Isi 63
Ndụmọdụ Ọzọkwa Maka Ịgbazi Olu
MGBE ndị na-eso ụzọ Jisọs ka nọ n’ụlọ ahụ dị na Kapanaum, a tụlere ihe ọzọ ma e wezụga nrụrịta ụka nke ndị ozi ahụ banyere onye kasị ukwuu. Ọ pụrụ ịbụ na ihe nke a mekwara ka ha na-alọta na Kapanaum, mgbe Jisọs n’onwe ya na-anọghị ebe ahụ. Onyeozi bụ Jọn na-akọ, sị: “Anyị hụrụ otu onye ka ọ na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị: anyị wee gbochie ya, n’ihi na ọ dịghị eso anyị.”
O doro anya na Jọn na-ewere ndị ozi ahụ dị ka ndị pụrụ iche, òtù ndị a ma ama dị ka ndị na-agwọ ọrịa. Ya mere ọ na-eche na nwoke ahụ na-arụ ọrụ ndị dị ike n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị n’ihi na o soghị n’òtù ha.
Otú ọ dị, Jisọs dụrụ ọdụ, sị: “Unu egbochila ya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla nke ga-arụ ọrụ dị ike n’aha m, nke ga-apụkwa ikwujọ m ọsọ ọsọ. N’ihi na onye na-adịghị emegide anyị dịịrị anyị. N’ihi na onye ọ bụla nke ga-ekuru otu iko mmiri nye unu ṅụọ, n’ihi na unu bụ ndị nke Kraịst, n’ezie asị m unu, na ọ gaghị atụfu ụgwọ ọrụ ya ma ọlị.”
Ọ dịghị mkpa na nwoke ahụ aghaghị ịdị na-eso Jisọs n’ụzọ a na-ahụ anya tupu ọ bụrụ na ọ nọ n’akụkụ ya. A ka eguzobeghị ọgbakọ ndị Kraịst n’oge ahụ, ya mere na ọ nọghị n’òtù ha apụtaghị na ọ nọ ná nzukọ dị iche. Nwoke a nwere okwukwe n’ezie n’aha Jisọs wee si otú a na-enwe ihe ịga nke ọma n’ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Ọ na-eme ihe yiri nnọọ ihe Jisọs sịrị na e kwesịrị ịkwụ ụgwọ ọrụ n’ihi ya. Jisọs gosiri na n’ihi ime nke a, ọ gaghị atụfu ụgwọ ọrụ ya.
Ma gịnị ma ọ bụrụ na nwoke a enwee ihe ịsụ ngọngọ n’ihi okwu na omume nke ndị ozi ahụ? Nke a ga-abụ ihe dị njọ nke ukwuu! Jisọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke ga-eme otu n’ime ndị nta ndị a ndị kwerenụ ka ọ maa n’onyà, ọ ga-aka ya mma ma e were nkume igwe nri nke ịnyịnya ibu na-adọkpụgharị kwụba ya n’olu, tụba ya n’oké osimiri.”
Jisọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị iwepụ ihe ọ bụla ná ndụ ha nke dị oké ọnụ ahịa nye ha, dị ka aka, ụkwụ, ma ọ bụ anya, nke pụrụ iwetara ha ihe ịsụ ngọngọ. Ọ ka mma ịbanye n’Alaeze Chineke n’enweghị ihe ndị a dị oké ọnụ ahịa karịa ijigidesi ha ike ma bụrụ onye a tụbara na Gehena (ebe a na-esu ihe ndị e kpofuru ekpofu ọkụ nke dị nso na Jerusalem), nke bụ ihe atụ ịla n’iyi ebighị ebi.
Jisọs dọkwara aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka unu ghara ilelị otu n’ime ndị nta ndị a anya; n’ihi na asị m unu, na mgbe nile ndị mmụọ ozi ha n’eluigwe na-elegide ihu Nna m nke bi n’eluigwe.” O nyeziri ihe atụ banyere ịdị oké ọnụ ahịa nke “ndị nta” mgbe ọ na-akọ banyere otu nwoke nwere narị atụrụ, otu n’ime ha wee fuo. Jisọs na-akọwa na nwoke ahụ ga-ahapụ 99 nke fọrọ wee gaa chọọ nke ahụ furu efu, mgbe ọ chọtakwara ya, ọ ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’isi ya karịa n’isi 99 ahụ. Jisọs na-ekwubi sị, “Otú a ọ bụghị ihe a chọrọ n’ihu Nna unu nke bi n’eluigwe, ka otu n’ime ndị nta ndị a laa n’iyi.”
Eleghị anya n’iburu n’uche ụka ndị ozi ya rụrụ n’etiti onwe ha, Jisọs gbara ume, sị: “Nweenụ nnú n’ime unu, unu na ibe unu dịkwa n’udo.” A na-eme ka nri ndị na-adịghị ụtọ dị ụtọ karị site n’itinye ha nnú. Otú a, nnú ihe atụ na-eme ka ihe mmadụ na-ekwu dị mfe ịnakwere karị. Inwe nnú dị otú ahụ ga-enye aka ịhụ na udo dị.
Ma n’ihi ezughị okè mmadụ, esemokwu ndị siri ike ga-apụta mgbe ụfọdụ. Jisọs na-enyekwa ihe nduzi banyere otú a ga-esi dozie ha. Jisọs na-ekwu sị, “Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jee, tụọ ya mmehie ya n’anya n’etiti nanị gị na ya abụọ: ọ bụrụ na ọ nụrụ olu gị, i ritara nwanna gị n’uru.” Ọ bụrụ na o geghị ntị, Jisọs dụrụ ọdụ, sị, “kuru otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ tinyere onwe gị, ka e wee mee okwu ọ bụla e kwuru ka o guzo n’ọnụ ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ.”
Nanị dị ka ihe ikpeazụ a ga-eme, Jisọs kwuru ka e wegara “nzukọ” okwu ahụ, ya bụ, iwegara ya ndị nlekọta kwesịrị ekwesị nke ọgbakọ, bụ́ ndị nwere ike inye mkpebi ikpe ziri ezi. Ọ bụrụ na onye mmehie ahụ agaghị ekwenyere mkpebi ha, Jisọs na-ekwubi sị, “ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ.”
N’ime mkpebi dị otú ahụ, ndị nlekọta aghaghị ịdaberesi ike na ndụmọdụ nile dị n’Okwu Jehova. N’ụzọ dị otú ahụ, mgbe ha chọpụtara na iwu mara mmadụ nakwa na o kwesịrị ka a taa ya ahụhụ, ikpe ahụ ‘ga-abụworị nke e bu ụzọ kee agbụ n’eluigwe.’ Mgbe ha “ga-atọpụ n’elu ụwa,” ya bụ, chọpụta na ikpe amaghị onye ahụ, a ‘tọpụworị ya n’eluigwe.’ N’okwu ikpe ndị dị otú ahụ, Jisọs kwuru sị, “ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọworo n’aha m, n’ebe ahụ ka m nọ n’etiti ha.” Matiu 18:6-20; Mak 9:38-50; Luk 9:49, 50.
▪ Gịnị mere na ọ dịghị mkpa n’ụbọchị Jisọs ịdị na-esogharị ya?
▪ Ruo ókè hà aṅaa ka ime ka onye dị nta sụọ ngọngọ dị njọ, oleekwa otú Jisọs si na-enye ihe atụ banyere ịdị mkpa nke ndị nta dị otú ahụ?
▪ Gịnị ma eleghị anya na-akpali Jisọs inye agbamume ka ndị na-eso ụzọ ya nwee nnú n’ime ha?
▪ Gịnị ka ‘ike agbụ’ na ‘ịtọhapụ’ pụtara?