Isi 26
Ịlaghachi Azụ n’Obodo Ya Bụ Kapanaum
KA Ọ dị ugbu a, ebube Jisọs agbasowo ebe nile, ọtụtụ ndị na-ejekwurukwa ya n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ ọ na-anọ. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ọ na-alọghachi na Kapanaum, nke dị n’akụkụ Osimiri Galili. N’oge na-adịghị anya, a nụzuru ya ebe nile na ọ lọghachiwo, ọtụtụ ndị wee bịa n’ụlọ ebe ọ nọ. Ndị Farisi na ndị nkuzi Iwu si na Jerusalem nke dị nnọọ anya bịa.
Ìgwè mmadụ ahụ dị ukwuu nke na ha nọchisiri ụzọ, o dịghịkwa ohere ọ bụla e nwere iji banye n’ime ụlọ ahụ. Oge eruwo maka otu ihe omume pụrụ iche. Ihe mere n’oge ahụ dị oké mkpa, n’ihi na o nyeere anyị aka ịmata na Jisọs nwere ike iwepụ ihe na-akpata ahụhụ nile ụmụ mmadụ na-ata, ma nyeghachi ndị nile ọ họọrọ ahụ ike.
Ka Jisọs nọ na-ezi ìgwè mmadụ ahụ ihe, ndị ikom anọ jiri ihe ndina nta bute otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ha chọrọ ka Jisọs gwọọ enyi ha, ma n’ihi ìgwè mmadụ ahụ, ha apụghị ịbata n’ime ụlọ. Lee nnọọ ihe nkụda aka nke a bụụrụ ha! N’agbanyeghị nke ahụ, ha adaghị mbà. Ha rịgooro n’elu ụlọ ahụ dị larịị, meghee oghere n’elu ya, wee budaa ya n’ihe ndina nta ya n’ihu Jisọs.
Jisọs ò were iwe n’ihi ihe nke a kwụsịtụrụ okwu ya? Ọ dịghị ma ọlị! Kama okwukwe ha metụrụ ya n’obi nke ukwuu. O wee sị nwoke ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ: “A na-agbaghara gị mmehie gị nile.” Ma Jisọs ọ̀ pụrụ ịgbaghara mmehie n’ezie? Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii echeghị otú ahụ. Ha malitere ịtụle n’obi ha, sị: “Gịnị mere nwoke a na-ekwu okwu otú a? Ọ na-ekwulu Chineke: ònye pụrụ ịgbaghara mmehie, ma ọ bụghị otu onye, bụ́ Chineke?”
N’ịmata ihe dị ha n’obi, Jisọs sịrị ha: “Gịnị mere unu na-atụle ihe ndị a n’obi unu? Olee nke ka mfe, ịsị onye akụkụ ahụ ya nwụrụ anwụ, A na-agbaghara gị mmehie gị nile; ma ọ bụ ịsị, Bilie, chịrị ute [“ihe ndina nta,” NW] gị, jegharịakwa?”
Ugbu a, Jisọs na-ekwe ka ìgwè mmadụ ahụ, gụnyere ndị na-akatọ ya, hụ ngosi dị ịrịba ama nke ga-egosipụta na o nwere ike ịgbaghara mmehie n’elu ụwa nakwa na ọ bụ ya bụ nwoke kachasị ukwuu nke dịworo ndụ mgbe ọ bụla. Ọ tụgharịrị n’ebe onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọ, wee sị: “Bilie chịrị ute [“ihe ndina nta,” NW] gị, laa n’ụlọ gị.” O wee mee otú ahụ ozugbo, bulie ihe ndina nta ya pụọ n’ihu ha! Ná mgbagwoju anya, ndị ahụ nọ n’ebe ahụ wee nye Chineke otuto, na-eti mkpu, sị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị hụrụ ya otú a”!
Ị̀ chọpụtara na Jisọs kpọtụrụ mmehie aha dị ka ihe metụtara ọrịa, na-egosikwa mgbaghara mmehie dị ka ihe kwekọrọ n’inweta ahụ ike? Bible kọwara na nna anyị mbụ, bụ́ Adam mehiere, na anyị nile ketakwara ihe ndị si ná mmehie ahụ pụta, nke bụ ọrịa na ọnwụ. Ma n’okpuru ọchịchị Alaeze Chineke, Jisọs ga-agbaghara ndị nile hụrụ Chineke n’anya na-efekwa Ya ofufe, mgbe ahụ, a ga-ewepụsị ọrịa nile. Lee nnọọ ihe dị mma ọ ga-abụ! Mak 2:1-12; Luk 5:17-26; Matiu 9:1-8; Ndị Rom 5:12, 17-19.
▪ Olee ọnọdụ ebe otu ihe pụrụ iche nọ mee?
▪ Olee ụzọ nwoke ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ si rute ebe Jisọs nọ?
▪ Gịnị mere anyị nile ji bụrụ ndị mmehie, oleekwa otú Jisọs si mee ka anyị nwee olileanya na ịgbaghara anyị mmehie na ime ka anyị nweghachi ezi ahụ ike ga-ekwe omume?