Ibu Ọnụ Ọ̀ Ghọwo Ihe Oge Ya Gafeworo?
“ANỌWO m na-ebu ọnụ na Monday ọ bụla kemgbe m nọ n’afọ iri na ụma,” ka Mrudulaben, nwanyị India dị afọ 78, nke bara ọgaranya na-ekwu. Nke a abụwo akụkụ nke ofufe ya, ụzọ isi jide n’aka na o nwere alụmdi na nwunye dị mma na ụmụ ahụ siri ike, nakwa nchebe maka di ya. Ugbu a ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ, ọ na-aga n’ihu na-ebu ọnụ na Monday ọ bụla maka ezi ahụ ike na maka ọganihu nke ụmụ ya. Dị ka ya, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ nwanyị ndị Hindu na-eme ibu ọnụ mgbe nile akụkụ nke ndụ ha.
Prakash, nwoke katatụrụ ahụ bụ onye ọchụ ntá ego bi n’ógbè dịpụrụ adịpụ nke Mumbai (Bombay), India, na-ekwu na ya na-ebu ọnụ kwa afọ na Monday ọ bụla nke Sawan (Shravan). Nke a bụ ọnwa dị mkpa pụrụ iche n’ụzọ okpukpe na kalenda ndị Hindu. Prakash na-akọwa, sị: “Amalitere m ime ya n’ihi okpukpe, ma ugbu a ahụrụ m ihe mkpali ọzọ iji gaa n’ihu maka nzube ahụ ike. Ebe ọ bụ na Sawan na-abịa mgbe udu mmiri na-aga ịgwụsị, ọ na-enye ahụ m ohere ịsachapụ onwe ya nrịanrịa ndị na-adị n’udu mmiri.”
Ụfọdụ na-eche na ibu ọnụ na-enyere mmadụ aka n’ụzọ elu ahụ, n’uche, na n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Grolier International Encyclopedia na-ekwu, sị: “Nchọpụta sayensị e mere ná nso nso a na-atụ aro na ibu ọnụ pụrụ ịdị na-enye ahụ ike nakwa na, mgbe e ji nlezianya mee ya, ọ pụrụ iweta ọnọdụ dị elu nke ịmụrụ anya na ịmara ihe na-aganụ.” A na-ekwu na onye ọkà ihe ọmụma Grik bụ́ Plato ga-ebu ọnụ ruo ụbọchị iri ma ọ bụ karịa nakwa na onye ọkà mgbakọ na mwepụ bụ́ Pythagoras na-eme ka ụmụ akwụkwọ ya buo ọnụ tupu ọ kụziere ha ihe.
Nye ụfọdụ, ibu ọnụ pụtara ịjụ nri na mmiri kpam kpam ruo oge a kara aka, ebe ndị ọzọ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ n’oge obubu ọnụ ha. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ewere ya na ịhapụ nri ụfọdụ ma ọ bụ ịjụ otu ụdị nri bụ ibu ọnụ. Ma ibu ọnụ ogologo oge nke a na-elekọtaghị elekọta pụrụ ịdị ize ndụ. Odeakụkọ Parul Sheth na-ekwu na mgbe ahụ jisịworo carbohydrate ya mee ihe, ihe ọzọ ọ na-eme bụ ime ka protein dị n’uru ahụ ghọọ glucose ma chigharịkwuruzie abụba ahụ. Ịgbanwe abụba ịghọ glucose na-ewepụta ihe ndị na-egbu egbu a na-akpọ ketone body. Ka ha na-aba ụba, ha na-aga n’ụbụrụ, na-akpaghasị usoro ịrụ ọrụ nke ụbụrụ na akwara. “Nke a bụ mgbe ibu ọnụ pụrụ ịdị ize ndụ,” ka Sheth na-ekwu. “Ị pụrụ inwe mgbagwoju anya, nwee mgbaghasị isi, na nke ka njọ. . . . [Ọ pụrụ ịkpata] mmadụ amaghị onwe ya na n’ikpeazụ ọnwụ.”
Ngwá Ọrụ na Ememe Okpukpe
E jiriwo ibu ọnụ mee ihe dị ka ngwá ọrụ dị ike maka ebumnobi ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ mmekọrịta ọha mmadụ. Onye pụtara ìhè ji ngwá ọrụ a mee ihe bụ Mohandas K. Gandhi n’India. N’ịbụ onye ọtụtụ narị nde ndị mmadụ na-akwanyere ùgwù, o jiri ibu ọnụ mee ihe iji nwee mmetụta siri ike n’ahụ ọha ndị Hindu nke India. N’ịkọwa ihe si n’ibu ọnụ ya iji dozie esemokwu ndị ọrụ nke dị n’etiti ndị ọrụ nke ụlọ ọrụ mmepụta ihe na ndị nwere ụlọ mmepụta ihe pụta, Gandhi kwuru, sị: “Ọkpụrụkpụ ihe ọ rụpụtara bụ na e nwere ọnọdụ obi ọma ebe nile. A kpaliri obi nke ndị nwere ụlọ ọrụ mmepụta ihe . . . A kwụsịrị ịgba abụbọ ọrụ ahụ mgbe m buworo ọnụ nanị ruo ụbọchị atọ.” President nke South Africa, bụ́ Nelson Mandela, keere òkè n’ụbọchị ise nke ịjụ nri n’afọ ndị ọ bụ onye a tụrụ nga n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị meworo ka ibu ọnụ bụrụ omume ha emewo otú ahụ n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe. Ibu ọnụ bụ otu ememe okpukpe a ma ama n’okpukpe Hindu. N’ụbọchị ụfọdụ, ka akwụkwọ bụ́ Fast and Festivals of India na-ekwu, “a na-ebu ọnụ zuru ezu . . . a naghị aṅụ ọbụna mmiri ọ bụla. Ma ndị nwoke ma ndị nwanyị na-ebu ọnụ zuru ezu . . . iji hụ na e nwere obi ụtọ, ọganihu na mgbaghara nke njehie na mmehie.”
A na-ebu ọnụ n’ụzọ sara mbara n’okpukpe Jain. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sunday Times of India Review na-akọ, sị: “Otu onye muni [nkụzi] Jain na Bombay [Mumbai] ṅụrụ nanị iko mmiri abụọ e siri n’ọkụ kwa ụbọchị—ruo ụbọchị 201. O wepụrụ 33 kg [73 Ib] n’ịdị arọ ya.” Ụfọdụ ọbụna na-ebu ọnụ ruo n’ókè nke ịkwụ onwe ha agụụ ruo ọnwụ, na-ekwere na nke a ga-eweta nzọpụta.
Nye ndị toworo eto na-ekpe Alakụba n’ozuzu ha, ibu ọnụ bụ ihe a na-aghaghị ime n’ọnwa Ramadan. E nwere ike a gaghị eri nri ma ọ bụ ṅụọ mmiri ọ bụla site n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda anyanwụ n’ọnwa ahụ nile. Onye ọ bụla na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-eme njem n’oge a aghaghị ibu ọnụ ahụ n’oge ndị ọzọ. Lent, oge na-ewe ụbọchị 40 na-ebute Ista ụzọ, bụ oge ibu ọnụ nye ụfọdụ nọ na Krisendọm, ọtụtụ ndị òtù okpukpe na-ebukwa ọnụ n’ụbọchị ndị ọzọ a kara aka.
N’ezie ibu ọnụ akwụsịbeghị. Ebe ọ bụkwa akụkụ nke ọtụtụ okpukpe, anyị pụrụ ịjụ, sị, Chineke ọ̀ chọrọ ka a na-ebu ọnụ? E nwere oge mgbe ndị Kraịst pụrụ ikpebi ibu ọnụ? Nke a ọ̀ pụrụ ịba uru? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.
[Foto dị na peeji nke 3]
Okpukpe Jain na-ewere ibu ọnụ dị ka ụzọ isi nweta nzọpụta nke mkpụrụ obi
[Foto dị na peeji nke 4]
Mohandas K. Gandhi jiri ibu ọnụ mee ihe dị ka ngwá ọrụ dị ike maka ebumnobi ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke mmekọrịta ọha mmadụ
Garo Nalbandian
[Foto dị na peeji nke 4]
N’Alakụba, a ghaghị ibu ọnụ n’ọnwa Ramadan
[Ebe E Si Nweta Foto]