ISI NKE 71
Jehova Chebere Jizọs
E nwere ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ Izrel. Ha kweere na kpakpando nwere ike iduzi ha. N’otu abalị, ụfọdụ n’ime ndị ahụ bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ hụrụ ihe yiri kpakpando na-egbuke egbuke n’eluigwe ka ọ nọ na-aga, ha esoro ya na-aga. Ihe ahụ yiri kpakpando duuru ha gaa Jeruselem. Mgbe ha ruru, ha jụwara ndị mmadụ, sị: ‘Olee ebe nwa ahụ ga-abụ eze ndị Juu nọ? Anyị bịara ịkpọrọ ya isiala.’
Mgbe Herọd, eze na-achị Jeruselem nụrụ banyere eze ọhụrụ a, obi kooro ya n’elu. Ọ jụrụ ndị isi nchụàjà, sị: ‘Ebee ka a sị na a ga-amụ eze a?’ Ha gwara ya, sị: ‘Ndị amụma kwuru na a ga-amụ ya na Betlehem.’ N’ihi ya, Herọd kpọrọ ndị ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma gwa ha, sị: ‘Gaanụ Betlehem chọọ nwa a. Unu chọta ya, bịanụ gwa m ebe ọ nọ. M chọkwara ịga kpọọrọ ya isiala.’ Ma, ihe a o kwuru bụ ụgha.
Ihe ahụ yiri kpakpando gawakwara ọzọ. Ndị ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ sooro ya gawa Betlehem. Ọ kwụsịrị n’elu otu ụlọ, ụmụ nwoke ahụ abanye n’ime ụlọ ahụ. Ha hụrụ Jizọs na Meri nne ya ebe ahụ. Mgbe ha hụrụ Jizọs, ha kpọọrọ ya isiala, nyekwa ya onyinye. Ha nyere ya ọlaedo, frankinsens, na mea. Ọ̀ bụ Jehova zigara ndị ahụ ka ha gaa chọta Jizọs? Mba.
N’abalị ahụ, Jehova gwara Josef ná nrọ, sị: ‘Herọd chọrọ igbu Jizọs. Kpọrọ nwunye gị na nwa gị gbaga Ijipt. Nọrọnụ ebe ahụ ruo mgbe ala jụchara oyi ka unu laghachi.’ Josef kpọọrọ nwunye ya na nwa ya gbaga Ijipt ozugbo.
Jehova gwakwara ndị ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ka ha ghara ịgaghachikwuru Herọd. Mgbe Herọd hụrụ na ha alọghachighị, ezigbo iwe were ya. Ebe ọ bụ na ọ mataghị ebe Jizọs nọ, o nyere iwu ka e gbuo ụmụntakịrị nwoke niile nọ na Betlehem ha na Jizọs bụ ọgbọ. Ma, e nweghị ihe mere Jizọs n’ihi na ọ nọzi n’Ijipt bụ́ ebe dị anya.
Ka oge na-aga, Herọd nwụrụ. Jehova gwara Josef, sị: ‘O nweghị ihe ga-eme unu, unu nweziri ike ịlaghachi.’ Josef kpọọrọ Meri na Jizọs laghachi Izrel, ha ebirizie na Nazaret.
“Otú ahụ ka okwu si m n’ọnụ pụta ga-adị. . . . Ihe m kwuru ga-emezurịrị otú ahụ m si kwuo ya.”—Aịzaya 55:11