Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 31 p. 76-p. 77 para. 3
  • Ịghọrọ Ọka n’Ụbọchị Izu Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịghọrọ Ọka n’Ụbọchị Izu Ike
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịghọrọ Ọka n’Ụbọchị Izu Ike
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Iwu Ò Ji Ndị Kraịst Idebe Ụbọchị Izu Ike?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Idebe Ụbọchị Izu Ike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Olee Ihe Iwu Kwadoro na E Nwere Ike Ime n’Ụbọchị Izu Ike?
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 31 p. 76-p. 77 para. 3
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aghọrọ ọka ma na-ata ya n’Ụbọchị Izu Ike

ISI NKE 31

Ịghọrọ Ọka n’Ụbọchị Izu Ike

MATIU 12:1-8 MAK 2:23-28 LUK 6:1-5

  • NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS GHỌỌRỌ ỌKA N’ỤBỌCHỊ IZU IKE

  • JIZỌS BỤ “ONYENWE ỤBỌCHỊ IZU IKE”

Ugbu a, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gawara Galili nke dị n’ebe ugwu. Ọ bụ oge opupu ihe ubi, e nwekwara ọka ndị dị n’ubi. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọọrọ ọka na-ata n’ihi na agụụ na-agụ ha. Ma, ụbọchị a ha na-eme ihe a bụ Ụbọchị Izu Ike, ndị Farisii hụkwara ihe ahụ ha na-eme.

Ọ̀ kwa i chetara na ọ dịbeghị anya ndị Juu ụfọdụ nọ na Jeruselem boro Jizọs ebubo na ọ na-emebi iwu Ụbọchị Izu Ike, chọọkwa igbu ya? Ugbu a kwa, n’ihi ihe ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mere, ndị Farisii bịara kpesara Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-emebi Ụbọchị Izu Ike. Ha sịrị ya: “Lee! Ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe iwu na-akwadoghị ka e mee n’ụbọchị izu ike.”—Matiu 12:2.

Ndị Farisii sịrị na ịghọrọ ọka na iji aka na-agbachasị ya na-ata bụ iwe ihe ubi nakwa ịzọcha ọka. (Ọpụpụ 34:21) Otú a ha si na-akọwa ihe bụ́ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike mere ka Ụbọchị Izu Ike ghọọ ibu arọ. Mana, ihe e bu n’uche nye iwu ahụ bụ ka ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị ọṅụ nakwa ụbọchị mmadụ ga-eji eme ka okwukwe ya sikwuo ike. Jizọs ji ihe atụ abụọ gosi na otú ha si were Ụbọchị Izu Ike adịghị mma. Ọ gwara ha na Jehova Chineke ebughị n’obi ka e si otú ahụ na-akọwa iwu Ụbọchị Izu Ike ahụ o nyere.

Otu n’ime ihe atụ ndị Jizọs nyere ha bụ banyere Devid na ndị ikom ya. Otu ụbọchị mgbe agụụ gụwara ha, ha kwụsịrị n’ụlọikwuu ma were achịcha e cheburu n’ihu Chineke. Ọ na-abụ ewepụ achịcha ochie n’ihu Jehova, e were ndị ọhụrụ dochie ha. Ọ bụ naanị ndị nchụàjà kwesịrị ịta achịcha ndị ahụ e wepụrụla n’ihu Jehova. Mana, a maghị Devid na ndị ikom ya ikpe n’ihi na ha tara achịcha ndị ahụ.—Levitikọs 24:5-9; 1 Samuel 21:1-6.

N’ihe atụ nke abụọ, Jizọs sịrị ha: “Ka ọ̀ bụ na unu agụbeghị n’Iwu ahụ na n’ụbọchị izu ike, ndị nchụàjà bụ́ ndị nọ n’ụlọ nsọ, na-eme ụbọchị izu ike dị ka ihe na-adịghị nsọ ma bụrụ ndị ikpe na-amaghị?” Ihe ihe a Jizọs kwuru pụtara bụ na n’Ụbọchị Izu Ike, ndị nchụàjà na-egbu ụmụ anụmanụ e ji achụ àjà ma rụọkwa ọrụ ndị ọzọ n’ụlọ nsọ. Jizọs sịziri ha: “Ma ana m agwa unu na e nwere ihe ka ụlọ nsọ ahụ n’ebe a.”—Matiu 12:5, 6; Ọnụ Ọgụgụ 28:9.

Jizọs kwukwara ihe ọzọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ iji mee ka ihe ọ na-ekwu doo anya. Ọ sịrị: “A sị na unu ghọtara ihe nke a pụtara, ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghị àjà,’ unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe.” N’ikpeazụ, ọ sịrị: “N’ihi na Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izu ike.” Jizọs na-ekwu banyere ọchịchị puku afọ ya, bụ́ nke udo ga-adị na ya.—Matiu 12:7, 8; Hosia 6:6.

O teela ụmụ mmadụ tawara ahụhụ ka ndị ohu n’aka Setan. Ime ihe ike na agha jukwara ebe niile. Oge ọchịchị Kraịst, nke bụ́ oké Ụbọchị Izu Ike, ga-adị iche. Ọ dịla anya ọ gụsiwere anyị agụụ ike izuru ike ná nsogbu anyị niile. Anyị ga-enwekwa ike izuru ike n’oge ọchịchị Kraịst.

  • Olee ebubo ndị Farisii boro ndị na-eso ụzọ Jizọs, gịnịkwa mere ha ji bo ha ebubo ahụ?

  • Olee otú Jizọs si gbazie echiche ndị Farisii nwere banyere Ụbọchị Izu Ike?

  • Olee otú Jizọs si bụrụ “Onyenwe Ụbọchị Izu Ike”?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya