Isi 6
Nwa nke Nkwa ahụ
KAMA ịlaghachi Nazaret, Josef na Meri nọgidere na Betlehem. Mgbe Jisọs rukwara abalị asatọ, ha biri ya úgwù dị ka Iwu Chineke nyere Mosis si kwuo. O yikwara ka ọ bụ omenala ịgụ nwata nwoke aha mgbe o ruru ụbọchị asatọ. N’ihi ya, ha gụrụ nwa ha Jisọs dị ka mmụọ ozi Gebriel buworo ụzọ gwa ha.
Ihe karịrị otu ọnwa agafewo, Jisọs eruwokwa 40 ụbọchị. Olee ebe ndị mụrụ ya kuuru ya na-eje ugbu a? N’ụlọ nsọ dị na Jerusalem nke dị nanị maịlụ ole na ole site n’ebe ha nọ. Dị ka Iwu Chineke nyere Mosis si kwuo, mgbe 40 ụbọchị nke ọmụmụ nwa nwoke ọhụrụ gasịrị, nne ya ga-eweta onyinye e ji eme ka ọ dị ọcha n’ụlọ nsọ ahụ.
Nke a bụ ihe Meri na-eme. O wetara ụmụ nnụnụ abụọ dị ka onyinye ya. Nke a na-egosipụta otú Josef na Meri nwedebere n’ego. Iwu Mosis gosiri na a ga-enye nwa ebulu, nke dị nnọọ oké ọnụ ahịa karịa nnụnụ. Ma ọ bụrụ na nne ahụ apụghị iweta nke a, nduru abụọ ma ọ bụ kpalakwukwu abụọ pụrụ izu ezu iji mee ihe.
N’ime ụlọ nsọ ahụ, otu agadi nwoke kuuru Jisọs n’aka ya. Aha ya bụ Simeọn. Chineke ekpugheworo ya na ọ gaghị anwụ tupu ọ hụ Kraịst ma ọ bụ Mesaịa ahụ Jehova kwere ná nkwa. Mgbe Simeọn batara n’ụlọ nsọ n’ụbọchị a, mmụọ nsọ duziri ya gaa n’ebe nwata ahụ nke Josef na Meri ku bịa nọ.
Ka Simeọn kuuru Jisọs, o kelere Chineke, na-asị: “Onyenwe m, ugbu a ka ị na-ahapụ ohu gị ka ọ laa n’udo, dị ka okwu gị si dị; n’ihi na anya m ahụwo nzọpụta gị, nke i doziri n’ihu ndị nile; ìhè a ga-ekpughere mba nile ọzọ, na ebube ndị gị, bụ́ Israel.”
O juru Josef na Meri anya mgbe ha nụrụ nke a. Simeọn wee gọzie ha ma gwa Meri banyere nwa ya nwoke na “e dowo nwa nke a ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nke ọtụtụ mmadụ n’Israel” na iru újú dị ka mma dị nkọ ga-adụpukwa mkpụrụ obi ya.
Onye ọzọ nọkwa mgbe ihe ndị a nile na-eme bụ onye amụma nwanyị ahụ dị 84 afọ, bụ́ Anna. N’ezie, ọ dịghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ ahụ. N’oge hour ahụ, ọ bịara nso, malitekwa inye Chineke ekele, na-ekwukwa banyere Jisọs gwa onye ọ bụla ga-ege ntị.
Lee nnọọ otú ihe ndị a mere n’ụlọ nsọ ahụ si mee ka Josef na Meri ṅụrịa ọṅụ! N’ezie ihe ndị a nile mere ka ha jiri n’aka na nwa ahụ bụ n’ezie Onye Chineke E Kwere ná Nkwa. Luk 2:21-38; Levitikọs 12:1-8.
▪ Olee mgbe o yiri ka o ziri ezi dị ka omenala si dị ịgụ nwata nwoke aha n’Israel?
▪ Gịnị ka a chọrọ n’aka onye Israel bụ nne mgbe nwa ya dị 40 ụbọchị, oleekwa ụzọ mmezu nke a si gosipụta otú Meri nwedebere n’ego?
▪ Olee ndị matara onye Jisọs bụ n’ọnọdụ nke a, oleekwa otú ha si gosipụta nke a?