Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 23 p. 122-126
  • Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Arịa Ọrịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Arịa Ọrịa
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịlaghachi Azụ n’Obodo Ya Bụ Kapanaum
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • “A Gbagharawo Gị Mmehie Gị”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • “A Gbagharawo Gị Mmehie Gị”
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Rụrụ Ọtụtụ Ọrụ Ebube
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 23 p. 122-126

ISI NKE 23

Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Arịa Ọrịa

Ọ̀ DỊ onye ị̀ maara na-arịa ọrịa?— Ma eleghị anya, gị onwe gị kwa na-arịa ọrịa mgbe ụfọdụ. Azụ̀zụ̀ pụrụ ijide gị, ma ọ bụ afọ pụrụ ịta gị. Ụfọdụ ndị na-arịasi ọrịa ike. Ha agaghịdị enwe ike iguzo ọtọ n’onwe ha. Nke a na-emekarị mgbe mmadụ mere nnọọ okenye.

Mmadụ nile na-arịa ọrịa mgbe ụfọdụ. Ị̀ ma ihe mere ndị mmadụ ji arịa ọrịa, na-aka nká ma na-anwụ anwụ?— Otu ụbọchị, a kpọtaara Jizọs otu nwoke nke na-enweghị ike ịga ije, Jizọs gosikwara ihe mere ndị mmadụ ji arịa ọrịa ma na-anwụ anwụ. Ka m kọọrọ gị banyere ya.

Jizọs nọ n’ime otu ụlọ dị n’otu obodo dịdewere Oké Osimiri Galili. Ìgwè mmadụ bịara ịhụ ya. Ọtụtụ mmadụ bịara nke na ohere adịghị ka ndị ọzọ bata n’ime ụlọ ahụ. Ọ dịghị onye pụrụ ọbụna ịbịaru nso n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị mmadụ nọgidere na-abịa! Otu ìgwè butere otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, onye na-apụghịkwa ọbụna ịga ije. Ọ na-ewe ụmụ nwoke anọ iji buru ya n’obere àkwà, ma ọ bụ ihe ndina ya.

Ị̀ ma ihe mere ha ji chọọ ibute nwoke a na-arịa ọrịa n’ebe Jizọs nọ?— Ha nwere okwukwe na Jizọs ga-enwe ike inyere ya aka. Ha kwenyere na Jizọs pụrụ ịgwọ ya. Ị̀ ma otú ha si mee ka nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ bịaruo ebe Jizọs nọ n’agbanyeghị ndị nile nọ n’ime ụlọ ahụ?—

Ihe osise ị na-ahụ n’ebe a na-egosi otú ha si mee ya. Nke mbụ, ha buuru nwoke ahụ rịgoro n’elu ụlọ ahụ. Ọ bụ elu ụlọ dị mbadamba. Mgbe ahụ, ha wapuru nnukwute oghere na ya. N’ikpeazụ, ha si n’oghere ahụ budata nwoke ahụ na-arịa ọrịa nke nọ n’elu àkwà ya n’ime ụlọ ahụ. Lee nnukwute okwukwe ha nwere!

O juru ndị nile nọ n’ime ụlọ ahụ anya mgbe ha hụrụ ihe na-emenụ. Nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nke dina n’elu àkwà ya gbadatara nnọọ n’etiti ha. Mgbe Jizọs hụrụ ihe ndị ikom ahụ mere, iwe ò were ya?— Ọ dịghị ma ọlị! O nwere obi ụtọ ịhụ na ha nwere okwukwe. Ọ sịrị nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ: “A gbagharawo gị mmehie gị.”

[Foto dị na peeji nke 123]

Gịnị ka Jizọs gwara nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ ka o mee?

Ụfọdụ n’ime ndị ahụ chere na ihe ahụ Jizọs kwuru ekwesịghị ekwesị. Ha echeghị na ọ pụrụ ịgbaghara mmehie. Ya mere, iji gosi na ya pụrụ ịgbaghara mmehie n’ezie, Jizọs sịrị nwoke ahụ: “Bilie, bulite ihe ndina nta gị, lawakwa n’ebe obibi gị.”

Mgbe Jizọs kwuru nke ahụ, a gwọrọ nwoke ahụ! Ahụ́ ya abụkwaghị nke kpọnwụrụ akpọnwụ. Ugbu a, ọ pụrụ iguzoro ọtọ n’onwe ya ma na-aga ije. O juru ndị hụrụ ọrụ ebube a anya. Ná ndụ ha nile, ha ahụtụbeghị ụdị ihe ịtụnanya dị otú ahụ! Ha nyere Chineke otuto maka inye ha Onye Ozizi Ukwu a, bụ́ onye pụrụ ọbụna ịgwọ ndị mmadụ ọrịa ha.—Mak 2:1-12.

[Foto dị na peeji nke 124]

Olee ihe anyị na-amụta site n’ọrụ ebube a?

Gịnị ka anyị na-amụta site n’ọrụ ebube a?— Anyị na-amụta na Jizọs nwere ikike ịgbaghara mmehie na ime ka ahụ́ dị ndị na-arịa ọrịa mma. Anyị na-amụtakwa ihe ọzọ, ihe dị nnọọ oké mkpa. Anyị na-amụta na ndị mmadụ na-arịa ọrịa n’ihi mmehie.

Ebe anyị nile na-arịa ọrịa mgbe ụfọdụ, nke a ọ̀ pụtara na anyị nile bụ ndị mmehie?— Ee, Bible na-ekwu na anyị nile ketara mmehie mgbe a mụrụ anyị. Ị̀ ma ihe bụ na mmadụ ketara mmehie mgbe a mụrụ ya?— Ọ pụtara na a mụrụ anyị dị ka ndị na-ezughị okè. Mgbe ụfọdụ, anyị na-emehie ihe, ọ bụ ezie na anyị achọghị ime otú ahụ. Ị̀ ma otú anyị nile si bịa keta mmehie?—

Anyị ketara mmehie n’ihi na nwoke mbụ bụ́ Adam, erubereghị Chineke isi. O mehiere mgbe o mebiri iwu Chineke. Anyị nile ketakwara mmehie site n’aka Adam. Ị̀ ma otú anyị si keta mmehie site n’aka ya? Ka m gbalịa ịkọwara gị ya otú ị ga-aghọta ya.

[Foto dị na peeji nke 125]

Olee otú anyị nile si bịa keta mmehie?

Ma eleghị anya, ị hụwo bred e mere na pan. Gịnị ga-eme bred ahụ ma ọ bụrụ na pan e ji sie ya nwere ebe ọ kụpịara akụpịa? Ị̀ ma ihe ga-eme ya?— Ebe ahụ kụpịara akụpịa ga-apụta na bred nile e ji pan ahụ mee, ọ́ bụghị ya?—

Adam yiri iko ahụ, anyị yikwara bred ahụ. Ọ ghọrọ onye na-ezughị okè mgbe o mebiri iwu Chineke. Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na o nwere ebe a kụpịara ya, ma ọ bụ na o nwere akara ọjọọ. Ya mere, mgbe ọ mụrụ ụmụ, olee otú ha ga-adị?— Ụmụ ya nile ga-enweta otu akara a nke ezughị okè.

Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ụmụaka a na-amụ adịghị enwe nnukwu ezughị okè a pụrụ ịhụ anya. Ha adịghị enwe nanị otu aka ma ọ bụ otu ụkwụ. Ma ezughị okè ha na-enwe na-esi ike nke na ha na-arịa ọrịa, nwụọkwa ka oge na-aga.

N’ezie, ụfọdụ ndị na-arịa ọrịa karịa ndị ọzọ. N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ n’ihi na mmehie ha ketara mgbe a mụrụ ha buru ibu karị?— Ee e, mmadụ nile na-eketa mmehie hà nhata mgbe a mụrụ ha. A mụrụ anyị nile dị ka ndị na-ezughị okè. Ya mere, n’ikpeazụ, onye ọ bụla ga-arịarịrị ọrịa. Ọbụna ndị na-agbalị irube isi n’iwu nile Chineke nyere, ndị na-adịghịkwa eme ihe ọ bụla dị njọ n’ezie pụrụ ịrịa ọrịa.

[Foto dị na peeji nke 126]

Ụdị ahụ́ ike dị aṅaa ka anyị ga-enwe mgbe e wepụworo mmehie anyị?

Ya bụrụ otú ahụ, gịnị mere ụfọdụ ndị ji arịa ọrịa karịa ndị ọzọ?— E nwere ọtụtụ ihe kpatara ya. O nwere ike ịbụ na ha adịghị eriju afọ otú o kwesịrị. Ma ọ bụ na ha adịghị eri ụdị nri kwesịrị ekwesị. Ha pụrụ ịdị na-eribiga ihe ndị na-adịghị edozi ahụ́ ókè. Ihe ọzọ pụrụ ịbụ na ha adịghị alakpu ụra n’oge, ha adịghịkwa ehi ụra nke ọma. Ma ọ bụ na ha adịghị eyi uwe ga-ekpuchi ha ahụ́ nke ọma mgbe oyi na-atụ. Ahụ́ ụfọdụ ndị esighị nnọọ ike, ha apụghịkwa ịlụso ọrịa ọgụ, ọ bụrụgodị na ha agbalịa ilekọta onwe ha.

Ọ̀ dị oge anyị na-agaghị na-arịa ọrịa? Ọ̀ dị mgbe anyị ga-enwere onwe anyị pụọ ná mmehie?— Gịnị ka Jizọs meere nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ?— Jizọs gbaghaara ya mmehie ya ma gwọọ ya. N’ụzọ dị otú ahụ, Jizọs gosiri ihe ọ gaje ime otu ụbọchị maka ndị nile na-agbalịsi ike ime ihe ziri ezi.

Ọ bụrụ na anyị egosi na anyị achọghị ime mmehie nakwa na anyị kpọrọ ihe ọjọọ asị, Jizọs ga-agwọ anyị. N’ọdịnihu, ọ ga-ewepụ ezughị okè anyị nwere ugbu a n’ebe anyị nọ. Ọ ga-eme nke a dị ka Eze nke Alaeze Chineke. A gaghị ewepụcha mmehie nile anyị ketara otu mgbe. Ọ ga-ewetụ oge tupu e wepụchaa ya. Mgbe ahụ n’ikpeazụ, mgbe e wepụworo mmehie anyị, anyị agaghị arịakwa ọrịa ọzọ. Anyị nile ga-enwe ahụ́ ike zuru okè. Lee ihe na-enye obi ụtọ nke ahụ ga-abụ!

Iji matakwuo otú mmehie si emetụta mmadụ nile, gụọ Job 14:4; Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 3:23; 5:12; nakwa Ro 6:23.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya