Isi 72
Jisọs Ezipụ 70 Mmadụ Ndị ahụ
Ọ BỤ n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke 32 O.A., bụ kpọmkwem afọ atọ kemgbe e mesịrị Jisọs baptism. Ya na ndị na-eso ụzọ ya ka gasịrị Ememe Ụlọ Ikwuu na Jerusalem, ọ ghaghị ịbụkwa na ha ka nọ nso n’ebe ahụ. N’ezie, Jisọs nọrọ ọnwa isii nke fọdụụrụ ya iji jezuo ozi ya na Judia ma ọ bụkwanụ n’akụkụ nke ọzọ nke Osimiri Jọdan n’ókèala Perea. Ọ ghaghị ijekwa ozi n’ókèala nke a.
N’eziokwu, mgbe Ememe Ngabiga nke 30 O.A. gabigara, Jisọs kwusara ozi ọma ihe dị ka ọnwa asatọ na Judia. Ma mgbe ndị Juu nwara igbu ya n’ebe ahụ n’ememe Ngabiga nke 31 O.A., o ji otu afọ na ọkara nke na-esonu na-ezi ihe n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nanị na Galili. N’oge ahụ ọ zụlitere òtù nzukọ buru ibu nke ndi nkwusa a zụrụ nke ọma, bụ́ nke ọ na-enweghị na mbụ. Ya mere ugbu a, ọ malitere mkpọsa ikpeazụ dị ike nke ịgba àmà na Judia.
Jisọs malitere mkpọsa nke a site n’ịhọrọ 70 ndị na-eso ụzọ ma zipụ ha abụọ abụọ. Ya mere ná ngụkọta, e nwere 35 òtù dị iche iche nke ndị nkwusa Alaeze ga-arụ ọrụ n’ókèala ahụ. Ndị a bu ya ụzọ gaa n’obodo nile na ebe nile Jisọs na-achọ ịga, nke ihe àmà na-egosi na ndị ozi ya so ya jee.
Kama ịgwa 70 mmadụ ndị a ka ha gaa n’ụlọ nzukọ ndị Juu, Jisọs gwara ha ka ha gaa n’ebe obibi ndị mmadụ, na-akọwa, sị: “Ma ụlọ ọ bụla unu ga-aba n’ime ya, burunụ ụzọ sị, Udo dịrị ụlọ a. Ọ bụrụkwa na onye udo nọ n’ebe ahụ, udo unu ga-anọkwasị ya.” Gịnị ga-abụ ozi ha ga-ezi? Jisọs na-asị, “Sịkwanụ ha, Alaeze Chineke dị unu nso.” Banyere ije ozi nke 70 mmadụ ndị a, akwụkwọ bụ Matthew Henry’s Commentary na-akọ, sị: “Dị ka Onyenwe ha, n’ebe ọ bụla ha rutere, ha kwusara ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.”
Ndụmọdụ Jisọs nyere 70 mmadụ ndị a dịkwa ka nke o nyere ndị ozi 12 ya mgbe o zipụrụ ha ná mkpọsa ozi ọma na Galili ihe dị ka otu afọ tupu oge a. Ọ bụghị nanị na ọ dọrọ 70 mmadụ ndị a aka ná ntị banyere mmegide ha ga-eche ihu, ma kwadebe ha iche ozi ahụ n’ihu ndị mmadụ, o nyekwara ha ike ịgwọ ndị ọrịa. Otú a, mgbe Jisọs ga-erute n’oge na-adịghị anya, ọtụtụ ga-adị njikere ige Onyenwenụ ahụ ntị, bụ́ onye ndị na-eso ụzọ ya nwere ike ime ihe ebube ndị dị otú a.
Ọrụ nkwusa 70 mmadụ ndị a na ọrụ Jisọs ji sochie ya dịrị nanị nwa oge. N’oge na-adịghị anya, òtù ndị nkwusa Alaeze ahụ malitere ịlaghachikwute Jisọs. Ha ji ọṅụ na-ekwupụta sị, “Onyenwe anyị, ọbụna ndị mmụọ ọjọọ ka a na-edo n’okpuru anyị n’aha gị.” Ụdị ezi akụkọ ije ozi dị otú a aghaghị inyeworị Jisọs ọṅụ, n’ihi na ọ zaghachiri, sị: “Ahụrụ m Setan ka ọ dararịị dị ka àmụ̀mà pụọ n’eluigwe. Lee, enyewo m unu ike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ.”
Jisọs maara na mgbe a mụsịrị Alaeze Chineke n’oge nke ọgwụgwụ ihe nile, na a ga-achụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. Ma ugbu a, ụmụ mmadụ nkịtị ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ a na-adịghị ahụ anya nọ dị ka ihe ọzọ na-emesi obi ike banyere ihe ahụ ga-ewere onọdụ n’ọdịnihu. Ya mere, Jisọs kwuru banyere ọdịda Ekwensu ga-ada n’oge dị n’ihu site n’eluigwe dị ka kpọmkwem ihe e ji n’aka na ọ ghaghị ime. Ya mere ọ bụ n’ụzọ ihe atụ ka e nyeworo 70 mmadụ ndị a ikike nke ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ. Ma Jisọs kwuru, sị: “Unu aṅụrịla ọṅụ na nke a, na a na-edo ndị ajọ mmụọ n’okpuru unu; ma ṅụrịanụ ọṅụ na e dewo aha unu n’akwụkwọ n’eluigwe.”
Jisọs nwere oké ọṅụ ma too Nna ya n’ihu ọha n’ihi iji ndị a na-eje ozi, bụ́ ndị dị umeala n’obi mee ihe n’ụzọ dị ike otú a. Ka o chigharịkwuuru ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị: “Ngọzi na-adịrị anya na-ahụ ihe unu na-ahụ: n’ihi na asị m unu, na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze chọrọ ịhụ ihe unu onwe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha; na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ha.” Luk 10:1-24; Matiu 10:1-42; Mkpughe 12:7-12.
▪ Ebee ka Jisọs kwusara ozi ọma n’afọ atọ mbụ nke ije ozi ya, oleekwa ókèala nke ọ gazuru n’ọnwa isii nke ikpeazụ?
▪ Ebee ka Jisọs gwara 70 mmadụ ndị a ka ha chọta ndị mmadụ?
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji sị na ya hụrụ ka Setan dawororịị site n’eluigwe?
▪ N’echiche dị aṅaa ka 70 mmadụ ndị ahụ na-azọkwasị agwọ na akpị ụkwụ?