Isi 43
Iji Ihe Atụ Na-ezi Ihe
O YIRI ka Jisọs nọ na Kapanaum mgbe ọ baara ndị Farisii mba. Ka oge na-aga n’otu ụbọchị ahụ, ọ hapụrụ ụlọ ahụ ma gaa n’Osimiri Galili nke dị nso, bụ́ ebe ìgwè mmadụ gbakọtara. Ọ banyere ụgbọ n’ebe ahụ wee pụọ, ma na-akụziri ndị mmadụ ihe n’ụsọ osimiri banyere Alaeze eluigwe. Ọ na-eme otú ahụ site n’ịtụ ilu ma ọ bụ inye ihe atụ dị iche iche, na-eji ihe doro ndị mmadụ anya nke ọma eme ihe na nke ọ bụla n’ime ha.
Nke mbụ, Jisọs na-ekwu banyere ọgha mkpụrụ nke na-agha mkpụrụ. Mkpụrụ ụfọdụ dara n’akụkụ ụzọ ma bụrụ nke ụmụ nnụnụ tụtụụrụ rie. Mkpụrụ ọzọ dara n’elu ájá nke nkume dị n’okpuru ya. Ebe mkpọrọgwụ ya na-abamighị abami, anwụ chagburu ihe ọkụkụ ahụ ka na-etolite etolite. Mkpụrụ ọzọ danyekwara n’etiti ogwu, bụ́ nke kpagburu ihe ọkụkụ ndị ahụ mgbe ha na-etolite. E mesịa, mkpụrụ ụfọdụ danyere n’ájá dị mma ma mịa mkpụrụ ndị dị n’ụyọkọ nke otu narị, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa, iri atọ.
N’ihe atụ ọzọ, Jisọs ji Alaeze Chineke tụnyere nwoke na-agha mkpụrụ. Ka ụbọchị na-aga, ka nwoke ahụ na-ehi ụra na-etetakwa, mkpụrụ ahụ toro. Nwoke ahụ amaghị otú o si too. O toliteere onwe ya ma mịpụta mkpụrụ. Mgbe mkpụrụ ahụ chara, nwoke ahụ weere ya.
Jisọs na-enye ihe atụ nke atọ banyere nwoke onye kụrụ ezi mkpụrụ, ma “mgbe mmadụ na-arahụ ụra,” onye iro bịara kụnye atá n’etiti ọka ahụ. Ndị na-ejere nwoke ahụ ozi jụrụ ma ha kwesịrị ifopu ahịhịa ndị ahụ. Ma ọ zaghachiri, sị: ‘Ee e, unu ga-efopu ụfọdụ n’ime ọka ahụ ma ọ bụrụ na unu mee otú ahụ. Hapụnụ ha abụọ ka ha na-abakọta ụba ruo owuwe ihe ubi. Mgbe ahụ, m ga-agwa ndị na-ewe ihe ubi ka ha buru ụzọ chịkọta atá ahụ rechapụkwa ha n’ọkụ ma kpokọta ọka ahụ n’ọba.’
Ka ọ na-aga n’ihu ịgwa ìgwè mmadụ ahụ okwu n’ụsọ osimiri ahụ, Jisọs nyere ihe atụ abụọ ọzọ. Ọ na-akọwa na “alaeze eluigwe” yiri mkpụrụ mustard nke mmadụ kụrụ. Ọ na-asị na n’agbanyeghị na ọ kasị dị nta ná mkpụrụ ọkụkụ nile, ọ na-eto karịsịa ihe ọkụkụ nile. Ọ na-aghọ osisi nke ụmụ nnụnụ na-abịa na ya, na-enweta ndo n’etiti alaka ya dị iche iche.
Ụfọdụ ndị taa na-arụ ụka na-asị na e nwere mkpụrụ ọkụkụ ndị dị nta karịa mkpụrụ mustard. Ma Jisọs adịghị akụzi ihe banyere nkà mmụta nke ihe ọkụkụ. A bịa ná mkpụrụ ndị Galili nke oge ya maara nke ọma, mkpụrụ mustard kasị dị nta n’ezie. Ya mere ha ghọtara ihe banyere ntolite dị ịrịba ama nke Jisọs na-enye ihe atụ ya.
E mesịa, Jisọs ji “alaeze eluigwe” tụnyere ihe na-eko achịcha nke nwanyị weere gwakọọ ya na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atọ buru ibu nke ntụ́ e ji eme achịcha. Ọ na-ekwu na ka oge na-aga, ọ bamiri n’akụkụ nile nke ihe ngwakọ ahụ.
Mgbe o nyesịrị ihe atụ ise ndị ahụ, Jisọs zilagara ìgwè mmadụ ahụ ma lọghachite n’ụlọ ebe o bi. N’oge na-adịghị anya, ndị ozi 12 ya nakwa ndị ọzọ bịakwutere ya n’ebe ahụ.
Irite Uru Site n’Ihe Atụ Ndị Jisọs Nyere
Mgbe ndị na-eso ụzọ ahụ bịakwutere Jisọs ka ọ gwasịworo ìgwè mmadụ ahụ okwu n’akụkụ mmiri, ha nwere ọchịchọ siri ike ịmata banyere ụzọ ọhụrụ nke o si akụzi ihe. Leenụ, ha anụwo ka o ji ihe atụ mee ihe na mbụ, ma ọ bụghị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu otú a. Ya mere ha na-ajụ, sị: “N’ihi gịnị ka ị na-agwa ha okwu n’ilu?”
Otu ihe mere o ji mee nke a bụ iji mezuo okwu ndị ahụ nke onye amụma, sị: “M ga-asaghe ọnụ m n’ịtụ ilu; m ga-ekwuwa ihe e zoro ezo site na ntọala ụwa.” Ma e nwere ihe karịrị nke a kpatara ya. Ojiji o ji ihe atụ dị iche iche na-eme ihe na-enye aka ikpughe ọnọdụ obi nke ụmụ mmadụ.
N’ezie, ihe ka ọtụtụ nwere mmasị n’ebe Jisọs nọ nanị dị ka onye ọkọ akụkọ na onye na-arụ ọrụ ebube, ọ bụghị dị ka onye a ga-ejere ozi dị ka Onyenwenụ ma gbasoo ya n’enweghị ọchịchọ onwe onye ọ bụla. Ha achọghị ka e gbochie ha n’ụzọ ha si ele ihe anya ma ọ bụ ụzọ ha si ebi ndụ. Ha achọghị ka ozi ahụ bamie n’ime ha ruo ókè ha otú ahụ.
Ya mere Jisọs na-asị: “N’ihi nke a ka m na-agwa ha okwu n’ilu; n’ihi na ha adịghị ahụ n’ọhụhụ, ha adịghị anụkwa n’ọnụnụ, ha adịghị anụtakwa. Ma a na-emezuru ha amụma nke Aịsaịa, nke sị, . . . N’ihi na obi ndị nke a mara abụba.”
Jisọs gara n’ihu ikwu sị, “Ma [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị anya unu, n’ihi na ha na-ahụ ụzọ; na ntị unu, n’ihi na ha na-anụ ihe. N’ihi na n’ezie asị m unu, na agụụ gụrụ ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ịhụ ihe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha; na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ha.”
Ee, ndị ozi 12 ahụ na ndị sooro ha nwere obi na-anabata ihe. Ya mere Jisọs na-ekwu, sị: “Ọ bụ unu ka e nyeworo ịmara ihe omimi alaeze eluigwe, ma enyeghị ndị ahụ.” N’ihi ọchịchọ ha nwere ịghọta ihe, Jisọs na-enye ndị na-eso ụzọ ya nkọwa banyere ihe atụ nke ọgha mkpụrụ ahụ.
Jisọs na-asị na “Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke,” ájá ahụ bụkwa obi. Banyere mkpụrụ nke a kụrụ n’akụkụ ụzọ nke ájá elu ya siri ike, ọ na-akọwa, sị: “Mgbe ahụ Ekwensu bịa, wee napụ okwu ahụ n’obi ha, ka ha ghara ikwere, e wee zọpụta ha.”
N’aka nke ọzọ, mkpụrụ nke a kụrụ n’elu ájá nke nkume dị n’okpuru ya na-ezo aka n’obi nke ụmụ mmadụ ndị ji ọṅụ nabata okwu ahụ. Otú ọ dị, n’ihi na okwu ahụ apụghị ịgbami mkpọrọgwụ n’ime obi ndị dị otú ahụ, ndị a na-adachapụ mgbe oge ule na mkpagbu bịara.
Jisọs gara n’ihu na-asị na banyere mkpụrụ ahụ danyere n’etiti ogwu, nke a na-ezo aka ná ndị nụworo okwu ahụ. Ma, e ji nchegbu na akụ na ụba na ihe ụtọ nke ndụ a bogbuo ha, ya mere ha bụ ndị a kpagburu kpamkpam, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ha mịpụtara.
E mesịa, banyere mkpụrụ ahụ a kụrụ n’ájá dị mma, Jisọs na-asị na ndị a bụ ndị ahụ, bụ́ ndị mgbe ha jisịrị ezi obi nụrụ okwu ahụ, ha jigidere ya ma jiri ntachi obi mịpụta mkpụrụ.
Lee ka ndị a na-eso ụzọ si bụrụ ndị a gọziri agọzi, bụ́ ndị chọtara Jisọs iji nweta nkọwa nke ihe ndị ọ kụziri! Jisọs na-ezube ka a ghọta ihe atụ ndị a iji mee ka ndị ọzọ nweta eziokwu ahụ. Ọ na-ajụ sị, “À na-ebute oriọna ka a dọba ya n’okpuru mgbè, ma ọ bụ n’okpuru ihe ndina? Ọ́ bụghị ka a dọba ya n’elu ihe ịdọba oriọna?” N’ihi nke a, Jisọs na-ekwukwa, sị: “Lezienụ anya ihe unu na-anụ.”
A Gọziri Ha Site n’Inyekwu Ntụziaka
Mgbe ha natasịrị nkọwa Jisọs banyere ihe atụ nke ọgha mkpụrụ ahụ, ndị na-eso ụzọ ahụ chọrọ ịmụtakwu ihe. Ha rịọrọ sị, “Kọọrọ anyị isi ilu atá dị n’ubi ahụ.”
Lee otú omume ndị na-eso ụzọ ahụ si dị iche pụọ na nke ihe fọdụrụ n’ìgwè mmadụ ahụ nọ n’akụkụ osimiri! Ndị ahụ enweghị ọchịchọ siri ike nke ịmụta nghọta dị n’ihe atụ ndị ahụ, ha nwere afọ ojuju nanị n’ihe ndị e kwuru n’ime ha. N’igosi ọdịiche dị n’etiti ndị ahụ gere ntị n’akụkụ osimiri na ndị na-eso ụzọ ya nwere ọchịchọ nke ịmara ihe, bụ́ ndị bataworo n’ụlọ ahụ, Jisọs na-asị:
“Ihe unu ji tụọ ihe ka a ga-eji tụọrọ unu: a ga-enyekarịkwa unu.” Ndị na-eso ụzọ ahụ ji ọchịchọ siri ike na ige ntị na-atụrụ Jisọs ihe, ya mere e ji inwetakwu ntụziaka gọzie ha. Otú a, n’ịzaghachi nye ajụjụ ndị na-eso ụzọ ya, Jisọs na-akọwa, sị:
“Onye na-agha mkpụrụ ọma ahụ bụ Nwa nke mmadụ; ubi ahụ bụ ụwa; mkpụrụ ọma ahụ, ndị ahụ bụ ụmụ alaeze eluigwe; atá ahụ bụ ụmụ ajọ onye ahụ; onye iro ahụ nke ghara ha bụ Ekwensu: owuwe ihe ubi bụ ọgwụgwụ oge a; ndị ahụ na-ewe ihe ubi bụ ndị mmụọ ozi.”
Mgbe o mesịrị ka a mata nke ọ bụla n’ime akụkụ ndị ahụ nke ihe atụ ya, Jisọs na-akọwa ihe na-esi na ya apụta. Ná ngwụsị nke usoro ihe ndị a, ọ na-asị na ndị ahụ na-ewe ihe ubi, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ga-ekewapụ ndị Kraịst adịgboroja ahụ yiri atá pụọ n’ezi “ụmụ alaeze eluigwe.” Mgbe ahụ a ga-akakwa “ụmụ ajọ onye ahụ” akara maka mbibi, ma ụmụ nke Alaeze Chineke, bụ́ ndị “ezi omume” ga-enwupụta ìhè dị ebube n’Alaeze nke Nna ha.
Jisọs gakwara n’ihu iji ihe atụ atọ ọzọ gọzie ndị na-eso ụzọ ya nwere ọchịchọ ịmata ihe. Nke mbụ, ọ na-asị: “Alaeze eluigwe yiri akụ e zoworo n’ubi; nke mmadụ hụrụ, zobekwa; n’ọṅụ ya o wee laa, ree ihe nile o nwere, ka ha hà, wee zụta ubi ahụ.”
Ọ gakwara n’ihu sị, “Ọzọkwa, alaeze eluigwe yiri onye ahịa na-achọ pearl ọma: ma mgbe ọ hụrụ otu pearl dị oké ọnụ ahịa, o jee, ree ihe nile o nwere, ka ha hà, wee zụta ya.”
Jisọs n’onwe ya yiri nwoke ahụ nke chọpụtara akụ e zoro ezo ma yiekwa onye ahịa nke chọpụtara nkume pearl dị oké ọnụ ahịa. O rere ihe nile o nwere, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-ahapụ ọnọdụ ùgwù o nwere n’eluigwe ma ghọọ mmadụ dị ala. Mgbe ahụ, dị ka mmadụ nọ n’ụwa, ọ hụrụ ahụhụ nke nkọcha na mkpagbu obi ọjọọ, na-egosipụta onwe ya ịbụ onye ruru eru ịghọ Onye Ọchịchị nke Alaeze Chineke.
E doro ihe ịma aka ahụ n’ihu ndị na-eso ụzọ Jisọs ka ha ree ihe nile ha nwere iji nweta nkwụghachi ụgwọ ahụ dị ebube nke isoro Kraịst chịa achị ma ọ bụ ịbụ onye Alaeze ahụ ga-achị n’ụwa. Ànyị ga-ewere ikere òkè n’Alaeze Chineke dị ka ihe kasị ihe ọ bụla ọzọ ná ndụ dị oké ọnụ ahịa, dị ka akụ dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu ma ọ bụ nkume pearl dị oké ọnụ ahịa?
E mesịa, Jisọs ji “alaeze eluigwe” tụnyere ụ̀gbụ́ nke na-ekpokọta ụdị azụ ọ bụla. Mgbe e kewara azụ ahụ, a na-achịfu ndị na-ekwesịghị ekwesị ma debe ndị dị mma. Ya mere, Jisọs na-asị na ọ ga-adị otú ahụ ná ngwụsị usoro ihe dị iche iche; ndị mmụọ ozi ga-ekewapụ ndị ajọ omume ná ndị ezi omume, na-edebe ndị ajọ omume maka mbibi.
Jisọs n’onwe ya malitere ọrụ ịkụ azụ nke a, na-akpọ ndị na-eso ụzọ mbụ ya ka ha bụrụ “ndị ọ́kụ̀ na-akụta mmadụ.” N’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi, ọrụ ịkụ azụ ahụ adịgidewo eri ọtụtụ narị afọ. N’ikpeazụ, oge eruwo ka awụba “oké ụ̀gbụ́” ahụ, bụ́ nke na-anọchite anya nzukọ dị iche iche n’ụwa, ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst.
Ọ bụrịị eziokwu na a na-ewezụga azụ ndị na-ekwesịghị ekwesị ibibi ha, anyị nwere ekele na a pụrụ ịgụnye anyị ‘n’ezi azụ’ ndị a na-edebe. Site n’igosipụta otu ụdị ọchịchọ ahụ siri ike dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs mere maka inwetakwu ihe ọmụma na nghọta, a ga-agọzi anyị, ọ bụghị nanị site n’inye okwu ntụziaka kamakwa ngozi Chineke nke ndụ ebighị ebi. Matiu 13:1-52; Mak 4:1-34; Luk 8:4-18; Abụ Ọma 78:2; Aịsaịa 6:9, 10.
▪ Òle mgbe, ọ̀ bụkwa n’ebee ka Jisọs ji ihe atụ dị iche iche na-agwa ìgwè mmadụ okwu?
▪ Olee ihe atụ ise ndị Jisọs na-agwa ìgwè mmadụ ahụ ugbu a?
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji na-ekwu na mkpụrụ mustard ahụ kasị mkpụrụ ndị ọzọ nile dị ntakịrị?
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji jiri ihe atụ na-ekwu okwu?
▪ Olee otú ndị na-eso ụzọ Jisọs si gosipụta onwe ha ịbụ ndị dị iche pụọ n’ìgwè mmadụ ahụ?
▪ Nkọwa dị aṅaa ka Jisọs na-enye banyere ihe atụ nke ọgha mkpụrụ?
▪ Olee otú ndị na-eso ụzụ ahụ si dị iche pụọ n’ìgwè mmadụ ahụ nọ n’akụkụ mmiri?
▪ Òle ndị ma ọ bụ gịnị ka ọgha mkpụrụ ahụ, ubi ahụ, ezi mkpụrụ ahụ, onye iro ahụ, owuwe ihe ubi ahụ, na ndị na-ewe ihe ubi na-anọchi anya ha?
▪ Olee ihe atụ atọ ndị ọzọ Jisọs na-enye, gịnịkwa ka anyị pụrụ isi na ha mụta?