Ụzọ Nnwogha Kraịst Si Emetụta Gị
Ndị ikom anọ ka rịgosịrị otu ugwu dị oké elu. N’ebe ahụ dị oké elu otu ihe dị ịtụnanya mere. Ka ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst atọ ndị nọ na-enwe ihe ijuanya nọ na-ekiri ihe na-emenụ, o mere mgbanwe n’anya ha. Gee ntị ka onye ahụ dere Oziọma bụ Mak kọọ ihe omume nke a na-akpali akpali:
“JISỌS chịịrị Pita na Jemes na Jọn tinyere onwe ya, o kuru ha rịgoo n’ugwu dị elu wee pụọ iche, nanị ha: o wee nwoghaa n’ihu ha: uwe ya nile wee na-enwupụ, na-acha oké ụcha; dị ka onye ọ bụla nke na-eme ka ákwà dị ọcha n’ụwa na-apụghị ime ka ha dị ọcha. E wee mee ka ha hụ Elaịja na Mosis: ha na Jisọs na-ekwurịtakwa okwu. Pita wee zaa, sị Jisọs, Rabaị, ọ dị mma ka anyị nọọ n’ebe a: ka anyị maakwa ụlọ ikwuu atọ; ka otu dịịrị gị, ka otu dịkwara Mosis, ka otu dịkwara Elaịja. N’ihi na ọ maghị ihe ọ ga-aza; n’ihi na ha na-atụ oké egwu. Igwe ojii wee bịa kpuchie ha: olu wee si n’igwe ojii ahụ pụta, sị, Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya: nụrụnụ okwu ya. Na mberede, mgbe ha lere anya gburugburu, ha ahụghị onye ọ bụla ọzọ, ma ọ bụghị nanị Jisọs, ya na ha.”—Mak 9:2-8.
Cheedị nnọọ echiche! Ihu Jisọs na-enwu enwu dị ka anyanwụ. (Matiu 17:2) Uwe ya na-egbukepụ egbukepụ, “dị ka onye ọ bụla nke na-eme ka ákwà dị ọcha n’ụwa na-apụghị ime ka ha dị ọcha.” A nụrụ ụda olu dị ike nke Chineke n’onwe ya ka ọ na-eme nkwupụta banyere Ọkpara ya. Lee nnọọ oké ihe omume nke ahụ bụ!
Okwu Grik nke a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “nwoghaa” pụtara “gbanwee gaa n’ụdị ọzọ.” Ọ pụtakwara ná Ndị Rom 12:2, ebe e nyere ndị Kraịst ndụmọdụ ka “e nwoghaa” ha site n’ime ka uche ha bụrụ ihe ọhụrụ.—An Expository Dictionary of New Testament Words, nke W. E. Vine dere, Mpịakọta IV, peji 148.
Ee, oké ihe omume weere ọnọdụ mgbe e nwoghara Jisọs n’oge ụfọdụ mgbe Ememe Ngabiga nke afọ 32 O.A. gasịrị. Gịnị dujere n’ọrụ ebube nke a? Ò nwere nzube pụrụ iche? N’ihi gịnị ka o ji metụta Mosis na Elaịja? Oleekwa ụzọ nnwogha Kraịst si metụta gị?
Ihe Ndị Mere Tupu nke a
Tupu ha agbagoo n’ugwu ahụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na gburugburu Sizaria Filipaị. Ebe ọ bụ na obodo nke a dị ihe dị ka 25 kilomita n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke Ugwu Heamọn, ọ pụrụ ịbụ na nnwogha ahụ weere ọnọdụ n’otu n’ime ugwu ndị dị elu dị na ya.
Mgbe ha zọọrọ ije na-eje “n’ugwu dị elu,” Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Ònye ka ndị mmadụ na-asị na mụ onwe m bụ?’ Ha zara, sị: “Jọn Baptist: ndị ọzọ sịkwa, Elaịja; ma ndị ọzọ sị, Otu n’ime ndị amụma.” Mgbe ahụ Kraịst jụrụ, sị: “Ma ọ̀ bụ onye ka unu onwe unu si na m bụ?” Pita zaghachiri, sị: “Gị onwe gị bụ Kraịst ahụ.” Mgbe nke ahụ mere, Jisọs “wee dọọ ha aka ná ntị ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla okwu banyere ya. O wee malite izi ha, na Nwa nke mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ, na ndị okenye na ndị isi nchụaja na ndị odeakwụkwọ aghaghịkwa ịjụ ya, na a ghaghị igbu ya, na ọ ghaghịkwa isi n’ọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị.”—Mak 8:27-31.
Jisọs gara n’ihu ikwe nkwa nke a, sị: “N’etiti ndị guzoro nso ụfọdụ dị n’ebe a, ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị, ruo mgbe ha ga-ahụ alaeze Chineke ka ọ bịaworo n’ike.” (Mak 9:1; Matiu 16:28) E mezuru nkwa nke a “mgbe ụbọchị isii gasịrị,” mgbe Jisọs nọ na-ekpe ekpere, e wee nwoghaa ya n’ihu Pita, Jemes, na Jọn. Luk kwuru na nke a mere “mgbe ụbọchị asatọ gasịrị,” n’ihi na ma eleghị anya ọ gụnyekọtara ụbọchị e kwere nkwa ahụ na ụbọchị o mezuru.—Matiu 17:1, 2; Mak 9:2; Luk 9:28.
Ọ Bụghị Nrọ ma ọ bụ Ihe Na-emeghị Eme
Nnwogha Jisọs abụghị nrọ. Ndị ozi atọ ahụ agaghị arọworị otu nrọ ahụ, Jisọs kpọkwara ya ‘ọhụụ.’ Nke ahụ adịghị egosi ihe na-emeghị eme n’ezie, n’ihi na n’ebe ọzọ, a sụgharịrị okwu ahụ e jiri mee ihe na Matiu 17:9 ịbụ ‘ihe a hụrụ.’ (Ọrụ 7:31) Ya mere, ndị hụrụ ihe ndị ahụ mụ nnọọ anya, ha jikwa anya ha hụ, jirikwa ntị ha nụ ihe na-emenụ n’ezie.—Luk 9:32.
N’ịbụ onye mụ anya ma n’amaghị ihe ọ ga-ekwu, Pita tụrụ aro ka ha guzobe ụlọ ikwuu atọ—maka Jisọs, Mosis, na Elaịja n’otu n’otu. (Luk 9:33) Ihe àmà gosiri na igwe ojii ahụ nke kwụkọtara mgbe Pita na-ekwu okwu gosiri ọnụnọ nke Chineke nọ n’elu ugwu ahụ, dị ka ọ dị n’ụlọ ikwuu nzute nke Israel n’ọzara ahụ. (Ọpụpụ 40:34-38; Luk 9:34) O dokwara anya na ndị ozi ahụ agaghị na-ehi ụra mgbe “Chineke, bụ́ Nna” kwupụtara, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara: nụrụnụ okwu ya.”—2 Pita 1:17, 18; Luk 9:35.
Ihe Mere E Ji Hụ Mosis
Mgbe nnwogha ahụ weere ọnọdụ, Mosis ‘amaghị ihe ọ bụla,’ n’ihi na ọ nwụworị ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. (Eklisiastis 9:5, 10) Dị ka Devid, a kpọlitebeghị ya n’ọnwụ, n’ihi nke ahụ, ọ nọghịkwa n’ebe ahụ n’onwe ya. (Ọrụ 2:29-31) Ma n’ihi gịnị ka e ji hụ Mosis na Kraịst n’ọhụụ nke a?
Chineke agwawo Mosis, sị: “M ga-eme ka onye amụma, nke dị ka gị, biliere ha site n’etiti ụmụnne ha; m ga-etinyekwa okwu m nile n’ọnụ ya, ọ ga-agwakwa ha okwu nile nke m ga-enye ya n’iwu.” (Deuterọnọmi 18:18) Pita kọwara amụma nke a kpọmkwem dị ka nke metụtara Jisọs Kraịst. (Ọrụ 3:20-23) E wezụga Jisọs, Mosis bụ onye amụma kasị ukwuu Chineke ziteere mba Israel.
E nwere myirịta dị iche iche n’etiti Mosis na Mosis ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst. Dị ka ihe atụ, mgbe ha bụ ụmụaka, ndị ọchịchị aka ike tinyere ndụ ha abụọ n’ihe ize ndụ, ma Chineke hụrụ na e chebere ụmụ ọhụrụ ahụ. (Ọpụpụ 1:20–2:10; Matiu 2:7-23) Ha abụọ buru ọnụ 40 ụbọchị ná mmalite nke ozi ha jere dị ka ndị ohu pụrụ iche nke Jehova. (Ọpụpụ 24:18; 34:28; Deuterọnọmi 9:18, 25; Matiu 4:1, 2) Mosis na Jisọs rụkwara ọrụ ebube site n’ike Chineke.—Ọpụpụ 14:21-31; 16:11-36; Abụ Ọma 78:12-54; Mak 4:41; Luk 7:18-23; Jọn 14:11.
Chineke jiri Mosis mee ihe ịnapụta Israel site n’agbụ nke Ijipt, ọbụna dị ka Jisọs si eweta ntọhapụ nke ime mmụọ. (Ọpụpụ 12:37–14:31; Jọn 8:31, 32) Mosis nwere ihe ùgwù nke ịbụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ dị n’etiti Chineke na ụmụ Israel, ebe Jisọs bụ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. (Ọpụpụ 19:3-9; 34:3-7; Jeremaịa 31:31-34; Luk 22:20; Ndị Hibru 8:3-6; 9:15) Jehova jikwara Mosis mee ihe imere Onwe ya aha n’ihu ụmụ Israel, ndị Ijipt, na ndị ọzọ, dị nnọọ ka Jisọs Kraịst meworo ka aha nsọ Jehova dị ukwuu. (Ọpụpụ 9:13-17; 1 Samuel 6:6; Jọn 12:28-30; 17:5, 6, 25, 26) Site n’ime ka Mosis soro Jisọs ahụ nke e nwoghara enwogha pụtakọọ, Chineke gosiri na Kraịst ga-eje ozi n’ọnọdụ ndị a n’ụzọ dị ukwuu karị.
Ihe Mere E Ji Hụ Elaịja
Ọ bụ ezie na a kpọlitebeghị onye amụma ahụ nwụrụ anwụ bụ Elaịja n’ọnwụ, o kwesịrị ekwesị ka ọ pụta n’ọhụụ nnwogha ahụ. Elaịja rụrụ ọrụ dị ukwuu n’iweghachite ofufe dị ọcha na ido aha Jehova nsọ n’etiti ụmụ Israel. Jisọs Kraịst mere otu ihe ahụ mgbe ọ nọ n’elu ala, ọ ga-emekwa ihe dị ukwuu ọbụna karị n’iweghachite okpukpe dị ọcha na iwepụ Nna ya nke eluigwe n’ụta site n’Alaeze Mesaịa ahụ.
Malakaị onye amụma gosiri na ọrụ Elaịja sere onyinyo ọrụ a gaje ịrụ n’ọdịnihu. Site n’ọnụ Malakaị, Chineke sịrị: “Mụ onwe m na-ezitere unu Elaịja, bụ́ onye amụma, tupu oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa. Ọ ga-emekwa ka obi ndị bụ nna chigharịkwute ụmụ ha, ka obi ụmụ chigharịkwutekwa ndị bụ nna ha; ka m wee ghara ịbịa were iwezụga ka e bibie ya tigbuo ụwa.”—Malakaị 4:5, 6.
Amụma nke a nwere mmezu ya dị nta n’ọrụ nke Jọn Onye Na-eme Baptism. Jisọs mere ka nke a pụta ìhè mgbe nnwogha ahụ gasịrị, mgbe ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe mere ndị odeakwụkwọ ji kwuo na Elaịja aghaghị ibu ụzọ bịa—tupu mpụta nke Mesaịa ahụ. Jisọs sịrị: “Ọ bụ ezie na Elaịja na-abịa, ọ ga-emekwa ka ihe nile dị ka ha dị na mbụ: ma asị m unu, na Elaịja abịaworị ugbu a, ha amazughịkwa ya, kama ha mere n’ahụ ya ka ihe ha chọrọ hà. Ọbụna otú a ka ha gaje imekwa ka Nwa nke mmadụ hụọ ahụhụ.” Ihe ndekọ ahụ kwukwara, sị: “Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ gwara ha okwu banyere Jọn Baptist.”—Matiu 17:10-13.
Jọn rụrụ ọrụ yiri nke Elaịja mgbe o mere ndị Juu baptism, bụ́ ndị chegharịrị ná mmehie ha megide ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Nke ka mkpa, Jọn butere Mesaịa ahụ ụzọ, kọwapụtakwa Jisọs Kraịst. (Matiu 11:11-15; Luk 1:11-17; Jọn 1:29) Ma n’ihi gịnị ka ọrụ Jọn ji bụrụ nanị mmezu dị nta nke amụma Malakaị?
N’ọhụụ nke a, a hụrụ ka Elaịja na-akpanyere Jisọs ụka. Nke a bụ mgbe ọnwụ Jọn Onye Na-eme Baptism gasịrị, wee si otú a na-egosi na a gaje ịrụ ọrụ Elaịja ahụ n’ọdịnihu. Ọzọkwa, amụma ahụ gosiri na a gaje ịrụ ọrụ nke a tupu “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova.” Ihe omume ahụ nke na-abịa ọsọ ọsọ gụnyere “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” na Ha–Magedọn, ma ọ bụ Amagedọn. (Mkpughe 16:14-16) Nke a pụtara na a gaje ibu ụzọ rụọ ọrụ kwekọrọ n’ọrụ Elaịja na onye sochiri ya, bụ́ Elaịsha, rụrụ, tupu nguzobe nke ahụ a gaje iguzobe Alaeze eluigwe Chineke n’ọdịnihu. Ruokwa ihe karịrị otu narị afọ, Ndịàmà Jehova nke oge a anọwo na-arụ ọrụ metụtara mweghachi nke ofufe dị ọcha na ibuli aha Chineke elu.—Abụ Ọma 145:9-13; Matiu 24:14.
Nzube Ya
Nnwogha ahụ aghaghị iwusiworị Jisọs ike maka ahụhụ na ọnwụ ọ gaje izute. Ịnụ ka Nna ya nke eluigwe kwuru okwu banyere ya dị ka Ọkpara Ya nke ọ nwapụtaworo aghaghị iwusiworị okwukwe Jisọs ike. Ma gịnị ka nnwogha ahụ meere ndị ọzọ?
Nnwogha Jisọs wusikwara okwukwe nke ndị ahụ hụrụ ya ike. Ọ kụnyere n’ime uche ha eziokwu ahụ nke bụ na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke. N’ezie, ebe Ọnụ Bụ Isi nke Na-ekwuru Jehova, bụ́ Okwu ahụ, nọ n’etiti ha mgbe ahụ, ọ bụ olu Chineke n’onwe ya ka ha nụrụ mgbe o kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma.” Ọ bụ ezie na Jehova agbawo àmà yiri nke ahụ mgbe e mere Jisọs baptism, n’oge nnwogha ahụ, Chineke kwukwara na ndị ahụ na-eso ụzọ kwesịrị ige Ọkpara Ya ntị.—Matiu 3:13-17; 17:5; Jọn 1:1-3, 14.
Nnwogha ahụ bụkwa ihe na-ewusi okwukwe ike n’ụzọ ọzọ. N’oge ọhụụ ahụ, Jisọs, “Mosis,” na “Elaịja” kwuru okwu banyere “ọlịla ya, nke [Kraịst] gaje imezu na Jerusalem.” (Luk 9:31) A sụgharịrị okwu ahụ bụ “ọlịla” site n’ụdị okwu Grik ahụ bụ eʹxo·dos. Ihe àmà gosiri na ọpụpụ, ma ọ bụ ọlịla nke a metụtara ma ọnwụ Jisọs ma mkpọlite Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ gaa ná ndụ dị ka mmụọ. (1 Pita 3:18) Ya mere nnwogha ahụ wusiri okwukwe ike ná mbilite n’ọnwụ nke Kraịst. O wulitere okwukwe karịsịa site n’inye ihe àmà na-eme ka anyị kwere na Jisọs gaje ịbụ Eze nke Alaeze Mesaịa Chineke. Ọzọkwa, ọhụụ ahụ gosiri na Alaeze ahụ ga-abụ ihe dị ebube.
Nnwogha ahụ wusikwara okwukwe ike n’amụma dị n’Akwụkwọ nsọ. Mgbe ihe dị ka 32 afọ gasịrị (n’ihe dị ka afọ 64 O.A.), Pita ka chetara ahụmahụ nke a wee dee, sị: “Ee e, ọ bụghị site n’ịgbaso akụkọ ụgha e ji nkà chepụta ka anyị mere ka unu mara ike na ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, kama ọ bụ site n’ịbụ ndị ji anya ha hụ ịdị ukwuu ya. N’ihi na ọ natara n’aka Chineke, bụ́ Nna, nsọpụrụ na ebube, mgbe e kwuru okwu ndị yiri nke a site n’ebube ahụ dị ukwuu: ‘Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye mụ onwe m nwapụtaworo.’ Ee, a nụrụ ka okwu ndị a si n’eluigwe daa mgbe anyị na ya nọ n’ugwu nsọ ahụ. N’ihi nke a, a na-eme ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị; unu na-emekwa nke ọma n’ịṅa ya ntị dị ka oriọna nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọcha, kpakpando isi ụtụtụ wee biliekwa, n’ime obi unu.”—2 Pita 1:16-19, NW.
Ihe Ọ Pụtara nye Gị
Ee, Pita lere nnwogha Jisọs anya dị ka nkwado siri ike nke okwu amụma Chineke. Ọ pụkwara ịbụ na Jọn onyeozi zoro aka n’ọhụụ nke a mgbe o kwuru, sị: “Okwu ahụ wee ghọọ anụ ahụ, bụ́ mmadụ, o wee biri n’etiti anyị, (anyị kirikwara otuto ya, bụ́ otuto dị ka otu nwa nwoke a mụrụ nanị ya na-anata n’aka nna ya), o jupụtara n’amara na eziokwu.” (Jọn 1:14) N’otu aka ahụ, nnwogha ahụ pụrụ iwulite okwukwe nke gị onwe gị n’okwu amụma Jehova.
Nnwogha ahụ na ihe omume ndị e jikọrọ ha na ya pụrụ iwusi okwukwe gị ike na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke na Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ọ pụrụ iwusi ike nkwenye i kwenyere ná mbilite n’ọnwụ Jisọs gaa ná ndụ dị ka mmụọ n’eluigwe. Ọhụụ nke a dị ịtụnanya kwesịkwara ịmụba okwukwe i nwere n’ọchịchị Chineke, n’ihi na nnwogha ahụ bụ nhụta bu ụzọ nke ebube Kraịst na ike Alaeze.
Ọ bụ ihe na-ewusi okwukwe ike karịsịa ịmara na nnwogha Kraịst zoro aka n’ụbọchị anyị a, mgbe ọnụnọ Jisọs bụ ihe dị adị n’ezie. (Matiu 24:3-14) Kemgbe 1914, ọ nọwo na-achị achị dị ka Eze Chineke họpụtara n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, a gaje iji ikike na ike Chineke nyeworo ya mee ihe megide ndị iro nile nke ọchịchị Chineke, na-emeghe ụzọ maka ụwa ọhụrụ. (2 Pita 3:13) Ị pụrụ inweta ọṅụ ná ngọzi ya ndị na-adịghị agwụ agwụ ma ọ bụrụ na i nwee okwukwe n’ihe ndị ahụ dị ebube e gosipụtara ná nnwogha nke Jisọs Kraịst.