Isi 64
Ihe Mmụta Banyere Ịgbaghara Mmehie
O DORO anya na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ka nọ n’ime ụlọ ahụ dị na Kapanaum. Ya na ha anọwo na-ekwurịta ụzọ ha ga-esi dozie nsogbu dị iche iche n’etiti ụmụnna, ya mere, Pita na-ajụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ugbo ole ka nwanna m ga-emehie megide m, ewee m gbaghara ya?” Ebe ọ bụ na ndị ozizi okpukpe ndị Juu na-akwado ịgbaghara mmehie ruo ugbo atọ, eleghị anya Pita chere na ọ bụ omume obi ọma ịtụ aro sị, ‘ọ̀ bụ ruo ugbo asaa?’
Ma echiche ọ bụla nke idebe ihe ndekọ dị otú ahụ ezighị ezi. Jisọs gbaziri Pita olu, sị: “Ọ bụghị, Ruo ugbo asaa, kama, Ruo ugbo iri asaa na asaa.” (NW) Ọ na-egosi na e kwesịghị ịkpa ókè ugbo ole Pita ga-agbaghara nwanna ya.
Iji kụnye n’uche ndị na-eso ụzọ ya ọrụ dịịrị ha ịnọgide na-agbaghara ibe ha, Jisọs nyere ha ihe atụ. Ọ bụ banyere otu eze nke chọrọ ka ya na ndị ohu ya pịazie ego. A kpọtaara ya otu ohu ya nke ji ya ụgwọ buru ibu, bụ́ 60,000,000 denari. Ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọ ga-esi kwụọ ya. Ya mere, dị ka Jisọs kọwara, eze ahụ nyere iwu ka e ree ya na nwunye ya na ụmụ ya ka e wee jiri ego ha kwụọ ụgwọ ahụ.
Na nke a, ohu ahụ dara n’ụkwụ onyenwe ya, na-arịọ, sị: “Nwee ogologo ntachi obi n’ahụ m, na m ga-akwụghachi gị ihe nile.”
N’ịbụ onye a kpaliri ọmịiko ya n’ebe ọ nọ, onyenwe ya ji obi ebere kagbuo oké ụgwọ ohu ahụ ji ya. Jisọs gara n’ihu ịkọ na n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ohu ahụ pụrụ, hụ otu n’ime ndị ohu ibe ya nke ji ya nanị 100 denari. Nwoke ahụ pịgidere ohu ibe ya n’akpịrị wee na-atọgbu ya, na-asị: “Kwụghachi m ihe i ji.”
Ohu ibe ya enweghị ego ahụ. Ya mere ọ dara n’ụkwụ ohu ahụ nke o ji ụgwọ, na-arịọ, sị: “Nwee ogologo ntachi obi n’ahụ m, na m ga-akwụghachi gị.” N’adịghị ka onyenwe ya, ohu ahụ emeghị ebere, o wee were ohu ibe ya tụba n’ụlọ mkpọrọ.
Ya mere, Jisọs gara n’ihu ịsị ndị ohu ibe ya, bụ́ ndị hụrụ ihe mere gara kọọrọ onyenwe ha. O wee jiri iwe kpọọ ohu ahụ. Ọ na-asị, “Ajọ ohu, agbaghaara m gị ụgwọ ahụ nile, n’ihi na ị rịọrọ m: ó kwesịghịkwa gị imere ohu ibe gị ebere ọbụna dị ka mụ onwe m meere gị ebere?” Site n’oké iwe, onyenwe ya raara ya nye n’aka ndị mmekpa ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụsị ụgwọ nile o ji.
Ya mere Jisọs mechiri okwu ya site n’ịsị: “Otú a ka Nna m nke eluigwe ga-emekwa unu, ọ bụrụ na unu agbagharaghị, onye ọ bụla mmehie nwanne ya, site n’obi unu.”
Lee ezi ihe mmụta banyere ịgbaghara mmehie nke a bụ! Iji ya tụnyere mmehie dị ukwuu nke Chineke gbagharaworo anyị, mmehie ọ bụla nke nwanna anyị bụ onye Kraịst mehieworo megide anyị dị nnọọ nta. Karịa nke ahụ, Jehova Chineke agbagharawo anyị ọtụtụ puku ugbo. Ọbụna ọtụtụ mgbe anyị adịghị amata mmehie anyị mere megide ya. N’ihi ya, ọ̀ bụ na anyị apụghị ịgbaghara nwanne anyị ugbo ole na ole a sịgodi na e nwere ezi ihe mere a ga-eji taa ya ụta. Dị ka Jisọs ziri n’Ozizi Elu Ugwu, cheta na Chineke ga-agbaghara anyị “ụgwọ nile anyị ji, dị ka anyị onwe anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ.” Matiu 18:21-35; 6:12; Ndị Kọlọsi 3:13.
▪ Gịnị kpaliri ajụjụ Pita banyere ịgbaghara nwanna ya, n’ihi gịnịkwa ka ọ pụrụ iji bụrụ na ọ na-ele aro ya nke ịgbaghara ugbo asaa anya dị ka ihe na-egosi obi ọma?
▪ Olee otú nzaghachi eze ahụ n’arịrịọ ohu ya si dị iche na nke ohu ahụ n’arịrịọ nke ohu ibe ya?
▪ Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe atụ Jisọs?