Lee Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe!
“Ònye bụ onye na-agaghị atụ gị egwu n’ezie, Jehova, tookwa aha gị, n’ihi na nanị gị na-eguzosi ike n’ihe?”—MKPUGHE 15:4, NW.
1. Akaebe dị aṅaa ka J. F. Rutherford gbara banyere iguzosi ike n’ihe nke onye bu ya ụzọ, bụ́ C. T. Russell?
JOSEPH F. RUTHERFORD, onye nọchiri C. T. Russell dị ka onyeisi oche nke Watch Tower Society na 1917, malitere okwu ya n’ememe olili ozu Russell site n’ịsị: “Charles Taze Russell guzosiri ike n’ihe nye Chineke, guzosie ike n’ihe nye Kraịst Jisọs, guzosie ike n’ihe nye nzube nke alaeze Mesaịa. O guzosiri ike n’ihe ruo n’ụmị ọkpụkpụ ya—ee, guzosie ike n’ihe ọbụna ruo ọnwụ.” N’ezie, nke ahụ bụ ezi okwu ịja mma a ga-ekwu nye ohu kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova Chineke. Ọ dịghị okwu ịja mma nke anyị pụrụ inye onye ọ bụla karịa ikwu na o meriri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe, na o guzosiri ike n’ihe—guzosie ike n’ihe ruo n’ụmị ọkpụkpụ ya.
2, 3. (a) N’ihi gịnị ka iguzosi ike n’ihe ji eweta ihe ịma aka? (b) Olee ndị gbakọrọ megide ezi ndị Kraịst ná mgbalị ha iguzosi ike n’ihe?
2 Iguzosi ike n’ihe na-eweta ihe ịma aka. N’ihi gịnị? N’ihi na iguzosi ike n’ihe na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-asọkọrịta isi. Ndị bụ isi n’etiti ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe nye Chineke bụ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm. Ọzọkwa, ọ dịbeghị mgbe e nwere ụdị mgbasa nke eguzosighị ike n’ihe dị ka e nwere ya ná mmekọrịta alụmdi na nwunye taa. A na-ahụ ịkwa iko ndị lụrụ di na nwunye ebe nile. Eguzosighị ike n’ihe jupụtakwara n’ụwa azụmahịa. Banyere nke a, a gwara anyị, sị: “Ọtụtụ ndị maneja na ndị ọkà . . . kwenyere na nanị ndị iberibe na ndị a pụrụ ịghọgbu na-eguzosi ike n’ihe nye ụlọ ọrụ ha taa.” A na-eleda ndị “na-eguzosi ike n’ihe n’ụzọ gafere ókè” anya. “Iguzosi ike n’ihe bụ́ isi na nanị nke i nwere kwesịrị ịbụ nye onwe gị” bụ ụzọ otu onyeisi oche nke ụlọ ọrụ na-ejere ụlọ ọrụ ndị ọzọ ozi si tinye ya. Ikwu banyere iguzosi ike n’ihe nye onwe onye bụ ịgwagbu ihe okwu ahụ pụtara. Ọ na-echetara anyị ihe e kwuru na Maịka 7:2: “Onye ebere [“na-eguzosi ike n’ihe,” NW] alawo n’iyi pụọ n’ụwa.”
3 N’ọ̀tụ̀tụ̀ ka nnọọ ukwuu, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agbakọwo megide anyị, kpebisie ike ime ka anyị ghara iguzosi ike n’ihe nye Chineke. Ọ bụ ya mere e ji gwa ndị Kraịst ná Ndị Efesọs 6:12, sị: “Ịgba mgba anyị abụghị imegide anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ imegide ịbụ ndị isi nile, imegide ịchịisi nile, imegide ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a, imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.” Ee, ọ dị anyị mkpa ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ bụ́: “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.”—1 Pita 5:8.
4. Àgwà ndị dị aṅaa na-eme ka iguzosi ike n’ihe sie oké ike?
4 Ihe ọzọkwa na-eme ka iguzosi ike n’ihe bụrụ ihe siri ike bụ àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nke anyị ketara eketa site n’aka nne na nna anyị, dị ka e hotara na Jenesis 8:21: “Nchepụta nke obi mmadụ dị njọ”—na-achọkwa ọdịmma nke nanị ya—“site na nwata.” Anyị nile nwere nsogbu nke Pọl onyeozi kwupụtara na ya nwere: “Ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme.”—Ndị Rom 7:19.
Iguzosi Ike n’Ihe Bụ Ihe Pụrụ Iche
5, 6. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ihe iguzosi ike n’ihe bụ, oleekwa otú e siworo kọwaa ya?
5 “Iguzosi ike n’ihe” bụ nnọọ okwu pụrụ iche. N’ihi ya, Insight on the Scriptures na-asị: “O yiri ka ọ dịghị okwu Bekee na-akọwa kpọmkwem ihe okwu Hibru na Grik ahụ pụtazuru, ma ‘iguzosi ike n’ihe,’ na-agụnye, dị ka ọ na-eme, echiche nke nraranye na ikwesị ntụkwasị obi, mgbe e ji ya mee ihe n’ihe banyere Chineke na ozi ya, bụ nkọwa kasị nso.”a Banyere “Iguzosi ike n’ihe,” Ụlọ Nche kwuru n’otu mgbe, sị: “Ikwesị ntụkwasị obi, ọrụ dịịrị mmadụ, ịhụnanya, ihe mmadụ na-aghaghị ime, na nsọpụrụ. Gịnị ka okwu ndị a nwekọrọ ọnụ? Ha bụ akụkụ dị iche iche nke iguzosi ike n’ihe.” Ee, ọtụtụ àgwà ọma bụ akụkụ dị iche iche nke iguzosi ike n’ihe. Ọ bụ n’ezie ihe e kwesịrị ịrịba ama otú e si jikọọ iguzosi ike n’ihe na ezi omume n’Akwụkwọ Nsọ ọtụtụ mgbe.
6 Ihe ọzọ na-enyekwa aka bụ nkọwa ndị a na-esonụ: ‘Iguzosi ike n’ihe pụrụ igosi ikwesị ntụkwasị obi na nraranye a pụrụ ịdabere na ha, nke na-aga n’ihu, nke e chebere pụọ n’ịda ada ma ọ bụ ọnwụnwa.’ ‘Iguzosi ike n’ihe nwere echiche nke ikwesị ntụkwasị obi nye nkwa mmadụ ma ọ bụ ịnọgide na-erube isi n’òtù ma ọ bụ ụkpụrụ mmadụ chere na ọ bụ iwu na ọ ga-edebe dị ka ihe ziri ezi; okwu ahụ na-atụ aro ọ bụghị nanị ịraparasi ike kama iguzogide ịbụ onye a ratara ma dọpụ ná nraparasi ike ahụ.’ N’ihi ya, ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ule dị iche iche, mmegide, na mkpagbu kwesịrị ka a kpọọ ha “ndị na-eguzosi ike n’ihe.”
7. Gịnị bụ ọdịiche a pụrụ ime n’etiti iguzosi ike n’ihe na ikwesị ntụkwasị obi?
7 Otú ọ dị, n’ihe banyere nke a, ọ pụrụ ịdị mma ime ihe atụ ọdịiche nke pụrụ ịdị n’etiti iguzosi ike n’ihe na ikwesị ntụkwasị obi. N’ebe ọdịda anyanwụ United States, e nwere mmiri iyi nke na-agbapụta mmiri ọkụ ihe dị ka hour ọ bụla. Ọ na-eme mgbe nile nke na a kpọwo ya Onye Ochie Kwesịrị Ntụkwasị Obi. Bible na-ekwu banyere ihe ndị dị otú ahụ na-adịghị ndụ dị ka ọnwa ịbụ ihe kwesịrị ntụkwasị obi, n’ihi na a pụrụ ịdabere na ha. Abụ Ọma 89:37 na-ekwu banyere ọnwa dị ka “Onyeàmà Nke nọ ná mbara igwe kwesịrị ntụkwasị obi.” A na-asị na okwu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi. Mkpughe 21:5 na-asị: “Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” Ihe ndị a nile kwesịchara ntụkwasị obi, bụrụ ihe ndị a pụrụ ịdabere na ha, ma ha enweghị ike inwe nkekọ ọ bụla ma ọ bụ àgwà omume ọma, dị ka iguzosi ike n’ihe.
Jehova, Onye Mbụ Na-eguzosi Ike n’Ihe
8. Akaebe dị aṅaa nke Akwụkwọ Nsọ na-eme ka a mata ihe nlereanya kasị mma nke iguzosi ike n’ihe?
8 N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, Jehova Chineke bụ ihe nlereanya kasị mma nke iguzosi ike n’ihe. Jehova anọwo na-eguzosi ike n’ihe nye agbụrụ mmadụ, ọbụna na-enye Ọkpara ya ka ụmụ mmadụ nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Na Jeremaịa 3:12, anyị na-agụ, sị: “Lata, gị Israel nke na-adaghachi azụ, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta; M gaghị edo unu ihu iwe: n’ihi na onye ebere [“na-eguzosi ike n’ihe,” NW] ka m bụ.” Ihe ọzọ na-agba akaebe iguzosi ike n’ihe nke Jehova bụ okwu ndị e dekọrọ ná Mkpughe 16:5: “Onye ezi omume ka Ị bụ, Gị Onye na-adị adị, Onye dịkwarị, Onye dị ọcha n’obi [“na-eguzosi ike n’ihe,” NW].” Ọzọkwa, n’Abụ Ọma 145:17, a gwara anyị, sị: “Onye ezi omume ka Jehova bụ n’ụzọ Ya nile, Ọ dịkwa ebere [“na-eguzosikwa ike n’ihe,” NW] n’ọrụ Ya nile.” N’ezie, Jehova pụrụ nnọọ iche n’iguzosi ike n’ihe ya nke na Mkpughe 15:4 na-asị: “Ònye bụ onye na-agaghị atụ gị egwu n’ezie, Jehova, tookwa aha gị, n’ihi na nanị gị na-eguzosi ike n’ihe?” Jehova Chineke na-eguzosi ike n’ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ukwuu.
9, 10. Ihe ndekọ dị aṅaa nke iguzosi ike n’ihe ka Jehova nwere ná mmeso o mesoro mba Israel?
9 Akụkọ ihe mere eme nke mba Israel karịsịa nwere ihe àmà bara ụba nke iguzosi ike n’ihe nke Jehova n’ebe ndị ya nọ. N’oge nke Ndị Ikpe, Israel dapụrụ n’ezi ofufe ugboro ugboro, ma Jehova ugboro ugboro nwere mwute wee zọpụta ha. (Ndị Ikpe 2:15-22) N’ime narị afọ ise ahụ Israel nwere ndị eze, Jehova gosiri iguzosi ike n’ihe ya nye mba ahụ.
10 Iguzosi ike n’ihe nke Jehova mere ka o nwee ndidi n’ebe ndị ya nọ, dị ka e kwuru na 2 Ihe Emere 36:15, 16: “Jehova, bụ́ Chineke nke ndị bụ nna ha, wee zigara ha ozi n’aka ndị ozi Ya, na-ebili n’isi ụtụtụ, na-ezikwa; n’ihi na O nwere ọmịiko n’ahụ ndị Ya na n’ebe ebe obibi Ya dị: ha wee na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu Ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma Ya nọ, ruo mgbe ọnụma Jehova lara elu imegide ndị Ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.”
11. Mmesi obi ike ma ọ bụ nkasi obi dị aṅaa ka iguzosi ike n’ihe nke Jehova na-enye anyị?
11 N’ihi na Jehova na-eguzosi ike n’ihe n’ụzọ kasị elu, Pọl onyeozi pụrụ ide, dị ka e dekọrọ ya ná Ndị Rom 8:38, 39, sị: “E mewo ka m kwenye, na ọnwụ, ma ọ bụ ndụ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ịbụisi dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ ihe gaje ịdị, ma ọ bụ ike dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị elu, ma ọ bụ ihe dị omimi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke, agaghị apụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke, nke dị n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” Ee, Jehova na-ekwe anyị nkwa, sị: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) N’ezie, ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na Jehova Chineke na-eguzosi ike n’ihe mgbe nile!
Jisọs Kraịst, Ọkpara Na-eguzosi Ike n’Ihe
12, 13. Akaebe dị aṅaa ka anyị nwere banyere iguzosi ike n’ihe nke Ọkpara Chineke?
12 Onye na-eṅomi Jehova n’ụzọ zuru okè n’imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe bụ Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya mere Pita onyeozi pụrụ ihota Abụ Ọma 16:10 n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma jiri ya mee ihe n’ebe Jisọs Kraịst nọ n’Ọrụ 2:27: “Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Hedis, Ị gaghị enyekwa Onye nke Gị dị ọcha n’obi [“na-eguzosi ike n’ihe,” NW] ka Ọ hụ ire ure.” A kpọrọ Jisọs Kraịst n’ụzọ kwesịrị ekwesị ‘onye na-eguzosi ike n’ihe.’ N’ụzọ nile, ọ na-eguzosi ike n’ihe nye Nna ya na Alaeze nke Chineke kwere ná nkwa. Setan buru ụzọ nwaa imebi ịnọgidesi ike n’ezi ihe Jisọs site n’iji ọnwụnwa dị iche iche, ihe na-adọrọ mmasị onwe onye mee ihe. Ebe ọ dara ada na nke ahụ, Ekwensu weere mkpagbu mee ihe, n’ikpeazụ na-akpata ọnwụ Jisọs n’osisi a na-egbu mmadụ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs dapụrụ n’iguzosi ike n’ihe ya nye Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke.—Matiu 4:1-11.
13 Jisọs Kraịst anọwo na-eguzosi ike n’ihe nye ndị na-eso ụzọ ya ná mmezu nke nkwa ya e dekọrọ na Matiu 28:20: “Lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” Ná mmezu nke nkwa ahụ, ọ nọwo jiri iguzosi ike n’ihe na-edu ọgbakọ ya malite na Pentikọst 33 O.A. ruo ugbu a.
Ụmụ Mmadụ Na-ezughị Okè Ndị Guzosiri Ike n’Ihe
14. Ihe nlereanya dị aṅaa nke iguzosi ike n’ihe ka Job setịpụrụ?
14 Ugbu a, gịni banyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè? Hà pụrụ iguzosi ike n’ihe nye Chineke? Anyị nwere ọnọdụ pụtara ìhè nke Job. Setan mere ka ihe iseokwu ahụ doo anya n’ọnọdụ nke ya. Job ò guzosiri ike n’ihe nye Jehova Chineke, ka ọ na-ejere ya ozi nanị n’ihi ọdịmma onwe onye? Setan turu ọnụ na ya pụrụ ịdọpụ Job n’ebe Jehova nọ site n’inye Job nsogbu. Mgbe ihe onwunwe ya nile, ụmụ ya nile, na ọbụna ahụ ike ya funahụrụ Job, nwunye ya gbara ya ume, sị: “Gbakụta Chineke azụ, nwụọ.” Ma Job guzosiri ike n’ihe, n’ihi na ọ gwara ya, sị: “Dị ka otu n’ime ndị inyom nzuzu si ekwu, otú a ka ị na-ekwu. Ànyị ga-anarakwa ezi ihe n’aka Chineke, ghara ịnara ihe ọjọọ? N’ihe a nile Job ejighị egbugbere ọnụ ya mehie.” (Job 2:9, 10) N’ezie, nye ndị ga-abụrụ ya ndị nkasi obi, Job sịrị: “Ọ bụrụgodị n’ezie na o [Chineke] gbuo m, m ka ga-enwekwarị olileanya n’ebe ọ nọ.” (Job 13:15, New International Version) Ka a sịkwa ihe mere Job ji nweta nnwapụta Jehova! N’ihi ya, Jehova gwara Elifaz, bụ́ onye Timan, sị: “Iwe m dị ọkụ megide gị, megidekwa ndị enyi gị abụọ: n’ihi na unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m, dị ka ohu m, bụ́ Job, kwuworo.”—Job 42:7, 10-16; Jemes 5:11.
15. Akaebe dị aṅaa nke Akwụkwọ Nsọ ka anyị nwere banyere iguzosi ike n’ihe nke ọtụtụ ndị ohu Jehova Chineke?
15 A pụrụ ikwu banyere ndị ikom na ndị inyom nile nwere okwukwe a kọwara ná Ndị Hibru isi nke 11 dị ka ndị guzosiri ike n’ihe. Ọ bụghị nanị na ha kwesịrị ntụkwasị obi kamakwa ha guzosiri ike n’ihe n’ihu nrụgide dị iche iche. N’ihi ya, anyị na-agụ banyere “ndị sitere n’okwukwe . . . kpuchite ọnụ ọdụm, menyụọ ike ọkụ, gbanarị ihu mma agha . . . Ma ndị ọzọ ka a nwara ọnwụnwa nke ihe ọchị na ụtarị, ee, tụkwasị ihe ndị a, nke agbụ na ụlọ mkpọrọ: a tụrụ ha nkume, a kwọwara ha, a nwara ha, e weere ihu mma agha gbuo ha: ha [jiri] akpụkpọ atụrụ na akpụkpọ ewu na-ejegharị; ebe ha nọ ná mkpa, a na-akpagbu ha, a na-emejọ ha.”—Ndị Hibru 11:33-37.
16. Ihe nlereanya dị aṅaa nke iguzosi ike n’ihe ka Pọl onyeozi nyere?
16 Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-enyekwa ihe nlereanya mara mma nke Pọl onyeozi. N’ụzọ ziri ezi ọ pụrụ ịgwa ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka banyere ozi ya, sị: “Unu onwe unu bụ ndịàmà, Chineke bụkwa onyeàmà, otú a hụrụ anyị na anyị bụ ndị dị ọcha n’obi [“na-eguzosi ike n’ihe,” NW] na ndị ezi omume na ndị na-adịghị ịta ụta n’ebe unu nọ, bụ́ ndị kwere ekwe.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:10) Anyị nwekwara ihe ọzọ na-egosi iguzosi ike n’ihe nke Pọl n’okwu ya ndị e dekọrọ ná 2 Ndị Kọrint 6:4, 5, ebe anyị na-agụ, sị: “N’ihe nile anyị na-eme ka mmadụ mara anyị, dị ka ndị na-ejere Chineke ozi, n’ime oké ntachi obi, n’ime mkpagbu, n’ime mkpa, n’ime oké mkpa, n’ime ihe otiti, n’ime ụlọ mkpọrọ, n’ime aghara, n’ime ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ, n’ime ịmụrụ anya, n’ime obubuọnụ.” Ihe ndị a nile na-egosi nkwanye ùgwù onwe onye nke Pọl onyeozi nwere n’ihi na o guzosiri ike n’ihe.
Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe n’Oge A
17. Okwu ndị dị aṅaa nke J. F. Rutherford gosiri mkpebisi ike ya iguzosi ike n’ihe?
17 A bịa n’oge a, anyị nwere ihe nlereanya ọma nke anyị tụlewororị n’okwu mmalite anyị. Rịba ama ihe e kwuru n’akwụkwọ bụ́ Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ, na peji nke 146 n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Iguzosi Ike n’Ihe n’Oge Mkpọrọ.” N’ebe ahụ e kwuru, sị: “N’igosipụta iguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova n’oge ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, onyeisi oche nke Watch Tower Society, bụ́ Joseph F. Rutherford, na December 25, 1918, dere ihe na-esonụ: ‘N’ihi na m jụrụ ikwenyere Babilọn, kama jiri ikwesị ntụkwasị obi gbalịa ijere Onyenwe m ozi, anọ m n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ nke m nwere obi ekele n’ihi ya. . . . M ga-ahọrọ n’ụzọ dị ukwuu nnwapụta na ịmụmụ ọnụ ọchị Ya ma nọrọ n’ụlọ mkpọrọ, kama ikwenyere ma ọ bụ ịnakwere Anụ Ọhịa ahụ ma nwere onwe m, nweekwa otuto nke ụwa dum.’”b
18, 19. Ihe nlereanya ndị dị aṅaa magburu onwe ha nke iguzosi ike n’ihe n’oge a ka anyị nwere?
18 Anyị nwere ihe nlereanya ndị magburu onwe ha nke iguzosi ike n’ihe nke ọtụtụ ndị Kraịst ndị ọzọ tachiworo obi ná mkpagbu. N’ime ndị dị otú ahụ na-eguzosi ike n’ihe bụ Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Germany n’oge ọchịchị Nazi, dị ka e gosiri n’ihe nkiri vidio bụ́ Purple Triangles, nke e kesaworo n’ụzọ sara mbara n’asụsụ Bekee. Ndị kwesịkwara ịrịba ama bụ ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị Africa, dị ka ndị nọ na Malawi. N’ebe ahụ, otu onye nche ụlọ mkpọrọ gbara akaebe banyere iguzosi ike n’ihe nke Ndịàmà, na-asị: “Ha agaghị emebi okwukwe ha ma ọlị. Ha na-aba nnọọ ụba.”
19 Mmadụ apụghị ịgụ Yearbook of Jehovah’s Witnesses ndị dị ọhụrụ n’abụghị onye nwere mmasị n’iguzosi ike n’ihe nke ezi ndị Kraịst gosipụtara, dị ka ndị nọ na Gris, Mozambique, na Poland. Ọtụtụ n’ime ha tara ahụhụ mmekpọ ọnụ na-egbu oké mgbu; e gburu ndị ọzọ. Peji nke 177 nke 1992 Yearbook sepụtara foto nke ndị ikom itoolu bụ́ ndị Kraịst n’Etiopia bụ́ ndị meriri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe ruo n’ọnọdụ nke ịbụ ndị e gburu. Dị ka Ndịàmà Jehova, ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ inwe ọtụtụ ihe nlereanya ọma iji kpasuo anyị imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe?
20. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-eguzosi ike n’ihe?
20 Site n’iji iguzosi ike n’ihe na-eguzogide ọnwụnwa na nrụgide dị iche iche, anyị na-ewulite nkwanye ùgwù onwe onye anyị. Ya mere, mgbe ahụ, n’akụkụ ònye n’ihe iseokwu nke iguzosi ike n’ihe ka anyị chọrọ ka a hụ anyị? Site n’imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe, anyị na-ewere akụkụ Jehova Chineke n’ihe iseokwu ahụ ma nwapụta Setan bụ́ Ekwensu ịbụ akataka onye ụgha ọ bụ! Anyị na-esi otú ahụ enweta nnwapụta nke Onye Mere anyị, bụ́ Jehova Chineke, na nkwụghachi ụgwọ nke ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ. (Abụ Ọma 37:29; 144:15b) Ihe ọzọ a ga-atụle bụ ihe ọ na-ewe iji merie ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible dị mpịakọta abụọ nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị mere iguzosi ike n’ihe ji bụrụ ihe ịma aka?
◻ N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na “iguzosi ike n’ihe” bụ okwu pụrụ nnọọ iche?
◻ Ihe nlereanya ndị dị aṅaa nke Akwụkwọ Nsọ ka anyị nwere banyere ụmụ mmadụ na-ezughi okè guzosiri ike n’ihe?
◻ Ihe nlereanya ọma ndị dị aṅaa nke iguzosi ike n’ihe ka anyị nwere n’oge a?
[Foto dị na peeji nke 11]
Charles Taze Russell
[Foto dị na peeji nke 12]
Jisọs bụ n’ezie ‘onye na-eguzosi ike n’ihe’ nke Jehova
[Foto dị na peeji nke 13]
Job, ọ bụ ezie na o zughị okè, guzosiri n’ike n’ihe nye Chineke
[Foto dị na peeji nke 14]
Pọl setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke iguzosi ike n’ihe nye Jehova