Isi 12
Baptism Jisọs
IHE dị ka ọnwa isii mgbe Jọn malitesịrị ọrụ nkwusa ya, Jisọs, onye gbaworo 30 afọ ugbu a, bịakwutere ya na Jọdan. Gịnị ka ọ bịara ime? Ọ̀ bụ nleta efu ka ọ bịara? Ihe dị Jisọs mkpa ọ̀ bụ nanị ịhụ otú ọrụ Jọn si na-aga n’ihu? Ee e, Jisọs gwara Jọn ka o mee ya baptism.
Ozugbo ahụ, Jọn jụrụ ajụ, na-asị: “Ọ dị mụ onwe m mkpa ka i mee m baptism, gị onwe gị ị̀ na-abịakwutekwa m?” Jọn matara na nwa nwanne nne ya, bụ́ Jisọs, bụ Ọkpara Chineke n’ụzọ pụrụ iche. Cheta na Jọn maliri elu n’ọṅụ n’afọ nne ya mgbe Meri, onye dị ime Jisọs bịara ileta ha! Obi abụọ adịghị ya na nne Jọn, bụ́ Elizabet mesịrị kọọrọ ya banyere ihe nke a merenụ. Ọ ga-agwawokwarị ya banyere ọkwà mmụọ ozi ahụ mara metụta ọmụmụ Jisọs na banyere nzute ndị mmụọ ozi zutere ndị ọzụzụ atụrụ n’abalị ụbọchị a mụrụ Jisọs.
N’ihi ya, Jisọs abụghị onye ọhụrụ n’ebe Jọn nọ. Jọn matakwara na baptism ya abụghị maka Jisọs. Ọ bụ maka ndị ahụ na-echegharị site ná mmehie ha, ma Jisọs enweghị mmehie ọ bụla. Ma, n’agbanyeghị ọjụjụ Jọn jụrụ, Jisọs nọgidere na-ekwu, sị: “Kwere m ugbu a: n’ihi na otú a ka o kwesịrị anyị imezu ezi omume nile.”
Gịnị mere o ji zie ezi ka e mee Jisọs baptism? N’ihi na baptism Jisọs bụ ihe àmà, ọ bụghị nke nchegharị maka mmehie, kama nke iwepụta onwe ya ime uche Nna ya. Jisọs bụ onye ọkwa nkà, ma ugbu a oge eruwo ka ọ malite ije ozi nke Chineke zitere ya ka o jee n’elu ụwa. Ì chere na Jọn tụrụ anya ihe ọ bụla dị ebube ime mgbe o mesịrị Jisọs baptism?
N’ezie, Jọn mesịrị kọọ, sị: “Onye zitere m ka m were mmiri mee baptism, onye ahụ sịrị m, Onye ọ bụla ị ga-ahụ mmụọ nsọ ka ọ na-efedakwasị ya, na-anọgidekwa n’ahụ ya, onye ahụ bụ onye na-eji mmụọ nsọ eme baptism.” N’ihi ya Jọn na-atụ anya mmụọ Chineke ịdakwasị otu onye ọ ga-eme baptism. Ya mere, ọ bụghịrị ya ihe ijuanya, ma eleghị anya, na mgbe Jisọs si na mmiri na-arịgopụta, Jọn hụrụ “mmụọ nke Chineke ka ọ na-efeda dị ka nduru na-ebekwasị ya.”
Ma ihe karịrị nke ahụ mere mgbe a na-eme Jisọs baptism. “E meghere eluigwe” nye ya. Gịnị ka nke a pụtara? O doro anya na ọ pụtara na mgbe a na-eme ya baptism, o cheteghachiri otú ọ dịrị n’eluigwe tupu ọ ghọọ mmadụ. Otú a, Jisọs chetaghachiri ugbu a ndụ ya dị ka mmụọ bụ Ọkpara Jehova Chineke n’ụzọ zuru ezu, gụnyere ihe nile Chineke gwara ya n’eluigwe n’oge ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ.
Tụkwasịkwa, n’oge baptism ya, olu nke sitere n’eluigwe kwupụtara, sị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma.” Nke ahụ ọ̀ bụ olu ònye? Ọ̀ bụ olu Jisọs n’onwe ya? Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị! Ọ bụ olu Chineke. N’ụzọ doro anya, Jisọs bụ Ọkpara Chineke, ọ bụghị Chineke n’onwe ya, dị ka ụfọdụ ndị na-ekwu.
Otú ọ dị, Jisọs bụ nwa Chineke nke bụ mmadụ, ọbụna dị ka mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam bụ. Onye na-eso ụzọ bụ Luk, mgbe ọ kọwasịrị baptism Jisọs, dere, sị: “Jisọs onwe ya, mgbe ọ malitere izi ihe, ọ gbara ihe dị ka [iri afọ atọ], bụrụ nwa Josef (dị ka e chere), nwa Hili, . . . nwa Devid, . . . nwa Abraham, . . . nwa Noa, . . . nwa Adam, nwa Chineke.”
Dị ka Adam bụ mmadụ nke bụ “nwa Chineke,” otú ahụ ka Jisọs bụkwa. Jisọs bụ mmadụ kachasị ukwuu dịrịla ndụ, bụ́ nke na-edo anya mgbe anyị tụlere ndụ Jisọs. Otú ọ dị, na baptism ya, Jisọs na-abanye ná mmekọrịta ọhụrụ nke ya na Chineke, na-aghọkwa Ọkpara Chineke n’ụzọ ime mmụọ. Ugbu a Chineke na-akpọghachite ya n’eluigwe, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, site n’ịmalitere ya ihe omume nke ga-eduga ya n’ịtọgbọ ndụ mmadụ ya ruo mgbe ebighị ebi dị ka ihe ịchụ àjà n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ ikpe mara. Matiu 3:13-17; Luk 3:21-38; 1:34-36, 44; 2:10-14; Jọn 1:32-34; Ndị Hibru 10:5-9.
▪ Gịnị mere Jisọs abụghị onye ọhụrụ nye Jọn?
▪ Ebe ọ bụ na o meghị mmehie ọ bụla, gịnị mere e ji mee Jisọs baptism?
▪ N’iburu n’uche ihe Jọn maara banyere Jisọs, gịnị mere na ọ pụghị ijuworị ya anya mgbe mmụọ Chineke bekwasịrị Jisọs?