Isi 17
Iji Iguzosi Ike n’Ihe Na-echeta Nzukọ Jehova
1. Anyị kwesịrị ịdị na-eche echiche banyere iguzosi ike n’ihe nye ònye, gịnịkwa ka Eze Devid kwuru n’ihe banyere nke a?
ANA-EKWU ọtụtụ ihe taa banyere iguzosi ike n’ihe nye mba nke mmadụ si na ya. Ma ruo ókè hà aṅaa ka ndị ọchịchị na ụmụ mmadụ n’ụwa nke a kwuworo okwu banyere iguzosi ike n’ihe nye Chineke, onye bụ Onye Okike nke ala ahụ nke mba ahụ mmadụ si na ya dị n’elu ya? N’oge ochie, Eze Devid nke Israel bụ bụ onye ji iguzosi ike n’ihe fee Onye Okike ahụ, bụ Jehova Chineke ofufe. N’ịgwa Chineke nke a na-eguzosi ike n’ihe okwu, Devid gwara ya okwu ndị a, sị: “N’ebe onye ebere [“onye na-eguzosi ike n’ihe,” NW] nọ ị ga-egosi onwe gị onye ebere [“onye na-eguzosi ike n’ihe,” NW].” (2 Samuel 22:26; Abụ Ọma 18:25) Okwu ndị ahụ hà na na-egosi ihe bụ àgwà gị n’ebe Chineke nọ?
2. Olee otú anyị si maara na Jehova anọwo na-eguzosi ike n’ihe nye ezinụlọ mmadụ?
2 Ihe bụ àgwà ụmụ mmadụ taa n’ozuzu ha abụghị oké nchegbu ha nwere banyere iguzosi ike n’ihe nye Chineke. Ma n’agbanyeghị nke a, Jehova na-eguzosi ike n’ihe nye ezinụlọ nke mmadụ. Ọ tụpụbeghị ya. Ọkpara ya na-eguzosi ike n’ihe kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighi ebi.” (Jọn 3:16) Chineke agbakụtaghị ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ azụ nye onye kasịnụ na-ebuso ya iro, bụ́ Setan, onye manyeworo nne na nna anyị mbụ ịghọ ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe nye Chineke. Chineke gosikwara iguzosi ike n’ihe ya nye ezinụlọ nke mmadụ na 2370 T.O.A. site n’ichebe Noa na ezinụlọ ya gabiga iju mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ, bụ́ nke kpochapụrụ ihe nile fọdụrụ n’ihe a kpọrọ mmadụ. (2 Pita 2:5) N’ụzọ nke a Onye Okike nyere ezinụlọ mmadụ mmalite dị ọhụrụ.
3. (a) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ime ihe ike taa, gịnịkwa ka Chineke zubeworo ime banyere ya? (b) Gịnị bụ ụgwọ ọrụ maka iguzosi ike n’ihe nye Jehova?
3 Taa ime ihe ike zuru ụwa ọnụ akarịwo nke oge Noa n’ihe karịrị 4,000 afọ gara aga. (Jenesis 6:11) Ya mere ọ bụ ihe ikpe ziri ezi dị na ya otu Chineke ahụ ikpochapụ usoro ihe dị ugbu a nke ụwa pụọ n’ịdị adị. Nke a ka o zubeworo ime, ma mgbe ọ ga-eme otú ahụ, ọ gaghị ebibi ndị ya nọ n’elu ala na-eguzosi ike n’ihe. Mgbe ahụ ọ ga-eme ihe kwekọrọ n’Abụ Ọma 37:28: “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere ya [“ndị ya na-eguzosi ike n’ihe,” NW].” Dị ka ọ dị n’ụbọchị Noa, ọ ga-eji ezi omume malite usoro ihe ọhụrụ ahụ, bụ́ nke ihe mejupụtara ya bụ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (2 Pita 3:13) Ụgwọ ọrụ nke iguzosi ike n’ihe dị ukwuu. Ọ bụ nke na-enye ndụ!
4. Olee otú anyị si maara na mba Israel bụ nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova n’oge ahụ?
4 N’oge ọchịchị nke Eze Devid, mba Israel ghọrọ nke na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova. Devid setipụụrụ mba ahụ dum ụkpụrụ ha ga-agbaso. Mba ahụ bụ nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova. Ha bụ ndị a haziri ahazi, ndị dịịrị nanị ya n’ụzọ pụrụ iche. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke ahụ bụ ihe ihe ncheta nke Chineke pụtara, dị ka e depụtara ya n’Emọs 3:1, 2: “Nụrụnụ okwu a nke Jehova kwuworo megide unu, ụmụ Israel, megide agbụrụ ahụ nile nke m mere ka ha si n’ala Ijipt rịgopụta, sị, Nanị unu ka m mawooro n’etiti agbụrụ nile nke ụwa.”—Tụlee 1 Ndị Eze 8:41-43.
5. (a) N’ụbọchị ndị ozi Jisọs Kraịst, ọ̀ dị mgbalị ndị e mere iwebata ihe na-ezighị ezi n’ime ọgbakọ ndị Kraịst? (b) Gịnị ka e buru n’amụma na ọ ga-eme mgbe ọnwụ nke ndị ozi gasịrị?
5 N’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu nke a nke akụkọ ihe mere eme nke Bible, otu Chineke nke a, bụ́ Jehova, ahaziwo otu ndị, nzukọ a na-ahụ anya, n’elu ụwa taa. Ọ bụ nzukọ nke bụ nke ya kpam kpam. Otú ọ dị, a nwara iwebata ihe ndị na-ezighị ezi n’ime nzukọ Chineke ọbụna site ná mmalite ya n’ụbọchị ndị ozi nke Jisọs Kraịst, ndị bụ́ ndị nkwado siri ike nke ịnọgidesi ike n’ezi ihe nke ọgbakọ ndị Kraịst. (1 Ndị Kọrint 15:12; 2 Timoti 2:16-18) Mgbe ọnwụ Jọn onyeozi gasịrị, nke ihe àmà na-egosi na ọ bụghị oge dị anya mgbe 98 O.A. gasịrị, ndapụ ahụ e buru n’amụma malitere.—Ọrụ 20:30; 2 Pita 2:1, 3; 1 Timoti 4:1.
6. (a) Ogologo oge hà aṅaa ka ndapụ n’ezi ofufe ahụ chịrị eze, ihe dịkwa aṅaa ka ọ rụpụtara? (b) Ndọta n’agha dị aṅaa ka okpukpe dị iche iche nke Krisendọm banyere n’ime ya, ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilitekwa?
6 Ndapụ n’ezi ofufe ahụ chịrị eze ruo ihe karịrị narị afọ 17, banye n’ọkara ikpeazụ nke narị afọ nke 19. Rule mgbe ahụ e kewasịwo Krisendọm gaa n’ọtụtụ narị ịrọ òtù okpukpe dị iche iche. Ihe e ji amata ezi ndị Chineke gbara itiri. Krisendọm ghọrọ bebel nke òtù okpukpe ụgha, ma ndị ukwu ma ndị obere, na-enwe ọtụtụ ngwakọta nke asụsụ okpukpe nke na-enweghị ihe mgbakwasị ụkwụ siri ike n’asụsụ okpukpe nke Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ. Nzukọ okpukpe ndị dị otú ahụ abụrụwo ndị a dọtara n’agha n’ezie site n’aka otu alaeze ukwu nke dị ukwuu nke ukwuu karịa Alaeze Ukwu Babilọn nke bibiri Jerusalem. Ma gịnị ka Babilọn oge ochie dị ka ya, oleekwa ihe na-aghaghị ịbụworị àgwà nke ndị Juu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị a dọtara n’agha?
Ndị A Dọtara n’Agha na Babilọn Jiri Iguzosi Ike n’Ihe Cheta Zaịọn
7. (a) N’ikwu ya n’ụzọ okpukpe, gịnị ka ala Babilọn oge ochie dị ka ya? (b) Mmetụta dị aṅaa ka nke a na-aghaghị inweworị n’ebe ndị Juu ahụ a dọtara n’agha nọ?
7 Babilọn oge ochie bụ ala nke chi ụgha dị iche iche, arụsị ya dịkwa ọtụtụ nke ukwuu. (Daniel 5:4) Anyị pụrụ iche n’echiche mmetụta nke ofufe nke a nke ọtụtụ chi ụgha dị iche iche nwere n’obi nke ndị Juu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị feworo nanị otu ezi Chineke ahụ n’ejighị ụdị ọ bụla nke ihe oyiyi. Kama ịhụ ụlọ nsọ Jehova n’ịma mma ya nile na Jerusalem, ha hụrụ ụlọ nsọ dị iche iche nke chi ụgha ndị a na arụsị ha n’ala nile nke Babilọn.a Lee ka ndị na-efe otu ezi Chineke ahụ e nwere nanị ya na-aghaghị isiworị taa ahụhụ nke mmetụta ịsọ oyi n’ihi ihe ndị a nile!
8. (a) Ogologo oge hà aṅaa ka ndị Juu ahụ ga-anagide ndọta n’agha ha, gịnịkwa ka ndị Juu na-eguzosi ike n’ihe ga-atụ anya ya? (b) Olee otú Abụ Ọma 137:1-4 si kọwaa ọnọdụ obi mgbawa nke ndị Juu ahụ na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị a dọtara n’agha?
8 Dị ka amụma Jeremaịa si kwuo, ha gaje ịnagide nke a ruo 70 afọ tupu mweghachi abịa. (2 Ihe Emere 36:18-21; Jeremaịa 25:11, 12) Ọnọdụ na-agbawa obi nke ndị Juu ahụ a dọtara n’agha, bụ́ ndị hụrụ Jehova n’anya ma nwee ọchịchọ ife ya ofufe n’ụlọ nsọ nke a raara nye ya n’obodo nke ọ họpụtara ka a kọwaara anyị n’Abụ Ọma 137:1-4: “N’akụkụ osimiri nile nke Babilọn, n’ebe ahụ ka anyị nọdụrụ ala, ee, anyị kwara ákwá, mgbe anyị chetara Zaịọn. N’osisi willow dị n’etiti ya ka anyị na-ekokwasị ụbọ akwara nile anyị. N’ihi na n’ebe ahụ ka ndị na-adọta anyị n’agha rịọrọ n’aka anyị okwu abụ, ndị lụtara ihe anyị n’agha rịọkwara anyị ka anyị ṅụrịa ọṅụ, sị, Bụọrọnụ anyị otu n’ime abụ Zaịọn. Ànyị ga-esi aṅaa bụọ abụ Jehova n’ala nke onye ala ọzọ?”
9. Olee otú ndị Babilọn ga-esi lee ịbụ “abụ Jehova” anya, ma gịnị gaje ime n’ọgwụgwụ nke 70 afọ ahụ?
9 “Abụ Jehova” kwesịrị ịbụ abụ nke ndị nweere onwe ha na-efe ya ofufe n’ụlọ nsọ ya. Nye ndị Babilọn ahụ, ndị Juu ndị a ịbụ “abụ Jehova” n’ala nke ndọta n’agha ha ga-abụ oge ndị dọtara ha n’agha ga-eji kwaa aha Jehova emo dị ka aha nke chi dị ala n’ebe chi dị iche iche nke Babilọn dị. A taworị aha nsọ ya ụta dị ukwuu site na ya ikwere ka a kpọpụ ndị ya n’ala nke aka ha bụ nke Chineke nyere ha wee mee ka ha zọrọ ije gaa n’ala nke nwere ọtụtụ chi. Ma oge ndị Babilọn ahụ nwere ịkwa ya emo na iweda ndị ya a kpọkwasịrị aha ya ala gaje ịbụ nanị oge a kpaara ókè—70 afọ. Mgbe ahụ ka e budaa aha chi ụgha dị iche iche nke Babilọn ala ma mee ka e bulie aha nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, elu!
Inwe Njikọ nke Obi n’Ebe Nzukọ Jehova Dị
10. Ajụjụ dị aṅaa na-ebilite n’ihe banyere ndị Jehova nke narị afọ nke 20 nke a, bụ́ ndị a dọtara n’agha gaa na Babilọn Ukwu ahụ?
10 Taa e nwere òtù okpukpe nke a kpọrọ Babilọn Ukwu, bụ́ nke na-adịghị n’ala nke Babilọn mbụ ahụ, kama ọ bụ nke zuru ụwa ọnụ. Àgwà nke obi nke ndị Juu ahụ nọ na Babilọn oge ochie ọ̀ na-esetịpụ ezi ihe nlereanya maka ndị Jehova na narị afọ nke 20 nke a, bụ́ ndị a manyere ịbụ ndị a dọtara n’agha nye Babilọn Ukwu ahụ dị ka ahụhụ sitere n’aka Chineke nke Israel oge ochie ahụ?
11. (a) Ndị Juu na-eguzosi ike n’ihe hà kwere ka ala nke aka ha fuo ha n’uche? (b) Olee otú ọbụ abụ ahụ a dọtara n’agha si kwupụta mmetụta nke ibe ya ndị a dọtara n’agha?
11 Ọ bụ ezie na ha pụrụ ibirizi na Babilọn oge ochie ahụ ma tụsara ahụ dị ka ndị nọ n’ụlọ nke aka ha, ebe ọ bụ na ịnọ n’ala ọzọ ahụ ga-adị ihe dị ka otu ọgbọ n’ogologo, hà kwere ka ala nke aka ha pụọ ha n’uche? Onye ọbụ abụ ahụ a dọtara n’agha na-ekwupụta ya n’ụzọ mara mma mgbe o kwupụtara ihe bụ mmetụta nke ibe ya ndị a dọtara n’agha, sị: “Ọ bụrụ na echezọọ m gị, Jerusalem, ka aka nri m chezọọ nkà ya. Ka ire m rapara n’okpó ọnụ m, ma ọ bụrụ na adịghị m echeta gị; ma ọ bụrụ na adịghị m eme ka Jerusalem dị elu n’elu isi ọṅụ m.”—Abụ Ọma 137:5, 6.
12. Gịnị ka àgwà nke obi nke onye ọbụ abụ ahụ a dọtara n’agha gosipụtara?
12 Gịnị ka àgwà nke obi nke onye Israel ahụ a dọtara n’agha gosipụtara? Ọ bụ nke a: iguzosi ike n’ihe nye nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova n’oge ahụ mgbe ọ hụrụ ala ahụ nke Chineke nyeworo ndị Ya a họpụtara ahọpụta ka ọ na-atọgbọ n’efu ruo 70 afọ. Ee, nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova dịrị gaa n’ihu n’obi nke ndị Israel ahụ.
13. Olee otú e si kwụghachi iguzosi ike n’ihe nye nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova ụgwọ ọrụ?
13 Iguzosi ike n’ihe dị otú ahụ nye nzukọ Chineke a na-ahụ anya n’oge ochie bụ nke a kwụghachiri ụgwọ mgbe oge ya ruru. Nke a bụ mgbe e bibiri Babilọn, bụ́ ike ụwa nke atọ nke akụkọ ihe mere eme nke Bible, Midia na Peasia kwa, ike ụwa nke anọ, wee mezuo uche nke Chineke nke Israel. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ime ka ndị Juu ahụ a dọtara n’agha laghachi n’ala nke nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova, na-enye ha ntụziaka iwughachi ụlọ nsọ Chineke ha dị ka ebe bụ isi nke isi obodo ahụ, bụ́ Jerusalem. (2 Ihe Emere 36:22, 23) Ọ bụghị nanị na e wughachiri ụlọ nsọ nke ezi ofufe kama a rụghachikwara obodo Jerusalem ahụ a gbara mgbidi, ịghọ obodo nke ọ bụ site na ya ka Jehova chịrị dị ka Eze n’elu ndị ya.
14. (a) Ọtụtụ narị afọ n’ikpeazụ, gịnị ka Mesaịa ahụ kwuru banyere nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova? (b) N’echiche dị aṅaa ka Jehova chịrị site na Jerusalem?
14 N’ihe karịrị narị afọ isii mgbe mbibi Jerusalem gasịrị, Jisọs kwuru, sị: “Aṅụla iyi ma ọlị; ejila eluigwe ṅụọ, n’ihi na ọ bụ ocheeze Chineke; ejikwala ala, n’ihi na ọ bụ ihe mgbakwasị ụkwụ nke ụkwụ ya; aṅụkwala iyi n’ebe Jerusalem dị, n’ihi na ọ bụ obodo nke Eze ukwu ahụ.” (Matiu 5:34, 35) Mgbe Mesaịa ahụ nọ n’elu ala, e nwere ụlọ nsọ Jehova nke e wughachiri ewughachi na Jerusalem, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, Jehova Chineke chịkwara ọchịchị n’Ebe Kasị Nsọ nke ụlọ nsọ ahụ. Ya mere site na Jerusalem dị ka isi obodo nke ndị ya, Jehova chịrị isi n’elu nzukọ ya a na-ahụ anya.
Jehova Na-anọgide n’Iguzosi Ike n’Ihe nye Nzukọ Ya
15. Jisọs ọ̀ na-ajụ akụkụ a na-ahụ anya nke nzukọ Jehova mgbe o kpughere ndị ndú okpukpe na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi nke Israel? Kọwaa.
15 Ọ dị mma, ugbu a, Jisọs ọ̀ tụpụrụ nzukọ a na-ahụ anya nke Chineke mgbe o kpughere ndị ndú okpukpe na-ekwesịghị ntụkwasị obi nke Israel ma maa ha ikpe? Ee, n’ihi na ọ sịrị: “Jerusalem, Jerusalem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-ewerekwa nkume atụ ndị e zitewooro ya! Ọtụtụ mgbe ole ka m chọrọ ịchịkọ ụmụ gị, ọbụna dị ka nnekwu ọkụkọ na-achịkọ ụmụ ya n’okpuru nku ya abụọ, ma unu achọghị! Lee, a na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.” (Matiu 23:37, 38) Mgbe Jisọs jụrụ Jerusalem na “ụmụ” ya, ò mere mgbe ahụ ka Nna ya nke eluigwe nọrọ n’enweghị nzukọ nke elu ala? Ee e! N’ihi na Jisọs n’onwe ya bụ ntọala nke nzukọ ọhụrụ nke a na-ahụ anya nke Onye Okike nke eluigwe na ala gaje iwulite.
16. N’oge ọnwụ Jisọs n’elu osisi ịta ahụhụ, olee otú e si gosi ọjụjụ a jụrụ mba Israel anụ ahụ?
16 Ọjụjụ nke a jụrụ Israel anụ ahụ bụ nke e gosiri n’ezie mgbe ákwà mgbochi ahụ buru ibu nke kewara Ebe Kasị Nsọ ahụ pụọ n’Ebe Nsọ nke ụlọ nsọ Jerusalem gbawara abụọ “site n’elu ruo ala” mgbe Jisọs nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ. N’otu oge ahụ, “ala makwara jijiji; oké nkume gbawakwara.” Ndị a bụ ọrụ ndị dị ebube n’akụkụ nke Chineke, onye na-achịbu n’ebe ahụ n’ụzọ ihe atụ, na-egosi ọjụjụ ọ jụrụ mba Israel na okpukpe ya.—Matiu 27:51.
17. Olee otú Jisọs na Jehova si gosi iguzosi ike n’ihe nye ndị gaje ịbụ ndị òtù nke nzukọ ọhụrụ a na-ahụ anya nke Chineke?
17 A hapụrụ na gburugburu Jerusalem n’ebe ahụ, ndị gaje ịghọ n’ọdịnihu ndị òtù nke nzukọ ọhụrụ nke a na-ahụ anya nke Jehova Chineke gaje iwulite mgbe na-adịghị anya. Jisọs tinyere ha ná nlekọta anya nke Chineke, onye na-ahapụ obodo nke elu ala ahụ n’ihi ihe nke ka ukwuu. (Jọn 17:9-15) Otú a Jehova nọgidere n’iguzosi ike n’ihe nye nzukọ ya, na-egosi ndị nna ha ochie kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Abraham, Aịsak, na Jekọb na ụmụ ndị ikom 12 nke Jekọb ihu ọma n’ụzọ pụrụ iche. (Daniel 12:1) Isi akwụkwọ nke na-esonụ ga-agakwu n’ihu ná ntụle anyị nke iguzosi ike n’ihe nke dabeere n’Abụ Ọma nke 137.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otu ụdị ihe odide cuneiform sitere na Babilọn oge ochie na-akọ, sị: “Ná ngụkọta e nwere na Babilọn 53 ụlọ nsọ dị iche iche nke chi ndị bụ isi, 55 chapel nke chi Marduk, 300 chapel maka chi ndị nke elu ala, 600 maka chi ndị nke eluigwe, 180 ebe ịchụàjà maka chi nwanyị bụ Ishtar, 180 maka chi Nergal na Adad na ebe ịchụàjà 12 ndị ọzọ maka chi dị iche iche.”