Isi 70
Ịgwọta Nwoke Kpuru Ìsì Site n’Ọmụmụ
MGBE ndị Juu nwara ịtụ Jisọs nkume, ọ hapụghị Jerusalem. Na mgbe ọzọ n’Ụbọchị Izu Ike, ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agagharị n’obodo ahụ mgbe ha hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site n’ọmụmụ. Ndị na-eso ụzọ Jisọs na-ajụ, sị: “Rabaị, ònye mehiere, onye a, ma ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere ka a mụọ ya n’ìsì?”
Ma eleghị anya, ndị na-eso ụzọ ahụ kwere, dị ka ndị rabaị ụfọdụ kwere, na mmadụ nwere ike imehie n’akpa nwa nne ya tupu a mụọ ya. Ma Jisọs na-aza, sị: “Onye a emehieghị, ndị mụrụ ya emehieghịkwa: kama ka ọrụ Chineke wee pụta ìhè n’ahụ ya.” Ìsì nwoke ahụ kpuru abụghị n’ihi mmehie ya ma ọ bụ nke ndị mụrụ ya mere. Mmehie nke Adam mbụ ahụ mere ka mmadụ nile ghọọ ndị na-ezughị okè, si otú a bụrụ ndị nwere ike inwe nkwarụ dị ka ịbụ onye ìsì site n’ọmụmụ. Nkwarụ dị otú a nyere ohere maka Jisọs ime ka ọrụ Chineke pụta ìhè.
Jisọs mesiri ịdị ngwa nke ọrụ ndị a ike. Ọ na-ekwu sị, “Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye zitere m, mgbe ụbọchị fọdụrụ: abalị na-abịa, mgbe ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịrụ ọrụ. Mgbe ọ bụla m nọ n’ụwa, abụ m ìhè nke ụwa.” Nwa mgbe nta, ọnwụ Jisọs ga-eweba ya n’ime ọchịchịrị nke ili ebe ọ na-agaghị enwekwa ike ime ihe ọ bụla ọzọ. Na nwa oge a, ọ bụ isi iyi nke ìhè nye ụwa.
Mgbe o kwusịrị ihe ndị a, Jisọs bụrụ asụ n’ala, jirikwa asọ mmiri ahụ gwọọ ájá. O were ya tee n’anya nwoke ahụ kpuru ìsì ma sị ya: “Jee saa mmiri n’ọdọ mmiri nta nke Saịloam.” Nwoke ahụ mere otú ahụ. Mgbe o mere otú ahụ, o nwere ike ịhụ ụzọ! Lee ụdị ọṅụ ọ ga-abụrụ ya ịhụ ụzọ nke mbụ ná ndụ ya mgbe ọ laghachiri!
Ndị agbata obi na ndị ọzọ matara ya nwere ihe ijuanya. Ha na-ajụ sị, “Onye a, ọ́ bụghị onye na-anọ ala na-arịọkwa arịrịọ?” Ụfọdụ ndị na-aza sị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ enweghị ike ikwere ya: “Ee e, kama o yiri ya.” Ma nwoke ahụ sịrị: “Mụ onwe m bụ ya.”
Ndị ahụ na-achọ ịmata sị, “È si aṅaa meghee anya gị?”
“Nwoke ahụ a na-akpọ Jisọs gwọrọ ájá, teekwa ya n’anya m abụọ, sị m, Jee Saịloam, saa mmiri: ya mere ejere m, saa mmiri, e wee mee ka m hụ ụzọ.”
Ha na-ajụ sị, “Olee ebe onye ahụ nọ?”
Ọ zara sị, “Amataghị m.”
Ndị ahụ wee duru onye ahụ kpuru ìsì na mbụ gakwuru ndị ndú okpukpe ha, bụ́ ndị Farisii. Ndị a n’onwe ha malitekwara ịjụ ya otú o si nwetaghachi ike ịhụ ụzọ ya. Nwoke ahụ na-akọwa sị, “Ọ tụkwasịrị ájá n’anya m abụọ, m wee saa mmiri, na-ahụkwa ụzọ.”
N’ezie, ndị Farisii ahụ kwesịrị isoro onye arịrịọ nke a a gwọrọ ọrịa ya ṅụrịkọọ ọṅụ! Ma kama nke ahụ, ha kwugidere Jisọs. Ha sịrị: “Nwoke a esiteghị n’ebe Chineke nọ.” Gịnị mere ha ji kwuo nke a? “N’ihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izu ike.” Ma mgbe ahụ ndị Farisii ndị ọzọ kwuru, sị: “Nwoke bụ onye mmehie si aṅaa [nwee ike] ime ihe ịrịba ama dị otú a?” Ya mere e nwere nkewa n’etiti ha.
Ya mere, ha jụrụ nwoke ahụ, sị: “Gịnị ka gị onwe gị na-ekwu banyere ya, n’ihi na o meghere anya gị?”
Ọ na-aza sị, “Ọ bụ onye amụma.”
Ndị Farisii ahụ jụrụ ikwere nke a. Ha kwenyesiri ike na ọ ghaghị ịdị nkwekọrịta nzuzo dị n’etiti Jisọs na nwoke a iji ghọgbuo ndị mmadụ. Ya mere, iji dozie okwu ahụ, ha kpọrọ ndị mụrụ onye arịrịọ ahụ ka a jụọ ha ajụjụ. Jọn 8:59; 9:1-18.
▪ Gịnị kpatara, gịnị bụkwa ihe na-akpataghị ikpu ìsì nke nwoke ahụ?
▪ Gịnị bụ abalị ahụ mgbe onye ọ bụla na-apụghị ịrụ ọrụ?
▪ Mgbe a gwọrọ nwoke ahụ, gịnị bụ mmeghachi omume nke ndị maara ya?
▪ Olee otú ndị Farisii si nwee nkewa banyere ọgwụgwọ nke nwoke a?