Isi 42
Jisọs Abaara Ndị Farisii Mba
JISỌS na-asị na ọ bụrụ na ya na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’ike Setan, mgbe ahụ Setan kewara ekewa megide onwe ya. Ọ gara n’ihu sị, “Meenụ osisi ka ọ dị mma, meenụ mkpụrụ ya ka ọ dịkwa mma; ma ọ bụ meenụ osisi ka ọ bụrụ osisi na-abaghị n’ihe, meenụ mkpụrụ ya ka ọ bụrụkwa mkpụrụ na-abaghị n’ihe: n’ihi na a maara osisi site ná mkpụrụ ya.”
Ọ bụ ihe nzuzu ịsị na ezi mkpụrụ nke ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ bụ n’ihi na Jisọs na-ejere Setan ozi. Ọ bụrụ na mkpụrụ ahụ dị mma, osisi ahụ apụghị ịbụ nke na-abaghị n’ihe. N’aka nke ọzọ, mkpụrụ na-abaghị n’ihe ndị Farisii na-amịpụta nke bụ ebubo ndị jọgburu onwe ha na mmegide nke na-enweghị ihe kpatara ya n’ebe Jisọs nọ bụ ihe na-egosi na ha onwe abaghị n’ihe. Jisọs kwupụtara sị, “Ụmụ nke ajụala, ùnu ga-esi aṅaa pụọ ikwu ezi ihe, ebe unu bụ ajọ mmadụ? N’ihi na ọnụ site n’ihe nke obi nwebigara ókè na-ekwu okwu.”
Ebe okwu ndị anyị na-ekwu na-egosipụta ọnọdụ nke obi anyị, ihe anyị na-ekwu na-enye ihe a ga-eji kpee anyị ikpe. Jisọs na-asị, “Asị m unu, na okwu ọ bụla mmadụ ga-ekwu nke na-abaghị n’ihe, ha ga-aza ajụjụ banyere ya n’ụbọchi ikpe. N’ihi na a ga-esite n’okwu ọnụ gị nile gụọ gị n’onye ezi omume, a ga-esitekwa n’okwu ọnụ gị nile kpegbuo gị.”
N’agbanyeghị oké ọrụ nile ndị Jisọs rụrụ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-arịọ, sị: “Onye ozizi, anyị na-achọ ịhụ ihe ịrịba ama site n’aka gị.” Ọ bụ eziokwu na ọ pụrụ ịbụ na ndị ikom ndị a kpọmkwem, bụ́ ndị sitere Jerusalem ahụbeghị ọrụ ebube ya dị iche iche, e nwere ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha banyere ha. Ya mere Jisọs na-agwa ndị ndú Juu ahụ, sị: “Ajọ ọgbọ nke na-akwakwa iko na-achọ ihe ịrịba ama; a gaghị enyekwa ya ihe ịrịba ama ma ọ bụghị ihe ịrịba ama nke Jona onye amụma.”
N’ịkọwa ihe o bu n’uche, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ ehihie na abalị n’afọ oké anụ mmiri; otú a nwa nke mmadụ ga-anọ n’obi nke ala ụbọchị atọ ehihie na abalị.” Mgbe azụ losịrị ya, Jona pụtara dị ka onye e si n’ọnwụ kpọlite, ya mere Jisọs na-ebu amụma na ya ga-anwụ, na a ga-ewelikwa ya n’ụbọchị nke atọ. Ma, ndị ndú Juu ahụ, ọbụna mgbe e mesịrị si n’ọnwụ kpọlite Jisọs, jụrụ “ihe ịrịba ama nke Jona” ahụ.
N’ihi nke a, Jisọs na-asị na ndị Nineve bụ́ ndị chegharịrị n’ihi nkwusa nke Jona ga-ebilite n’ụbọchị ikpe ma maa ndị Juu ahụ jụrụ Jisọs ikpe. N’ụzọ yiri nke ahụ, o kwuru ihe yiri ya banyere eze nwanyị Sheba, bụ́ onye si n’ebe dị ná nsọtụ ụwa bịa ịnụrụ amamihe Solomọn ma bụrụ onye ibubo nwụrụ n’ihi ihe ọ hụrụ na ihe ọ nụrụ. Jisọs na-asị, “Ma lee, onye ka Solomọn nọ n’ebe a.”
Mgbe ahụ Jisọs na-enye ihe atụ nke otu nwoke onye otu mmụọ na-adịghị ọcha si n’ime ya pụọ. Otú ọ dị, nwoke ahụ ejighị ezi ihe dochie ohere ahụ, ya mere mmụọ asaa ọzọ jọkarịrị njọ nọchiri ya. Jisọs na-asị, “Otú a ka ọ ga-adịkwara ajọ ọgbọ a.” E mewo ka mba Israel dị ọcha, a hazigharịwokwa ha—dị ka ọpụpụ nwa oge nke mmụọ na-adịghị ọcha. Ma ọjụjụ mba ahụ jụrụ ndị amụma Chineke, na-eru nsọtụ ya ná mmegide ha megidere Kraịst n’onwe ya, na-ekpughe ọnọdụ ọjọọ ya ịbụ nke dị njọ nke ukwuu karịa ná mmalite.
Mgbe Jisọs ka nọ na-ekwu okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara ma nọnye n’akụkụ ìgwè mmadụ ahụ. Ya mere otu onye kwuru, sị: “Lee, nne gị na ụmụnne gị na-eguzo n’èzí, na-achọ ịgwa gị okwu.”
“Ònye bụ nne m? Olee ndị bụkwa ụmụnne m?” ka Jisọs jụrụ. Ka ọ na-agbasapụ aka ya n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ọ sịrị: “Lee, nne m na ụmụnne m! N’ihi na onye ọ bụla nke ga-eme ihe Nna m nke bi n’eluigwe na-achọ, onye ahụ bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.” N’ụzọ dị otú a, Jisọs na-egosi na n’agbanyeghị otú ya si nwee mmasị ná njikọ nke ya na ndị ikwu ya, na ya nwere mmasị ka ukwuu ná mmekọrịta nke ya na ndị na-eso ụzọ ya. Matiu 12:33-50; Mak 3:31-35; Luk 8:19-21.
▪ Olee otú ndị Farisii ahụ si daa n’ime ka “osisi” na “mkpụrụ” ya dị mma?
▪ Gịnị bụ “ihe ịrịba ama nke Jona,” oleekwa otú e si mesịa jụ ya?
▪ Olee otú mba Israel narị afọ mbụ si yie nwoke ahụ mmụọ na-adịghị ọcha si n’ahụ ya pụọ?
▪ Olee otú Jisọs si mesie mmekọrịta chiri anya nke ya na ndị na-eso ụzọ ya ike?