọrọ ya maka ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya nakwa nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a, ugbu a ọ na-enye ha ihe atụ nke ikpeazụ dị n’usoro ihe atụ atọ ndị ahụ. Jisọs na-amalite ikwu sị, “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya.”
Ndị mmadụ apụghị ịhụ ndị mmụọ ozi nọ n’ebube ha nke eluigwe. Ya mere ọbịbịa nke Nwa nke mmadụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ya na ndị mmụọ ozi aghaghị ịbụ nke ụmụ mmadụ na-agaghị eji anya ha hụ. Ọbịbịa ahụ mere n’afọ 1914. Ma ọ̀ bụ n’ihi nzube dị aṅaa? Jisọs na-akọwa, sị: “Ma n’ihu ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu: ọ ga-edebekwa atụrụ n’aka nri ya, ma ụmụ ewu n’aka ekpe.”
N’ịkọwa ihe ga-eme ndị ahụ e kewapụrụ gaa n’akụkụ nke inweta ihu ọma, Jisọs kwuru, sị: “Mgbe ahụ eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri ya, Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.” Atụrụ ndị dị n’ihe atụ nke a agaghị eso Kraịst chịa achị n’eluigwe kama ha ga-eketa Alaeze ahụ n’echiche nke ịbụ ndị ọ ga-achị n’elu ala. “Ntọala nke ụwa” weere ọnọdụ mgbe Adam na Iv mụtara ụmụ mbụ ndị ga-erite uru site na ndokwa Chineke ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ.
Ma ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka e ji kewapụta atụrụ ndị ahụ gaa n’aka nri nke inweta ihu ọma nke Eze ahụ? Eze ahụ na-azaghachi sị, “N’ihi na agụụ gụrụ m, unu wee nye m ihe m ga-eri: akpịrị kpọrọ m nkụ, unu wee kuru mmiri nye m: abụ m ọbịa, unu wee kpọbata m; agbara m ọtọ, unu wee gbokwasị m ákwà: ahụ adịghị m ike, unu wee leta m: anọ m n’ụlọ mkpọrọ, unu wee bịakwute m.”
Ebe ọ bụ na atụrụ ndị ahụ nọ n’elu ala, ha chọrọ ịma otú ọ pụrụ isiworị bụrụ na ha meere Eze eluigwe ha ihe ọma ndị dị otú ahụ. Ha na-ajụ sị, “Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, anyị wee zụọ gị? Ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị wee kuru mmiri nye gị? Olee mgbe anyị hụkwara gị ka ị bụ ọbịa, anyị wee kpọbata gị? Ma ọ bụ ka ị na-agba ọtọ, anyị wee gbokwasị gị ákwà? Olee mgbe anyị hụkwara gị ka ahụ na-adịghị gị ike, ma ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ, anyị wee bịakwute gị?”
Eze ahụ na-azaghachi sị, “N’ezie asị m unu, ka ọ hà, bụ́ otú unu si mee ya nye otu onye n’ime ụmụnna m ndị a, bụ́ ndị dịkarịsịrị nta, mụ ka unu mere ya nye.” Ụmụnna Kraịst bụ ihe fọdụrụ na 144,000 ndị ahụ nọ n’elu ala bụ́ ndị ga-eso ya chịa achị n’eluigwe. Jisọs kwukwara na imere ha ihe ọma bụ otu ihe ahụ dị ka imere ya ihe ọma.
Ọzọ, Eze ahụ gwara ewu ndị ahụ okwu. “Pụọnụ n’ihu m, ndị a na-abụ ọnụ, gaa n’ọkụ ebighị ebi ahụ nke e doziworo nye Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya: n’ihi na agụụ gụrụ m, ma unu enyeghị m ihe m ga-eri: akpịrị kpọrọ m nkụ, ma unu ekughị mmiri nye m: abụ m ọbịa, ma unu akpọbataghị m; agbara m ọtọ, ma unu egbokwasighị m ákwà; ahụ adịghị m ike, anọkwa m n’ụlọ mkpọrọ, ma unu eletaghị m.”
Otú ọ dị, ewu ndị ahụ mere mkpesa, sị: “Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, ma ọ bụ ka ị bụ ọbịa, ma ọ bụ ka ị na-agba ọtọ, ma ọ bụ ka ahụ na-adịghị gị ike, ma ọ bụ ka ị nọ n’ụlọ mkpọrọ, ma anyị ejeghịrị gị ozi?” E kpere ewu ndị ahụ ikpe nke anataghị ihu ọma n’ihi otu ihe ahụ mere e ji kpe atụrụ ndị ahụ ikpe nke ịnata ihu ọma. Jisọs zara, sị: “Ka ọ hà, bụ́ otú unu na-emeghị ya nye otu onye n’ime ndị a dịkarịsịrị nta [nke ụmụnna m], mụ ka unu na-emeghị ya nye.”
Ya mere ọnụnọ Kraịst n’ike Alaeze, na nwa oge tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a ná mkpagbu ukwu ahụ, ga-abụ oge ikpe ikpe. Ewu ndị ahụ “ga-apụ jee baa n’ahụhụ mbibi ebighị ebi: ma ndị ezi omume [atụrụ ndị ahụ] ga-aba ná ndụ ebighị ebi.” Matiu 24:2–25:46; 13:40, 49; Mak 13:3-37; Luk 21:7-36; 19:43, 44; 17:20-30; 2 Timoti 3:1-5; Jọn 10:16; Mkpughe 14:1-3.
▪ Gịnị kpalitere ajụjụ ndị ozi ahụ jụrụ, ma gịnị ọzọ ka o yiri ka hà bu n’uche?
▪ Akụkụ dị aṅaa nke amụma Jisọs mezuru n’afọ 70 O.A., ma gịnị bụ ihe na-emeghị mgbe ahụ?
▪ Olee mgbe amụma Jisọs nwere mmezu nke mbụ, ma olee mgbe ọ ga-enwe mmezu ka ukwuu?
▪ Gịnị bụ ihe arụ ahụ ná mmezu nke mbụ ya na nke ikpeazụ?
▪ N’ihi gịnị ka oké mkpagbu ahụ na-ejighị nwee mmezu ya nke ikpeazụ ná mbibi nke Jerusalem?
▪ Ọnọdụ ụwa dịgasị aṅaa na-aka ọnụnọ Kraịst akara?
▪ Olee mgbe ‘ebo nile nke ụwa ga-eti aka n’obi,’ ma gịnị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-anọ na-eme?
▪ Ihe atụ dị aṅaa ka Jisọs nyere iji nyere ndị gaje ịbụ ndị na-eso ụzọ ya n’ọdịnihu aka ịghọta mgbe ọgwụgwụ ahụ dị nso?
▪ Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ga-adị ndụ n’ime mgbe ikpeazụ ahụ?
▪ Ole ndị ka ụmụ agbọghọ iri ahụ sere onyinyo ha?
▪ Olee mgbe e kwere ọgbakọ Kraịst ná nkwa nye onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ, ma olee mgbe onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ bịara ịkpọrọ nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ jee oriri alụmdi na nwunye ahụ?
▪ Gịnị ka mmanụ ahụ na-anọchi anya ya, gịnịkwa ka inwe ya mere ka ụmụ agbọghọ ahụ nwere uche nwee ike ime?
▪ Olee ebe a ga-anọ nwee oriri alụmdi na nwunye ahụ?
▪ Oké ụgwọ ọrụ dị aṅaa funahụrụ ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ, gịnịkwa dabaara ha?
▪ Ihe mmụta dị aṅaa ka ihe atụ nke talent ndị ahụ na-akụzi?
▪ Olee ndị bụ ndi ohu ahụ, gịnị bụkwa ihe onwunwe ndị ahụ e nyefere ha?
▪ Olee mgbe onyenwe ahụ bịara maka ime mpịazi, oleekwa ihe ọ chọpụtara?
▪ Gịnị bụ ọṅụ ahụ nke ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi banyere n’ime ya, oleekwa ihe mere ohu nke atọ, bụ́ ajọ onye ahụ?
▪ N’ihi gịnị ka ọnụnọ Kraịst na-aghaghị iji bụrụ nke anya na-adịghị ahụ, ọrụ dịkwa aṅaa ka ọ na-arụ n’oge ahụ?
▪ N’echiche dị aṅaa ka atụrụ ndị ahụ ketara Alaeze ahụ?
▪ Olee mgbe “ntọala nke ụwa” weere ọnọdụ?
▪ N’ihe ndabere dị aṅaa ka a na-ekpe ndị mmadụ ikpe ma hà bụ atụrụ ma hà bụ ewu?