ISI NKE 14
Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-agbaghara
Ọ̀ DỊTỤWO mgbe mmadụ mejọrọ gị?— Ò mere ihe wutere gị ka ọ̀ gwara gị okwu ọjọọ?— Ì kwesịrị imeso ya ihe otú ahụ o si mesoo gị?—
Ọ bụrụ na mmadụ emee ha ihe wutere ha, ọtụtụ ndị ga-emegwara onye ahụ ihe ga-ewute ya. Ma, Jizọs kụziri na anyị kwesịrị ịgbaghara ndị mejọrọ anyị. (Matiu 6:12) Ọ bụrụkwanụ na mmadụ na-eme anyị ihe ọjọọ ọtụtụ ugboro? Ugboro ole ka anyị kwesịrị ịgbaghara ya?—
Nke ahụ bụ ihe Pita chọrọ ịmata. Ya mere, otu ụbọchị, ọ jụrụ Jizọs, sị: ‘Èkwesịrị m ịnọgide na-agbaghara ruo ugboro asaa?’ Ugboro asaa ezughị. Jizọs sịrị: ‘Ị ga-agbaghara ya ruo ugboro iri asaa na asaa’ ma ọ bụrụ na onye ahụ emejọọ gị ruo ugboro ole ahụ.
Gịnị ka Pita chọrọ ịmata banyere mgbaghara?
Nke ahụ bụ nnọọ ọtụtụ ugboro! Anyị agadịghị echeta ihe ọjọọ mmadụ mere anyị ma ọ bụ okwu ọjọọ ọ gwara anyị ruo ugboro ole ahụ, ọ́ bụghị ya? Ihe Jizọs nọkwa na-agwa anyị bụ: Anyị ekwesịghị ịgbalị icheta ugboro ole ndị ọzọ mejọrọ anyị. Ọ bụrụ na ha arịọ ka anyị gbaghara ha, anyị kwesịrị ịgbaghara ha.
Jizọs chọrọ igosi ndị na-eso ụzọ ya otú ịdị na-agbaghara ndị ọzọ dịruru nnọọ ná mkpa. Ya mere, mgbe ọ zasịrị ajụjụ Pita, ọ kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya otu akụkọ. Ị̀ chọrọ ịnụ akụkọ ahụ?—
O ruru otu oge, e nwere otu eze bụ́ ezi mmadụ. O nwere obiọma nke ukwuu. Ọ na-agbazinye ọbụna ndị ohu ya ego mgbe ha chọrọ enyemaka. Ma, o ruru otu ụbọchị, eze ahụ chọrọ ka ndị ohu ya ji ya ụgwọ kwụọ ya ụgwọ ha ji ya. A kpọbatara otu ohu nke ji eze ahụ ụgwọ nde mkpụrụ ego 60. Ọ bụghị obere ego!
Gịnị mere mgbe ohu ahụ rịọrọ eze ahụ ka o nyetụkwuo ya oge iji kwụọ ụgwọ o ji?
Ma, ohu ahụ emefusịwo ego ahụ dum eze gbazinyere ya, o nweghịkwa ike ịkwụ eze ahụ ụgwọ o ji ya. Ya mere, eze ahụ nyere iwu ka e ree ya. Eze ahụ sịkwara ka e ree nwunye ya na ụmụ ya na ihe nile o nwere. A ga-ejizi ego e retara kwụọ eze ụgwọ ya. Olee otú i chere obi dị ohu ahụ n’ihi ihe a?—
O gburu ikpere n’ala n’ihu eze ahụ rịọ ya, sị: ‘Biko, nyetụkwuo m oge, m ga-akwụ gị ụgwọ nile m ji gị.’ A sị na ọ bụ gị bụ eze ahụ, gịnị ka ị gaara eme ohu ahụ?— Eze ahụ nwere ọmịiko n’ebe ohu ya nọ. Ya mere, eze ahụ gbaghaara ya. Ọ gwara ohu ahụ ka ọ gharazie ịkwụghachi ya ego ahụ, ọbụna otu kobo n’ime nde mkpụrụ ego 60 ahụ. Lee obi ụtọ ohu ahụ na-aghaghị inweworị!
Ma, gịnịzi ka ohu ahụ mere? Ọ pụrụ wee hụ ohu ọzọ, onye ji ya ụgwọ nanị otu narị mkpụrụ ego. Ọ tọgidere ohu ibe ya ahụ aka n’akpịrị chọọ ịtọgbu ya, na-asị: ‘Kwụọ m otu narị mkpụrụ ego i ji m n’ụgwọ!’ Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche na mmadụ ga-eme ihe dị otú a, karịsịa mgbe eze gbagharasịịrị ya ego buru ibu o ji n’ụgwọ?—
Olee otú ohu ahụ si mesoo ohu ibe ya nke na-enweghị ike ịkwụ ya ụgwọ o ji ya?
Ohu ahụ nke ji ụgwọ nanị otu narị mkpụrụ ego dara ogbenye. Ọ pụghị ịkwụ ego ahụ ozugbo. Ya mere, ọ dara n’ala n’ụkwụ ohu ibe ya wee rịọ ya, sị: ‘Biko, nyetụkwuo m oge, m ga-akwụ gị ụgwọ nile m ji gị.’ Nwoke ahụ ò kwesịrị inyetụkwu ohu ibe ya ahụ oge?— Gịnị ka ị gaara eme?—
Nwoke a enweghị obiọma otú eze ahụ nwere. Ọ chọrọ ego ya ozugbo. N’ihi na ohu ibe ya ahụ enweghị ike ịkwụ ego ahụ, o kwuru ka a tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. Ndị ohu ndị ọzọ hụrụ mgbe ihe a nile mere, o wutekwara ha. Ha mechiteere ohu ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ ebere. Ya mere, ha gara kọọrọ ya eze ahụ.
Ihe ahụ merenụ wutekwara eze. O wesoro ohu ahụ na-adịghị agbaghara iwe nke ukwuu. Ya mere, ọ kpọrọ ya, sị ya: ‘Gị ajọ ohu, ọ̀ bụ na mụ agbagharaghị gị ụgwọ i ji m? Ya mere, ọ̀ bụ na i kwesịghị ịgbaghara ohu ibe gị?’
Gịnị ka eze ahụ mere ohu ahụ na-adịghị agbaghara?
Ohu ahụ na-adịghị agbaghara kwesịrị ịmụtaworị ihe site n’aka eze ahụ bụ́ ezi mmadụ. Ma, ọ mụtaghị ihe. Ya mere, eze ahụ kwuziri ka a tụba ohu ahụ n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe ọ kwụrụ nde mkpụrụ ego 60 ahụ o ji n’ụgwọ. N’ezie, ọ dịghịkwa mgbe ọ pụrụ ịnọ n’ụlọ mkpọrọ kpata ego iji kwụọ eze ahụ ụgwọ ya. Ya mere, ọ ga-anọgide ebe ahụ nwụọ.
Mgbe Jizọs kọsịrị akụkọ a, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: ‘N’otu ụzọ ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu adịghị agbaghara nwanna ya site n’obi unu.’—Matiu 18:21-35.
Ị hụlanụ, anyị nile ji Chineke ụgwọ buru ibu. N’ezie, ndụ anyị si n’aka Chineke! Ya mere, ihe ndị ọzọ ji anyị n’ụgwọ dị ntakịrị ma e jiri ya tụnyere ihe anyị ji Chineke n’ụgwọ. Ihe ha ji anyị n’ụgwọ yiri otu narị mkpụrụ ego ahụ ohu ahụ ji ibe ya n’ụgwọ. Ma, ihe anyị ji Chineke n’ụgwọ n’ihi ihe ọjọọ anyị na-eme yiri nde mkpụrụ ego 60 ahụ ohu ahụ ji eze ahụ n’ụgwọ.
Chineke nwere nnọọ obiọma. Ọ bụ ezie na anyị emewo ihe ndị na-adịghị mma, ọ na-agbaghara anyị. Ọ dịghị eme ka anyị kwụọ ụgwọ ha site n’ịnapụ anyị ndụ anyị ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ihe mmụta ọ dị mkpa ka anyị na-echeta bụ: Chineke na-agbaghara anyị nanị ma ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị mejọrọ anyị. Nke ahụ bụ ihe anyị kwesịrị ichebara echiche, ọ́ bụghị ya?—
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ arịọ gị ka ị gbaghara ya?
Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ emee gị ihe ọjọọ ma sị gị ndo, gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-agbaghara ya?— O meekwanụ ya ọtụtụ ugboro? Ị̀ ka ga-agbaghara ya?—
Ọ bụrụ na ọ bụ anyị na-arịọ ka a gbaghara anyị, anyị ga-achọ ka onye ahụ gbaghara anyị, ọ́ bụghị ya?— Ya mere, anyị kwesịrị ịgbaghara ya. Anyị agaghị ekwu nanị n’ọnụ na anyị agbagharawo ya, kama anyị kwesịrị n’ezie ịgbaghara ya site n’obi anyị. Mgbe anyị mere nke ahụ, anyị na-egosi na anyị chọrọ n’ezie ịbụ ụmụazụ nke Onye Ozizi Ukwu ahụ.
Iji ghọta otú ịbụ ndị na-agbaghara dịruru mkpa, ka anyị gụọkwa Ilu 19:11; Matiu 6:14, 15; na Luk 17:3, 4.