Isi 77
Okwu Banyere Ihe Nketa
IHE àmà gosiri na ndị ahụ maara na Jisọs anọwo na-eri nri n’ụlọ onye Farisii ahụ. Ya mere ọtụtụ puku n’ime ha zukọtara n’èzí na-echere mgbe Jisọs ga-apụta. N’adịghị ka ndị Farisii ndị na-emegide Jisọs ma na-anwa ijide ya ma o kwuo ihe na-ezighị ezi, ndị ahụ ji mmasị na-ege ya ntị nke ọma.
Ka o bu ụzọ chee ndị na-eso ụzọ ya ihu, Jisọs sịrị: “Na-ezenụ ihe ndị Farisii, bụ́ ihe na-eko achịcha, nke bụ ihu abụọ.” Dị ka e gosipụtara n’oge nri ahụ, usoro nile nke okpukpe ndị Farisii jupụtara n’ihu abụọ. Ma ọ bụrịị eziokwu na a pụrụ izobe ajọ omume ndị Farisii site n’ime nsọ nsọ n’ihu ọha, e mesịa a ga-ekpughe ya. Jisọs na-asị, “Ọ dịghị ihe ọ bụla e kpuchiworo ekpuchi, nke a na-agaghị ekpughe: ọ dịghịkwa ihe e zoro ezo, nke a na-agaghị ama.”
Jisọs gara n’ihu ikwughachi okwu agbamume ahụ nke ọ gwara ndị ikom 12 ahụ mgbe o zipụrụ ha ịga njem nke ikwusa ozi ọma na Galili. Ọ na-asị: “Unu atụla egwu ndị na-egbu ahụ, ma e mesịa ha enweghị ihe ọzọ karị nke ahụ ha ga-eme.” Ebe ọ bụ na Chineke adịghị echefu ọbụna otu nwa nnụnụ egwele, Jisọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na Chineke agaghị echefu ha. O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla ha kuuru unu bịa n’ihu ụlọ nzukọ, na ndị isi, na ndị na-achị isi, . . . mmụọ nsọ ga-ezi unu n’oge hour ahụ ihe unu na-aghaghị ikwu.”
Otu nwoke n’ìgwè mmadụ ahụ biliri kwuo okwu. Ọ na-eme mkpesa sị, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kere ihe nketa anyị nye m.” Iwu Mosis depụtara na nwa nwoke mbụ ga-anata òkè abụọ n’ihe nketa, ya mere e kwesịghị inwe ihe ọ bụla ga-eweta esemokwu. Ma o doro anya na nwoke ahụ chọrọ ihe karịrị òkè ruuru ya n’ihe nketa ahụ.
N’ụzọ ziri ezi Jisọs jụrụ itinye onwe ya na nke a. Ọ na-ajụ sị, “Nwoke, ònye mere m ka m bụrụ onye ikpe ma ọ bụ onye okike n’ebe unu nọ?” Mgbe ahụ o nyere ìgwè mmadụ ahụ ndụmọdụ dị mkpa, sị: “Lezienụ anya, debekwanụ onwe unu ka unu ghara inwe anyaukwu ọ bụla: n’ihi na ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.” Ee, n’agbanyeghị otú ihe mmadụ nwere pụrụ ịha, dị ka o si adị, ọ ga-anwụ ma hapụsịa ha nile. Iji mesie eziokwu nke a ike, na iji gosi nzuzu nke dị n’ịghara iwulite aha ọma n’ebe Chineke nọ, Jisọs jiri ihe atụ mee ihe. Ọ kọwara, sị:
“Ala otu ọgaranya mịrị mkpụrụ hie nne: o wee tụgharịa n’obi ya, sị, Gịnị ka m ga-eme, n’ihi na enweghị m ebe ikpokọta mkpụrụ m? O wee sị, Nke a ka m ga-eme: m ga-eweda ọba m, wuokwa nke ka ukwuu; n’ebe ahụ ka m ga-ekpokọta ọka m nile na ezi ihe m nile. M ga-asịkwa mkpụrụ obi m, Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ezi ihe e debere nye gị ruo ọtụtụ afọ; na-ezu ike, na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ka obi na-atọ gị ụtọ. Ma Chineke sịrị ya, Onye na-enweghị uche, n’abalị a ka a na-achọ mkpụrụ obi gị; n’aka gị’ ma ihe i doziri, ònye ga-enwe ha?”
Ná mmechi, Jisọs kwuru, sị: “Otú a ka ọ dị, bụ́ onye na-akpadoro onwe ya akụ̀, ma ọ bụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” Ebe ọ pụrụ ịbụ na a gaghị amata ndị na-eso ụzọ ahụ n’ọnyà site ná nzuzu nke ibukọba ihe onwunwe, ọ pụrụ ịdị mfe ịdọrọ mmasị ha pụọ n’iji obi ha nile fee Jehova n’ihi nchegbu ndị a na-enwe ná ndụ kwa ụbọchị. Ya mere Jisọs ji ohere a nyeghachi ndụmọdụ ọma ahụ o nyeworo ihe dị ka otu afọ na ọkara gara aga n’Ozizi Elu Ugwu ya. N’iche ihu n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ọ sịrị:
“N’ihi nke a ka m ji sị unu, Unu echegbula onwe unu nye ndụ unu, ihe unu ga-eri; echegbukwala onwe unu nye ahụ unu, ihe unu ga-eyi. . . . Tụgharịanụ uche n’ugoloọma, na ha adịghị agha mkpụrụ, ha adịghị ewekwa ihe ubi; nke na-enweghị ime ụlọ nta ma ọ bụ ọba; ma Chineke na-azụ ha. . . . Tụgharịanụ uche n’urodi, otú ha na-eto eto: ha adọgbughị onwe ha n’ọrụ, ha atụghịkwa ogho; ma asị m unu, Ọbụna Solomọn n’ebube ya nile, e gbokwasịghị ya ákwà dị ka otu n’ime ndị a. . . .
“Unu onwe unu achọkwala ihe unu ga-eri, na ihe unu ga-aṅụ, unu enwekwala obi abụọ. N’ihi na ihe ndị a nile ka mba nile nke ụwa na-achọ: ma Nna unu na-amata na ihe ndị a dị unu mkpa. Otú ọ dị, chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a.”
E kwesịrị ịtụle okwu ndị a nke Jisọs karịsịa n’oge ihe isiike ego. Onye chegbubigara onwe ya ókè banyere mkpa anụ ahụ ya ma malite ịdaghachi azụ n’ịchụso ihe ime mmụọ na-egosi n’ezie na ya enweghị okwukwe n’ike Chineke nwere inye ndị ohu Ya ihe na-akpa ha. Luk 12:1-31; Deuterọnọmi 21:17.
▪ N’ihi gịnị, ma eleghị anya, ka nwoke ahụ ji jụọ ajụjụ banyere ihe nketa, ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs nyekwara?
▪ Ihe atụ dị aṅaa ka Jisọs ji mee ihe, oleekwa isi ihe dị na ya?
▪ Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs nyeghachiri, gịnịkwa mere o ji kwesị ekwesị?