Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 10
  • Njem Ndị A Gara na Jerusalem

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Njem Ndị A Gara na Jerusalem
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezinụlọ Jizọs Hà Agaa Jeruselem
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Mgbe Jizọs Dị Afọ Iri na Abụọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Mgbe Nwata Bụ́ Jizọs Nọ n’Ụlọ Nsọ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Jizọs Mụtara Irube Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 10

Isi 10

Njem Ndị A Gara na Jerusalem

OGE opupu ihe ubi eruola. Oge eruwokwa ka ezinụlọ Josef tinyere ndị enyi na ndị ikwu, gaa njem ha na-aga Jerusalem kwa oge opupu ihe ubi n’afọ na ime Ememe Ngabiga. Mgbe ha malitere njem nke ihe dị ka 65 maịlụ, e nwere otu obi ụtọ ahụ a na-enwe mgbe a na-eme ụdị njem a. Jisọs dị afọ 12 ugbu a, o jikwa mmasị pụrụ iche na-atụ anya maka ememe ahụ.

Nye Jisọs na ezinụlọ ya, Ememe Ngabiga ahụ abụghị nanị ihe otu ụbọchị. Ha na-anọgidekwa ruo ememe na-esonụ nke a na-eme ụbọchị asaa, bụ́ Ememe Achịcha Ekoghị Eko, nke ha lere anya dị ka otu akụkụ nke Ememe Ngabiga ahụ. N’ihi ya, njem nile ahụ site n’ụlọ ha na Nazaret tinyere ọnụnọ ha na Jerusalem, na-ewe ihe dị ka izu abụọ. Ma n’afọ a, n’ihi otu ihe merenụ nke metụtara Jisọs, o were ogologo oge karị.

A chọpụtara nsogbu ahụ mgbe ha na-alaghachi njem ahụ site na Jerusalem. Josef na Meri chere na Jisọs nọ n’ìgwè nke ndị ikwu na ndị enyi ahụ na-emekọ njem ọnụ. Ma ọ bịakwuteghị ha mgbe ha kwụsịrị n’abalị ahụ, ha wee gaa na-achọgharị ya n’ebe nile ndị ha na ha so nọ. Ma ha ahụghị ya. Ya mere Josef na Meri laghachiri Jerusalem ịchọ ya.

Ha chọrọ ya otu ụbọchị zuru ezu ma ha achọtaghị ya. N’ụbọchị nke abụọ, ha enweghịkwa ike ịchọta ya. N’ikpeazụ, n’ụbọchị nke atọ, ha gara n’ụlọ nsọ ahụ. N’ebe ahụ, n’otu n’ime ụlọ mgbakọ dị na ya, ha hụrụ Jisọs ka ọ nọ n’etiti ndị ozizi ndị Juu, na-ege ha ntị, na-ajụkwa ha ajụjụ.

Meri jụrụ sị, “Nwa m, gịnị mere i meso anyị otú a? Lee, nna gị na mụ onwe m na-achọ gị n’obi ụfụ.”

O juru Jisọs anya na ha amaghị ebe ha gaara achọta ya. Ọ jụrụ sị, “Gịnị mere unu na-achọ m? Ùnu amataghị na aghaghị m ịdị n’ihe nke Nna m?”

Jisọs aghọtaghị ihe mere na ndị mụrụ ya agaghị amata nke a. Mgbe ahụ, Jisọs sooro ndị mụrụ ya laghachi, nọgidekwa na-erubere ha isi. Ọ nọgidere na-eto eto n’amamihe na n’anụ ahụ, ma na-enwekwa amara n’ihu Chineke na n’anya mmadụ. N’ezie, site na mgbe ọ bụ nwata gaa n’ihu, Jisọs setịpụrụ ezi ihe ilereanya, ọ bụghị nanị n’ịchụso ọdịmma ime mmụọ kamakwa, igosipụta nrubeisi nye ndị mụrụ ya. Luk 2:​40-⁠52; 22:⁠7.

▪ Olee njem oge opupu ihe ubi nke Jisọs na ezinụlọ ya na-aga mgbe mgbe, ụbọchị ole ka ọ na-ewekwa?

▪ Gịnị mere na njem ahụ mgbe Jisọs dị afọ 12?

▪ Ihe ilereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụụrụ ndị ntorobịa taa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya