Isi 7
Ịpịazi Ego n’Ihi Ego Kraịst E Ji Mee Ihe
1. Olee ọchịchị nke na-enweghị nsogbu akụ na ụba, olee ndị kwa ugbu a ga-esoro ọchịchị nke a mee mpịazi?
ỌDỊGHỊ ọchịchị ọ bụla na-enweghị nsogbu ọnọdụ akụ na ụba, e wepụkwa otu. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ọchịchị dị iche iche ji ụgwọ dị ukwuu. Nanị ọchịchị dị iche bụ “alaeze eluigwe” ahụ a na-akpọsa ebe nile ugbu a. (Matiu 25:1) A ka nwere n’elu ala ndị ahụ gaje iso n’Alaeze eluigwe ahụ, ndị ga-eje ozi n’ọchịchị ahụ. N’oge a nke kasị egwu n’akụkọ ihe mere eme dum nke mmadụ, a na-akpọku ndị ohu ndị a nke “alaeze eluigwe” ịbịa mee mpịazi. Ha aghaghị ịkọrọ ọchịchị ahụ otú ha si jiri akụ ndị e nyere ha mee ihe.
2. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee ezi mmasị n’otu ilu nke “Onyeisi Udo” ahụ tụrụ?
2 Iji maa atụ okwu a, onye nnọchianya mbụ nke “alaeze eluigwe” ahụ tụrụ otu ilu, ma ọ bụ mee otu ihe atụ n’oge dị anya gara aga. Nke a kwesịrị ịmasị anyị taa, n’ihi na “Onyeisi Udo” ahụ tinyere ya n’amụma ya ahụ metụtara oge dị ogologo banyere “ihe ịrịba ama” nke ga-aka akara “ọnụnọ” ya n’Alaeze, na-enwe ike zuru ezu iji chịa ọchịchị. (Matiu 24:3) Taa ihe ndị na-esochi mmezu nke ilu amụma ahụ metụtara anyị n’ụzọ a na-apụghị izere ezere, ebe o metụtara ndịgide anyị, ndụ anyị n’onwe ya. Ya mere otú a ka “Onyeisi Udo” ahụ si tụọrọ ndị ozi ya ilu ahụ ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ ịchụ àjà ya n’elu Kalvarị.
Ilu nke Talent Ndị Ahụ
3. Olee otú ndị ohu ahụ natara talent n’aka onye nwe ha tupu ọ pụọ si jiri ha mee ihe mgbe ọ na-anọghị ya?
3 “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge hour ahụ. N’ihi na ọ dị ka mgbe mmadụ, mgbe ọ gaje ịnọdụ n’ala ndị ọzọ, ọ kpọrọ ndị ohu nke aka ya, rara ihe nile o nwere nye n’aka ha. Otu ka o nyere talent ise,a nke ọzọ talent abụọ, nke ọzọ otu talent; o nye onye ọ bụla dị ka ike nke aka ya hà; o wee jee ịnọdụ n’ala ndị ọzọ. Ngwa ngwa onye naara talent ise ahụ gara were ha zụọ ahịa, wee rite uru talent ise ọzọ. Otú ahụ onye naara talent abụọ ahụ ritekwara talent abụọ ọzọ. Ma onye naara otu talent ahụ jere gwuo ala, zobe ego onye nwe ya.
4. Gịnị ka onyenwenụ ahụ gwara ndị ohu ahụ mụbara ọnụ ọgụgụ nke talent ndị ahụ?
4 “Ma mgbe ogologo oge gasịrị onye nwe ndị ohu ahụ bịa, ya na ha wee pịazie. Onye ahụ nke naara talent ise wee bịakwute ya weta talent ise ọzọ, sị, Onyenwe anyị, ị raara talent ise nye m n’aka: lee, eritere m talent ise ọzọ n’uru. Onye nwe ya sịrị ya, I mere nke ọma, ezi ohu nke kwesịrị ka a tụkwasị gị obi: i kwesịrị ka a tụkwasị gị obi n’ụmụ ihe ole na ole, m ga-eme gị onye isi ọtụtụ ihe: baa n’ọṅụ nke onye nwe gị. Onye naara talent abụọ ahụ wee bịakwutekwa ya, sị, Onyenwe anyị, ị raara talent abụọ nye m n’aka: lee, eritere m talent abụọ ọzọ n’uru. Onye nwe ya sịrị ya, I mere nke ọma, ezi ohu nke kwesịrị ka a tụkwasị gị obi; i kwesịrị ka a tụkwasị gị obi n’ụmụ ihe ole na ole, m ga-eme gị onye isi ọtụtụ ihe: baa n’ọṅụ nke onye nwe gị.
5, 6. Gịnị ka ohu nke atọ ahụ kwuru mere o ji zobe talent ahụ, gịnịkwa ka onyenwenụ ahụ mere ya?
5 “Onye naararị otu talent ahụ wee bịakwutekwa ya, sị, Onyenwe anyị, amaara m gị na ị bụ mmadụ aka ike, na-ewe ihe ubi n’ebe ị na-aghaghị mkpụrụ, na-achịkọpụtakwa n’ebe ị na-afụchaghị: m wee tụọ egwu, wee jee zobe talent nke gị n’ala: lee, i nwere nke gị. Ma onye nwe ya zara, sị ya, Ajọ ohu nke dị ume ngwụ, ị matara na ana m ewe ihe ubi n’ebe m na-aghaghị mkpụrụ, na-achịkọpụtakwa n’ebe m na-afụchaghị; ya mere, ọ dị gị mkpa iwere ego m tinye n’aka ndị na-agbanwe ego, mgbe m bịara mụ onwe m ga-anaraghachikwa nke m, ya na ụma.
6 “Ya mere, napụnụ ya talent ahụ, werekwa ya nye onye ahụ nke nwere talent iri ahụ. N’ihi na onye ọ bụla nke nwere ka a ga-enye, ọ ga-enwebigakwa ókè: ma site n’aka onye na-enweghị, ọbụna ihe o nwere ka a ga-anapụ ya. Tụpụkwanụ ohu a na-abaghị n’ihe n’ọchịchịrị nke èzí: n’ebe ahụ ka ịkwa ákwá na ịta ikikere eze ahụ ga-adị.”—Matiu 25:13-30.
7. Gịnị ka talent ndị ahụ nọchiri anya ya?
7 N’ilu nke a, gịnị ka talent ndị ahụ nọchiri anya ya? Ọ bụ ihe bara uru dị ukwuu, ọ bụghị n’ụzọ ego kama n’ụzọ ime mmụọ. Talent ndị ahụ na-anọchi anya ọrụ ime ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ihe ya na ọrụ nke a so bụ ohere ihe ùgwù dị elu nke ịrụ ọrụ dị ka ndị ụkọ n’ọnọdụ Kraịst, bụ́ Eze ahụ, iji nọchite anya Alaeze ahụ ná mba nile nke ụwa.—Ndị Efesọs 6:19, 20; 2 Ndị Kọrint 5:20.
8. (a) N’ọchịchịrị dị aṅaa ka a tụbaworo òtù ohu ahụ “dị ume ngwụ” n’oge “ọgwụgwụ oge a”? (b) N’ihi gịnị ka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ejighị nwee ìhè nke ihu ọma na ngọzi Chineke?
8 Ajụjụ ọ bụla adịghị ya na taa anyị eruwo ọgwụgwụ nke mmezu nke ilu amụma a! Oge kasị gbaa ọchịchịrị n’akụkọ ihe mere eme mmadụ adakwasịwo ọgbọ nke a! N’ezie, e nwere ọchịchịrị kwekọrọ na nke a n’èzí nke akụkụ nzukọ Jehova a na-ahụ anya bụ́ ebe a pụrụ ịtụba òtù ohu ahụ nke “dị ume ngwụ” na nke “na-abaghị n’ihe,” mgbe Onyenwenụ ahụ nyere iwu. ‘Ọchịchịrị nke èzí’ dị otú a na-egosi ọnọdụ ọchịchịrị nke ụwa nke agbụrụ mmadụ nọ ya, karịsịa n’ụzọ okpukpe. Ụwa nke agbụrụ mmadụ enweghị ìhè nke ihu ọma Chineke na ngọzi ya. Ọ nọghị n’ìhè nke ihe ọmụma Alaeze Chineke. Ọ nọ n’okpuru “chi nke oge a,” onye “mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha, ka inye ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraịst, onye bụ onyinyo Chineke, wee ghara ịwakwasị ha.”—2 Ndị Kọrint 4:4.
9. (a) Ná mmezu nke ilu ahụ, ònye ka “mmadụ” ahụ sere onyinyo ya, ruokwa n’ebe dị anya dị aṅaa ka o jere? (b) Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere nke na-egosị nlọghachi ya?
9 Taa e nwere ihe àmà buru ibu na onye ahụ nke “mmadụ” ahụ sere onyinyo ya, bụ́ onye nwere ma ọ dịkarịa ala talent ọlaọcha asatọ, esiwo na njem o mere gaa ala ọzọ lọghachi. “Mmadụ” ahụ bụ Kraịst Jisọs. Njem o mere gaa ala ọzọ dujere ya n’ihu Onye Okike nke anyanwụ, ọnwa, na kpakpando nile nke eluigwe na ala anyị. Iji kaa akara nlọghachi ya, agha abụọ zuru ụwa ọnụ, nke ụmụ agha ndị ọzọ dị nta sochiworo ya ugbu a, emewo ka ụwa anyị jupụta n’ọbara. Dị ka e buru n’amụma, ihe sochiworo ihe ndị a bụ ụnwụ nri, ọrịa ndị na-efe efe, na ala ọma jijiji dị iche iche, na ịba ụba nke mmebi iwu na nkwusa nke “ozi ọma nke a nke alaeze” n’elu ụwa dum mmadụ bi. Nke a emezuwo n’otu n’otu ihe Jisọs kwuru ga-abụ “ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [ya] na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a.”—Matiu 24:3-15, NW.
10. (a) N’ihi gịnị ka mmadụ ahụ ji mee njem gaa mba ọzọ? (b) N’ihi gịnị ka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ejighị hụ nlọghachi ya n’ezie?
10 Ọ bụ ezie na e kwughị ya kpọmkwem n’ilu Jisọs, mmadụ ahụ na-aga ala ọzọ, onye na-agaghị anọ ya ruo ogologo oge, mere njem ya n’ezie iji nweta “alaeze eluigwe,” bụ́ nke e zoro aka na ya ná mbụ na Matiu 25:1. N’agbanyeghị ntiwapụ nke Agha Ụwa Mbụ, Jehova Chineke, onye a kwaturu alaeze ya n’elu Israel na 607 T.O.A., mere ka Onye Nketa Alaeze ahụ ruuru nọkwasị n’ocheeze na 1914 O.A., n’oge o ruru ka nzọda ahụ kwụsị. Ee e, mba ndị Jentaịl ejighị ọhụhụ ụzọ nkịtị ha hụ nnọkwasị n’ocheeze nke Onye ahụ Eze Devid kpọrọ “Onyenwe m.” (Abụ Ọma 110:1) Ha apụghị ime otú ahụ n’ihi na mmadụ nke ilu ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, agwawo ndị na-eso ụzọ ya tupu o jee ala ọzọ, sị: “Ọ fọdụrụ nwa oge, ụwa ahụkwaghị m ọzọ.”—Jọn 14:19.
11. (a) Gịnị ga-abụ akụkụ nke ihe ịrịba ama na-aka nlọghachi na ọnụnọ ya akara? (b) Olee mgbe nke a ga-ewere ọnọdụ?
11 Ebe ọbịbịa Kraịst n’ike Alaeze eluigwe bụ nke anya mmadụ na-ahụghị, ọ ghaghị ime ka ọnụnọ ya n’Alaeze eluigwe pụta ìhè site n’ihe ịrịba ama ahụ ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya ụbọchị atọ tupu e gbuo ya n’ihi okwukwe ya. Akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ doro anya gaje ịbụ na nwoke ahụ ga-esi ná mba ọzọ o jere lọta wee soro ndị ohu ya pịazie ihe, bụ́ ndị o nyeworo talent ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa. Ebe nke a dị otú a, isoro ndị ahụ mee mpịazi, bụ́ ndị e nyere ihu ọma iji talent ndị ahụ mee ihe gaje ịbụ ma 1914 gasịa.
12. (a) Olee ndị ka ibu ọrụ nke ibute ụzọ n’ịgba àmà Alaeze ahụ dịkwasị? (b) Nzọpụta ha n’ikpeazụ na-adabere na gịnị?
12 Nke a ga-apụta isoro ndị nketa nke “alaeze eluigwe” ahụ mee mpịazi. Nke a ga-apụta isoro ihe fọdụrụ ahụ nke òtù ndị Kraịst ahụ mee mpịazi, bụ́ ndị e jiworo mmụọ Chineke mụọ malite n’ụbọchị Pentikọst afọ 33 O.A. (Ọrụ Ndị Ozi, isi nke 2) A gaje inwe ihe fọdụrụ nke ndị a n’elu ala n’oge “ọgwụgwụ oge a” site na 1914 gaa n’ihu. Ndị a ga-abụ ndị ibu ọrụ ahụ ga-adakwasị ịbụ ndị ga-ebute ụzọ n’imezu amụma Jisọs maka oge ahụ: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14; Mak 13:10) Ha ka ibu ọrụ ikwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ dịkwasịrị, ka e wee zọpụta ha baa n’Alaeze eluigwe ahụ. (Matiu 24:13) N’iburu nzọpụta ikpeazụ ha n’uche, Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile enyewo ha ume iji tachie obi ruo ugbu a n’agbanyeghị mkpagbu zuru ụwa. Eziokwu a bụ ihe àmà na ọ nwapụtawo ha!
Ndị Na-azọrọ n’Ụzọ Ụgha Ijide Talent Ndị Ahụ
13. (a) Olee ndị na-azọrọ na ha natara talent ndị ahụ? (b) Ná mkpebi ikpe dị aṅaa banyere ya ka anyị na-erute?
13 Krisendọm na-azọrọ na n’ụzọ na-egosi nsọpụrụ, e nyere ya talent ndị ahụ nke mmadụ ahụ bara ọgaranya dị n’ilu Jisọs. Ma mgbe anyị tụlere omume ya kemgbe 1914, ná mkpebi ikpe dị aṅaa ka anyị na-erute? Ọ bụ nke a: O mebeghị ihe kwekọrọ n’ihe ndị ọ na-azọrọ. N’ekwesịghị ntụkwasị obi nye mmadụ nke ilu ahụ, o jikọwo onwe ya n’ebe alaeze nile nke ụwa a dị; ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ọchịchị ndị ahụ nke ụwa bụ ndị enyi ya ha na ya na-akwa iko. Ọ ka na-akwado òtù United Nations, ihe nọchiri òtù League of Nations nke dakpọworonụ ugbu a.
14. Olee ebe anyị na-achọta Krisendọm taa?
14 O kwekọghị n’ọbụna ohu ahụ nwere otu talent, onye dị ume ngwụ na onye na-amụbaghị ihe onwunwe nke onye nwe ya. Ya mere n’oge a kemgbe Agha Ụwa Mbụ bisịrị na 1918, e kpughewo Krisendọm n’ezie dị ka nke nọworo mgbe nile n’ọchịchịrị nke èzí nke ụlọ Onyenwenụ ahụ nke jupụtara n’ìhè. N’etiti abalị, n’èzí ebe ahụ n’ụwa ka ịkwa ákwá na ịta ikikere eze ya maliteworo iwere ọnọdụ, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ. Ọ ka ga-ewerekwu ọnọdụ mgbe ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ ndị enyi ya na ha na-akwa iko ga-atụgharị megide ya ma gbaa ya ọtọ dị ka akụkụ kasị nwee ụta na Babilọn Ukwu ahụ nile, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha.
A Tụpụ Òtù “Ohu Ọjọọ” ahụ n’Èzí
15. Olee ndị mezuworo onyinyo ohu ume ngwụ ahụ, oleekwa ebe ha na-achọta onwe ha ugbu a?
15 Ndị bụworo n’ezie akụkụ nke ihe fọdụrụ ahụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ndị e tinyewokwara ihe ndị dị oké ọnụ ahịa nke Alaeze ahụ n’aka, ma bụrụ ndị kwụsịrị ime mgbalị ịmụba ọdịmma nke Onyenwenụ ahụ lọghachiworonụ, ka a tụpụworo n’ije ozi eze nke Onyenwenụ ahụ. (Matiu 24:48-51) Anyị adịghị ahụkwa ọzọ ka òtù “ohu ọjọọ” ahụ dị ume ngwụ na-ekwusa “ozi ọma nke a nke alaeze.” Kama nke ahụ, ha na-ekwukarị okwu banyere nzọpụta onwe ha kama ịbụ banyere ọdịmma nile nke Alaeze Chineke. Ha na-ahụ onwe ha ugbu a “n’ọchịchịrị nke èzi,” ebe ụwa nke agbụrụ mmadụ nọ. A napụwo ha talent ihe atụ ha ma were ya nye òtù ahụ gosiworo ịdị njikere iji talent ahụ mee ihe n’akụkụ fọdụrụnụ nke “ọgwụgwụ oge a.”
16. (a) Maka iji talent ndị ahụ nke ihe atụ mee ihe dị aṅaa ka nke a bụ oge kasị na-ekwe nkwa ihe ịga nke ọma? (b) Ibu ọrụ dị aṅaa na-adịkwasị “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ugbu a?
16 E nwebeghị oge na-ekwe nkwa ihe ịga nke ọma karịa nke a maka ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” site n’iji “talent” ahụ mee ihe, ya bụ, ihe ùgwù pụrụ iche, ohere nke ịrụ ọrụ dị ka “ndị ụkọ n’ọnọdụ Kraịst,” Eze ahụ na-achị achị, na imere ya ndị na-eso ụzọ. (2 Ndị Kọrint 5:20) Ka ọgwụgwụ ahụ ji ọsọ na-abịa, ọ dị mkpa nye “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ inyere ndị fọdụrụ ná ndị nnọchianya ahụ e ji mmụọ nsọ mụọ aka, ka ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-eji “talent” ahụ dị oké ọnụ ahịa e tinyere ha n’aka na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otu talent ọlaọcha ndị Grik dị 20.4 kilogram n’ịdị arọ.
[Foto dị na peeji nke 59]
A na-atụpụ ndị na-egosi àgwà nke ohu ọjọọ ahụ pụọ n’ije ozi nke Onyenwenụ ahụ baa n’ọchịchịrị ahụ