Isi 60
Ịhụ Onyinyo Ebube nke Alaeze Kraịst
JISỌS abatawo n’akụkụ ụfọdụ nke Sizaria Filipaị, ọ na-akụzikwara ìgwè mmadụ nke gụnyere ndị ozi ya ihe. Ọ na-amara ha ọkwà nke a dị ịtụnanya, sị: “N’ezie asị m unu, ụfọdụ dị n’etiti ndị guzoro n’ebe a, ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.”
Ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ịdị na-atụgharị uche sị, ‘Gịnị bụ ihe Jisọs na-ekwu?’ Mgbe ihe dị ka otu izu gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, Jemes, na Jọn, ha wee rịgoro n’ugwu dị elu. Ọ pụrụ ịbụ na mgbe ahụ bụ abalị, ebe ọ bụ na ndị na-eso ụzọ ya na-ero ụra. Ka Jisọs na-ekpe ekpere, e nwoghara ya n’ihu ha. Ihu ya ewee na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya na-achakwa ụcha dị ka ìhè.
Mgbe ahụ, mmadụ abụọ ndị a kọwara dị ka “Mosis na Elaịja” pụtara wee malite ịgwa Jisọs okwu banyere ‘ọpụpụ ọ ga-apụ site na Jerusalem.’ Ọ pụtara ìhè na ọpụpụ ahụ na-ezo aka n’ọnwụ Jisọs na mbilite n’ọnwụ ya nke ga-esochi. Otú a, nkwurịta okwu nke a gosiri na ọnwụ ihere ọ ga-anwụ bụ ihe a na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ dị ka Pita chọrọ.
Ugbu a n’ịmụrụ anya n’ụzọ zuru ezu, ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ekiri na-egekwa ntị site n’egwu. Ọ bụ eziokwu na nke a bụ ọhụụ, o yiri ihe na-eme eme nke na Pita malitere itinye ọnụ na nkwurịta okwu ahụ, na-asị: “Onyenwe anyị, ọ dị mma ka anyị nọ n’ebe a: ọ bụrụ na ị na-achọ, m ga-ama ụlọ ikwuu atọ n’ebe a; ka otu dịrị gị, ka otu dịkwara Mosis, ka otu dịkwara Elaịja.”
Ka Pita kpụ okwu n’ọnụ, igwe ojii na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere n’igwe ojii ahụ wee sị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma; nụrụnụ okwu ya.” Ka ha nụrụ olu ahụ, ndị na-eso ụzọ ya dara kpuchie ihu ha n’ala. Ma Jisọs sịrị: “Bilienụ, unu atụkwala egwu.” Mgbe ha biliri, ha ahụghị onye ọ bụla ma e wezụga Jisọs.
Ka ha si n’ugwu ahụ na-arịda n’echi ya, Jisọs na-enye iwu, sị: “Unu agwala onye ọ bụla ihe unu hụrụ, ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-esi na ndị nwụrụ anwụ bilie.” Ọhụhụ ha hụru Elaịja n’ọhụụ ahụ kpaliri ajụjụ n’uche ndị na-eso ụzọ ya. Ha na-ajụ sị, “Gịnị mere ndị odeakwụkwọ ji sịkwa na Elaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”
Jisọs na-azaghachi sị, “Elaịja abịaworị ugbu a, ha amazughịkwa ya.” Otú ọ dị, Jisọs na-ekwu banyere Jọn Onye Na-eme Baptism, nke rụzuru ọrụ yiri nke Elaịja. Jọn kwadebere ụzọ maka Kraịst, dị ka Elaịja mere maka Elaịsha.
Lee ihe mwusi ike ọhụụ nke a bụụrụ ma Jisọs ma ndị na-eso ụzọ ahụ! Ọhụụ ahụ dị ka a pụrụ ikwu ya, bụ onyinyo ebube nke Alaeze Kraịst. Dị ka ihe si n’ime ya pụta, ndị na-eso ụzọ ya hụrụ “Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya,” dị ka Jisọs kweworo nkwa ya otu izu tupu mgbe ahụ. Mgbe Jisọs nwụsịrị, Pita dere banyere ‘ọhụhụ ha ji anya ha hụ ịdị ukwuu nke ebube Kraịst mgbe ha na ya nọ n’ugwu ahụ dị nsọ.’
Ndị Farisii arịọwo ka Jisọs nye ha ihe àmà ga-egosi na ọ bụ onye ahụ e kwere nkwa ya n’Akwụkwọ nsọ na ọ ga-abụ Eze nke Chineke họpụtara. E nyeghị ha ihe ịrịba ama dị otú ahụ. Ma n’ụzọ dị iche, e kwere ka ndị na-eso ụzọ Jisọs ha na ya nwere mmekọrịta chiri anya hụ nnwogha Jisọs nwoghara dị ka ihe àmà mere ka amụma dị iche iche banyere Alaeze pụta ìhè. N’ihi nke a, Pita mesịrị dee, sị: “E mekwara ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị.” Matiu 16:13, Mt 16:28–17:13; Mak 9:1-13; Luk 9:27-37; 2 Pita 1:16-19.
▪ Olee otú ụfọdụ ndị si hụ Kraịst ka ọ na-abịa n’Alaeze ya tupu ha edetụ ọnwụ ire?
▪ N’ọhụụ ahụ, banyere gịnị ka Mosis na Elaịja so Jisọs na-ekwurịta okwu?
▪ Gịnị mere ọhụụ nke a ji bụrụ ihe mwusi ike nye ndị na-eso ụzọ ahụ?