Isi 71
Ọjụjụ Ndị Farisii Leziri Anya Jụ Ikwere
ỤJỌ tụrụ nne na nna nke onye arịrịọ ahụ kpuru ìsì na mbụ mgbe a kpọọrọ ha bịa n’ihu ndị Farisii. Ha maara na e kpebiwo isi n’ụlọ nzukọ chụpụ onye ọ bụla nke gosiri okwukwe n’ebe Jisọs nọ. Ụdị nkewapụ dị otú a pụọ ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’ógbè ebe o bi pụrụ ịkpata oké ihe isi ike, karịsịa nye ezinụlọ dara ogbenye. Ya mere nne na nna ahụ ji akọ mee ihe.
Ndị Farisii ahụ na-ajụ sị, “Onye a, ọ̀ bụ nwa unu, onye unu na-asị na a mụrụ ya n’ìsì? Ò sikwa aṅaa hụ ụzọ ugbu a?”
Nne na nna ahụ na-aza sị, “Anyị matara na onye a bụ nwa anyị, na a mụkwara ya n’ìsì: ma otú ọ na-ahụ ụzọ ugbu a, anyị amataghị; ma ọ bụ onye meghere anya ya, anyị onwe anyị amataghị.” Ọ ghaghị ịbụ na nwa ha agwawo ha ihe nile merenụ, ma n’ụzọ amamihe dị na ya nne na nna ahụ sịrị: “Jụọnụ ya; o ruwo dimkpa; ya onwe ya ga-ekwuru onwe ya.”
Ya mere, ndị Farisii ahụ kpọkwara nwoke ahụ ọzọ. N’oge a ha nwara ịmaja ya site n’ịkọ na ha enwetawo ihe àmà megide Jisọs iji gosi na ọ bụ onye iwu ji. Ha na-agwa ya sị, “Nye Chineke otuto: anyị onwe anyị matara na nwoke a bụ onye mmehie.”
Nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ adịghị agọnahụ ebubo ha, na-ekwu, sị: “Ma ọ̀ bụ onye mmehie, amataghị m.” Ma o kwukwasịrị: “Otu ihe ka m matara, na, ebe m kpuru ìsì, ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
N’ịgba mbọ iji chọta ntụpọ n’àmà ọ gbara, ndị Farisii ahụ jụrụ ọzọ, sị: “Gịnị ka o mere gị? Ò si aṅaa meghee anya gị?”
Nwoke ahụ na-eme mkpesa sị, “Agwara m unu ọbụna ugbu a, ma unu anụghị: gịnị mere unu na-achọ ịnụ ya ọzọ?” N’ụzọ na-akpali iwe, ọ jụrụ, sị: “Unu onwe unu ọ̀ na-achọkwa ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?”
Nzaghachi ya were ndị Farisii ahụ iwe nke ukwuu. Ha kwuru sị, “Gị onwe gị bụ onye na-eso ụzọ onye ahụ; ma anyị onwe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis. Anyị onwe anyị matara na Chineke agwawo Mosis okwu: ma onye a, anyị amataghị ebe o si pụta.”
N’igosi ịtụnanya, onye arịrịọ ahụ dị umeala n’obi zara, sị: “Ihe ebube dị na nke a, na unu onwe unu amataghị ebe o si pụta, ma o meghere anya m.” Olee nkwubi okwu a pụrụ irute site na nke a? Onye arịrịọ ahụ na-atụ aka n’ihe mmadụ nile kwere, sị: “Anyị matara na Chineke adịghị anụ olu ndị mmehie: kama ọ bụrụ na onye ọ bụla bụ onye na-ebi isiala nye Chineke, na-emekwa ihe ọ na-achọ, onye ahụ ka ọ na-anụ. Site na mmalite oge a ọ dịghị mgbe a nụrụ na onye ọ bụla meghere anya onye a mụrụ n’ìsì.” Ya mere, nkwubi okwu ya kwesịrị ido anya: “Ọ bụrụ na onye a esiteghị n’ebe Chineke nọ, ọ pụghị ime ihe ọ bụla.”
Ndị Farisii ahụ enweghị azịza ọ bụla nye ịrụ ụka dị otú a nke guzo kwem ma doo anya. Ha apụghị iche eziokwu ahụ ihu, ya mere ha kwutọrọ nwoke ahụ, sị: “A mụrụ nnọọ gị onwe gị n’ime mmehie, ọ̀ bụ gị onwe gị na-ezikwa anyị ihe?” Na nke a, ha tụpụrụ nwoke ahụ n’èzí, ma eleghịkwa anya na-achụpụ ya n’ụlọ nzukọ ahụ.
Mgbe Jisọs matara banyere ihe ha mere, ọ chọtara nwoke ahụ ma na-asị: “Gị onwe gị [ì] kwere n’Ọkpara Chineke?”
Ná nzaghachi, onye arịrịọ ahụ kpuru ìsì na mbụ na-ajụ, sị: “Ọ̀ bụkwa ònye, Onyenwe anyị, ka m wee kwere na ya?”
Jisọs na-azaghachi sị, “Onye gị na ya na-ekwu okwu bụ onye ahụ.”
Ozugbo, nwoke ahụ kpọrọ isiala n’ihu Jisọs ma na-asị: “Onyenwe anyị, ekwe m.”
Mgbe ahụ Jisọs kọwara, sị: “Ọ bụ ikpe ikpe ka mụ onwe m ji bịa n’ụwa nke a, ka ndị na-ahụghị ụzọ wee hụ; ka ndị hụrụ ụzọ wee ghọọkwa ndị ìsì.”
Na nke ahụ, ndị Farisii na-ege ntị jụrụ, sị: “Anyị onwe anyị ò kpukwara ìsì?” Ọ bụrụ na ha ga-ekweta na ha kpuru ìsì n’echiche, a ga-enwe ihe ngọpụ maka mmegide ha na-emegide Jisọs. Dị ka Jisọs gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, unu agaghị enwe mmehie.” Ma ha kpọrọ ekwo nkụ na-asị na ha ekpughị ìsì, nakwa na ha enweghị mkpa nke nghọta ime mmụọ. Ya mere Jisọs kwuru, sị: “Ma ugbu a unu na-asị, Anyị na-ahụ ụzọ: mmehie unu na-anọgide.” Jọn 9:19-41.
▪ Gịnị mere ụjọ ji na-atụ nne na nna nke onye arịrịọ ahụ kpuru ìsì na mbụ mgbe a kpọọrọ ha bịa n’ihu ndị Farisii, ya mere ha sikwa aṅaa zaghachi n’ụzọ akọ?
▪ Ndị Farisii ahụ si aṅaa nwaa ịmaja nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ?
▪ Ịrụ ụka dị aṅaa ezi uche dị na ya nke nwoke ahụ kpasuru ndị Farisii oké iwe?
▪ Gịnị mere na ndị Farisii ahụ enweghị ihe ngọpụ maka mmegide ha na-emegide Jisọs?