Isi 8
Ịgbanahụ Onye Ọchịchị Aka Ike
JOSEF kpọlitere Meri n’ụra ma zie ya ozi dị oké mkpa. Mmụọ ozi Jehova ka bịakwutesịrị ya nnọọ na-asị: “Bilie, kuru nwatakịrị ahụ na nne ya gbalaga n’Ijipt, nọrọ n’ebe ahụ ruo mgbe ọ bụla m ga-agwa gị: n’ihi na Herọd gaje ịchọ nwatakịrị ahụ ka ọ laa ya n’iyi.”
Ozugbo, ha mmadụ atọ wee gbapụ. Ọ bụkwa nnọọ n’oge, n’ihi na Herọd amatala na ndị ahụ na-agụ kpakpando aghọgbuwo ya, wee laa. Cheta, ọ tụrụ anya na ha ga-alọghachi ịkọrọ ya ma ọ bụrụ na ha achọta Jisọs. Oké iwe jidere Herọd. Ya mere, n’ịnwa igbu Jisọs, o nyere iwu ka e gbuo ụmụntakịrị nwoke nile nọ na Betlehem na n’ókèala ya nile, bụ́ ndị dị malite n’afọ abụọ gbadaa. O mere ngụkọ ya na-adabere n’akụkọ o buru ụzọ nweta n’aka ndị ahụ na-agụ kpakpando, bụ́ ndị si n’Ọwụwa Anyanwụ bịa.
Ogbugbu e gburu ụmụntakịrị nwoke ndị ahụ bụ ihe jọgburu onwe ya ịhụ! Ndị agha Herọd na-amaba n’ụlọ ọ bụla. Mgbe ha hụkwara nwata bụ nwoke, ha na-anapụ ya nne ya. Anyị amaghị ụmụntakịrị ole ha gburu, ma oké ịkwa akwá na iti mkpu nke ndị nne ndị ahụ mezuru otu amụma Bible nke onye amụma Chineke bụ Jeremaịa buru.
Ka ọ dị ugbu a, Josef na ezinụlọ ya eruolarị Ijipt n’enweghị nsogbu, ha bikwa n’ebe ahụ ugbu a. Ma n’otu abalị, mmụọ ozi Jehova bịakwutere Josef ọzọ ná nrọ. Mmụọ ozi ahụ kwuru sị, “Bilie, kuru nwatakịrị ahụ na nne ya, gaa ala Israel, n’ihi na ndị na-achọ ndụ nwatakịrị ahụ anwụwo.” Ya mere, n’imezu amụma Bible ọzọ nke e buru na a ga-akpọpụta Ọkpara Chineke site n’Ijipt, ezinụlọ ahụ laghachiri ná mba nke aka ha.
O yiri ka Josef zubere ibi na Judia, bụ́ ebe ha bibu, n’obodo Betlehem, tupu ha gbaga Ijipt. Ma ọ nụrụ na nwa Herọd bụ Akeleọs nke nwere obi ọjọọ, bụzi eze Judia, ọzọkwa, Jehova dọrọ ya aka ná ntị ná nrọ ọzọ banyere ihe ize ndụ ahụ. N’ihi ya, Josef na ezinụlọ ya jere n’ebe ugwu wee biri n’obodo Nazaret na Galili. N’ebe a, n’ime obodo nke a dịpụrụ adịpụ site n’isi obodo nke okpukpe ndị Juu, bụ ebe Jisọs nọrọ too. Matiu 2:13-23; Jeremaịa 31:15; Hosea 11:1.
▪ Mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando na-alọghachighị, ihe oké egwu dị aṅaa ka Eze Herọd mere, ma olee otú e si chebe Jisọs?
▪ Mgbe o siri Ijipt lọta, gịnị mere Josef ebikwaghị na Betlehem?
▪ Olee amụma Bible ndị mezuru n’ime oge a?