Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 56
  • Gịnị Na-emerụ Mmadụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Na-emerụ Mmadụ?
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị n’Eziokwu Na-emerụ Mmadụ?
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Gwọrọ Mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ndị Farisii Agbaa Nwoke Ahụ Kpuburu Ìsì Ajụjụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ọjụjụ Ndị Farisii Leziri Anya Jụ Ikwere
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 56

Isi 56

Gịnị Na-emerụ Mmadụ?

MMEGIDE a na-emegide Jisọs siwanyere ike. Ọ bụghị nanị na ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ ya, kamakwa ndị Juu bi na Judia na-achọ igbu ya, dịkwa ka ha mere mgbe ọ nọ na Jerusalem n’oge Ememe Ngabiga nke 31 O.A.

Ugbu a bụ Ememe Ngabiga nke 32 O.A. Ma eleghị anya, n’ịkwekọ n’ọchịchọ Chineke ka o jee, Jisọs gara Ememe Ngabiga ahụ na Jerusalem. Otú ọ dị, o ji akọ mee nke ahụ n’ihi na ndụ ya nọ n’ihe ize ndụ. Mgbe e mesịrị, ọ laghachiri Galili.

Eleghị anya, Jisọs nọ na Kapanaum mgbe ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ si Jerusalem bịakwute ya. Ha na-achọ ụzọ isi boo ya ebubo na ọ na-emebi iwu okpukpe. Ha na-ajụ sị, “N’ihi gịnị ka ndị na-eso ụzọ gị na-ejehie n’ozizi ndị okenye nyere anyị n’aka idebe? N’ihi na ha adịghị akwọ aka mgbe ọ bụla ha na-eri nri.” Nke a abụghị ihe Chineke chọrọ ka ha mee, ma ndị Farisii were ya ná mmehie dị oké njọ bụ́ mmadụ ịghara ime omenala nke a e nyere n’aka idebe nke gụnyere ịkwọ aka ruo n’ikpere aka.

Kama ịzaghachi ha banyere ebubo ha, Jisọs rụtụụrụ ha aka n’ajọ omume ha, na ojiji ha na-eji nlezianya emebi Iwu Chineke. Ọ chọrọ ịmara, “N’ihi gịnị ka unu onwe unu na-ejehiekwa n’ihe Chineke nyere n’iwu n’ihi ozizi e nyere unu n’aka? N’ihi na Chineke sịrị, Sọpụrụ nna gị na nne gị: na, onye kwujọrọ nna ma ọ bụ nne, ya nwụọ ọnwụ ahụ. Ma unu onwe unu na-asị, Onye ọ bụla nke ga-asị nna ya ma ọ bụ nne ya, Ihe ọ bụla ị ga-eritarị n’aka m bụ ihe e nyere Chineke; ọ gaghị asọpụrụ nna ya ma ọ bụ nne ya ma ọlị.”

N’ezie, ndị Farisii na-ezi na ego, ihe onwunwe, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ a raara nye Chineke dị ka onyinye bụ ihe dịịrị ụlọ nsọ, a gaghịkwa e ji ya mee ihe maka nzube ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, onyinye ahụ a raara nye ga-abụ nke onye nyere ya na-ejide. N’ụzọ dị otú ahụ, onye bụ nwa nwoke ịsị nanị n’ọnụ efu na ego ya ma ọ bụ ihe onwunwe ya bụ “kọban”​—⁠onyinye e nyere Chineke ma ọ bụ ụlọ nsọ​—⁠na-ewepụ onwe ya n’ibu ọrụ nke inyere ndị mụrụ ya meworo agadi aka, ndị ọ pụrụ ịbụ na ha nọ n’oké mkpa.

N’iwe iwe ziri ezi megide ngwagbu ọjọọ ndị Farisii na-agwagbu Iwu Chineke, Jisọs sịrị: “Unu na-emekwa okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu n’ihi ozizi e nyere unu n’aka idebe. Ndị ihu abụọ, Aịsaịa buru amụma nke ọma banyere unu, sị, Ndị nke a na-asọpụrụ m n’egbugbere ọnụ ha; ma obi ha dị anya n’ebe m nọ. Ma ha na-ebiri m isiala n’efu, na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu ka ha bụrụ ozizi ha.”

Eleghị anya ìgwè mmadụ ahụ nyere ohere ka ndị Farisii ahụ jụọ Jisọs ajụjụ. Ugbu a, mgbe ndị Farisii ahụ na-enweghị ike ịzaghachi okwu nkatọ Jisọs megide ha, ọ kpọrọ ìgwè mmadụ ahụ ka ha bịa ya nso. Ọ na-asị, “Nụrụnụ okwu m, unu nile, ghọtakwanụ: ọ dịghị ihe ọ bụla dị mmadụ n’ìhè nke pụrụ imerụ ya, ma ọ bụrụ na ọ baa n’ime ya: kama ihe si n’ime mmadụ pụta bụ ihe na-emerụ mmadụ.”

Mgbe e mesịrị, mgbe ha banyere n’ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “Ị̀ matawo na e mere ka ndị Farisii maa n’ọnyà, mgbe ha nụrụ okwu ahụ?”

Jisọs na-azaghachi sị, “A ga-efopu ihe ọkụkụ ọ bụla nke Nna m nke eluigwe na-akụghị. Hapụnụ ha: ha bụ ndị ndú kpuru ìsì. Ma ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”

Ọ yiri ka ọ tụrụ Jisọs n’anya mgbe Pita kwuchitere ọnụ ndị na-eso ụzọ ya, na-agwa ya ka o mee ka okwu ahụ o kwuru banyere ihe na-emerụ mmadụ doo ha anya. Jisọs na-azaghachi sị, “Unu onwe unu ọ̀ dịkwa n’enweghị nghọta wee ruo ugbu a? Ùnu atụgharịghị uche unu na ihe ọ bụla nke na-aba n’ọnụ na-aga n’afọ, e wee nyụpụ ya n’ụlọ nsị́? Ma ihe nke si n’ọnụ pụta na-esi n’ime obi apụta; ihe ndị a na-emerụkwa mmadụ. N’ihi na n’obi ka ajọ echiche nile, igbu mmadụ nile, ịkwa iko nile nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, ịkwa iko nile, ohi nile, àmà ụgha nile, nkwulu nile, si apụta: ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ: ma iwere aka a na-akwọghị akwọ iri ihe adịghị emerụ mmadụ.”

Jisọs adịghị ekwu okwu n’ebe a megide mmadụ ịdị ọcha. Ọ dịghị ekwu na mmadụ ekwesịghị ịkwọ aka ya tupu ya amalite isi nri ma ọ bụ iri nri. Kama nke ahụ, Jisọs na-akatọ omume ihu abụọ nke ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị ji ụzọ aghụghọ na-achọ imebi ụkpụrụ ezi omume nke Chineke site n’ịnọgidesi ike n’omenala e nyere n’aka idebe nke na-esiteghị n’Akwụkwọ nsọ. Ee, ọ bụ omume mmebi iwu bụ ihe na-emerụ mmadụ, Jisọs gosikwara na nke a na-esite n’obi mmadụ. Jọn 7:⁠1; Deuterọnọmi 16:16; Matiu 15:​1-20; Mak 7:​1-23; Ọpụpụ 20:12; 21:17; Aịsaịa 29:⁠13.

▪ Gịnị bụ mmegide nke Jisọs na-eche ihu ugbu a?

▪ Gịnị bụ ebubo ndị Farisii na-ebo Jisọs, ma dị ka Jisọs na-ekwu, n’ụzọ dị aṅaa ka ndị Farisii si elezi anya emebi Iwu Chineke?

▪ Olee ihe ndị Jisọs na-ekpughe na ha na-emerụ mmadụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya