Isi 21
N’Ụlọ Nzukọ Dị n’Obodo Jisọs
IHE ịrụ ụka adịghị ya na e nwere oké mkpali na Nazeret mgbe Jisọs lọghachitere. Tupu ọ pụọ ije ka Jọn mee ya baptism n’ihe ji nke nta karịa otu afọ tupu mgbe ahụ, a maara Jisọs dị ka onye ọkwa nkà. Ma ugbu a a marawo ya n’ebe nile dị ka onye na-arụ ọrụ ebube. Ndị bi n’ógbè ahụ nwere ọchịchọ siri ike ịhụ ya mgbe ọ ga-arụ ụfọdụ n’ime ọrụ ebube ndị a n’etiti ha.
Olileanya ha rịkwuru elu mgbe Jisọs, dị ka ọ na-eme mgbe dum, gara n’ụlọ nzukọ dị n’ógbè ahụ. Ka nzukọ ahụ na-aga n’ihu, o wee bilie ịgụ ihe, e wee nye ya akwụkwọ mpịakọta nke Aịsaịa onye amụma. O wee chọta ebe ọ na-ekwu banyere Onye ahụ e ji mmụọ Jehova tee mmanụ, nke bụ Aịz isi 61 n’ime Bible anyị taa.
Mgbe ọ gụsịrị banyere otú Onye nke a ga-esi kwusaa ntọhapụ nye ndị a dọtara n’agha, ịhụ ụzọ nye ndị ìsì, na ikwusa afọ mgbe Jehova na-anara mmadụ nke ọma, Jisọs nyeghachiri onye na-eje ozi akwụkwọ ahụ, wee nọdụ ala. Mmadụ nile lekwasịrị ya anya. O wee malite ikwu okwu, ma eleghị anya ruo ogologo oge ụfọdụ, na-akọwa, sị: “Taa ka e mezuworo ihe a e deworo n’akwụkwọ nsọ ná ntị unu.”
“Okwu nile nke amara” ndị o kwuru tụrụ ndị ahụ n’anya, ha wee sịrịta onwe ha: “Onye a, ọ́ bụghị nwa Josef?” Ma ebe ọ maara na ha chọrọ ịhụ ka ọ rụrụ ọrụ ebube, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “N’ezie unu ga-atụrụ m ilu a, Dibịa, mee ka ahụ gị onwe gị dị ike: ka ihe anyị nụrụ na e mere ha na Kapanaum hà, meekwa otú a n’ebe a n’obodo nke aka gị.” O doro anya na ndị bụbu ndị agbata obi Jisọs na-eche na ọgwụgwọ kwesịrị ibu ụzọ bido n’ụlọ, maka abamuru nke ndị ya. N’ihi nke a, ha chere na Jisọs lelịrị ha anya.
Ebe ọ ghọtara ihe ha na-eche, Jisọs kọrọ akụkọ ụfọdụ kwesịrị ekwesị. Ọ kọrọ na e nwere ọtụtụ ndị inyom di ha nwụrụ n’Israel n’oge Elaịja, ma e zigaghị Elaịja jekwuru nke ọ bụla n’ime ndị ahụ. Kama o jekwuuru nwanyị di ya nwụrụ nke bi na Saịdọn, onye na-abụghị onye Israel, ebe ọ rụrụ ọrụ ebube iji zọpụta ndụ. N’oge Elaịsha kwa, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta, ma Elaịsha mere ka nanị Neman onye Siria dị ọcha.
N’ịbụ ndị akụkọ ihe mere eme ndị a e ji tụnyere ha n’ụzọ na-adịghị aja mma kpasuru iwe, bụ́ nke gosiri ọchịchọ onwe onye na enweghị okwukwe ha, ndị ahụ nọ n’ụlọ nzukọ biliri wee dọkpụrụ Jisọs gaa n’azụ obodo ahụ. N’ebe ahụ, n’ọnụ ọnụ ugwu ebe e wukwasịrị obodo Nazaret, ha nwara ịtụda Jisọs. Ma Jisọs gbapụnahụrụ ha wee gbalaga na-emerụghị ahụ. Luk 4:16-30; 1 Ndị Eze 17:8-16; 2 Ndị Eze 5:8-14.
▪ Gịnị mere e ji nwee oké mkpali na Nazaret?
▪ Gịnị ka ndị ahụ chere banyere okwu Jisọs, ma ọ bụ gịnị kpasuru ha iwe?
▪ Olee ihe ndị ahụ nwara ime Jisọs?