Isi 28
A Jụrụ Ya Ajụjụ Banyere Ibu Ọnụ
Ọ FỌRỌ nke nta ka ọ bụrụ na otu afọ agafesịwo kemgbe Jisọs jesịrị Ememe Ngabiga nke afọ 30 O.A. Ka ọ dị ugbu a, a tụwo Jọn Baptist mkpọrọ ruo ọnwa ole na ole. Ọ bụ ezie na ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ma ọ bụghị ha nile meworo otú ahụ.
Ugbu a, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jọn ahụ a tụrụ mkpọrọ bịakwutere Jisọs wee jụọ ya, sị: “N’ihi gịnị ka anyị onwe anyị na ndị Farisii na-ebu ọnụ ọtụtụ mgbe, ma ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ?” Ndị Farisii na-ebu ọnụ ugbo abụọ n’otu izu dị ka ihe dị n’ememe okpukpe ha. Ma eleghị anya, ndị na-eso ụzọ Jọn gbasokwara omenala dị otú ahụ. Ọ pụkwara ịbụ na ha na-ebu ọnụ iji gosipụta mwute maka mkpọrọ a tụrụ Jọn, wee na-eche ihe mere ndị na-eso ụzọ Jisọs esonyereghị ha ná ngosipụta mwute nke a.
N’ịza ajụjụ ha, Jisọs kwuru, sị: “Ụmụ ndị ikom nke ụlọ a na-alụ nwunye ọhụrụ, ọ̀ ga-abụ na ha pụrụ iru újú ka oge ahụ hà, bụ́ mgbe ha na onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-anọ? Ma ụbọchị ga-abịa, mgbe a ga-anapụ ha onye na-alụ nwunye ọhụrụ, mgbe ahụ ka ha ga-ebukwa ọnụ.”
Ndị na-eso ụzọ Jọn kwesịrị icheta na Jọn n’onwe ya kwuru okwu banyere Jisọs dị ka Onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ya mere, mgbe Jisọs ka nọ ya, Jọn agaghị eche na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ibu ọnụ, otú ahụ ka ọ dịkwa ndị na-eso ụzọ Jisọs. N’ikpe azụ, mgbe Jisọs nwụsịrị, ndị na-eso ụzọ ya ruru újú, buokwa ọnụ. Ma mgbe o si n’ọnwụ bilie, lagookwa n’eluigwe, e nweghịkwa ihe ọzọ kpatara ha ga-eji nọgide n’ibu ọnụ.
Ọzọ, Jisọs nyere ihe ịma atụ nke a, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla na-ewere iberibe ákwà ọgbụgba ọhụrụ tụkwasị n’uwe ochie; n’ihi na nke kwesịrị imechi ya na-adọkapụ ihe n’ahụ uwe ahụ, ndọka jọkarịrị njọ apụta. Ha adịghị agbanyekwa mmanya vine ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie: e mee otú a, karama akpụkpọ ahụ agbawaa, mmanya vine ahụ wee wụsie, karama akpụkpọ ahụ alaakwa n’iyi: ma ha na-agbanye mmanya vine ọhụrụ na karama akpụkpọ ọhụrụ.” Olee ihe jikọrọ ihe atụ ndị a na ibu ọnụ?
Jisọs na-enyere ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptism aka ịghọta na o nweghị onye kwesịrị ịtụ anya ka ndị na-eso ụzọ ya na-agbasokwa omume ochie nile nke okpukpe ndị Juu, ndị dị ka ememe ibu ọnụ. Ọ bịaghị idozi na ime ka usoro ofufe ochie kaworo nkà nke a chọkwara ibibi ebibi gakwuo n’ihu. A gaghị eme ka Iso Ụzọ Kraịst kwekọọ n’okpukpe ndị Juu nke oge ahụ ya na omenala ya nile nke mmadụ. Ee e, ọ gaghị adị ka ebe e weere ákwà ọhụrụ na-adụkwa nke ochie ma ọ bụ ịgbanye mmanya ọhụrụ na karama mmanya ochie. Matiu 9:14-17; Mak 2:18-22; Luk 5:33-39; Jọn 3:27-29.
▪ Olee ndị na-ebu ọnụ, ọ bụkwa n’ihi nzube dị aṅaa?
▪ Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jisọs ebughị ọnụ mgbe ya na ha nọ, n’ikpeazụkwa, olee otú ihe na-akpata ibu ọnụ si gabiga ngwa ngwa?
▪ Ihe atụ ndị dị aṅaa ka Jisọs nyere, gịnịkwa ka ha pụtara?