Isi 23
Ọrụ Ebube Ndị Ọzọ A Rụrụ na Kapanaum
N’ỤBỌCHỊ IZU IKE mbụ e nwere mgbe Jisọs kpọsịrị ndị na-eso ụzọ anọ mbụ ya—Pita, Andru, Jemes, na Jọn—ha nile sooro jee n’ụlọ nzukọ dị na Kapanaum. N’ebe ahụ, Jisọs malitere izi ihe, o jukwara ọtụtụ ndị anya n’ihi na ọ na-ezi ihe dị ka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka ndị odeakwụkwọ.
N’Ụbọchị Izu Ike nke a, otu nwoke mmụọ ọjọọ ji aka nọ n’ebe ahụ. Mgbe nwa oge gasịrị, o tiri mkpu n’oké olu, sị: “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, Jisọs onye Nazaret? Ị̀ bịara ịla anyị n’iyi? Amatara m gị onye ị bụ, Onye Nsọ ahụ nke Chineke.”
Mmụọ ọjọọ ahụ nke na-arụ ọrụ n’ahụ nwoke ahụ bụ n’ezie otu n’ime ndị mmụọ ozi Setan. N’ịbara mmụọ ọjọọ ahụ mba, Jisọs sịrị: “Kpuchie ọnụ gị, sikwa n’ime ya pụta.”
Ka o sina dị, mmụọ ọjọọ ahụ mere ka akwụkwụ malite ịdọ nwoke ahụ, wee tie mkpu n’oké olu. Ma o si n’ime nwoke ahụ pụta n’emerụghị ya ahụ. O juru mmadụ nile anya! Ha jụrụ sị, “Gịnị bụ nke a?” “Ọ bụ n’ike ka ọ na-enye ọbụna ndị mmụọ na-adịghị ọcha iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.” Akụkọ banyere nke a gbasara ebe nile dị na gburugburu ógbè ahụ.
Mgbe ha si n’ụlọ nzukọ ahụ pụta, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya jere n’ụlọ Saịmọn, ma ọ bụ Pita. N’ebe ahụ, nne nwunye Pita nwere oké ahụ ọkụ. Ha rịọrọ sị, ‘Biko nyere anyị aka.’ Ya mere, Jisọs jekwuuru ya, sere ya n’aka ma selite ya. Ozugbo ahụ ahụ dịrị ya mma, o wee malite ịkwadebere ha ihe oriri!
N’ikpeazụ mgbe anyanwụ dasịworo, ndị mmadụ si ebe dị iche iche malitere ibute ndị ha ahụ na-esighị ike n’ụlọ Pita. N’oge na-adịghị anya, ndị obodo ahụ nile gbakọrọ n’ọnụ ụzọ! Jisọs gwọkwara ndị ha nile ahụ na-esighị ike, n’agbanyeghị ụdị ọrịa ha nwere. Ọbụna na ọ tọhapụrụ ndị mmụọ ọjọọ ji. Mgbe ha na-apụta, mmụọ ọjọọ ndị ahụ ọ na-achụpụ na-eti mkpu, sị: “Gị onwe gị bụ Ọkpara Chineke.” Ma Jisọs na-abara ha mba, ọ naghị ekwekwa ka ha kwuo okwu n’ihi na ha maara na ọ bụ Kraịst ahụ. Mak 1:21-34; Luk 4:31-41; Matiu 8:14-17.
▪ Gịnị mere n’ụlọ nzukọ ahụ n’Ụbọchị Izu Ike nke sochirinụ mgbe Jisọs kpọsịrị ndị na-eso ụzọ ya anọ?
▪ Ebee ka Jisọs gara mgbe ọ hapụrụ ụlọ nzukọ ahụ, ọrụ ebube dịkwa aṅaa ka ọ rụrụ n’ebe ahụ?
▪ Gịnị mekwara n’ikpeazụ n’otu anyasị ahụ?