Ngọzi Ndị Ka Ukwuu Site n’Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
“[Jisọs] bụkwa onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ka mma.”—NDỊ HIBRU 8:6.
1. Ònye mesịrị bụrụ ‘mkpụrụ nke nwanyị ahụ’ e kwere ná nkwa n’Iden, oleekwa otú e si ‘chifịa ya n’ikiri ụkwụ’?
MGBE Adam na Iv mehiesịrị, Jehova mara Setan ikpe, bụ́ onye duhiere Iv, na-asị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Mgbe e mere Jisọs baptism n’Osimiri Jọdan na 29 O.A., Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa n’Iden pụtara ìhè n’ikpeazụ. N’ọnwụ ya n’elu osisi ịta ahụhụ na 33 O.A., e mezuru otu akụkụ nke amụma ochie ahụ. Setan ‘echifịawo Mkpụrụ ahụ n’ikiri ụkwụ.’
2. Dị ka okwu Jisọs n’onwe ya si dị, olee otú ọnwụ ya si na-abara ihe a kpọrọ mmadụ uru?
2 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọnyá ahụ, ọ bụ ezie na ọ fụrụ oké ụfụ, adịgideghị. A kpọlitere Jisọs site ná ndị nwụrụ anwụ dị ka mmụọ na-adịghị anwụ anwụ, o wee rịgokwuru Nna ya n’eluigwe, ebe o chere uru nke ọbara ọ wụsịrị dị ka “ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” Okwu ya onwe ya si otú a bụrụ eziokwu: “A ghaghị iweli Nwa nke mmadụ elu: ka onye ọ bụla nke kwere wee nwee ndụ ebighị ebi na Ya. N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Matiu 20:28; Jọn 3:14-16; Ndị Hibru 9:12-14) Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-arụ ọrụ dị mkpa ná mmezu amụma Jisọs.
Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
3. Olee mgbe mbụ a hụrụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’ọrụ?
3 N’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya, Jisọs gwara ụmụazụ ya na ọbara ya a wụsịrị bụ ‘ọbara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.’ (Matiu 26:28; Luk 22:20) Ụbọchị iri ka ọ rịgosịrị n’eluigwe, a hụrụ na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ amalitewo ọrụ mgbe a wụkwasịrị ndị na-eso ụzọ 120 gbakọrọ n’ime ụlọ dị n’elu na Jerusalem mmụọ nsọ. (Ọrụ 1:15; 2:1-4) Ịkpọbata ndị na-eso ụzọ 120 a n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ gosiri na ọgbụgba ndụ “nke mbụ,” ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, abakwaghị uru ugbu a.—Ndị Hibru 8:13.
4. Ọgbụgba ndụ ochie ahụ ọ̀ dara ada? Kọwaa.
4 Ọgbụgba ndụ ochie ahụ ọ̀ dara ada? Ọ dịghị ma ọlị. N’eziokwu, ebe ọ bụ na e dochiwo ya ugbu a, Israel anụ ahụ abụghịzi ndị pụrụ iche nke Chineke. (Matiu 23:38) Ma nke ahụ bụ n’ihi nnupụisi Israel na ọjụjụ ha jụrụ Onye E Tere Mmanụ nke Jehova. (Ọpụpụ 19:5; Ọrụ 2:22, 23) Otú ọ dị, tupu e dochie Iwu ahụ, ọ rụzuru ihe dị ukwuu. Ruo ọtụtụ narị afọ, o meghere ụzọ isi gakwuru Chineke na nchebe pụọ n’okpukpe ụgha. O nwere ihe atụ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, sitekwa n’àjà ya a na-achụ ugboro ugboro, gosipụta oké mkpa nke mgbapụta site ná mmehie na ọnwụ dị mmadụ. N’ezie, Iwu ahụ bụ “onye ozizi anyị ikuru anyị bịakwute Kraịst.” (Ndị Galetia 3:19, 24; Ndị Rom 3:20; 4:15; 5:12; Ndị Hibru 10:1, 2) Otú ọ dị, ọ bụ site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ka a ga-esi nwetazuo ngọzi ahụ e kwere Abraham ná nkwa.
A Gọzie Mba Nile Site ná Mkpụrụ Abraham
5, 6. Ná mmezu bụ́ isi nke ime mmụọ nke ọgbụgba ndụ Abraham, ònye bụ Mkpụrụ Abraham, oleekwa mba mbụ natara ngọzi site na ya?
5 Jehova kwere Abraham nkwa, sị: “Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jenesis 22:18) N’okpuru ọgbụgba ndụ ochie ahụ, a gọziri ọtụtụ ndị ala ọzọ dị umeala n’obi site ná mkpakọrịta ha na ndị Israel, mba bụ́ mkpụrụ Abraham. Otú ọ dị, ná mmezu ime mmụọ ya bụ́ isi, Mkpụrụ Abraham ahụ bụ otu onye zuru okè. Pọl kọwara nke a mgbe ọ sịrị: “Ọ bụ Abraham ka e kwere nkwa ndị a, ya na Mkpụrụ ya. Ọ sịghị, Na mkpụrụ, dị ka Ọ na-ekwu okwu banyere ọtụtụ, kama dị ka Ọ na-ekwu okwu banyere otu Onye, Ọ sị, Na Mkpụrụ gị, Nke bụ Kraịst.”—Ndị Galetia 3:16.
6 Ee, Jisọs bụ Mkpụrụ Abraham, sitekwa na Ya mba nile na-anata ngọzi karịrị nnọọ ihe ọ bụla Israel anụ ahụ pụrụ inwetawo. N’ezie, mba mbụ natara ngọzi a bụ Israel n’onwe ya. N’oge na-adịghị anya mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị, Pita onyeozi gwara otu ìgwè ndị Juu, sị: “Unu onwe unu bụ ụmụ ndị amụma, na ụmụ ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke na nna unu hà gbara, mgbe Ọ sịrị Abraham, Ọ bụkwa ná Mkpụrụ gị ka a ga-agọzi agbụrụ nile nke ụwa. Unu bụ ndị Chineke buru ụzọ were Ya zitere, mgbe O mere ka O bilie, bụ́ Onye ahụ na-ejere Ya ozi, ịgọzi unu, n’ichigharị unu nile n’otu n’otu ka unu hapụ ajọ ihe unu.”—Ọrụ 3:25, 26.
7. Olee mba ndị a gọziri site na Jisọs, bụ́ Mkpụrụ Abraham?
7 N’oge na-adịghị anya, ngọzi ahụ ruteere ndị Sameria, e mesịa ndị Jentaịl. (Ọrụ 8:14-17; 10:34-48) Ihe dị ka n’agbata 50 na 52 O.A., Pọl deere ndị Kraịst nọ na Galetia dị na Asia Minor akwụkwọ, sị: “Ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ, ebe o buru ụzọ hụ na Chineke na-esite n’okwukwe gụọ ndị mba ọzọ ná ndị ezi omume, o buru ụzọ zie Abraham ozi ọma, sị, A ga-agọzi mba nile n’ime gị. Ya mere ndị sitere n’okwukwe, ndị a ka a na-agọzi, ha na onye okwukwe ahụ, bụ́ Abraham.” (Ndị Galetia 3:8, 9; Jenesis 12:3) Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị Kraịst nọ na Galetia bụ “ndị mba ọzọ,” a gọziri ha site na Jisọs n’ihi okwukwe ha. N’ụzọ dị aṅaa?
8. Nye ndị Kraịst nke ụbọchị Pọl, ịbụ ndị a gọziri site ná Mkpụrụ Abraham gụnyere gịnị, n’ikpeazụkwa mmadụ ole ga-anata ngọzi dị otú ahụ?
8 Pọl gwara ndị Kraịst nọ na Galetia, n’agbanyeghị ebe ha si, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu bụ ihe dị n’ahụ nke Kraịst, ya mere unu bụ mkpụrụ Abraham, bụrụ ndị nketa dị ka nkwa si dị.” (Galetia 3:29) Nye ndị Galetia ahụ, ngọzi ahụ site ná Mkpụrụ Abraham gụnyere ha ịbụ ndị na-ekere òkè n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nakwa ịbụ ndị nketakọ ha na Jisọs, na-esonye Jisọs ná mkpụrụ Abraham ahụ. Anyị amaghị ọnụ ọgụgụ nke ndị Israel oge ochie. Anyị maara nanị na ọ “dị ka ájá nke dị n’akụkụ oké osimiri n’ịba ụba.” (1 Ndị Eze 4:20) Otú ọ dị, anyị ma ọnụ ọgụgụ ikpeazụ nke ndị ga-eso Jisọs ná mkpụrụ ime mmụọ ahụ—144,000. (Mkpughe 7:4; 14:1) Narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ si “n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla” nke ihe a kpọrọ mmadụ pụta ma na-ekere òkè n’inye ndị ọzọkwa ngọzi nke ọgbụgba ndụ Abraham.—Mkpughe 5:9.
Amụma E Mezuru
9. Olee otú ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ si na-enwe iwu Jehova n’ime ha?
9 Mgbe ọ na-ebu amụma ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Jeremaịa dere, sị: “Nke a bụ ọgbụgba ndụ nke Mụ na ụlọ Israel ga-agba mgbe ụbọchị nile ahụ gasịrị, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta); M ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka M ga-edekwasị ya dị ka n’akwụkwọ.” (Jeremaịa 31:33) Ọ bụ njimara nke ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ahụ ijere Jehova ozi n’ịhụnanya. (Jọn 13:35; Ndị Hibru 1:9) E dere iwu Jehova n’obi ha, ha na-achọsikwa ike ime uche ya. N’eziokwu, n’Israel oge ochie ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi hụrụ iwu Jehova n’anya nke ukwuu. (Abụ Ọma 119:97) Ma ọtụtụ ndị emeghị otú ahụ. Ka o sina dị ha nọgidere bụrụ akụkụ nke mba ahụ. Ọ dịghị onye ga-anọgide n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ma ọ bụrụ na e deghị iwu Chineke n’obi ya.
10, 11. Nye ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, n’ụzọ dị aṅaa ka Jehova ‘si bụrụ Chineke ha,’ oleekwa otú ha nile ga-esi mara ya?
10 Jehova gara n’ihu ikwu banyere ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, sị: “M ga-abụkwara ha Chineke, ha onwe ha ga-abụkwara m otu ndị.” (Jeremaịa 31:33) N’Israel oge ochie ọtụtụ ndị fere chi ndị mba ọzọ ofufe, ma ha nọgidere bụrụ ndị Israel. Ná ndabere nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Jehova kepụtara otu mba ime mmụọ, “Israel nke Chineke,” ịnọchi Israel anụ ahụ. (Ndị Galetia 6:16; Matiu 21:43; Ndị Rom 9:6-8) Otú ọ dị, ọ dịghị onye ga-anọgide bụrụ akụkụ nke mba ime mmụọ ọhụrụ ahụ ma ọ kwụsị ife nanị Jehova ofufe.
11 Jehova kwukwara, sị: “Ha nile ga-amara Mụ onwe m, site n’onye dịkarịsịrị nta n’ime ha wee ruo onye dịkarịsịrị ukwuu n’ime ha.” (Jeremaịa 31:34) N’Israel, ọtụtụ ndị leghaara nnọọ Jehova anya, wee si otú ahụ na-asị: “Jehova agaghị eme ezi ihe, Ọ gaghị emekwa ihe ọjọọ.” (Zefanaịa 1:12) Ọ dịghị onye na-anọgide bụrụ akụkụ nke Israel nke Chineke ma ọ bụrụ na ọ na-eleghara Jehova anya ma ọ bụ na-emetọ ofufe dị ọcha. (Matiu 6:24; Ndị Kọlọsi 3:5) Israel ime mmụọ bụ “ndị ahụ nke maara Chineke ha.” (Daniel 11:32) Ha na-enwe ọṅụ ‘n’ịmara nanị ezi Chineke ahụ na Jisọs Kraịst.’ (Jọn 17:3) Ịmara Jisọs na-eme ka ihe ọmụma ha nke Chineke mie emi ebe ọ bụ na, n’ụzọ pụrụ iche, Jisọs bụ “Onye ahụ kọrọ [Chineke] nye mmadụ.”—Jọn 1:18; 14:9-11.
12, 13. (a) N’ihe ndabere dị aṅaa ka Jehova na-agbaghara mmehie nke ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (b) Banyere mgbaghara mmehie, olee otú ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ si ka ọgbụgba ndụ ochie mma?
12 N’ikpeazụ, Jehova kwere nkwa, sị: “M ga-agbaghara ajọ omume ha, M gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ.” (Jeremaịa 31:34b) Iwu Mosis gụnyere ọtụtụ narị iwu nchịkwa ndị e dere ede ndị a chọrọ ka ndị Israel rubere isi. (Deuterọnọmi 28:1, 2, 15) Ndị nile mebiri Iwu ahụ chụrụ àjà iji kpuchie mmehie ha. (Levitikọs 4:1-7; 16:1-31) Ọtụtụ ndị Juu bịara kweta na ha pụrụ ịbụ ndị ezi omume site n’ọrụ onwe ha dị ka ọ dị n’Iwu. Ma, ndị Kraịst ghọtara na ha apụghị inweta ezi omume site n’ọrụ nke onwe ha. Ha apụghị izere ime mmehie. (Ndị Rom 5:12) N’okpuru ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nguzo ezi omume n’ihu Chineke na-ekwe nnweta nanị ná ndabere nke àjà Jisọs. Otú ọ dị, nguzo dị otú ahụ bụ onyinye, ebere na-erughịrị mmadụ site na Chineke. (Ndị Rom 3:20, 23, 24) Jehova ka na-achọ nrubeisi n’aka ndị ohu ya. Pọl na-asị na ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nọ “n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ.”—1 Ndị Kọrint 9:21.
13 N’ihi ya, nyekwa ndị Kraịst e nwere otu àjà maka mmehie, kama ọ bụ nke uru ya karịrị àjà ndị a chụrụ n’okpuru Iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Pọl dere, sị: “Onye nchụàjà ọ bụla [n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu] na-eguzokwa kwa ụbọchị na-efe ofufe na-echekwa otu àjà ndị a n’ihu Chineke ọtụtụ mgbe, bụ́ àjà nke na-apụghị ichipụ mmehie mgbe ọ bụla: ma [Jisọs], mgbe O chererịị otu àjà n’ihu Chineke n’ihi mmehie, O wee nọdụ n’aka nri Chineke mgbe nile.” (Ndị Hibru 10:11, 12) Ebe ndị Kraịst nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-egosipụta okwukwe n’àjà Jisọs, Jehova na-agụ ha ná ndị ezi omume, na-enweghị mmehie, ma si otú ahụ nọrọ n’ọnọdụ ịbụ ndị e tere mmanụ dị ka ụmụ ime mmụọ ya. (Ndị Rom 5:1; 8:33, 34; Ndị Hibru 10:14-18) Mgbe ha mehiere n’ihi ezughị okè mmadụ, ha pụrụ ịrịọ mgbaghara Jehova, ná ndabere nke àjà Jisọs kwa, Jehova na-agbaghara ha. (1 Jọn 2:1, 2) Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha ahọrọ àgwà nke ịkpachara anya na-eme mmehie, nguzo ezi omume ha na ihe ùgwù nke ịbụ ndị na-ekere òkè n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-efunarị ha.—Ndị Hibru 2:2, 3; 6:4-8; 10:26-31.
Ọgbụgba Ndụ Ochie na nke Ọhụrụ
14. Olee ibi úgwù a chọrọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ? n’okpuru ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
14 E biri ndị ikom nọ n’ọgbụgba ndụ ochie ahụ úgwù dị ka ihe àmà na ha nọ n’okpuru Iwu ahụ. (Levitikọs 12:2, 3; Ndị Galetia 5:3) Mgbe ọgbakọ ndị Kraịst malitesịrị, ụfọdụ chere na ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu kwesịkwara ka e bie ha úgwù. Ma ndị ozi na ndị okenye nọ na Jerusalem, n’ịbụ ndị Okwu Chineke na mmụọ nsọ duziri, ghọtara na nke a adịghị mkpa. (Ọrụ 15:1, 5, 28, 29) Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Pọl sịrị: “Onye nke bụ onye Juu n’anya mmadụ abụghị onye Juu; obibi úgwù ahụ nke mmadụ na-ahụ anya, nke dị n’anụ ahụ, abụghịkwa obibi úgwù: kama onye nke bụ onye Juu n’ihe zoro ezo, onye ahụ bụ onye Juu; obibi úgwù bụkwa nke mkpụrụ obi, n’ime mmụọ, ọ bụghị n’ihe e deworo n’akwụkwọ.” (Ndị Rom 2:28, 29) Obibi úgwù nkịtị, ọbụna maka ndị Juu anụ ahụ, enwekwaghị uru ime mmụọ ọ bara n’anya Jehova. Nye ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, a ghaghị ibi obi úgwù, ọ bụghị anụ ahụ. A ghaghị ibepụ ihe ọ bụla n’echiche, ọchịchọ, na ná nkwali ha bụ́ ndị na-adịghị atọ Jehova ụtọ ma ọ bụ ndị na-adịghị ọcha n’anya ya.a Ọtụtụ ndị taa bụ ihe akaebe dị ndụ nke ike mmụọ nsọ ịgbanwe ụzọ iche echiche otú a.—1 Ndị Kọrint 6:9-11; Ndị Galetia 5:22-24; Ndị Efesọs 4:22-24.
15. Olee otú Israel anụ ahụ na Israel nke Chineke si yie n’ihe banyere ịchịisi eze?
15 Ná ndokwa ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, Jehova bụ Eze Israel, ka oge na-agakwa o gosipụtara ọbụbụeze ya site ná ndị eze bụ́ mmadụ na Jerusalem. (Aịsaịa 33:22) Jehova bụkwa Eze nke Israel nke Chineke, Israel ime mmụọ, eri 33 O.A. kwa, ọ chịwo site na Jisọs Kraịst, onye natara “ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Matiu 28:18; Ndị Efesọs 1:19-23; Ndị Kọlọsi 1:13, 14) Taa, Israel nke Chineke na-anara Jisọs dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke, nke e guzobere na 1914. Jisọs bụ Eze ka mma nke ukwuu karịa ọbụna Hezekaịa, Josaịa, na ndị eze ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Israel oge ochie.—Ndị Hibru 1:8, 9; Mkpughe 11:15.
16. Olee ụdị òtù ndị nchụàjà nke Israel nke Chineke bụ?
16 Ọ bụghị nanị na Israel bụ alaeze kamakwa o nwere usoro ndị nchụàjà e tere mmanụ. Na 33 O.A., Israel nke Chineke nọchiri Israel anụ ahụ ma ghọọ “ohu” Jehova, “ndị àmà” ya. (Aịsaịa 43:10) Okwu Jehova gwara Israel e dekọrọ n’Aịsaịa 43:21 na Ọpụpụ 19:5, 6 sitezie mgbe ahụ gaa n’ihu na-emetụta Israel ime mmụọ nke Chineke. Mba ime mmụọ ọhụrụ nke Chineke bụ ugbu a “ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara,” nwee ibu ọrụ nke ‘ikwusa ịdị mma nile nke Jehova.’ (1 Pita 2:9) Ndị nile so n’Israel nke Chineke, ndị ikom na ndị inyom, mejupụtara otu òtù ndị nchụàjà. (Galetia 3:28, 29) Dị ka akụkụ nke abụọ nke mkpụrụ Abraham, ha na-asị ugbu a: “Unu mba ọzọ, soronụ ndị Ya tie mkpu ọṅụ.” (Deuterọnọmi 32:43) Ndị Israel ime mmụọ ka nọ n’elu ala mejupụtara “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Ọ bụ nanị n’isonyere ha ka a pụrụ isi jeere Chineke ozi dị nsọ ọ na-anakwere.
Alaeze Chineke—Mmezu Ikpeazụ
17. Ọmụmụ dị aṅaa ka ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-enweta?
17 Ndị Israel a mụrụ ka 1513 T.O.A. gasịrị banyere n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’ọmụmụ. Ndị Jehova na-akpọbata n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-enwetakwa ọmụmụ—n’ọnọdụ nke ha, ọmụmụ ime mmụọ. Jisọs gwara Nikọdimọs onye Farisii nke a mgbe ọ sịrị: “N’ezie, n’ezie, asị m gị, Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.” (Jọn 3:3) Ndị na-eso ụzọ 120 ahụ na Pentikọst 33 O.A. bụ ndị mbụ na-ezughị okè nwetara ọmụmụ ọhụrụ a. N’ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume n’okpuru ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ha natara mmụọ nsọ dị ka ‘ihe ha ji mara’ ihe nketa nke ịbụ eze ha. (Ndị Efesọs 1:14) Ha bụ ndị “a mụwokwara site na Mmụọ Nsọ” ịghọ ụmụ Chineke kuchiri, nke mere ha ụmụnna Jisọs ma si otú ahụ bụrụ “ndị ha na Kraịst na-ekekọ.” (Jọn 3:6; Ndị Rom 8:16, 17) Ha ịbụ ndị ‘a mụrụ ọzọ’ meghere ụzọ maka olileanya dị ebube.
18. Ịbụ onye a mụrụ ọzọ na-emeghe ụzọ olileanya dịgasị aṅaa dị ebube maka ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
18 Mgbe ọ na-eme ihe dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Jisọs so ụmụazụ ya gbaa ọgbụgba ndụ ọzọ, na-asị: “Mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m.” (Luk 22:29) Ọgbụgba ndụ Alaeze a kwadebere ọnọdụ maka mmezu nke otu ọhụụ dị ịrịba ama, nke e dekọrọ na Daniel 7:13, 14, 22, 27. Daniel hụrụ “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” ka a na-enye ya ikike eze site n’aka “Onye ochie ahụ,” bụ́ Jehova Chineke. Mgbe ahụ Daniel hụrụ na “ndị nsọ nwere alaeze ahụ.” Jisọs bụ onye ahụ “dị ka nwa nke mmadụ” onye, na 1914, natara Alaeze eluigwe site n’aka Jehova Chineke. Ndị na-eso ụzọ ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ “ndị nsọ” ahụ so ya na-ekerịta Alaeze ahụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:12) N’ụzọ dị aṅaa?
19, 20. (a) Nye ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, olee mmezu ikpeazụ dị ebube nke nkwa Jehova kwere Abraham ga-enwe? (b) Olee ajụjụ ọzọ dị mkpa ka a tụlee?
19 Mgbe ha nwụsịrị, a na-akpọlite ndị a e tere mmanụ ka Jisọs site ná ndị nwụrụ anwụ dị ka ndị mmụọ e kere eke na-adịghị anwụ anwụ isoro ya jee ozi dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (1 Ndị Kọrint 15:50-53; Mkpughe 20:4, 6) Lee olileanya dị ebube ọ bụ! “Ha bụkwa eze n’elu ụwa,” ọ bụghị nanị n’ala Kenean. (Mkpughe 5:10) Hà ‘ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ama nke ndị iro ha’? (Jenesis 22:17) Ee, n’ụzọ zuru ezu, mgbe ha jiri anya ha hụ mbibi nke ajọ akwụna okpukpe ahụ, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, na mgbe ndị a e tere mmanụ e si n’ọnwụ kpọlite ga-eso Jisọs kere òkè n’iji “mkpanaka ígwè” zụọ mba nile dị ka atụrụ na igwepịa isi Setan. Ha ga-esi otú a kere òkè n’imezu akụkụ ikpeazụ nke amụma ahụ dị na Jenesis 3:15.—Mkpughe 2:26, 27; 17:14; 18:20, 21; Ndị Rom 16:20.
20 Ma, anyị ka pụrụ ịjụ sị, Ọgbụgba ndụ Abraham na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ọ̀ gụnyere nanị mkpụrụ obi 144,000 ndị a kwesịrị ntụkwasị obi? Ee e, a ga-agọzi ndị ọzọ na-anọghị kpọmkwem n’ọgbụgba ndụ ndị a site na ha, dị ka a ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 470, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee mgbe mbụ a hụrụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’ọrụ?
◻ Gịnị ka a rụzuru site n’ọgbụgba ndụ ochie ahụ?
◻ Ònye bụ Mkpụrụ Abraham n’ụzọ bụ́ isi, oleekwa usoro e si gọzie mba nile site ná Mkpụrụ ahụ?
◻ Nye 144,000 ahụ, gịnị bụ mmezu ikpeazụ nke ọgbụgba ndụ Abraham na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Mgbaghara mmehie pụtara ihe dị omimi karị nye ndị nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ karịa ndị nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ ochie ahụ