Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 8/15 p. 10-15
  • Iguzosi Ike n’Ihe n’Ọnụ Ahịa Dị Aṅaa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iguzosi Ike n’Ihe n’Ọnụ Ahịa Dị Aṅaa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nlereanya nke Iguzosi Ike n’Ihe
  • Ndị Nna Ochie Gosipụtara Nguzosi Ike n’Ihe
  • Nguzosi Ike nke Ndị Kraịst
  • Iguzosi Ike n’Ihe—Ọ̀ Bụ n’Ọnụ Ahịa Dị Aṅaa?
  • Nguzosi Ike nke Ego Na-agaghị Azụtali
  • Lee Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Imeri Ihe Ịma Aka nke Iguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • “Nanị Gị Na-eguzosi Ike n’Ihe”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ònye Ka I Kwesịrị Iguzosi Ike n’Ihe Nye?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 8/15 p. 10-15

Iguzosi Ike n’Ihe n’Ọnụ Ahịa Dị Aṅaa?

“N’ebe onye na-eguzosi ike n’ihe nọ, ị ga-egosi onwe gị onye na-eguzosi ike n’ihe.”—ABỤ ỌMA 18:25, NW.

1, 2. (a) Gịnị bụ iguzosi ike n’ihe, oleekwa otú akụkụ ya dị iche iche si emetụta ndụ anyị? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mma ichigharikwuru Jehova dị ka Ihe Nlereanya pụtara ìhè anyị nwere?

IKWESỊ ntụkwasị obi, ọrụ dịịrị mmadụ, ịhụnanya, ihe mmadụ na-aghaghị ime, nsọpụrụ. Gịnị ka okwu ndị a nwekọrọ ọnụ? Ha bụ akụkụ dị iche iche nke iguzosi ike n’ihe. Iguzosi ike n’ihe bụ àgwà nsọpụrụ Chineke nke sitere ná nraranye sitere n’ala ala obi. Otu ọ dị, nye ọtụtụ ndị taa, iguzosi ike n’ihe enweghị oké ihe ọ pụtara. Ikwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye mmadụ, mmadụ ịrụ ọrụ dịịrị ya n’ebe ndị meworo okenye n’ezinụlọ dị, nsọpụrụ onye e were n’ọrụ na-enye onye were ya n’ọrụ—ihe ndị a nile bụ ihe a na-elefurukarị anya dị ka ihe ndị na-adịghị oké mkpa. Gịnịkwa na-eme mgbe e nwere ihe abụọ a chọrọ igosi nguzosi ike na ha? N’oge na-adịghị anya gara aga, n’England, mgbe otu onyeọkà ngụzi ego gwara ndị ụlọ ọrụ taks eziokwu banyere ego ole ụlọ ọrụ ya nwere, a chụrụ ya n’ọrụ.

2 Ọ dị mfe nanị ikwu okwu banyere iguzosi ike n’ihe, ma iguzosi ike n’ihe n’ezie bụ nke a na-aghaghị iji ọrụ kwadoo, bụ́ nke na-emetụtaghị iji egwu hapụ ihe e kwenyere na ya. Dị ka ndị mmadụ na-ezughị okè, anyị na-adakarị ada na nke a. Ya mere, ọ dị mma ka anyị tụlee ihe nlereanya nke onye a na-apụghị inwe ihe ịga nke ọma n’ịrụ ụka ma ọ̀ na-eguzosikwa ike n’ihe, bụ́ Jehova Chineke n’onwe ya.

Ihe Nlereanya nke Iguzosi Ike n’Ihe

3. Olee otú Jehova siworo gosipụta na ya guzosiri ike ná nzube ya ahụ e dekọrọ na Jenesis 3:15?

3 Mgbe Adam mehiere, Jehova mere ka nzube ya pụta ìhè nke ịnapụtaghachi ezinụlọ mmadụ ndị a na-amụbeghị amụ. Ihe ndabere maka ihe omume nke a bụ ịhụnanya o nwere n’ebe ihe okike ya bụ mmadụ dị. (Jọn 3:16) Mgbe oge ya ruru, Jisọs Kraịst, bụ́ mkpụrụ nke nkwa ahụ e buru amụma ya na Jenesis 3:15, gosiri onwe ya ịbụ ihe àjà mgbapụta ahụ, ọ gaara abụwokwarị ihe a na-apụghị icheta n’echiche bụ́ Jehova ịla azụ n’imezu nzube ahụ o kwupụtaworo ekwupụta. N’ịnara àjà Jisọs, a gaghị agbaba okwukwe anyị aka.—Ndị Rom 9:33.

4. Olee ụzọ Jehova si gosipụta na ya na-eguzosi ike n’ebe Jisọs nọ, gịnịkwa si na ya pụta?

4 Àgwà iguzosi ike n’ihe nke Jehova gosiri n’ebe Jisọs nọ gbara Ọkpara ahụ ume n’ụzọ dị ukwuu mgbe ọ nọ n’elu ala. Jisọs maara na ya aghaghị iche ọnwụ ihu, o kpebisikwara ike iguzosi ike n’ebe Chineke ya nọ ruo ọgwụgwụ. E kpugheere ya ihe ọmụma ka ukwuu banyere ọdịdị ọ dịrị tupu ọ ghọọ mmadụ n’oge baptism ya na otite e ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ. N’anyasị ahụ a raara ya nye, o kpere ekpere ka a kpọghachiri ya Nna ya nke eluigwe, ka o nwetaghachi ‘ebube ahụ nke o nwere n’akụkụ Jehova mgbe ụwa akadịghị.’ (Jọn 17:5) Olee ụzọ nke a gaje isi kwe omume? Ọ bụ nanị site na Jehova ịghara ịhapụ Ọkpara ya nke na-eguzosi ike n’ihe n’ime ili ka o wee ghara ịhụ ire ure. Jehova si n’ọnwụ kpọlite ya gaa n’anwụghị anwụ, wee si otú a jiri nguzosi ike na-emezu nkwa amụma ahụ dị n’Abụ Ọma 16:10: “Ị gaghị ahapụrụ [Sheol, NW] mkpụrụ obi m.”—Ọrụ 2:24-31; 13:35; Mkpughe 1:18.

5. Ihe omume ndị ọzọ dị anaa ndị na-egosi iguzosi ike n’ihe metụtara nkwa ndị Jehova kwere Jisọs?

5 Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, Jisọs makwaara na ya pụrụ ịdabere n’okwu Jehova nke ‘idebe ndị iro ya dị ka ihe mgbakwasị dịịrị ụkwụ ya.’ (Abụ Ọma 110:1) Oge ahụ ruru na 1914, n’ọgwụgwụ nke ‘oge a kara aka nke ndị mba ọzọ,’ mgbe e guzobere Alaeze ahụ n’eluigwe. Mmeri ahụ e kwere ná nkwa na Jisọs ga-emeri ndị iro ya malitere ná nchụpụ ọ chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe. Ọ ga-abịarụ ọgwụgwụ ya mgbe a tụbara ha n’abyss ruo otu puku afọ, mgbe e bibiwokwara “ndị eze ụwa, na usuu nile nke ndị agha ha.”—Luk 21:24; Mkpughe 12: 7-12; 19:19; 20:1-3.

6. Olileanya dị anaa e ji n’aka ka Chineke setịpụụrụ anyị, oleekwa otú anyị ga-esi gosi ekele anyị maka ya?

6 Onye ọbụ abụ ahụ gbara ume, sị: “Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ ya, ọ ga-ebulikwa gị inweta ala.” (Abụ Ọma 37:34) Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-anọgide na-edebe okwu ya, na ọ ga-echebekwa ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ́ ndị ‘na-edebe ụzọ ya,’ gabiga ọgwụgwụ nke ụwa mmebi iwu nke a. Ahịrị okwu ahụ n’asụsụ Hibru mbụ na-enye echiche nke ma ịdị uchu ma iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi. Ya mere, ugbu a abụghị oge ịda mbà ma ọ bụ ịhapụ ihe ùgwù ije ozi ndị e nyere anyị. Ugbu a bụ oge ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’iji nguzosi ike na-ejere Chineke anyị na Alaeze ya ozi. (Aịsaịa 35:3, 4) E nwere ezi ihe nlereanya ndị ga-agba anyị ume. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

Ndị Nna Ochie Gosipụtara Nguzosi Ike n’Ihe

7, 8. (a) Ọrụ dị aṅaa ka Jehova kenyere Noa na ezinụlọ ya? (b) Olee ụzọ ezinụlọ Noa si gosi na ha kwesịrị ka a zọpụta ha n’oge iju mmiri ahụ zụrụ ụwa ọnụ?

7 Mgbe Jehova zubere iji iju mmiri bibie òtù ụmụ mmadụ ndị na-emebi iwu, o sooro nna ochie ahụ bụ onyeisi ezinụlọ, bụ́ Noa banye n’ọgbụgba ndụ maka ichebe ezinụlọ ya nakwa iji mee ka ndụ dịgide n’elu ala nke a. (Jenesis 6:18) Noa nwere ekele maka olileanya nke nchebe Chineke, ma ya na ezinụlọ ya aghaghị igosipụta na ha ruru eru inweta ya. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Site n’ime ihe Jehova nyere n’iwu. Ihe mbụ chere ha ihu bụ oké ọrụ nke iwu ụgbọ ahụ. Mgbe e wuzuru ya, Noa gaje iji ndị nnọchianya nke ụdị anụmanụ dị iche iche mejupụta ya, tinyekwara nri ga-ezu iji lekọta ha ruo ogologo oge. Ma nke ahụ agwụchabeghị. N’ogologo oge nkwadebe ahụ, Noa nọ na-eme ihe nile o nwere ike ime n’ọrụ nkwusa ozi ọma a na-arụtụbeghị ụdị ya mbụ, na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ikpe Chineke nke na-abịanụ.—Jenesis, isi 6 na 7; 2 Pita 2:5.

8 Bible na-agwa anyị na “Noa wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.” (Jenesis 6:22; 7:5) Noa na ezinụlọ ya gosiri onwe ha ndị na-eguzosi ike n’ihe n’ịrụzu ọrụ ha. Mmụọ ha nke iji onwe onye chụọ àjà pụtara na e jiri oge ha mee ihe n’ụzọ bara uru, ma ọrụ ahụ siri ike, ikwusa ozi ọma ahụ bụkwa ihe na-adịghị mfe. Site n’ịghara ịmụ ụmụ tupu Iju mmiri ahụ, e nyeere ụmụ Noa na ndị nwunye ha aka ịtụkwasị uche ha n’ọrụ ahụ ha ji n’aka, ijikwa mee ka ọrụ ha na-agakọ nke ọma. Oké Iju Mmiri ahụ wetara ọgwụgwụ ziri ezi nye ụwa nke na-emebi iwu. Ọ bụ nanị Noa, nwunye ya, ụmụ ha ndị ikom atọ, na ndị nwunye ụmụ ha atọ lanarịrị. Anyị kwesịrị inwe obi ụtọ na ha nọgidere ná nguzosi ike n’ebe Chineke na nduzi ya nile dị, ebe ọ bụ na onye ọ bụla n’ime anyị sitere kpọmkwem n’usoro ọmụmụ Noa site ma ọ bụ na Shem, Ham, ma ọ bụ Jefet.—Jenesis 5:32; 1 Pita 3:20.

9. (a) Olee ụzọ ule ahụ Jehova lere Abraham si bụrụ ule nke nguzosi ike ya? (b) Olee ụzọ Aịsak si gosipụta nguzosi ike na nke a?

9 Mgbe Abraham kwadebere iji Aịsak chụọ àjà, ihe ọ na-eme bụ iji ikwesị ntụkwasị obi na-erube isi n’ihe Jehova nyere n’iwu. Lee nnọọ ule iguzosi ike n’ihe nke ahụ bụụrụ ya! Ma, Jehova ghochiri Abraham, na-asị: “Ugbu a ka m maara na onye na-atụ egwu Chineke ka ị bụ, n’ihi na i gbochighị nwa gi nwoke, nke i nwere nanị ya, iwere ya nye m.” Ma, anyị ga-eme nke ọma ịtụgharị uche n’ihe ndị mere tupu mgbe ahụ. N’ime ụbọchị atọ ahụ o were iji jeruo Ugwu Moraịa, o doro anya na Abraham nwere ohere zuru ezu iji tụgharịa ihe nile n’uche ya ma gbanwee uche ya. Gịnị banyere Aịsak, bụ́ onye butere nkụ a ga-eji chụọ àjà, gbachikwa nkịtị ka e kee ya agbụ aka na ụkwụ? Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ dagharịrị ná nsọpụrụ o nwere nye nna ya bụ Abraham, ọ jụghịkwa ajụjụ ọ bụla banyere ihe ya onwe ya gaje ime, ọ bụ ezie na o yiri ka ezi nguzosi ike ya ọ gaje iwere ndụ ya.—Jenesis 22: 1-18; Ndị Hibru 11:17.

Nguzosi Ike nke Ndị Kraịst

10, 11. Ihe nlereanya dịgasi anaa nke iguzosi ike n’ihe ka ndị Kraịst mbụ na-esetipụ?

10 Jehova ejiwo ezi nguzosi ike na-eme ihe mgbe nile. Pọl onyeozi gbara ume, sị, “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke.” (Ndị Efesọs 5:1, 2) A chọrọ ka ndị Kraịst meghachi omume otú ahụ ndị nna ochie ahụ si meghachi omume. Ndị Kraịst mbụ setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’iji nguzosi ike na-efe ofufe, dị ka ahụmahụ na-esonụ na-egosi.

11 O yiri ka eze Rom bụ Constantius nke Mbụ, bụ́ nna nke Eze Constantine, ò nwere nsọpụrụ dị omimi maka ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. Iji lee nguzosi ike nke ndị Kraịst na-arụ ọrụ n’obíeze ya ule, ọ gwara ha na ha ga-anọgide na-arụrụ ya ọrụ nanị ma ha kwere ịchụ àjà nye arụsị. A gwara ha na ọ bụrụ na ha ajụ, na a ga-achụ ha n’ọrụ, ọ ga-egosikwa ha iwe ya. Site n’atụmatụ nke a dị mfe, Constantius chọrọ ịchọpụta ndị ọ na-adịghị ihe ga-eme ka ha mebie nguzosi ike ha. Ndị ahụ gosipụtara nguzosi ike nye Chineke na ụkpụrụ ya nile ka e mere ka ha nọgide na-arụrụ eze ahụ ọrụ, ọbụna na ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi. Ndị ahụ na-anọgideghị n’iguzosi ike nye Chineke ka a chụrụ n’ọrụ n’ụzọ mweda n’ala.

12. Olee otú ndị nlekọta bụ ndị Kraist ga-esi gosipụta nguzosi ike, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa maka ọdimma ọgbakọ?

12 Ọ bụ ezie na iguzosi ike n’ihe aghaghị ịbụ ihe dị ná ndụ nke ndị Kraịst nile, e hotara ya kpọmkwem na Taịtọs 1:8 [NW] ná ndepụta nke àgwà ndị dị mkpa ka nwoke wee ruo eruo ịbụ onye nlekọta n’etiti ndị Kraịst. William Barclay kwuru na ho’si-os, bụ́ okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “iguzosi ike n’ihe,” na-akọwa “nwoke nke na-erube isi n’iwu ebighị ebi ndị ahụ e guzobere tupu e nwee iwu ọ bụla mmadụ mere.” Ọ dị mkpa ka ndị okenye were ọnọdụ dị otú ahụ nke na-egosi nguzosi ike n’ihe banyere irubere iwu Chineke isi. Ezi ihe nlereanya nke a ga-enyere ọgbakọ aka ito eto, siekwa ike ruo n’okè nke imeri ọnwụnwa na ihe nrụgide nile pụrụ iche ya ihu dị ka otu òtù ma ọ bụkwanụ nke pụrụ iche ndị nọ n’ime ya ihu n’otu n’otu. (1 Pita 5:3) Ndị okenye a họpụtara ahọpụta nwere ibu ọrụ dị ukwuu n’ebe ìgwè atụrụ ahụ dị nke na ha ekwesịghị imebi nguzosi ike ha nye Jehova mgbe ọ bụla, n’ihi na a dụrụ ọgbakọ ọdụ ka ha ‘na-eṅomi okwukwe ha.’—Ndị Hibru 13:7.

Iguzosi Ike n’Ihe—Ọ̀ Bụ n’Ọnụ Ahịa Dị Aṅaa?

13. Gịnị ka okwu ahụ pụtara nke bụ “Mmadụ nile nwechara ọnụ ahịa e ji azụta ha,” oleekwa ihe nlereanya ndị yiri ka hà na-akwado nke a?

13 “Mmadụ nile nwechara ọnụ ahịa e ji azụta ha” bụ okwu nke a sịrị na ọ bụ Sir Robert Walpole kwuru, onye bụ onye praịm minista Britain n’ime narị afọ nke iri na asatọ. Ọ chịkọtara eziokwu ahụ nke ọma nke bụ na n’ime akụkọ ihe mere eme nile, ụmụ mmadụ anọgidewo na-agbanwegharị ihe ha guzosiri ike na ya iji nweta uru onwe onye. Tụlee ihe banyere onye nsụgharị Bible bụ William Tyndale, onye na-elezighị anya wee nakwere Henry Phillips dị ka enyi nke na-eguzosi ike n’ihe. Na 1535 Phillips jiri eguzosighị ike rara Tyndale nye n’aka ndị iro ya, na-eduje n’ọtụtụ a tụrụ Tyndale mkpọrọ ozugbo ahụ na nnwụchu ọnwụ ya. Otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na Phillips, ma eleghị anya n’ịbụ onye nnọchianya nke eze England ma ọ bụ ndị Katọlik bụ ndị England, “natara ụgwọ dị mma maka ọrụ Judas ahụ ọ rụrụ.” O doro anya na ọkọ akụkọ ihe mere eme ahụ na-ezo aka n’ebe Judas Iskariọt nọ, bụ́ onye naara iri ego ọla ọcha atọ dị ka ụgwọ ọrụ nke ịrara Jisọs Kraịst nye n’aka ndị iro. Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ikpebi site n’ihe atụ ndị a na “ụgwọ” a na-akwụ maka mmadụ iguzosi ike n’ihe na-abụ ego mgbe nile. Ọ bụghị otú ahụ.

14. Olee ụzọ e si tinye nguzosi ike Josef n’ebe Jehova nọ n’ụle, gịnị sikwa na ya pụta?

14 Mgbe nwunye Pọtịfa rịọrọ Josef ka ‘ha abụọ dinaa,’ e tinyere nguzosi ike ya nye Jehova n’ule. Gịnị ka ọ ga-eme? Site n’inwe uche nke ụkpụrụ ndị ihe ahụ metụtara doworo anya, Josef gbapụrụ n’ụlọ ahụ, na-ekpebisi ike na ya enweghị ike “[ime] oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke.” Olileanya nke ihe ụtọ nke mmekọahụ enweghị ike imeri nguzosi ike Josef nye Chineke ya, bụ́ Jehova.—Jenesis 39:7-9.

15. Olee ụzọ Absalọm si gosipụta egụzosighị ike, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?

15 Ma, e nwekwara ihe ize ndụ ndị ọzọ; inwe oké ọchịchọ pụrụ imerụ nguzosi ike n’ihe. Nke ahụ bụ ihe mkpali nke kpaliri nnupụisi Absalọm megide nna ya, bụ́ Eze Devid. Site n’ime atụmatụ ọjọọ na aghụghọ, Absalọm gbalịrị ịzụrụ ihu ọma n’ebe ọha ndị obodo nọ. O mesịrị wulite usuu ndị agha ya ibuso ndị guzosiri ike n’ịkwado nna ya agha. Ọnwụ ya n’aka Joab wetara eguzosighị ike nke Absalọm n’ebe nna ya nọ ná njedebe, ma lee nnọọ oké ọnụ ahịa nke a bụ ịkwụ maka ịnwa ịkwatu ndokwa ọchịchị Chineke!—2 Samuel 15:1-12; 18:6-17.

Nguzosi Ike nke Ego Na-agaghị Azụtali

16. Gịnị ka 2 Ndị Kọrint 11:3 na-ekpughe banyere nzube nile nke Setan?

16 Ọ bụ eziokwu na Setan na-azọrọ na onye ọ bụla nwere ọnụ ahịa a pụrụ iji zụta ya, nke a bụkwa eziokwu n’ihe banyere Absalọm, ọ bụghị eziokwu n’ihe banyere Josef, ọ bụbeghịkwa eziokwu n’ihe banyere ndị guzosiri ike n’ife Jehova ofufe. N’agbanyeghị nke a, Setan ga-ekwe anyị nkwa ihe ọ bụla iji mee ka anyị mebie nguzosi ike anyị nye Onye Okike anyị. Pọl onyeozi kwupụtara egwu ya “ma o nwere ụzọ . . . dị ka agwọ ahụ weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv,” a pụrụ imerụ echiche anyị, na-eduje anyị n’imebi nguzosi ike anyị na ofufe anyị na-efe Jehova.—2 Ndị Kọrint 11:3.

17. Gịnị ka ụfpdụ ndị jiworo ihe ùgwù ije ozi ndị ọnụ ahịa ọ bụla na-apụghị ịzụta gbanwere?

17 O kwesịrị ekwesị ka anyị jụọ onwe anyị, sị: ‘Ọ̀ dị ọnụ ahịa ọ bụla m ga-anara iji gbanwere ihe ùgwù m nke iji nguzosi ike na-efe Onye Okike m ofufe?’ Ọ bụ eziokwu dị mwute na, n’adịghị ka Josef, ụfọdụ ndị bụbu ndị ohu Jehova raara onwe ha nye naara nnọọ ọnụ ahịa dị nta iji gbanwere nke a. Ọbụna ụfọdụ ndị okenye ọgbakọ ejiriwo ihe ùgwù ha ndị a na-apụghị ịzụta n’ọnụ ahịa ọ bụla gbanwere mkpori ndụ nke ihe ụtọ rụrụ arụ nke na-adị nwa oge. Ma hà bụ ndị okenye ọgbakọ ma ọ bụ na ha abụghị, ọtụtụ n’ime ndị na-eme ihe dị otú a atụfuwo n’ebe ha na-apụghị inwetaghachi ya, ịdị n’otu nke ezinụlọ, ịhụnanya na nsọpụrụ nke ọgbakọ, na nkwado nke Jehova—bụ́ kpọmkwem Onye ahụ nke pụrụ inye ike a ga-eji nọgide n’iguzosi ike nakwa iji guzogide ọnwụnwa ọ bụla sitere n’aka Setan.—Aịsaịa 12:2; Ndị Filipaị 4:13.

18. N’ihi gịni ka o ji dị mkpa irube isi na ndụmọdụ ahụ dị na 1 Timoti 6:9, 10?

18 Ndị ọzọ, n’iji oké ọchịchọ na-agbalị inwe ihe ịga nke ọma ná nchụso dị iche iche nke ụwa, ‘ewerewo ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha’ n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị nile doro anya nke Bible. (1 Timoti 6:9, 10) Ruo nwa mgbe ma ọ̀ bụkwanụ n’ụzọ na-adịgide adịgide, ihe funarịrị Demas, bụ́ onye Kraịst nke Pọl kpọtụrụ aha, n’ihi nke a. (2 Timoti 4:10) A pụghị imebi nguzosi ike nye Jehova n’enweghị oké ihe ọjọọ si na ya pụta. “Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.”—Ndị Galetia 6:7.

19, 20. (a) Gịnị bụ ihe ize ndụ ụfọdụ e jikọtara ha na ilebiga telivishọn ókè? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka otu ezinụlọ Ndịàmà setịpụworo?

19 Mgbe ụfọdụ, ihe a chọrọ ka i jiri gbanwere ihe na-abịa n’ụzọ aghụghọ. Dị ka ihe atụ, akụkọ e si United States nweta na-ekwu na ọtụtụ ezinụlọ na-etinye ihe dị ka ọkara nke oge ha mụ anya n’ikiri telivishọn, nke a na-erikwa ụmụntakịrị ahụ karị. Ọ bụrụ na onye Kraịst ejiri telivishọn mere ihe bụ isi o ji azụ uche ya, ya na mmekọahụ na ime ihe ike a na-egosi na ya, n’oge na-adịghị anya, ụkpụrụ ndị Kraịst ya pụrụ ịda mbà. Ọ pụrụ ịdị mfe nke ahụ iduje na ya ịbụ onye na-eguzosikwaghị ike, onye e kewapụrụ n’ebe Jehova nọ. Mkpakọrịta ọjọọ dị otú ahụ na-emebi omume ọma. (1 Ndị Kọrint 15:33) Anyị ekwesịghị ichefu na Akwụkwọ nsọ na-adụ anyị ọdụ ka anyị wepụta oge iji mụọ Okwu Jehova ma tụgharịa uche na ya. Oge gabigara ókè nke a na-etinye n’ịtụsara ahụ n’ihu telivishọn ọ̀ bụ ihe kwesịrị ekwesị iji gbanwere oge a gaara eji mee ihe n’inweta ihe ọmụma nke ga-eduje ná ndụ ebighị ebi dị ka onye guzosiri ike n’ife Jehova ofufe? Ọdịwo mkpa ka ọtụtụ ndị na-abịa inweta ihe ọmụma nke eziokwu ahụ n’oge a mee oké mgbanwe dị iche iche n’echiche ha n’ihe banyere nke a.—1 Timoti 4:15, 16; 2 Timoti 2:15.

20 Takashi bụ onye Japan na-achụ ntá ego nke bi n’England. N’oge gara aga, ọ na-etinye ihe dị ka hour atọ ma ọ bụ anọ n’anyasị ọ bụla iso ezinụlọ ya kirie telivishọn. Mgbe ya na nwunye ya mesịrị baptism n’afọ atọ gara aga, o kpebiri na ọmụmụ Bible onwe onye na nke ezinụlọ aghaghị iwere ọnọdụ mbụ. Site n’ibelata oge ọ na-eji ekiri telivishọn gaa n’ihe dị ka 15 ma ọ bụ 30 minit kwa ụbọchị ná nkezi, o setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ezinụlọ ya. Ọ bụ ezie na Takashi aghaghị iji Bible abụọ na-eme ihe mgbe ọ na-amụ ihe, otu n’asụsụ Bekee, nke ọzọ n’asụsụ Japanese, ito uto ime mmụọ ya abịawo ọsọ ọsọ, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka ohu na-eje ozi n’otu ọgbakọ nke na-eji asụsụ Bekee eme ihe. Nwunye ya bụ onye ọsụ ụzọ inyeaka. Ọ sịrị, “Iji chebe ọnọdụ ime mmụọ nke ụmụntakịrị anyị abụọ, kwa ụbọchị, ana m eji nlezianya na-enyocha ihe ndị mụ na nwunye m na-ekwere ka ha na-ekiri na telivishọn.” Ịnapụ onwe onye ihe n’ụzọ dị otú ahụ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ.

21. Gịnị ka anyị maara banyere ụzọ aghụghọ nile nke Setan, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi chebe onwe anyị?

21 Anyị pụrụ ijide nke a n’aka: Setan maara adịghị ike nile anyị, ma eleghị anya karịa otú anyị maara ha n’onwe anyị. Ọ gaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie ya ná mgbalị ọ na-eme ime ka anyị mebie nsọpụrụ anyị na-enye Jehova. (Tụlee Matiu 4:8, 9.) Ya mere, olee ụzọ anyị pụrụ isi chebe onwe anyị? Ọ bụ site n’iburu nrara anyị raara onwe anyị nye n’uche mgbe nile, sitekwa n’inwe mmasị n’iwulite nkà dị iche iche ka anyị nọ na-eje ozi maka ọdịmma ime mmụọ nke ndị ọzọ. Dị ka ndị ohu Jehova ndị na-eguzosi ike, anyị aghaghị ịnọgide n’ije ozi ya, bụrụkwa ndị Okwu ya dị nsọ na-eduzi n’oge nile. Nke a ga-enyere anyị aka ná mkpebi siri ike anyị mere nke bụ na ọ dịghị ihe ọ bụla Setan kwere anyị ná nkwa nke ga-adọpụ uche anyị site ná nguzosi ike anyị n’ebe Chineke nọ.—Abụ Ọma 119:14-16.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Olee ụzọ Jehova na Jisọs siworo gosipụta iguzosi ike n’ihe?

◻ Ihe nlereanya ndị ọzọ dị aṅaa ka e nwere na Bible banyere iguzosi ike n’ihe?

◻ Gịnị ka Setan pụrụ iche anyị n’ihu ma ọ bụ nwaa ime?

◻ Olee ụzọ anyi pụrụ isi wusie onwe anyị ike iji nọgide n’iguzosi ike n’ofufe anyị na-efe Jehova?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya