ISI NKE 83
Jizọs Nyere Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri
Obere oge tupu e mee Ememme Ngabiga nke afọ 32, ndịozi Jizọs si ebe ha gara ikwusa ozi ọma lọta. Ike gwụchara ha, Jizọs agwa ha ka ha banye n’ụgbọ mmiri gaa Betseida zurutụ ike. Ma, mgbe ụgbọ ha ruwere n’akụkụ osimiri, Jizọs hụrụ na ọtụtụ puku mmadụ esorola ha rute ebe ahụ. Ọ bụ eziokwu na ọ chọrọ ka naanị ya na ndịozi ya nọrọ, ọ nabatara ndị ahụ nke ọma. Ọ gwọrọ ndị ọrịa ha kpọ bịa, malitekwa ịkụziri ha ihe. Ọ kụziiri ha banyere Alaeze Chineke ruo ná mgbede. Ma, mgbe o ruru mgbede, ndịozi ya gakwuuru ya, sị ya: ‘Agụụ abịala ndị a. Gwa ha ka ha lawa, ka ha nwee ike chọta ihe ha ga-eri.’
Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Ha ekwesịghị ịla. Nyenụ ha nri ka ha rie” ebe a. Ndịozi ya jụrụ ya, sị: ‘Ị̀ chọrọ ka anyị gaa zụtara ha nri?’ Filip, otu n’ime ndịozi ya, sịrị: ‘Ọ bụrụgodị na anyị nwejuru ego enweju, ọ gaghị ezu ịzụta nri ga-ezu ìgwè mmadụ a.’
Jizọs jụrụ ha, sị: ‘Ogbe achịcha ole ka unu nwere?’ Andru zara ya, sị: ‘Anyị nwere ogbe achịcha ise na obere azụ̀ abụọ. Ọ gatụdịghị ezu.’ Jizọs sịrị ha: ‘Wetaranụ m ogbe achịcha ndị ahụ na azụ̀ ndị ahụ.’ Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala n’elu ahịhịa n’ìgwè n’ìgwè. Ụfọdụ dị mmadụ iri ise, ụfọdụ adịrị otu narị. Jizọs weere achịcha na azụ̀ ndị ahụ lelie anya n’eluigwe ma kpee ekpere. Mgbe o kpechara ekpere, o nyere ha ndịozi ya, ha ekesaara ha ìgwè mmadụ ahụ. Puku ụmụ nwoke ise (5,000) na ụmụ nwaanyị na ụmụaka riri ihe oriri ahụ rijuo afọ. Mgbe ha richara, ndịozi Jizọs tụtụkọtara ihe ha rifọrọ ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi. Ihe ha tụtụkọtara juru nkata iri na abụọ. Ihe a bụ ezigbo ọrụ ebube, ọ́ bụghị ya?
Ihe a Jizọs mere dị ndị mmadụ mma nke na ha chọwara ime ya eze ha. Ma, Jizọs ma na oge Jehova ga-eme ya eze erubeghị. Ọ gwaziri ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa ma gwa ndịozi ya ka ha gafee Osimiri Galili. Ndịozi Jizọs banyere n’ụgbọ gawa, ya agawa n’ugwu naanị ya. Gịnị mere o ji gawa naanị ya? Ọ bụ maka na ọ chọrọ ịnọ naanị ya kpee ekpere. N’agbanyeghị na Jizọs nwere ọtụtụ ọrụ ọ na-arụ, ọ na-ewepụta oge mgbe niile ekpe ekpere.
“Unu arụla ọrụ maka nri nke na-ala n’iyi, kama rụọnụ ọrụ maka nri nke ga-adịru ebighị ebi, nke Nwa nke mmadụ ga-enye unu.”—Jọn 6:27