Isi 31
Ịghọrọ Ọka n’Ụbọchị Izu Ike
N’OGE n’adịghị anya, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ Jerusalem ịlaghachi na Galili. Ọ bụ oge opupu ihe ubi, ọka jupụtakwara n’ubi dị iche iche. Agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha wee ghọrọ ọka taa. Ma, ebe ọ bụ n’Ụbọchị Izu Ike, ndị mmadụ hụrụ ihe ahụ ha na-eme.
Ndị ndú okpukpe na Jerusalem ka chọsịrị igbu Jisọs n’oge na-adịbeghị anya gara aga n’ihi ihe ha sị na ọ bụ imebi iwu Ụbọchị Izu Ike. Ugbu a, ndị Farisii wee boo ha ebubo. Ha sịrị, “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe na-ezighị ezi n’iwu ime n’Ụbọchị Izu Ike.”
Ndị Farisii ahụ sịrị na ịghọrọ ọka wee jiri aka na-ahịọchasị ya bụ iwe ihe ubi na ịzọcha ọka. Ma, ụzọ nke a siri ike ha si kọwaa ihe bụ ọrụ emewo ka Ụbọchị Izu Ike ahụ bụrụ ibu arọ, ebe ihe e bu n’uche mee ya bụ ka ọ bụrụ oge ọṅụ, nke na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ. Ya mere, Jisọs zaghachiri ha na-eji ihe atụ Akwụkwọ nsọ ndị na-egosi na Jehova Chineke ezubeghị ka e tinye iwu Ụbọchị Izu Ike Ya n’ọrụ n’ụzọ dị mkpagide otú ahụ.
Jisọs sịrị na mgbe agụụ gụrụ Devid na ndị ikom ya, ha kwụsịrị n’ụlọ nsọ ahụ wee rie achịcha a na-eche n’ihu Jehova. E wepụwo achịcha ndị ahụ n’ihu Jehova ma jiri ndị ọhụrụ dochie ha, e debekwara ha nanị maka ndị nchụaja iri ha. Ma, n’ọnọdụ ahụ, a maghị Devid na ndị ikom ya ikpe maka iri ha.
N’inye ihe atụ ọzọ, Jisọs sịrị: “Ma ọ̀ bụ unu agụghị n’Iwu, na ndị nchụaja na-emerụ ụbọchị izu ike n’ụlọ ukwu Chineke n’ụbọchị izu ike, ma a dịghị ata ha ụta?” Ee, ọbụna n’Ụbọchị Izu Ike, ndị nchụaja na-anọgide na-egbu anụ, na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ n’ụlọ nsọ ahụ n’ịkwadebe àjà e ji ụmụ anụmanụ achụ! Jisọs kwuru, sị “Ma asị m unu, na onye dị ukwuu karịa ụlọ nsọ Chineke nọ ebe a.”
Mgbe ọ na-adụ ndị Farisii ahụ ọdụ, Jisọs gara n’ihu, sị: “Ọ bụrụ na unu maararịị ihe okwu a bụ, Ana m achọ ebere, ọ bụghị àjà, unu agaghị ekpegbu ndị adịghị ata ha ụta.” O wee kwubie, sị: “N’ihi na Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izu ike.” Gịnị ka Jisọs bu n’uche wee kwuo nke ahụ? Jisọs na-ekwu banyere ọchịchị Alaeze ya nke ga-adị n’udo ruo otu puku afọ.
Eri 6,000 afọ ugbu a, ụmụ mmadụ atawo ahụhụ dị ka ohu n’okpuru Setan bụ́ Ekwensu, ebe ime ihe ike na agha bụ ihe a na-ahụ kwa ụbọchị. N’aka nke ọzọ, ọchịchị oké Ụbọchị Izu Ike nke Kraịst ga-abụ oge izuru ike pụọ n’ịta ahụhụ na mmegbu nile ahụ. Matiu 12:1-8; Levitikọs 24:5-9; 1 Samuel 21:1-6; Ọnụ Ọgụgụ 28:9; Hosea 6:6.
▪ Ebubo dị aṅaa ka e boro ndị na-eso ụzọ Jisọs, oleekwa ụzọ Jisọs si zaghachi ya?
▪ Ịda mba dị aṅaa nke ndị Farisii ka Jisọs mere ka ọ pụta ìhè?
▪ N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si bụrụ “Onyenwe ụbọchị izu ike”?