Isi 52
Jisọs Esite n’Ọrụ Ebube Zụọ Ọtụtụ Puku Mmadụ
NDỊ ozi 12 ahụ jere ozi kwesịrị ịrịba ama n’obodo Galili dum. Ugbu a, n’oge na-adịghị anya ka e gbusịrị Jọn, ha na-alọghachikwute Jisọs ịkọ akụkọ ahụmahụ ọma dị iche iche ha nwere. N’ịhụ na ike agwụsịwo ha, na ọtụtụ mmadụ na-abịakwa ma na-apụ nke na ha enweghị ohere ọ bụla ọbụna iji rie ihe, Jisọs sịrị: ‘Ka anyị wezụga onwe anyị iche n’ebe unu ga-ezurụtụ ike.’
Mgbe ha banyejuru n’ụgbọ ha, ma eleghị anya na nso nso Kapanaum, ha malitere ije ebe dị iche nke ihe àmà gosiri na ọ bụ n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan gabiga Betsaịda. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị hụrụ mgbe ha na-apụ, ndị ọzọ matakwara nke ahụ. Ndị a nile buuru ha ụzọ gbapụ, na-agba n’ogologo ụsọ mmiri ahụ, mgbe ha rutekwara n’ebe ahụ, ndị ahụ nọ ebe ahụ na-eche ha.
Mgbe Jisọs si n’ụgbọ ahụ pụta wee hụ ìgwè mmadụ ahụ, Jisọs nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, n’ihi na ha yiri atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ya mere, ọ gwọrọ ndị ha na-arịa ọrịa, malitekwa ịkụziri ha ọtụtụ ihe.
Oge na-agabiga ọsọ ọsọ, ndị na-eso ụzọ Jisọs wee bịakwute ya, na-asị: “Ebe a bụ ọhịa, chi na-ejikwa ugbu a: zilaga ha, ka ha wee jee n’ubi na obodo nta nile gburugburu, zụrụ onwe ha ihe ha ga-eri.”
Otú ọ dị, Jisọs zaghachiri, sị: “Unu onwe unu nye ha ihe ka ha rie.” Mgbe ahụ, ebe Jisọs matawororịị ihe ọ gaje ime, o lere Filip ule site n’ịjụ ya, sị: “Olee ebe anyị ga-azụta ogbe achịcha, ka ndị a wee rie ihe?”
Dị ka Filip si lee ya anya, nke ahụ agaghị ekwe omume. Ee, e nwere ihe dị ka 5,000 ndị ikom, na ma eleghị anya ihe karịrị 10,000 ma agụkọta ndị inyom na ụmụntakịrị! N’ihi ya, Filip zaghachiri, sị: “Ogbe achịcha [narị shilling abụọ] [otu shilling bụ ego a na-akwụ mmadụ maka ọrụ otu ụbọchị n’oge ahụ] agaghị ezu ha, ka mmadụ nile n’otu n’otu wee were nke nta nke nta.”
Eleghị anya iji gosi na ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume inye ọtụtụ mmadụ ha otú a nri, Andru tinyere ọnụ n’okwu ahụ wee sị: “Otu nwa okoro nta nọ n’ebe a, onye ji ogbe achịcha barley ise, na azụ abụọ,” na-ekwukwa, sị: “Ma ndị a bụ gịnị n’etiti ọtụtụ mmadụ dị otú a?”
Ebe ọ bụ na mgbe ahụ bụ oge opupu ihe ubi, nanị nwa oge tupu Ememe Ngabiga nke afọ 32 O.A., e nwere ọtụtụ ahịhịa ndụ dị n’ebe ahụ. Ya mere, Jisọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya gwa ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala n’elu ahịhịa ndụ ahụ n’ìgwè dị iche iche, iri ise iri ise na otu narị otu narị. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lee anya n’eluigwe, wee gọzie ha. Mgbe ahụ ọ malitere ịnyawa ogbe achịcha ndị ahụ na ikewa azụ ndị ahụ. O bunyere ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị mesịrị wee keere ya ìgwè mmadụ ahụ. N’ụzọ dị ịtụnanya, ha nile rijuru afọ!
Mgbe e mesịrị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Chịkọtanụ iberibe fọdụrụ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi.” Mgbe ha mere otú ahụ, ha chịkọtara nkata 12 nke ihe e rifọrọ erifọ! Matiu 14:13-21; Mak 6:30-44; Luk 9:10-17; Jọn 6:1-13.
▪ Gịnị mere Jisọs ji chọọ ka ndị ozi ya jee n’ebe dịpụrụ adịpụ?
▪ Olee ebe Jisọs kpọọrọ ndị na-eso ụzọ ya jee, gịnị mekwara na ha enwetaghị ezumike ha ji n’ihi ya jee ebe ahụ?
▪ Mgbe oge gamiworo, gịnị ka ndị na-eso ụzọ ya gbara ume ka e mee, ma olee otú Jisọs si lekọta ndị mmadụ ahụ?