Isi 7
Jisọs na Ndị Na-agụ Kpakpando
NDỊ ikom ole na ole si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ bịa. Ha bụ ndị na-agụ kpakpando—ndị na-asị na ha pụrụ ịkọwa ọnọdụ kpakpando. Mgbe ha nọ n’ụlọ ha n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ, ha hụrụ otu kpakpando ọhụrụ, ha esorowokwa ya ọtụtụ narị maịlụ ruo Jerusalem.
Mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando rutere Jerusalem, ha jụrụ, sị: “Olee ebe ọ nọ, bụ́ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? N’ihi na anyị hụrụ kpakpando ya n’Ọwụwa Anyanwụ, anyị wee bịa ịkpọ isiala nye ya.”
Mgbe Eze Herọd onye nọ na Jerusalem nụrụ banyere nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu. Ya mere, ọ kpọrọ ndị isi nchụàjà ma jụọ ha ebe a ga-amụ Kraịst ahụ. N’ịdabere n’Akwụkwọ nsọ wee na-enye azịza ha, ha zara, sị: “Na Betlehem.” Ya mere Herọd sịrị ka a kpọtara ya ndị ahụ na-agụ kpakpando, o wee gwa ha, sị: “Gaanụ chọpụta nke ọma okwu banyere nwatakịrị ahụ; ma mgbe ọ bụla unu ga-achọta ya, bịa kọọrọ m, ka mụ onwem wee jeekwa kpọọ isiala nye ya.” Ma n’ezie, Herọd na-ezube ịchọta nwa ahụ ka o wee gbuo ya.
Mgbe ha pụrụ, otu ihe dị ịtụnanya mere. Kpakpando ahụ nke ha hụrụ mgbe ha nọ n’ebe Ọwụwa Anyanwụ malitere ịga n’ihu ha. O doro anya na nke a abụghị kpakpando nkịtị, kama ọ bụ nke e wepụtara ná nzube pụrụ iche nke iduzi ha. Ndị ahụ na-agụ kpakpando nọgidere na-eso ya ruo mgbe ọ kwụsịrị kpọmkwem n’elu ụlọ ebe Josef na Meri nọ.
Mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando bara n’ime ụlọ ahụ, ha hụrụ Meri na nwa ọhụrụ ya, bụ́ Jisọs. Ha nile wee kpọọ isiala nye ya. Ha wee si n’akpa ha wepụtasịa onyinye nke ọlaedo, frankincense, na myrrh. Mgbe e mesịrị, mgbe ha chọrọ ije gwa Herọd ebe nwa ahụ nọ, Chineke dọrọ ha aka ná ntị ná nrọ ka ha ghara ime otu ahụ. Ya mere ha si ụzọ ọzọ wee laa n’obodo ha.
Ònye ka i chere na ọ bụ ya wepụtara kpakpando ahụ nke gagharịrị n’eluigwe iduzi ndị ahụ na-agụ kpakpando? Cheta, kpakpando ahụ eduzighị ha gaa kpọmkwem n’ebe Jisọs nọ na Betlehem. Kama, e dugara ha na Jerusalem, n’ebe ha zutere Eze Herọd, bụ́ onye chọrọ igbu Jisọs. Ọ gaara emewokwarị otú ahụ a sị na Chineke abịaghị dọọ ndị ahụ na-agụ kpakpando aka ná ntị ka ha ghara ịgwa Herọd ebe Jisọs nọ. Ọ bụ onye iro Chineke, bụ́ Setan Ekwensu, bụ onye chọrọ ka e gbuo Jisọs, o jikwa kpakpando ahụ mee ihe iji nwaa imezu nzube ya. Matiu 2:1-12; Maịka 5:2.
▪ Gịnị gosiri na kpakpando ahụ ndị na-agụ kpakpando hụrụ abụghị kpakpando nkịtị?
▪ Olee ebe Jisọs nọ mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando chọtara ya?
▪ Gịnị mere anyị ji mara na ọ bụ Setan wepụtara kpakpando ahụ iji duzie ndị ahụ na-agụ kpakpando?