Isi 89
Njem Obi Ebere n’Ime Judia
IZU ole na ole tupu mgbe ahụ, n’oge Ememe Nraranye e mere na Jerusalem, ndị Juu nwara igbu Jisọs. Ya mere o mere njem gaa n’ebe ugwu, nke o doro anya na ọ bụ n’ebe na-adịghị anya n’Osimiri Galili.
N’oge na-adịghị anya, ọ malitekwara ịga ebe ndịda ọzọ n’ụzọ chere ihu na Jerusalem, na-ekwusa ozi ọma ka ọ na-aga n’obodo nta ndị dị na Perea, bụ́ ógbè dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan. Mgbe ọ kọsịrị akụkọ banyere ọgaranya ahụ na Lazarọs, ọ gara n’ihu izi ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị o ziworo ha mbụ mgbe ha nọ na Galili.
Dị ka ihe atụ, ọ sị na ọ ga-abụ ihe baara mmadụ uru karị “ma a kwụba ya nkume igwe nri n’olu, tụbakwa ya n’oké osimiri” karịa onye ahụ ime ka otu n’ime “ndị nta ndị a” nke Chineke sụọ ngọngọ. Ọ mesikwara mkpa ọ dị ike ịgbaghara mmehie, na-akọwa, sị: “Ọ bụrụkwa na [nwanna] mehiere megide gị ugbo asaa n’otu ụbọchị, wee chigharịa ọzọ n’ebe ị nọ ugbo asaa, sị, Echegharịa m; ị ga-agbaghara ya.”
Mgbe ndị na-eso ụzọ ahụ rịọrọ sị, “Tụkwasịrị anyị okwukwe,” Jisọs zara, sị: “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe dị ka mkpụrụ mustard, unu ga-asị osisi sycamine nke a, Ka e fopu gị, kụọkwa gị n’oké osimiri; ọ ga-aṅakwa unu ntị.” Ya mere ọbụna okwukwe dị nta pụrụ ịrụzu ihe buru ibu.
Ọzọ, Jisọs na-akọ banyere ọnọdụ ihe na-eme eme ná ndụ nke na-akọwa àgwà kwesịrị ka onye na-ejere Chineke nke pụrụ ime ihe nile ozi nwee. Jisọs gara n’ihu ikwu sị, “Ma ònye n’etiti unu, a sị na o nwere ohu nke na-arụ ọrụ ubi ma ọ bụ nke na-azụ atụrụ, ga-asị ya, mgbe o si n’ubi bata n’ụlọ, Bịa ngwa ngwa nọdụ ná nri; nke na-agaghị asịkwa ya kama nke ahụ, Dozie ihe m ga-eri ná nri anyasị, keekwa ihe okike n’úkwù gị, na-ejere m ozi, ruo mgbe m risịrị ṅụọkwa; ma e mesịa gị onwe gị ga-eri ṅụọkwa? Ò nwere ekele n’ebe ohu ahụ nọ n’ihi na o mere ihe a kaworo aka? Otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu ga-emesi ihe nile a kaworo aka nye unu, sịnụ, Anyị bụ ohu ndị na-abaghị n’ihe; anyị emewo ihe anyị ji ụgwọ ime.” Otú a, ndị na-ejere Chineke ozi ekwesịghị iche mgbe ọ bụla na ha na-emere Chineke ihe ọma site n’ijere ya ozi. Kama nke ahụ, ha kwesịrị icheta mgbe nile ihe ùgwù ha nwere ife ya ofufe dị ka ndị òtù ezinụlọ ya ọ tụkwasịrị obi.
O yiri ka ọ bụ nwa ntakịrị oge mgbe Jisọs nyesịrị ihe atụ nke a ka otu onye na-eje ozi gbabatara. Ọ bụ Meri na Mata zipụrụ ya, bụ́ ụmụnne nwanyị Lazarọs, onye bi na Betani nke Judia. Onye ozi ahụ na-ekwu, sị “Onyenwe anyị, lee, ahụ nke onye ahụ ị hụrụ n’anya adịghị ike.”
Jisọs na-azaghachi, sị: “Nrịanrịa nke a abụghị nke ọnwụ, kama ọ bụ n’ihi otuto Chineke, ka e wee nye Ọkpara Chineke otuto site na ya.” Mgbe ọ nọsịrị ụbọchị abụọ n’ebe ahụ ọ nọ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị jee Judia ọzọ.” Otú ọ dị, ha chetaara ya, sị: “Rabaị, ugbu a ka ndị Juu na-achọ ụzọ ịtụ gị nkume; ị̀ na-ejekwa ebe ahụ ọzọ?”
Jisọs jụrụ ná nzaghachi sị, “Ọ́ bụghị oge hour iri na abụọ dị n’ehihie? Ọ bụrụ na onye ọ bụla ejegharịa n’ehihie, ọ dịghị asụ ngọngọ, n’ihi na ọ na-ahụ ìhè nke ụwa nke a. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ejegharịa n’abalị, ọ na-asụ ngọngọ, n’ihi na ìhè adịghị n’ime ya.”
Ihe ọ dị ka Jisọs o bu n’uche bụ na ‘hour ehihie,’ ma ọ bụ oge Chineke wepụtara maka ozi Jisọs n’elu ụwa, agwụsịbeghị, ruokwa mgbe ha ga-agwụsị, ọ dịghị onye pụrụ imerụ ya ahụ. Ọ dị ya mkpa iji nwa oge nta nke ‘ehihie’ fọdụụrụ ya mee ihe n’ụzọ zuru ezu, ebe ọ bụ na e mesịa ‘abalị’ ga-abịa, bụ́ mgbe ndị iro ya ga-egbuworị ya.
Jisọs kwukwara, sị: “Enyi anyị Lazarọs adawo n’ụra; ma ana m aga, ka m wee kpọtee ya n’ụra.”
O doro anya na ọ bụ n’ihi na ha bu n’uche na Lazarọs na-ezu ike site n’ihi ụra, na nke a bụkwa ihe àmà doro anya na ahụ ya ga-adị ya mma, mere ndị na-eso ụzọ ahụ ji zaghachi, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ dawo n’ụra, a ga-azọpụta ya.”
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha hoo haa, sị: “Lazarọs nwụrụ anwụ. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi unu na adịghị m n’ebe ahụ, ka unu wee kwere; otú ọ dị, ka anyị jekwuru ya.”
N’ịmata na a pụrụ igbu Jisọs na Judia, ma na-achọkwa ịkwado ya, Tọmas gbara ndị na-eso ụzọ ibe ya ume, sị: “Ka anyị onwe anyị jeekwa, ka anyị wee soro ya nwụọ.” Ya mere ọ bụ site n’itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ ka ndị na-eso ụzọ ahụ ji soro Jisọs na njem ya nke obi ebere n’ime Judia. Luk 13:22; 17:1-10; Jọn 10:22, 31, 40-42; 11:1-16.
▪ Ebee ka Jisọs nọworo na-eje ozi n’oge na-adịbeghị anya?
▪ Ozizi ndị dị aṅaa ka Jisọs na-akụzighachi, oleekwa ọnọdụ ihe na-eme eme ná ndụ nke o na-akọwa iji mee ka gịnị pụta ìhè?
▪ Olee akụkọ Jisọs natara, gịnịkwa ka o bu n’uche mgbe ọ na-asị ‘ehihie’ na ‘abalị’?
▪ Gịnị ka Tọmas bu n’uche mgbe ọ na-asị, “Ka anyị onwe anyị jeekwa, ka anyị wee soro ya nwụọ”?