Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 6 p. 20-p. 21 para. 8
  • Nwa ahụ E Kwere ná Nkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwa ahụ E Kwere ná Nkwa
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwa nke Nkwa ahụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ọ Nọ Na-eche ‘Ihe Ihe Ndị ahụ Pụtara’
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • O Chere ‘Ihe Ihe Ndị Ahụ Pụtara’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 6 p. 20-p. 21 para. 8
Ebe Simiọn ku Jizọs, Josef, Meri, na Ana onye amụma nwaanyị ana-ele ya

ISI NKE 6

Nwa ahụ E Kwere ná Nkwa

LUK 2:21-39

  • E BIRI JIZỌS ÚGWÙ, MECHAA KURU YA BỊA N’ỤLỌ NSỌ

Josef na Meri alaghachighị Nazaret ozugbo, ha nọtụrụ na Betlehem. Mgbe Jizọs nọrọ abalị asatọ, ha biri ya úgwù otú e kwuru n’Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel. (Levitikọs 12:2, 3) Ọ bụkwa omenala na a ga-agụ nwa nwoke aha n’ụbọchị ahụ e biri ya úgwù. Ha gụrụ nwa ha Jizọs otú mmụọ ozi Gebriel gwara ha.

Ihe karịrị otu ọnwa agaala. Jizọs dịzi ụbọchị iri anọ ugbu a. Ebee ka ndị mụrụ ya ku ya na-aga ugbu a? Ha ku ya na-aga n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, nke na-adịchaghị anya n’ebe ha bi. Iwu ahụ e nyere ụmụ Izrel kwuru na mgbe ụbọchị iri anọ a mụrụ nwa nwoke gachara, nne ya ga-eweta ihe a ga-eji chụọ àjà e ji eme ka mmadụ dị ọcha n’ụlọ nsọ.—Levitikọs 12:4-8.

Meri mere otú a. O wetara ụmụ nnụnụ abụọ. Ụmụ nnụnụ abụọ a o wetara gosiri na ya na Josef abaghị ọgaranya. Ihe Iwu ahụ kwuru gosiri na ihe e kwesịrị iweta bụ nwa ebule na nnụnụ. Ma, ọ bụrụ na aka nne ahụ erughị iweta otu ebule, o nweziri ike iweta nduru abụọ ma ọ bụ kpalakwukwu abụọ. Meri wetara nduru abụọ na kpalakwukwu abụọ n’ihi na ọ bụ ihe aka ya ruru.

“O RURU ỤBỌCHỊ A GA-EME KA HA DỊ ỌCHA”

Mgbe Josef na Meri ku Jizọs na-abanye n’ụlọ nsọ ka ha chụọ àjà a ga-eji mee ka ha dị ọcha

Ọ na-abụ ụmụ nwaanyị Izrel mụọ nwa, a na-ewere ha ka ndị na-adịghị ọcha ruo oge ụfọdụ. Mgbe ọ nọzuru oge ahụ, a na-achụ àjà nsure ọkụ iji mee ka ọ dị ọcha. Ihe a na-echetara ha na e nweela onye na-ezughị okè, bụ́kwa onye mmehie, si n’ahụ́ ha pụta. Ma, nwa ọhụrụ a bụ́ Jizọs zuru okè ma dịkwa nsọ. (Luk 1:35) N’agbanyeghị nke ahụ, Josef na Meri “kuuru ya” gaa n’ụlọ nsọ iji ‘mee ka ha dị ọcha’ otú e kwuru n’Iwu.—Luk 2:22.

Mgbe Josef na Meri rutere n’ụlọ nsọ ahụ, otu agadi nwoke bịakwutere ha. Aha ya bụ Simiọn. Chineke ekpugheerela Simiọn na tupu ya anwụọ, ọ ga-ahụ Kraịst, ma ọ bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. N’ụbọchị a Josef na Meri gara n’ụlọ nsọ, mmụọ nsọ mere ka Simiọn gaa n’ụlọ nsọ, bụ́ ebe ọ hụrụ Josef na Meri na nwa ọhụrụ ha. Simiọn kuuru nwa ahụ n’aka.

Mgbe o ku Jizọs, o kelere Chineke, sị: “Ugbu a, Ọkaakaa Onyenwe anyị, ị ga-ahapụ ohu gị ka ọ nwụọ n’udo dị ka i kwuru; n’ihi na anya m ahụwo onye ị ga-esi n’aka ya weta nzọpụta, bụ́ onye i wepụtara n’ihu mba niile. Onye a bụ ìhè nke ga-ewepụ ihe kpuchiri anya mba niile nakwa ebube nke ndị gị bụ́ Izrel.”—Luk 2:29-32.

Ọ tụrụ Josef na Meri n’anya mgbe ha nụrụ ihe a Simiọn kwuru. Simiọn gọzikwara ha ma gwa Meri na ‘e debere nwa ya a ka ọ bụrụ onye ga-akpata ọdịda na mbili nke ọtụtụ ndị n’Izrel.’ O kwukwara na Meri ga-enwe ezigbo mwute ga-adị ka è ji mma agha manye ya n’obi.—Luk 2:34.

E nwere onye ọzọ nọ n’ụlọ nsọ n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ Ana, onye amụma nwaanyị dị afọ iri asatọ na anọ. Ọ naghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ. N’otu oge ahụkwa, ọ bịakwutere Josef na Meri na nwa ọhụrụ ha bụ́ Jizọs. Ana bidoro ikele Chineke, na-agwakwa ndị niile nọ ebe ahụ banyere Jizọs.

Cheedị ụdị obi ụtọ Josef na Meri nwere ka ha na-ahụ ihe a na-eme n’ụlọ nsọ. N’eziokwu, ihe a niile mere ka o dokwuo ha anya na nwa ha a bụ Onye ahụ Chineke Kwere ná Nkwa.

  • N’oge ụmụ Izrel, olee mgbe a na-agụ nwa nwoke a mụrụ ọhụrụ aha?

  • Olee ihe a na-achọ ka nwaanyị mụrụ nwa nwoke mee ma nwa ya ruo abalị iri anọ. Gịnịkwa ka ihe Meri na Josef wetara na-egosi gbasara otú aka ha hà?

  • Mgbe Meri na Josef kuuru Jizọs rute n’ụlọ nsọ, olee ndị matara onye Jizọs bụ? Oleekwa otú ha si gosi na ha matara ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya