Isi 13
“Onyeisi Udo” ahụ Echee Ndị Na-anọghị n’Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ihu
1. N’ihi gịnị ka ndị Juu nke oge a na-apụghị ịgọnarị na ọgbụgba ndụ Mosis ahụ nke e soro ndị nna ha ochie gbaa gaje ịbịaru n’ọgwụgwụ?
NDỊ JUU anụ ahụ taa, ndị bụ ụmụ nke nna ochie ahụ bụ́ Abraham n’anụ ahụ, apụghị ịgọnarị na ọgbụgba ndụ Iwu Mosis nke meworo ochie gaje ịbụ nke ọgbụgba ndụ ahụ dị ọhụrụ na nke ka mma gaje iwere ọnọdụ ya. Ha apụghị ihichapụ site n’ihe odide ha nke Akwụkwọ Nsọ Hibru okwu ndị ahụ nke Chineke nke dị na Jeremaịa 31:31: “Lee, ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), mgbe mụ na ụlọ Israel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ.”
2. Olee otú e si zaa n’ikpeazụ ajụjụ banyere onye ga-abụ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
2 Jeremaịa ebughị amụma banyere onye ga-abụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ma n’abalị Nisan 14, 33 O.A., mgbe Jisọs Kraịst nyefere ndị na-eso ụzọ ya iko mmanya Ememe Ngabiga ahụ, o gosiri na ya gaje ịbụ Onye Ogbugbo ahụ. (Luk 22:20) Na ndị Hibru 7:22 a gwara anyị na ọ bụ “onye mbe,” onye nkwa, ma ọ bụ ihe mmesi obi ike, nke “ọgbụgba ndụ ka mma” dị otú ahụ, nke dịkwa ọhụrụ.
3. Ọkwá ọzọ dị aṅaa n’ebe Chineke nọ ka Jisọs Kraịst ji, ọ̀ bụkwa site n’eriri ọmụmụ?
3 Site n’àjà ya n’ihi ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Jisọs ghọrọ Onye Isi Nchụàjà nke Jehova. Ọ ghọghị nke ahụ site n’ịbụ nwa anụ ahụ nke Erọn, onye isi nchụàjà mbụ nke Israel. E ji ịṅụ iyi mee ka ọ banye n’ọkwá Onye Isi Nchụàjà site n’ịṅụ iyi nke Chineke Onye Kachasị Ihe Nile Elu, bụ́ Jehova, Onye Na-eme Onye Nchụàjà. Okwu ndị ahụ nke Abụ Ọma 110:4 na-emezu n’ebe Jisọs nọ: “Jehova aṅụwo iyi, ọ gaghị echegharịkwa uche ya, Gị onwe gị bụ onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.”—Ndị Hibru 7:20, 21.
4. (a) Ọ̀ bụ “Israel” olee nke ka ya na Jehova gbara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Ndị ahụ e webatara n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ghọrọ ụmụ nke nne na nna dị aṅaa?
4 E wepụkwa ihe fọdụrụ nke dị nta, mba Israel anụ ahụ jụrụ Jisọs Kraịst dị ka Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Otú a, “ụlọ Israel” nke Chineke soro gbaa ọgbụgba ndụ ahụ e buru n’amụma ghọrọ Israel ime mmụọ, “Israel nke Chineke.” (Ndị Galetia 6:16) A mụrụ Israel ime mmụọ ahụ n’ụbọchị Pentikọst, 33 O.A. N’ịbụ nke ime mmụọ, ọ pụrụ ịnabata ndị na-abụghị ndị Juu, ma ọ bụ ndị Jentaịl bụ́ ndị kwere ekwe dị ka ụmụ amaala ya. (Ọrụ 15:14) Pita kpọrọ ya “ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.” (1 Pita 2:9) “Mba dị nsọ” nke a bụ nke ụmụ ime mmụọ nke Abraham ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jehova, Onye Mere na Onye Mmezu nke ọgbụgba ndụ Abraham, mejupụtara. N’ihi ya, n’otu oge ahụ ha bụ “ụmụ” nke nzukọ eluigwe nke Jehova nke yiri nwunye, bụ nke Sera, nwunye Abraham, sere onyinyo ya. N’ụzọ a na-apụghị izere ezere, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke Abraham ahụ Ka Ukwuu metụtakwara nzukọ eluigwe ahụ dị ka nne nke “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa, nke Aịsak sere onyinyo ya.
“Atụrụ Ọzọ” ahụ E Mere Ka O Sonye n’Otu Ìgwè Atụrụ
5. Gịnị ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ chọrọ n’elu ụwa ebe a?
5 Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nwere mkpa nke ndị ozi na-arụsi ọrụ ike n’elu ala ebe a, ndị òtù nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ ejewokwa ozi dị ka ndị ruru eru ịbụ “ndị na-eje ozi ọgbụgba ndụ ọhụrụ” bụ́ nke werewooro ọnọdụ nke ọgbụgba ndụ Iwu Mosis ahụ meworo ochie. (2 Ndị Kọrint 3:6) Ha abụghị ndị ụkọchukwu na-eje ozi n’ime ọtụtụ narị òtù okpukpe nke Krisendọm, akụkụ pụtara ìhè nke Babilọn Ukwuu ahụ nke oge a. Ha aṅawo ntị n’òkù inye iwu ahụ a kpọrọ ná Mkpughe 18:4, ha esiwokwa n’alaeze ụwa ahụ nke okpukpe ụgha pụta.
6. (a) Ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eje ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ nke a kpaara ókè ịbụ ole? (b) Olee otú anyị si mara na Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ ga-eche ndị na-anọghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ihu?
6 Ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eje ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ gaje ịbụ nke a kpaara ókè ịbụ 144,000. (Mkpughe 7:1-8; 14:1-5) Ya mere oge ya aghaghị iru mgbe Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ ga-eche ihu ya gabiga ndị na-eje ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Onye Na-eje Ozi Kasị Ukwuu nke Jehova lepụrụ anya n’ihu hụ nke a wee zoo aka n’ebe nke a nọ mgbe ọ sịrị, na Jọn 10:16, na ya nwere “atụrụ ọzọ,” ndị na-esoghị ‘n’ìgwè atụrụ nta’ nke 144,000.—Luk 12:32.
7. (a) N’ihi gịnị ka ndị òtù nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-ejighị bụrụ ndị na-eje ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (b) Olee otú ihe fọdụrụ ahụ nke ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ siworo bụrụ ugbu a ihe ngọzi nye ezinụlọ na mba dị iche iche nke ụwa?
7 Ọ bụ ezie na “atụrụ ọzọ” ahụ agaghị eso ‘n’ìgwè atụrụ nta’ ahụ, ha ga-abụkwa ndị na-eje ozi nke Chineke, ma ọ bụghị ndị na-eje ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Eziokwu ahụ bụkwa na “atụrụ ọzọ” ndị ahụ ga-abụ “otu ìgwè atụrụ” ha na ihe fọdụrụ ahụ nke “ndị na-eje ozi ọgbụgba ndụ ọhụrụ” ahụ ga-egosipụta ihe nke dị ukwuu. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ nke a: Tupu ịbụ ndị e mere ebube n’Alaeze eluigwe ahụ, ihe fọdụrụ ahụ n’onwe ya ga-esoro “atụrụ ọzọ” ahụ n’elu ụwa mekọrịta ihe kpọmkwem. N’ụzọ nke a ihe fọdụrụ ahụ nke mkpụrụ ime mmụọ nke Abraham ga-amalite ịbụ ihe ngọzi nye ezinụlọ na mba nile tupu “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” n’Amagedọn na tupu mmalite nke Narị Afọ Iri ahụ.—Ndị Galetia 3:29; Mkpughe 16:14, 16.
8. Olee mgbe Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ ji chee ndị na-anọghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ihu, ọ̀ bụkwa nzọụkwụ mbụ dị aṅaa ka “atụrụ ọzọ” ndị a wereworo?
8 N’ezie nke a abụrụwo otú o mere, karịsịa kemgbe 1935. Kemgbe ahụ, ọtụtụ nde nke “atụrụ ọzọ” ahụ esonyeworo ọtụtụ iri puku ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa, rarakwa onwe ha nye Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ Kasị Elu, bụ́ Jehova Chineke. Otú a ha abụrụwo ndị a nabatara n’ime “otu ìgwè atụrụ” nke Onye Ọzụzụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst.
9. Mgbasapụ nke nlebara anya nke Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ọ̀ pụtara na ije ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ agwụsịwo n’elu ụwa?
9 Eziokwu ahụ bụ́ na site na mgbe ahụ gaa n’ihu, na Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nọ na-eme ka nlebara anya ya gbasaa ịgụnyekwa “atụrụ ọzọ” ahụ, ọ̀ pụtara na ije ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ gwụsịrị na 1935? Ee e, n’ihi na e nwere ihe fọdụrụ ná ndị na-eje ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ka nọ n’elu ala, ha ka ga-ejesịkwa ozi ahụ.
10. Olee ndị taa na-erite uru site n’ije ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị ka mmadụ asatọ ahụ dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst jere?
10 Taa, ma ihe fọdụrụ ahụ nke “ìgwè atụrụ nta” ma “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-aba ụba nke “atụrụ ọzọ” nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ na-enweta uru nke ije ozi nke ndị ọzọ butere ha ụzọ, dị ka Pọl onyeozi. N’iji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ruo ọnwụ ya na Rom, obere oge tupu e bibie Jerusalem na 70 O.A., e ji mmụọ nsọ kpalie Pọl ide 14 n’ime akwụkwọ 27 nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Lee ekele ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke “atụrụ ọzọ” pụrụ inwe na ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi nke narị afọ mbụ, dị ka Pọl onyeozi na mmadụ asaa ndị ọzọ dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, jere ozi ha nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ruo n’ọgwụgwụ nke ndụ ha nke elu ala! N’oge anyị kwa, ọtụtụ nde nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-erite uru ugbu a site n’ije ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, dị ka ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ jere ozi ya n’okpuru Onye Ogbugbo ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Ugbu a “Onyeisi Udo” ahụ echewo ihu ya n’ebe “atụrụ ọzọ” ndị a a hụrụ n’anya nọ, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha jiworo ọsọ rịa elu.
11. (a) Ogologo oge hà aṅaa ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nọworo n’ọrụ, gịnịkwa ka nke a na-egosi? (b) Ihe fọdụrụ ná ndị na-eje ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-eje ozi n’ọkwá dị aṅaa taa?
11 Otú ọ dị, oge aghaghị ịdị na-agwụsị ugbu a! Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ anọwo n’ọrụ 1,950 afọ, jiri 400 afọ dịrị ogologo karịa ọgbụgba ndụ Iwu Mosis bụ́ nke ọ nọchiri, ọnụ ọgụgụ ndị na-eje ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-atalatakwa atalata ka ndị òtù ha na-agabiga n’elu ala n’ọnwụ. Ma ihe fọdụrụ ahụ taa nke ndị ahụ na-eje ozi na-anọgide na-eje ozi dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke Onyenwenụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, họpụtaworo ịbụ “onye isi ihe nile o nwere.”—Matiu 24:45-47.
Ịgbatịpụ Ọkpụkpọ Òkù ahụ Bụ́: “Bịa”
12. Dị ka Mkpughe 22:17 si kwuo, ịkpọ òkù dị aṅaa ka òtù nke “nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ” na-agbatịpụ taa, ọ̀ bụkwa nye ole ndị?
12 Lee ka ozi ndị ahụ na-eje ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ si bụrụ nke ịhụnanya! Dị ka ihe atụ, na Mkpughe 22:17 anyị na-agụ, sị: “Mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” Òtù “nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ,” tinyere ike ọrụ ma ọ bụ mmụọ nke Jehova, na-agbatịpụ ọkpụkpọ òkù ahụ nye ndị ahụ na-anọghị n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-agbatịpụ ọkpụkpọ òkù ahụ, ọ bụghị nye ndị ahụ nwụworo anwụ dị ugbu a n’ime ili ncheta, bụ́ ndị a ga-eji mbilite n’ọnwụ site ná ndị nwụrụ anwụ gọzie, kama nye ndị nọ ndụ ugbu a, bụ́ ndị nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e bibiri n’Amagedọn ma bụrụ ndị nwere ntị ịnụ ihe.
13. (a) Ịkpọ òkù ahụ nke òtù “nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ” gbatịpụrụ ọ̀ bụwo n’efu? Kọwaa. (b) Gịnị ka ndị ahụ narawoororị ọkpụkpọ òkù ahụ na-eme ná nrubeisi nye Mkpughe 22:17? (ch) Gịnị ka ọ na-aghaghị ịbụ otú ọ dị n’ihe banyere oge fọdụrụ maka ịgbatịpụ ọkpụkpọ òkù ahụ?
13 Ọ bụghị n’efu ka a gbatịpụworo ọkpụkpọ òkù ịhụnanya nke a gaa ụwa gburugburu karịsịa kemgbe 1935. Ihe karịrị nde mmadụ anọ azaworị ọkpụkpọ òkù ọma ahụ ịbịa ṅụọ. Dị ka ndị jiworo obi ekele nụ, ha ji nrubeisi na-asịkwa ọtụtụ nde ndị ọzọ akpịrị na-akpọ nkụ maka ndụ na-adịghị agwụ agwụ na paradaịs elu ala, “Bịa”! Ma oge e nwere maka ịgbatịpụ ọkpụkpọ òkù ọma ahụ nye “atụrụ ọzọ” ahụ bụ nke a kpaara ókè. Mgbe ihe karịrị ọkara narị afọ nke ịbụ nke a gbatịpụrụ gasịrị, oge fọdụrụ maka ya ugbu a kwesịrị ịdị nnọọ mkpụmkpụ, ka agha Chineke n’Amagedọn na-eche “ọgbọ a” nke ihe a kpọrọ mmadụ ihu n’ụzọ na-eyi egwu.—Matiu 24:34.
14. Maka gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-enye Jehova ekele na otuto?
14 Ya mere, ugbu a, ka ekele dịrị Jehova na o nyewo Onye Ogbugbo nke a dị ike, onye na-enwe ihe ịga nke ọma n’imezu nzube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’iwepụta ndị mmadụ, 144,000 zuru ezu, maka aha Ya! Ka otuto dịkwara Jehova na Onye Ogbugbo ya dị ka Onye Ozụzụ Atụrụ Ọma na-ewebata ugbu a ọtụtụ nde na-arị elu nke “atụrụ ọzọ” ahụ ‘n’otu ìgwè atụrụ’ ahụ, bụ́ ebe ha banyewororịị n’abamuru ndị mbụ na-erutere ihe a kpọrọ mmadụ site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ!
[Foto dị na peeji nke 111]
Ọtụtụ nde nke “atụrụ ọzọ” ahụ abatawo n’ime nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova n’ụbọchị ikpeazụ ndị a