Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 2/1 p. 8-13
  • Jehova Bụ Chineke nke Ọgbụgba Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Bụ Chineke nke Ọgbụgba Ndụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọgbụgba Ndụ E So Abraham Gbaa
  • “Ọgbụgba Ndụ Ochie”
  • Ngọzi Ndị Sitere n’Ọgbụgba Ndụ Iwu Ahụ
  • Ndị Na-eso Ụzọ Ndị Juu n’Israel
  • Jehova Agọzie Mkpụrụ Abraham
  • A Chọrọ Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ
  • Ngọzi Ndị Ka Ukwuu Site n’Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ọgbụgba Ndụ Chineke na “Enyi” Ya Abawororị Ọtụtụ Nde Mmadụ Uru
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Unu Ga-abụ “Alaeze nke Ndị Nchụàjà”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • I Nwere Ike Irite Uru n’Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 2/1 p. 8-13

Jehova Bụ Chineke nke Ọgbụgba Ndụ

“Mụ na ụlọ Israel na Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ.”—JEREMAỊA 31:31.

1, 2. (a) Olee ememe Jisọs hiwere n’anyasị Nisan 14, 33 O.A.? (b) Olee ọgbụgba ndụ Jisọs zoro aka na ya n’ihe banyere ọnwụ ya?

N’ANYASỊ Nisan 14, 33 O.A., Jisọs na ndị ozi 12 ya mere Ememe Ngabiga. Ebe ọ maara na nke a ga-abụ nri ikpeazụ ya na ha ga-eri nakwa na n’isi nso na ya ga-anwụ n’aka ndị iro ya, Jisọs jiri oge ahụ kọwaara ndị na-eso ụzọ ya kasị dịrị ya nso ọtụtụ ihe ndị dị mkpa.—Jọn 13:1–17:26.

2 Ọ bụ n’oge a, mgbe ọ chụpụsịrị Judas Iskarịọt, ka Jisọs hiwere nanị ememe okpukpe a na-eme kwa afọ nke e nyere ndị Kraịst iwu idebe—Ememe Ncheta ọnwụ ya. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Mgbe ha na-eri ihe, Jisọs wee nara ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya; O wee nye ndị na-eso ụzọ Ya, sị, Naranụ, rie; nke a bụ ahụ m. O wee nara iko, keleekwa, wee nye ha, sị, Unu nile ṅụọ n’ime ya; n’ihi na nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ, nke a na-awụsịrị ọtụtụ mmadụ ka e wee gbaghara mmehie.” (Matiu 26:26-28) Ụmụazụ Jisọs ga na-eme ncheta ọnwụ ya n’ụzọ dị mfe, dị ùgwù. Jisọs zokwara aka n’otu ọgbụgba ndụ metụtara ọnwụ ya. N’ihe ndekọ dị na Luk, a na-akpọ ya “ọgbụgba ndụ ọhụrụ.”—Luk 22:20.

3. Olee ajụjụ ndị a na-ajụ banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?

3 Gịnị bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? Ọ bụrụ na ọ bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke ahụ ọ̀ na-apụta na e nwere ọgbụgba ndụ ochie? È nwere ọgbụgba ndụ ọ bụla ọzọ ndị metụtara ya? Ajụjụ ndị a dị mkpa n’ihi na Jisọs sịrị na ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ ka a ga-awụsị “ka e wee gbaghara mmehie.” Mgbaghara mmehie dị otú ahụ dị anyị nile oké mkpa.—Ndị Rom 3:23.

Ọgbụgba Ndụ E So Abraham Gbaa

4. Olee nkwa ochie na-enyere anyị aka ịghọta ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?

4 Iji ghọta ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, anyị aghaghị ịlaghachi azụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 tupu ozi elu ala Jisọs ruo n’oge mgbe Tira na ezinụlọ ya—gụnyere Abram (e mesịa, Abraham) na Seraị (e mesịa, Sera) nwunye Abram—mere njem site na Ua nke ndị Kaldea na-enwe ihe ịga nke ọma gaa Heran n’ebe ugwu Mesọpọtemia. Ha bigidere n’ebe ahụ ruo ọnwụ Tira. Mgbe ahụ, n’iwu Jehova, Abraham dị afọ 75 gafere Osimiri Yufretis ma gaa ndịda ọdịda anyanwụ ruo ala Kenean iji bie ndụ mwagharị n’ụlọikwuu. (Jenesis 11:31–12:1, 4, 5; Ọrụ 7:2-5) Nke ahụ bụ na 1943 T.O.A. Mgbe Abraham ka bi na Heran, Jehova agwawo ya, sị: “M ga-emekwa gị ka ị ghọọ mba ukwu, M ga-agọzikwa gị, mee ka aha gị dị ukwuu; gị bụrụkwa ngọzi: M ga-agọzikwa ndị na-agọzi gị, ọ bụkwa onye na-akọcha gị ka M ga-abụ ọnụ: a ga-agọzikwa agbụrụ nile nke ụwa n’ime gị.” N’ikpeazụ, mgbe Abraham banyeworo Kenean, Jehova kwukwasịrị: “Mkpụrụ gị ka M ga-ewere ala nke a nye.”—Jenesis 12:2, 3, 7.

5. Olee amụma a ma ama e jikọtara ya na nkwa Jehova kwere Abraham?

5 E jikọtara nkwa ahụ e kwere Abraham na otu n’ime nkwa Jehova ndị ọzọ. N’ezie, o mere Abraham onye a ma ama n’akụkọ ihe mere eme mmadụ, ihe njikọ ná mmezu nke amụma mbụ e detuworo. Mgbe Adam na Iv mehiesịrị n’ogige Iden, Jehova mara ha abụọ ikpe, n’otu oge ahụkwa, ọ gwara Setan bụ́ onye duhieworo Iv: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: Mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Ọgbụgba ndụ Jehova sooro Abraham gbaa gosiri na mkpụrụ ahụ a ga-esite na ya mee ka ọrụ Setan nile bụrụ ihe efu ga-esite n’usoro ọmụmụ nke nna ochie ahụ.

6. (a) Site n’ònye ka nkwa Jehova kwere Abraham ga-emezu? (b) Gịnị bụ ọgbụgba ndụ Abraham ahụ?

6 Ebe ọ bụ na nkwa Jehova metụtara otu mkpụrụ, ọ dị mkpa na Abraham ga-enwe otu nwa nwoke onye Mkpụrụ ahụ pụrụ isi na ya bịa. Ma ya na Sera emewo agadi ma nọgide n’enweghị nwa. Ma, n’ikpeazụ, Jehova gọziri ha, n’ụzọ ọrụ ebube na-eweghachi ikike ịmụ nwa ha, Sera mụkwaara Abraham otu nwa nwoke, bụ́ Aịsak, si otú a na-eme ka nkwa maka mkpụrụ ahụ dịgide. (Jenesis 17:15-17; 21:1-7) Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, mgbe e lesịrị okwukwe Abraham ule—ọbụna ruo n’ókè nke ya ịdị njikere ịchụ ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Aịsak, n’àjà—Jehova kweghachiri Abraham nkwa ya: “M ga-agọzi gị, n’ime ka a baa ụba M ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe, na dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri; mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá nke ndị iro ya; ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:15-18) A na-akpọkarị nkwa a gbatịpụrụ agbatịpụ ọgbụgba ndụ Abraham, a ga-ejikọtakwa ya na ọgbụgba ndụ ọhụrụ e mesịrị gbaa n’ụzọ chiri anya.

7. Olee otú mkpụrụ Abraham si malite ịmụba n’ọnụ ọgụgụ, oleekwa ihe ndị dugara ha ibi n’Ijipt?

7 Ka oge na-aga, Aịsak mụrụ ejima nwoke, bụ́ Ịsọ na Jekọb. Jehova họọrọ Jekọb ịbụ nna ochie nke Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. (Jenesis 28:10-15; Ndị Rom 9:10-13) Jekọb nwere ụmụ ndị ikom 12. N’ụzọ doro anya, ugbu a bụ oge maka mkpụrụ Abraham ịmalite ịmụba. Mgbe ndị ikom Jekọb toruru ogo mmadụ, ọtụtụ nwee ezinụlọ nke ha, ụnwụ nri manyere ha nile ịkwaga Ijipt ebe, site ná nduzi Chineke, nwa nwoke Jekọb bụ́ Josef akwadebewo ụzọ. (Jenesis 45:5-13; 46:26, 27) Ka afọ ole na ole gasịrị, ụnwụ nri ahụ dị na Kenean belatara. Ma ezinụlọ Jekọb nọgidere n’Ijipt—na mbụ dị ka ndị ọbịa, ma e mesịa dị ka ndị ohu. Ọ bụ mgbe o ruru 1513 T.O.A., mgbe afọ 430 gasịrị mgbe Abraham gafesịrị Yufretis, ka Mosis si Ijipt dupụta ụmụ ụmụ Jekọb gaa ná nnwere onwe. (Ọpụpụ 1:8-14; 12:40, 41; Ndị Galetia 3:16, 17) Ugbu a Jehova ga-enye ọgbụgba ndụ ya na Abraham nlebara anya pụrụ iche.—Ọpụpụ 2:24; 6:2-5.

“Ọgbụgba Ndụ Ochie”

8. Olee ihe Jehova so ụmụ Jekọb kwekọrịta na Saịnaị, oleekwa ihe jikọrọ ya na ọgbụgba ndụ Abraham?

8 Mgbe Jekọb na ụmụ ya kwagara n’Ijipt, ha bụ ezinụlọ gbasapụrụ agbasapụ, ma ụmụ ụmụ ha hapụrụ Ijipt dị ka nnukwute ìgwè nke ebo ndị bara ụba. (Ọpụpụ 1:5-7; 12:37, 38) Tupu Jehova akpọbata ha na Kenean, o duuru ha gaa n’akụkụ ndịda ruo ala ala ugwu a na-akpọ Horeb (ma ọ bụ, Saịnaị) n’Arebia. N’ebe ahụ, ya na ha gbara ndụ. Nke a ka e mesịrị kpọọ “ọgbụgba ndụ ochie” ma e jiri ya tụnyere ‘ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.’ (2 Ndị Kọrint 3:14) Site n’ọgbụgba ndụ ochie ahụ, Jehova wetara mmezu ihe atụ nke ọgbụgba ndụ ya na Abraham.

9. (a) Olee ihe anọ Jehova kwere ná nkwa site n’ọgbụgba ndụ Abraham? (b) Olee olileanya ndị ọzọ ọgbụgba ndụ Jehova na Israel meghere, ọ̀ bụkwa dabere na gịnị?

9 Jehova kọwaara Israel okwu ọgbụgba ndụ a: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karị ndị nile: n’ihi na ọ bụ Mụ nwe ụwa nile: unu onwe unu ga-abụkwara m alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ.” (Ọpụpụ 19:5, 6) Jehova ekwewo nkwa na mkpụrụ Abraham (1) ga-aghọ mba ukwu, (2) ga-enwe mmeri n’isi ndị iro ha, (3) ga-eketa ala Kenean, na (4) ga-abụ ụzọ maka ngọzi nye mba nile. Ugbu a o kpughere na ha onwe ha pụrụ iketa ngọzi ndị a dị ka ndị ya pụrụ iche, bụ́ Israel, “alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ,” ma ọ bụrụ na ha ga-erubere iwu ya isi. Ndị Israel hà kwere ịbanye n’ọgbụgba ndụ a? Ha zara dị ka otu onye: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.”—Ọpụpụ 19:8.

10. Olee otú Jehova si hazie ndị Israel ịbụ otu mba, oleekwa ihe ọ tụrụ anya n’aka ha?

10 Ya mere, Jehova haziri ndị Israel ịghọ otu mba. O nyere ha iwu ndị na-achịkwa ofufe na ndụ nkịtị. O nyekwara ụlọikwuu (e mesịa, ụlọ nsọ dị na Jerusalem) na òtù ndị nchụàjà ije ozi dị nsọ n’ụlọikwuu ahụ. Idebe ọgbụgba ndụ ahụ pụtara irubere iwu Jehova isi na, karịsịa, ife nanị ya ofufe. Nke mbụ n’Iwu Iri ahụ bụ́ ebe iwu ndị ahụ hiwere isi bụ: “Mụ onwe m bụ Jehova Chineke gị, Onye mere ka i si n’ala Ijipt, n’ụlọ ndị ohu, pụta. Gị enwela Chi ọzọ tinyere m.”—Ọpụpụ 20:2, 3.

Ngọzi Ndị Sitere n’Ọgbụgba Ndụ Iwu Ahụ

11, 12. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e si mezuo nkwa ndị dị n’ọgbụgba ndụ ochie ahụ n’ebe Israel nọ?

11 È mezuru nkwa ọgbụgba ndụ iwu ahụ n’ebe ndị Israel nọ? Mba Israel ọ̀ ghọrọ “mba dị nsọ”? Dị ka ụmụ Adam, ndị Israel bụ ndị mmehie. (Ndị Rom 5:12) Ma, n’okpuru Iwu ahụ, a chụrụ àjà iji kpuchie mmehie ha. Banyere àjà ndị a na-achụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie kwa afọ, Jehova sịrị: “N’ụbọchị a ka a ga-ekpuchiri unu mmehie unu, ime ka unu dị ọcha; site ná mmehie nile unu ka unu ga-adị ọcha n’ihu Jehova.” (Levitikọs 16:30) Ya mere, mgbe ha kwesịrị ntụkwasị obi, Israel bụ mba dị nsọ, ndị e mere ka ha dị ọcha maka ozi Jehova. Ma ọnọdụ ịdị ọcha a dabeere ná nrubeisi ha nye Iwu ahụ na ịnọgide na-achụ àjà.

12 Israel ọ̀ ghọrọ “alaeze ndị nchụàjà”? Siterị ná mmalite, ọ bụ alaeze, na-enwe Jehova dị ka Eze nke eluigwe. (Aịsaịa 33:22) Ọzọkwa, ọgbụgba ndụ Iwu ahụ gụnyere ndokwa maka ndị eze bụ́ mmadụ, nke na mgbe e mesịrị ndị eze na-achị na Jerusalem nọchitere anya Jehova. (Deuterọnọmi 17:14-18) Ma Israel ọ̀ bụ alaeze nke ndị nchụàjà? O nwere òtù ndị nchụàjà na-eje ozi dị nsọ n’ụlọikwuu ahụ. Ụlọikwuu ahụ (e mesịa, ụlọ nsọ ahụ) bụ ebe nzukọ maka ofufe dị ọcha nye ndị Israel tinyekwara ndị na-abụghị ndị Israel. Mba ahụ bụkwa ụzọ e nwere nanị ya maka eziokwu e kpughere ekpughe nye ihe a kpọrọ mmadụ. (2 Ihe E Mere 6:32, 33; Ndị Rom 3:1, 2) Ndị Israel nile kwesịrị ntụkwasị obi, ọ bụghị nanị ndị nchụàjà Livaị, bụ “ndị àmà” Jehova. Israel bụ “ohu” Jehova, nke ọ kpụworo ‘ịkọ akụkọ otuto ya.’ (Aịsaịa 43:10, 21) Ọtụtụ ndị ala ọzọ dị umeala n’obi hụrụ ike Jehova n’ebe ndị ya nọ ma bụrụ ndị ofufe dị ọcha dọọrọ. Ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ ndị Juu. (Joshua 2:9-13) Ma nanị otu ebo jere ozi n’ezie dị ka ndị nchụàjà e tere mmanụ.

Ndị Na-eso Ụzọ Ndị Juu n’Israel

13, 14. (a) Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na ndị na-eso ụzọ ndị Juu ekereghị òkè zuru ezu n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ? (b) Olee otú ndị na-eso ụzọ ndị Juu si banye n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ?

13 Gịnị bụ ọnọdụ nke ndị na-eso ụzọ ndị Juu dị otú ahụ? Mgbe Jehova gbara ọgbụgba ndụ ya, ọ bụ nanị ya na Israel; a kpọghị “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” aha, ọ bụ ezie na ha nọ ya, dị ka ndị so na ya. (Ọpụpụ 12:38; 19:3, 7, 8) A gụnyeghị ụmụ mbụ ha mgbe a gbakọrọ ọnụ ahịa ihe mgbapụta ahụ maka ụmụ Israel ndị e bu ụzọ mụọ. (Ọnụ Ọgụgụ 3:44-51) Ọtụtụ iri afọ n’ihu mgbe e kewara ala Kenean n’etiti ebo Israel nile, ọ dịghị ihe e kepụtaara ndị kwere ekwe na-abụghị ndị Israel. (Jenesis 12:7; Joshua 13:1-14) N’ihi gịnị? N’ihi na e soghị ndị na-eso ụzọ ndị Juu gbaa ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Ma e biri ndị ikom bụ́ ndị na-eso ụzọ ndị Juu úgwù ná nrubeisi nye Iwu ahụ. Ha debere iwu nchịkwa ya, ha ritekwara uru site ná ndokwa ya dị iche iche. Ndị na-eso ụzọ ndị Juu tinyekwara ndị Israel batara n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ.—Ọpụpụ 12:48, 49; Ọnụ Ọgụgụ 15:14-16; Ndị Rom 3:19.

14 Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye na-eso ụzọ ndị Juu egbuo mmadụ n’ọghọm, ọ pụrụ, dị ka onye Israel, ịgbaga n’obodo mgbaba. (Ọnụ Ọgụgụ 35:15, 22-25; Joshua 20:9) N’ụbọchị Mkpuchi Mmehie, a na-achụ otu àjà ‘ikpuchiri mkpọkọta nile nke Israel, mmehie ha.’ Dị ka akụkụ nke mkpọkọta ahụ, ndị na-eso ụzọ ndị Juu keere òkè n’ihe ndị a na-eme, bụrụkwa ndị àjà ahụ kpuchiri. (Levitikọs 16:7-10, 15, 17, 29; Deuterọnọmi 23:7, 8) Ndị na-eso ụzọ ndị Juu so ndị Israel kpachie nnọọ anya n’okpuru Iwu ahụ nke na na Pentikọst 33 O.A. mgbe e ji ‘mkpịsị ugodi mbụ nke Alaeze’ mee ihe maka ndị Juu, ndị na-eso ụzọ ndị Juu ritekwara uru. N’ihi ya, “Nikọlas, bụ́ onye Antiọk nke na-eso ụzọ ndị Juu,” ghọrọ onye Kraịst sorokwa n’ime ‘ndị ikom asaa a gbaara ezi àmà’ bụ́ ndị a họpụtara ilekọta mkpa ọgbakọ dị na Jerusalem.—Matiu 16:19; Ọrụ 2:5-10; 6:3-6; 8:26-39.

Jehova Agọzie Mkpụrụ Abraham

15, 16. Olee otú e siri mezuo ọgbụgba ndụ ahụ Jehova na Abraham gbara n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ?

15 Mgbe a haziri ụmụ ụmụ Abraham dị ka otu mba n’okpuru Iwu ahụ, Jehova gọziri ha dị ka nkwa o kwere nna ochie ahụ si dị. Na 1473 T.O.A., onye nọchiri Mosis bụ́ Joshua, duuru Israel banye na Kenean. Ike ala nke sochirinụ n’etiti ebo nile ahụ mezuru nkwa Jehova inye mkpụrụ Abraham ala ahụ. Mgbe Israel kwesịrị ntụkwasị obi, Jehova mezuru nkwa ya inye ha mmeri n’ebe ndị iro ha nọ. Nke a bụ eziokwu karịsịa n’oge ọchịchị Eze Devid. N’oge nwa Devid bụ́ Solomọn, e mezuru akụkụ nke atọ nke ọgbụgba ndụ Abraham. “Juda na Israel dị ọtụtụ, dị ka ájá nke dị n’akụkụ oké osimiri n’ịba ụba, na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ.”—1 Ndị Eze 4:20.

16 Ma, olee otú mba nile ga-esi gọzie onwe ha site n’Israel, bụ́ mkpụrụ Abraham? Dị ka a kpọtụworo uche, Israel bụ ndị pụrụ iche nye Jehova, onye nnọchiteanya ya n’etiti mba nile. N’oge na-adịghị anya tupu Israel azọbanye ụkwụ na Kenean, Mosis sịrị: “Unu mba ọzọ, soronụ ndị Ya tie mkpu ọṅụ.” (Deuterọnọmi 32:43) Ọtụtụ ndị ala ọzọ zaghachiri. “Ọtụtụ ndị gwara ọgwa” esoroworị Israel si n’Ijipt pụta, hụ ike Jehova n’ọzara, nụkwa ọkpụkpọ òkù Mosis ịṅụrị ọṅụ. (Ọpụpụ 12:37, 38) E mesịa, Rut onye Moab lụrụ Boaz onye Israel ma ghọọ nne nne nke Mesaịa ahụ. (Rut 4:13-22) Jehonadab onye Kinaịt na ụmụ ya na Ebed-melek onye Etiopia doro onwe ha iche site n’ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ ndị ziri ezi mgbe ọtụtụ ndị Israel anụ ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi. (2 Ndị Eze 10:15-17; Jeremaịa 35:1-19; 38:7-13) N’okpuru Alaeze Ukwu Peasia, ọtụtụ ndị ala ọzọ ghọrọ ndị na-eso ụzọ ndị Juu ma soro Israel lụọ ọgụ megide ndị iro ya.—Esta 8:17.

A Chọrọ Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ

17. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji jụ alaeze ebe ugwu na nke ebe ndịda Israel? (b) Olee ihe dugara n’ọjụjụ ikpeazụ a jụrụ ndị Juu?

17 Ma, iji nwetazuo mmezu nke nkwa Chineke, mba Chineke pụrụ iche aghaghị ikwesị ntụkwasị obi. O kwesịghị. N’ezie, e nwere ndị Israel nwere okwukwe dị ịrịba ama. (Ndị Hibru 11:32–12:1) Ka o sina dị, ọtụtụ mgbe, mba ahụ chigharịkwuuru chi ndị ọgọ mmụọ, na-atụ anya uru ihe onwunwe. (Jeremaịa 34:8-16; 44:15-18) Ndị mmadụ kọwahiere Iwu ahụ ma ọ bụ lefuru ya nnọọ anya. (Nehemaịa 5:1-5; Aịsaịa 59:2-8; Malakaị 1:12-14) Mgbe Solomọn nwụrụ, Israel kewara gaa n’alaeze ebe ugwu na ebe ndịda. Mgbe alaeze ebe ugwu ghọrọ nke ajọ nnupụisi, Jehova mara ọkwa, sị: “N’ihi na gị onwe gị ajụwo ọmụma ahụ, M ga-ajụkwa gị, i wee ghara ịbụrụ m onye nchụàjà.” (Hosea 4:6) A takwara alaeze ebe ndịda ahụhụ dị ukwuu n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi n’ọgbụgba ndụ ahụ. (Jeremaịa 5:29-31) Mgbe ndị Juu jụrụ Jisọs dị ka Mesaịa ahụ, n’otu aka ahụ Jehova jụrụ ha. (Ọrụ 3:13-15; Ndị Rom 9:31–10:4) N’ikpeazụ, Jehova mere ndokwa ọhụrụ iji mezuo ọgbụgba ndụ Abraham n’ụzọ zuru ezu.—Ndị Rom 3:20.

18, 19. Olee ndokwa ọhụrụ Jehova mere ka ọgbụgba ndụ Abraham nwee ike imezu n’ụzọ zuru ezu?

18 Ndokwa ọhụrụ ahụ bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Jehova ebuwo amụma nke a mgbe ọ sịrị: “Lee, ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), mgbe Mụ na ụlọ Israel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ . . . Nke a bụ ọgbụgba ndụ nke Mụ na ụlọ Israel ga-agba mgbe ụbọchị nile ahụ gasịrị, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta); M ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka M ga-edekwasị ya dị ka n’akwụkwọ; M ga-abụkwara ha Chineke, ha onwe ha ga-abụkwara m otu ndị.”—Jeremaịa 31:31-33.

19 Nke a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ Jisọs zoro aka na ya na Nisan 14, 33 O.A. N’oge ahụ, o kpughere na a na-achọ ịgba ọgbụgba ndụ ahụ e kwere ná nkwa n’etiti ndị na-eso ụzọ ya na Jehova, na-enwe Jisọs dị ka onye ogbugbo. (1 Ndị Kọrint 11:25; 1 Timoti 2:5; Ndị Hibru 12:24) Site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ a, nkwa Jehova kwere Abraham gaje inwe mmezu ka ebube na nke na-adịgide adịgide karị, dị ka anyị gaje ịhụ n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Olee ihe Jehova kwere ná nkwa n’ọgbụgba ndụ Abraham ahụ?

◻ Olee otú Jehova si mezuo ọgbụgba ndụ Abraham ahụ n’ebe Israel anụ ahụ nọ?

◻ Olee otú ndị na-eso ụzọ ndị Juu si rite uru site n’ọgbụgba ndụ ochie ahụ?

◻ N’ihi gịnị ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ji dị mkpa?

[Foto dị na peeji nke 9]

Site n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, Jehova wetara mmezu mbụ nke ọgbụgba ndụ Abraham

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya