ISI NKE IRI NA ANỌ
I Nwere Ike Irite Uru n’Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
1. Olee ọrụ gbara mkpị Jeremaya rụrụ?
JEHOVA nyere Jeremaya ọrụ gbara mkpị. Otu bụ ka ọ “na-efopụ ma na-akwada, na-ebibi ma na-etida.” Nke ọzọ abụrụ ka ọ “na-ewu ihe ma na-akụ mkpụrụ.” Otú onye amụma ahụ si rụọ ọrụ nke mbụ ahụ bụ ime ka a mata ihe ọjọọ ndị Juu dị mpako na-eme, ma gwa ha ikpe Chineke mara ha nakwa ikpe ọ mara Babịlọn. Ma Jeremaya bukwara amụma ndị gosiri na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. O kwuru na a ga-ewu ihe Chineke chọrọ ka e wuo ma kụọ ihe ọ chọrọ ka a kụọ. Dị ka ihe atụ, mgbe Jeremaya kwuru na a ga-eme ka ndị Juu laghachi n’ala ha, ọ bụ ọrụ nke abụọ ahụ e nyere ya ka ọ na-arụ.—Jere. 1:10; 30:17, 18.
2. Gịnị mere Jehova ji mee ndị ya ihe o kpere n’ikpe, oleekwa otú o meruru ya?
2 Ihe ahụ Jeremaya kwuru, nke bụ́ na Chineke ga-eme ka ndị ya lọghachi n’ala ha, apụtaghị na Chineke ebula ụzọ meere ndị ya ebere na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụkwanụ na o mebiri iwu o nyere banyere ikpe ziri ezi. Mbanụ. Ọ ga-eme ndị Juu ahụ bụ́ ndị nnupụisi ihe o kpere n’ikpe. (Gụọ Jeremaya 16:17, 18.) N’oge Jeremaya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na Jeruselem “na-eme ihe ziri ezi” ma ọ bụ “na-achọ ikwesị ntụkwasị obi.” N’ihi ya, Jehova kwuru na ya agaghịzi enwere ha ndidi. O kwuru, sị: “Ike ịgbanwe obi m agwụwo m.” (Jere. 5:1; 15:6, 7) Ndị Juu ahụ ‘laghachiri ná njehie ndị nna nna ha, ndị nke mbụ, ndị jụrụ irube isi n’ihe Jehova kwuru.’ Ihe ọzọ bụ na ha kpasuru Chineke iwe n’ihi na ha hapụrụ ya gaa fewe chi ọzọ. (Jere. 11:10; 34:18) Jehova ga-agbazi ndị ya ma pịa ha ihe “ruo n’ókè kwesịrị ekwesị,” nke nwere ike ime ka ụfọdụ ghọta na ihe ha mere adịghị mma ma laghachikwute Chineke.—Jere. 30:11; 46:28.
3. Gịnị mere i ji kwesị ịmụ banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
3 Chineke si n’ọnụ Jeremaya buo amụma banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bụ́ ihe ga-abara ọtụtụ ndị uru ga-adịte aka. Ka anyị na-atụle amụma ndị Jeremaya dere, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’otu n’ime ihe ọma o buru n’amụma, nke bụ́ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ọ bụ ya ka a ga-eji dochie anya ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na Izrel gbara mgbe ha si n’Ijipt pụta, nke Mozis bụ onye ogbugbo ya. (Gụọ Jeremaya 31:31, 32.) Mgbe Jizọs Kraịst malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, o kwuru banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. N’ihi ya, ọ gbasara anyị. (Luk 22:20) Pọl onyeozi kwuru banyere ọgbụgba ndụ a mgbe ọ na-edegara ndị Hibru akwụkwọ. O kwuru ihe Jeremaya buru n’amụma ma kwusie ike na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị mkpa. (Hib. 8:7-9) Ma, gịnị n’ezie bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? Gịnị mere e ji nwee ya? Olee ndị so na ya, oleekwa otú i nwere ike isi rite uru na ya? Ka anyị chọpụta.
GỊNỊ MERE E JI NWEE ỌGBỤGBA NDỤ ỌHỤRỤ AHỤ?
4. Olee uru ọgbụgba ndụ Iwu Mozis bara?
4 Ihe ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ pụtara bụ ibu ụzọ ghọta ihe mere e ji nwee nke ochie ahụ, ya bụ, ọgbụgba ndụ Iwu Mozis. E nwere ọtụtụ uru ọ ga-abara mba ahụ nke nọ na-eche Mkpụrụ e kwere ná nkwa, bụ́ onye a ga-esi n’aka ya gọzie ọtụtụ mmadụ. (Jen. 22:17, 18) Mgbe ndị Izrel nabatara ọgbụgba ndụ Iwu Mozis, ha ghọọrọ Chineke ‘ihe onwunwe pụrụ iche.’ N’ọgbụgba ndụ ahụ, ọ bụ n’ebo Livaị ka a ga-esi na-enweta ndị nchụàjà n’Izrel. Mgbe Jehova na Izrel na-agba ndụ ahụ n’Ugwu Saịnaị, Jehova kwuru banyere “alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ.” Ma, o kwughị mgbe a ga-enwe ya na otú a ga-esi nwee ya. (Ọpụ. 19:5-8) Tupu ya emezuo, ọgbụgba ndụ ahụ mere ka o doo anya na ndị Izrel enweghị ike idebe Iwu Mozis niile. N’ihi ya, o mere ka mmehie ha pụta ìhè. Ọ bụ ya mere Iwu Mozis ji kwuo na ndị Izrel ga na-achụ àjà mgbe niile iji kpuchie mmehie ha. Ma o doro anya na e kwesịrị inwe àjà ka nke ahụ, ya bụ, àjà zuru okè a na-agaghị achụ ugboro ugboro. N’ezie, ọ dị oké mkpa na a ga-enwe mgbaghara mmehie nke ga-adịru mgbe ebighị ebi.—Gal. 3:19-22.
5. Gịnị mere Jehova ji kwuo na a ga-enwe ọgbụgba ndụ ọhụrụ?
5 Ihe ndị a anyị tụlere nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe mere na, mgbe a ka nọ n’ọgbụgba ndụ Iwu Mozis, Chineke si n’ọnụ Jeremaya kwuo na a ga-enwe ọgbụgba ndụ ọzọ, nke bụ́ ọgbụgba ndụ ọhụrụ. N’ihi ịhụnanya Jehova na obiọma ya, ọ chọrọ ime ihe nwere ike ịbara ọtụtụ mba uru ruo mgbe ebighị ebi. Chineke si n’ọnụ Jeremaya kwuo banyere ndị ga-eso n’ọgbụgba ndụ ahụ a ga-enwe n’ọdịnihu, sị: “M ga-agbaghara ha njehie ha, agakwaghị m echeta mmehie ha.” (Jere. 31:34) Ọ bụ ezie na e kwere nkwa ahụ n’oge Jeremaya, ọ ga-eme ka mmadụ niile nwee olileanya magburu onwe ya. Olee otú ọ ga-esi eme ya?
6, 7. (a) Olee otú obi na-adị ụfọdụ ndị n’ihi mmehie ha? (b) Gịnị mere ịmụ banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ji kwesị ịgba gị ume?
6 Anyị ka bụ ndị na-ezughị okè. E nwekwara ọtụtụ ihe na-eme ka anyị cheta ezughị okè anyị. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nke na-agbalị imeri otu nsogbu ya na ya na-alụ. O kwuru, sị: “Ọ na-ewute m mgbe ọ bụla m mere ihe m kpebiri na agaghị m eme ọzọ. Ọ na-adị m ka e nweghị ike ịgbaghara m ihe m mere. Ọ na-esiri m ike ikpe ekpere. Otú m na-esi amalite ekpere m bụ, ‘Jehova, amaghị m ma ị̀ ga-anụ ekpere a, ma . . . ’” Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị emehie ma ọ bụ mee ihe ha kpebiri na ha agaghị eme ọzọ, ọ na-adị ha ka è nwere “ígwé ojii” nke na-eme ka Chineke ghara ịnụ ekpere ha. (Ákwá 3:44) E nwere ndị ọzọ ọ na-abụ, ha cheta ihe ọjọọ ha mere ọtụtụ afọ gara aga, ya ana-echu ha ụra. Ọbụna Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-akpa àgwà ọma, nwere ike ikwu ihe ndị ha ga-emecha kwaa m makwaara.—Jems 3:5-10.
7 O nweghị onye n’ime anyị kwesịrị iche na o nweghị ike ime ihe na-adịghị mma. (1 Kọr. 10:12) Pọl onyeozi ghọtara na ya na-emehie mgbe ụfọdụ. (Gụọ Ndị Rom 7:21-25.) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-echeta ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Chineke kwere nkwa na otu uru ọ ga-aba bụ na ọ ga-eme ka ya ghara icheta mmehie. Ọ bụ uru na-enweghị atụ! Ọ ga-abụrịrị na Jeremaya nwere obi ụtọ mgbe ọ nụrụ ya. Anyị nwekwara ike inwe obi ụtọ ka anyị na-amụkwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ma chọpụta otú o nwere ike isi baara anyị uru.
Gịnị mere Chineke ji mee ka e nwee ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
GỊNỊ BỤ ỌGBỤGBA NDỤ ỌHỤRỤ AHỤ?
8, 9. Gịnị ka o furu Jehova iji mee ka o nwee ike ịgbaghara mmehie?
8 Ka ị na-amatakwu Jehova, ị ga-achọpụta na ọ na-egosi ụmụ mmadụ na-ezughị okè obiọma ma na-emere ha ebere. (Ọma 103:13, 14) Mgbe Jeremaya na-ebu amụma na a ga-enwe ọgbụgba ndụ ọhụrụ, o mere ka a mata na Jehova “ga-agbaghara ha njehie ha” nakwa na ọ gakwaghị echeta mmehie ha. (Jere. 31:34) I nwere ike iche na ma eleghị anya, Jeremaya aghọtaghị otú Chineke ga-esi agbaghara mmehie ahụ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ ghọtara na ihe Chineke bu n’obi mgbe ọ na-ekwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ na ya na ụmụ mmadụ ga-enwe nkwekọrịta. Jehova ga-esi n’ọgbụgba ndụ ahụ mezuo ihe o si n’ọnụ Jeremaya kwuo, nke gụnyere ịgbaghara mmehie. Tupu a mata ihe ndị ọzọ banyere ọgbụgba ndụ ahụ, Chineke ga-ebu ụzọ mee ka a ghọtakwuo nzube ya, ma ihe Mesaya ga-eme.
9 O nwere ike ị hụla ndị nne na nna na-azụtọ ụmụ ha. Ha anaghị adọ ha aka ná ntị. Ị̀ tụrụ anya na Jehova ga-eme otú ahụ? Mbanụ! Otú anyị si mara bụ otú Jehova si malite ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Kama naanị ịkagbu mmehie, Chineke sara anya na mmiri mee ka e nwee ihe iwu kwadoro nke ga-eme ka ọ na-agbaghara mmehie. O si otú ahụ debe iwu o nyere banyere ikpe ziri ezi n’agbanyeghị na o furu ya ihe dị ukwuu. I nwere ike ịghọta ihe a e kwuru ma ọ bụrụ na ị mata ihe Pọl dere mgbe ọ na-ekwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. (Gụọ Ndị Hibru 9:15, 22, 28.) Pọl kwuru banyere ‘isi n’ihe mgbapụta tọhapụ’ ndị mmadụ, kwuokwa na “ọ gwụla ma à wụsịrị ọbara, a gaghị enwe mgbaghara ọ bụla.” N’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ọbara ahụ abụghị nke ehi ma ọ bụ ewu e ji chụọ àjà n’Iwu Mozis. Mbanụ. Ọ bụ ọbara Jizọs ka e ji mee ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè. Àjà ahụ zuru okè ga-eme ka Jehova ‘gbaghara njehie na mmehie’ kpamkpam. (Ọrụ 2:38; 3:19) Olee ndị ga-eso n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, a gbagharakwa ha mmehie ha? Ọ bụghị mba ndị Juu. Jizọs kwuru na Chineke ga-ajụ ndị Juu, bụ́ ndị ji anụmanụ chụọ àjà n’Iwu Mozis. Ọ ga-ahọrọkwa mba ọzọ. (Mat. 21:43; Ọrụ 3:13-15) Mba ahụ ọ họọrọ bụ “Izrel nke Chineke,” nke bụ́ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ọ bụ Jehova Chineke na ụmụ Izrel gbara ndụ n’ọgbụgba ndụ Iwu Mozis. Ma ọ bụ ya na Izrel ime mmụọ gbara ndụ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Jizọs bụkwa Onye Ogbugbo ya.—Gal. 6:16; Rom 9:6.
10. (a) Ònye bụ “ome” ahụ puuru Devid? (b) Olee otú ndị mmadụ nwere ike isi rite uru ‘n’ome’ ahụ?
10 Jeremaya kwuru na Onye ahụ na-abịanụ, bụ́ Mesaya ahụ, bụ “ome” nke ga-epuru Devid. Ihe ahụ o kwuru dabara adaba. Jeremaya ka bụ onye amụma mgbe e gbuturu ọchịchị ndị eze si n’ezinụlọ Devid dị ka osisi. Ma, úkwù osisi ahụ anwụghị anwụ. Ka oge na-aga, a mụrụ Jizọs n’agbụrụ Eze Devid. A kpọrọ ya “Jehova Bụ Ezi Omume Anyị,” nke gosiri na Chineke ji ezi omume kpọrọ ihe nke ukwuu. (Gụọ Jeremaya 23:5, 6.) Jehova kwere ka Ọkpara ọ mụrụ naanị ya taa ahụhụ n’ụwa ma nwụọ. O mere ihe dabara adaba n’ikpe ziri ezi ya. O ji uru àjà nke “ome” ahụ puuru Devid na-agbaghara mmehie. (Jere. 33:15) Nke a mere ka e nwee ike ịkpọ ụfọdụ ndị “ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ,” e jiri mmụọ nsọ tee ha mmanụ, ha esorokwa n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ihe ọzọ gosiri na Chineke ji ezi omume kpọrọ ihe bụ na, dị ka anyị ga-emecha chọpụta, ndị ọzọ na-esoghị n’ọgbụgba ndụ ahụ nwere ike irite uru na ya, ha na-eritekwa uru.—Rom 5:18.
“Iwu nke Kraịst” na-eme ka mmadụ jiri obi ya niile na-ejere Jehova ozi
11. (a) Olee ebe e dere iwu ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (b) Gịnị mere “atụrụ ọzọ” ahụ ji nwee mmasị n’iwu ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
11 Ị̀ chọrọ ịma ihe ndị ọzọ mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ pụọ iche? Otu ihe kacha dị iche n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na ọgbụgba ndụ Iwu Mozis bụ ebe e dere ha. (Gụọ Jeremaya 31:33.) E dere Iwu Iri nke ọgbụgba ndụ Iwu Mozis ná mbadamba nkume, nke mechara fuo. Ma, Jeremaya buru amụma na ebe a ga-ede iwu nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ n’obi ndị mmadụ, nakwa na ọ ga-adịgide. Ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ha jikwa ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ kpọrọ ihe. Oleekwanụ banyere “atụrụ ọzọ” ahụ nwere olileanya ibi n’ụwa, bụ́ ndị na-esoghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (Jọn 10:16) Iwu Chineke na-emekwa ha obi ụtọ. E nwere ike ikwu na ha yiri ndị mbịarambịa n’Izrel oge ochie, bụ́ ndị nabatara Iwu Mozis ma rite uru na ya.—Lev. 24:22; Ọnụ Ọgụ. 15:15.
12, 13. (a) Gịnị bụ iwu nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (b) ‘N’iwu nke Kraịst,’ gịnị mere i kwesịghị iche na a na-amanye gị ife Chineke?
12 Olee ihe ị ga-aza ma a jụọ gị, sị, ‘Gịnị bụ iwu ahụ e dere n’obi Ndị Kraịst e tere mmanụ?’ Ihe ọzọ a na-akpọ ya bụ “iwu nke Kraịst.” E bu ụzọ nye ya Izrel ime mmụọ, bụ́ ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. (Gal. 6:2; Rom 2:28, 29) Otu okwu e nwere ike iji kọwaa “iwu nke Kraịst” bụ ịhụnanya. (Mat. 22:36-39) Olee otú ndị e tere mmanụ si eme ka e dee iwu ahụ n’obi ha? Ụzọ abụọ dị mkpa ha si eme ya bụ ịmụ Okwu Chineke na ikpegara Jehova ekpere. N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-eme ihe abụọ ahụ mgbe niile n’ofufe ha na-efe ezi Chineke. Ndị na-esoghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ma chọọ irite uru na ya kwesịkwara ime otú ahụ.
13 A kpọrọ “iwu nke Kraịst” “iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe” nakwa “iwu nke ndị nweere onwe ha.” (Jems 1:25; 2:12) E nwere ọtụtụ ndị a mụrụ n’Iwu Mozis, ma o nweghị onye a na-amụ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ma ọ bụ n’iwu nke Kraịst. E nweghị onye ọ bụla na-erube isi n’iwu Kraịst a na-amanye ife Chineke. Kama nke ahụ, obi dị ha ụtọ ịmata na e nwere ike ide iwu Chineke n’obi ha nakwa na ndị mmadụ taa nwere ike irite uru ga-adịru mgbe ebighị ebi n’ọgbụgba ndụ ahụ Jeremaya buru amụma ya.
Olee otú Chineke si jiri ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ mee ka ọ na-agbaghara mmehie? Olee otú i nwere ike isi mụta iwu ahụ a na-ede n’obi ndị mmadụ?
NDỊ NA-ERITE URU N’ỌGBỤGBA NDỤ ỌHỤRỤ AHỤ
14. Olee ndị na-erite uru n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
14 Ọ na-abụ, ụfọdụ ndị nụ na ọ bụ otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ha echee na ọ bụ naanị ndị ahụ na-erite uru na ya. Ma eleghị anya, ihe mere ha ji eche otú ahụ bụ na ọ bụ naanị ndị e tere mmanụ na-ata achịcha, na-aṅụkwa mmanya na-anọchi anya ‘ọbara ọgbụgba ndụ’ ahụ mgbe a na-echeta ọnwụ Kraịst kwa afọ. (Mak 14:24) Ma, cheta na ndị ahụ so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-eso Jizọs bụrụ “mkpụrụ” Ebreham, nke a ga-esi na ya gọzie mba niile. (Gal. 3:8, 9, 29; Jen. 12:3) E nwere ike ikwu na Jehova ga-esi n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ mezuo nkwa o kwere na ya ga-esi ná “mkpụrụ” Ebreham gọzie mmadụ niile.
15. Olee ọrụ e buru n’amụma na ndị e tere mmanụ ga-arụ?
15 Jizọs Kraịst bụ isi sekpụ ntị ná mkpụrụ Ebreham, bụrụkwa Nnukwu Onye Nchụàjà. Ọ chụrụ àjà zuru okè nke mere ka e nwee ike ịna-agbaghara njehie na mmehie. (Gụọ Ndị Hibru 2:17, 18.) N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke kwuru banyere “alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ” n’oge dị anya gara aga. (Ọpụ. 19:6) Ná mba Izrel oge ochie, ọ bụ n’otu ebo ka e si enweta ndị nchụàjà. Ma ndị eze na-esi n’ebo ọzọ. Oleekwanụ otú a ga-esi enweta mba ahụ e kwere ná nkwa, ndị ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà? Ndị Pita onyeozi degaara akwụkwọ ozi mbụ ya bụ ndị e ji mmụọ nsọ doo nsọ. (1 Pita 1:1, 2) Ọ kpọrọ ha “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị pụrụ iche nke Chineke.” (1 Pita 2:9) N’ihi ya, Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ga-abụ ndị nchụàjà nọ n’okpuru Kraịst. Chegodị ihe nke ahụ pụtara! Anyị na mmehie na-agba mgba kwa ụbọchị. Ọ ka ‘na-achịkwa dị ka eze.’ Ndị nchụàjà ahụ ga-anọ n’okpuru Kraịst bụkwa ndị ha na mmehie gbara mgba. (Rom 5:21) Ha ga-ama otú ọ na-adị mmadụ ma o mejọọ ihe, obi ana-ama ya ikpe. N’ihi ya, ha na Kraịst ga-emere anyị ebere ka anyị na-agbalị imeri mmehie.
16. Olee otú Mkpughe 7:9, 14 nwere ike isi gbaa “oké ìgwè mmadụ” ahụ ume?
16 Ná Mkpughe 7:9, 14, a hụrụ ka “oké ìgwè mmadụ” “yi uwe mwụda na-acha ọcha,” nke pụtara na ha na Chineke dị ná mma. A na-achịkọta oké ìgwè mmadụ ahụ ugbu a, ka ha nwee ike isi “n’oké mkpagbu ahụ pụta.” N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ha bụ ndị ezi omume n’anya Chineke ugbu a. Ha bụ ndị enyi Jehova, bụ́ ndị ọ kpọrọ ndị ezi omume. (Rom 4:2, 3; Jems 2:23) Ọ bụ uru magburu onwe ya! Ọ bụrụ na i so n’oké ìgwè mmadụ ahụ, ka obi sie gị ike na Chineke ga-enyere gị aka, ka ị na-agbalị ịdị ọcha n’anya ya.
17. E kwuo na Jehova anaghị “echeta” mmehie, gịnị ka ọ pụtara?
17 Gịnị ka Chineke ga-eme mmehie nke ndị ha na ya dị ná mma? Dị ka anyị kwuru na mbụ, Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo, sị: “M ga-agbaghara ha njehie ha, agakwaghị m echeta mmehie ha.” (Jere. 31:34) Ọ bụ ihe Chineke na-emere ndị e tere mmanụ n’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ. N’otu aka ahụ, Chineke na-agbaghara oké ìgwè mmadụ ahụ mmehie ha n’ihi otu “ọbara nke ọgbụgba ndụ” ahụ. Ihe ahụ Jeremaya kwuru, nke bụ́ na Chineke agakwaghị “echeta” mmehie, apụtaghị na e nweghịzi ihe ọ na-echeta, nke ga-eme ka o chefuo mmehie ndị ahụ. Kama, ọ pụtara na mgbe ọ bụla Jehova dọrọ onye mmehie chegharịrị echegharị aka ná ntị ma gbaghara ya, ọ na-awụfu mmehie ahụ gara aga n’azụ ya. Chegodị banyere mmehie ahụ Eze Devid mere nke gbasara Bat-shiba na Yuraya. A dọrọ Devid aka ná ntị, ya ejirikwa isi ya buru ihe mmehie ya kpataara ya. (2 Sam. 11:4, 15, 27; 12:9-14; Aịza. 38:17) Ma, Chineke agụrụghị Devid mmehie ahụ mgbe niile. (Gụọ 2 Ihe E Mere 7:17, 18.) Dị ka e kwuru n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, mgbe ọ bụla Jehova gbaghaara mmehie, ọ naghị echeta ya ọzọ n’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ.—Ezik. 18:21, 22.
18, 19. Gịnị ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-akụziri anyị banyere ịgbaghara mmehie?
18 N’ihi ya, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ mere ka a mata ụzọ magburu onwe ya Jehova si emeso ụmụ mmadụ na-ezughị okè ihe, ma ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị so n’ọgbụgba ndụ ahụ, ma ndị ahụ nwere olileanya ibi n’ụwa. Ka obi sie gị ike na ọ bụrụ na Jehova agbaghara gị mmehie gị, ọ gaghị echetakwa ya. N’ihi ya, e nwere ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịmụta ná nkwa ahụ Chineke kwere banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na ndị ọzọ emee m ihe ọjọọ, mụ asị na agbagharala m ha, m̀ na-agbalị iṅomi Jehova, ghara ịna-ekwute okwu ihe ahụ ha mere?’ (Mat. 6:14, 15) Ihe a e kwuru gbasara ma obere ihe mmadụ mere anyị ma mmehie dị oké njọ, dị ka mgbe di ma ọ bụ nwunye Onye Kraịst kwara iko. Ọ bụrụ na onye ahụ aka ya dị ọcha ekweta ịgbaghara di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko ma chegharịa, ọ̀ bụ na o kwesịghị ichefu mmehie ahụ kpamkpam? N’eziokwu, ọ naghị adị mfe ichefu ihe mmadụ mere anyị. Ma, ọ bụ otu ụzọ anyị nwere ike isi ṅomie Jehova.a
19 Anyị nwere ike ime ihe a anyị mụtara banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ mgbe onye a chụpụrụ n’ọgbakọ chegharịrị, a nabata ya. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na e nwere otú onye ahụ si mee ka ihe funahụ gị ma ọ bụ mebie aha gị? Ma ugbu a, a nabatala ya n’ọgbakọ. Olee otú ihe anyị gụrụ na Jeremaya 31:34 ga-esi emetụta otú anyị si ele onye ahụ anya na àgwà anyị na-akpaso ya? Ànyị ga-agbaghara onye ahụ meburu ihe ọjọọ ma ghara ịna-echeta ihe ọjọọ ahụ o mere? (2 Kọr. 2:6-8) N’eziokwu, ọ bụ ihe onye ọ bụla ghọtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ kwesịrị ịgbalịsi ike ime kwa ụbọchị.
Olee otú ị ga-esi mee ihe ị mụtara n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ banyere ịgbaghara mmehie?
GỌZI ỌGBỤGBA NDỤ ỌHỤRỤ AHỤ, MA UGBU A MA N’ỌDỊNIHU
20. Olee otú àgwà gị si dị iche n’àgwà ọtụtụ ndị nọ n’oge Jeremaya?
20 N’oge Jeremaya, e nwere ike ikwu na ọtụtụ ndị Juu nọ na-ekwu, sị: “Jehova agaghị eme ihe ọma, ọ gaghịkwa eme ihe ọjọọ.” (Zef. 1:12) N’agbanyeghị na ha ma onye Jehova bụ nakwa àgwà ya, ha chere na ọ gaghị eme ihe ọ bụla, na ọ naghịkwa atụ anya ka ha debe iwu ọ bụla. Ma ị ma na o nweghị ihe Chineke na-anaghị ahụ. I kwesịrị ịtụ egwu ya ma na-agbara ihe ọjọọ ọsọ. (Jere. 16:17) Ị makwa na Jehova bụ Nna nwere obiọma. Ọ na-ahụ ihe ọma anyị na-eme, ma ndị ọzọ hà na-ahụ ya ma ọ bụ na ha anaghị ahụ ya.—2 Ihe 16:9.
Ndị ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi ga-enweta ngọzi ya n’ọdịnihu
21, 22. Gịnị mere na e kwesịghị ịna-agwa gị: “Mara Jehova”?
21 Chineke kwuru otu ihe pụtara ìhè banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, sị: “M ga-etinye iwu m n’ime ha, m ga-edekwa ya n’obi ha. M ga-abụ Chineke ha, . . . Onye ọ bụla n’ime ha agakwaghị akụziri enyi ya na nwanne ya, sị, ‘Maranụ Jehova!’ n’ihi na ha niile ga-amara m.” (Jere. 31:33, 34) Ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa taa egosila na e dere iwu Chineke n’obi ha. Ha hụrụ eziokwu e dere na ya n’anya kama ịtụkwasị obi n’ihe mmadụ ọ bụla na-akụzi. Ha ejirila obi ụtọ kụziere oké ìgwè mmadụ ahụ ihe ha mụtara na Baịbụl, nke mere ka ndị a nwere olileanya ibi n’ụwa mara onye Jehova bụ ma hụ ya n’anya. Ha na-eji obi ha dum erube isi ná nduzi ya ma tụkwasị nkwa ya obi. Ma eleghị anya, ị na-eme otú ahụ. Ị matala ya nke ọma, gị na ya adịrịkwa ná mma. Ọ bụ uru na-enweghị atụ!
22 Olee otú i sirila mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma? O doro anya na ị na-echeta oge ndị ọ zara ekpere gị. Ekpere ndị ọ zara gị emeela ka ị ghọtakwuo ụdị onye Chineke bụ. Ma eleghị anya, mgbe i chetara amaokwu Akwụkwọ Nsọ nke nyeere gị aka idi nsogbu gị, ị ghọtara na ọ bụ otú ahụ ka o si nyere gị aka. Ejila ụdị ihe ahụ egwuri egwu. Ka ị na-amụ Okwu ya, ị ga na-amatakwu ụdị onye ọ bụ, nke ga na-abara gị uru.
23. Olee otú ịmara Jehova nwere ike isi mee ka ihe na-enweghị isi ghara ime ka ị na-echegbu onwe gị?
23 Ma e nwere ngọzi ọzọ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nwere ike ime ka anyị nweta ugbu a. Ọ bụrụ na anyị amata na Jehova na-agbaghara mmehie dị ka e kwuru n’ọgbụgba ndụ ahụ, ọ ga-eme ka obi anyị ghara ịna-ama anyị ikpe. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị tere ime tupu ha amata iwu Chineke. Obi ha nwere ike ịna-ama ha ikpe, ya ana-ewutekwa ha, n’ihi na ha kpachaara anya gbuo nwa ha bu n’afọ. E nwere ndị ọzọ ọ na-ewute na ha gburu ndị mmadụ n’agha. Àjà mgbapụta ahụ Jizọs chụrụ, nke bụ́ ihe e ji gbaa ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, mere ka Chineke na-agbaghara ndị chegharịrị n’ezie. N’ihi ya, ọ̀ bụ na obi ekwesịghị isi anyị ike na ọ bụrụ na Jehova agbaghara mmehie anyị, ọ na-echezọ ya kpamkpam? Anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị banyere mmehie Jehova gbaghaara kpamkpam.
24. Olee otú ihe e kwuru na Jeremaya 31:20 nwere ike isi gbaa gị ume?
24 Jeremaya 31:20 mere ka o doo anya na Chineke na-agbaghara mmehie. (Gụọ ya.) Ọtụtụ afọ tupu oge Jeremaya, Jehova nyere alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu ntaramahụhụ n’ihi na ha na-ekpere arụsị. Ọ bụ Ifrem, bụ́ ebo a kacha mara amara n’ebo iri ahụ, ka e ji nọchite anya ha. A dọọrọ ha n’agha laa n’obodo ọzọ. Ma, Chineke ka hụrụ ndị nọ ná mba ahụ n’anya ma nweere ha obi ọmịiko. Ọ ka hụrụ ha n’anya dị ka ‘nwa a na-apa apa.’ Ọ na-abụ o cheta ha, eriri afọ ya ‘ana-eme mkpọtụ,’ nke pụtara na o metụrụ ya n’obi nke ukwuu. Ihe a e kwuru tupu e kwuo banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ gosiri na Jehova na-eji obi ya niile agbaghara ndị chegharịrị n’ihe ọjọọ ha mere n’oge gara aga.
25. Gịnị mere i ji kwesị ịna-ekele Jehova maka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
25 Ọ bụ mgbe Kraịst chịchara otu puku afọ ka Jehova ga-emezucha nkwa ahụ o kwere na ya ga-esi n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ gbaghara mmehie anyị. Jizọs Kraịst na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị nchụàjà nọ n’okpuru ya, ga-eme ka ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-erubere Chineke isi, zuo okè n’oge ahụ. Mgbe e lechara ha ule ikpeazụ, ha ga-eso n’ezie n’ezinụlọ eluigwe na ala nke Jehova. (Gụọ Ndị Rom 8:19-22.) Kemgbe ọtụtụ narị afọ, mmadụ niile na-asụ ude n’ihi ahụhụ mmehie mere ka ha na-ata. Ma, a ga-eme ka ụmụ mmadụ Jehova kere “nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke,” ya bụ, ịnapụta ha n’aka mmehie na ọnwụ. N’ihi ya, ka obi sie gị ike na ị ga-esi n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ Chineke mere ndokwa ya rite ọtụtụ uru. I nwere ike isite ‘n’ome’ ahụ puuru Devid rite uru ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi ma hụ mgbe a ga-enwe “ezi omume n’ala a.”—Jere. 33:15.
Olee otú i nwere ike isi rite uru n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ugbu a nakwa n’ọdịnihu?
a E ji àgwà Hosia kpasoro Goma mee ihe atụ otú Chineke si adị njikere ịgbaghara mmehie. Gụọ otú e si kọwaa Hosia 2:14-16 n’akwụkwọ bụ́ Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ, peeji nke 128-130.