Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 93
  • Mgbe E Kpughere Nwa nke Mmadụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe E Kpughere Nwa nke Mmadụ
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Ga-ekpughe Nwa nke Mmadụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ì Jikerewo Maka Ụbọchị Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Kwadebe Maka Mgbapụta Banye n’Ime Ụwa Ọhụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 93

Isi 93

Mgbe E Kpughere Nwa nke Mmadụ

MGBE Jisọs ka nọ n’ebe ugwu (na Sameria ma ọ bụ na Galili), ndị Farisii jụrụ ya banyere ọbịbịa nke Alaeze ahụ. Ha kwere na ọ ga-eji oké ngosipụta na ihe omume dị ukwuu wee bịa, ma Jisọs na-asị: “Alaeze Chineke adịghị abịa mgbe mmadụ na-eche nche: ha agaghị asịkwa, Lee, n’ebe a! ma ọ bụ, n’ebe ahụ! n’ihi na lee, alaeze Chineke dị n’etiti unu.”

Okwu ndị ahụ Jisọs kwuru, nke bụ “n’etiti unu” abụrụwo nke a sụgharịrị mgbe ụfọdụ ịbụ “n’ime unu.” Ya mere ndị ụfọdụ echewo na Jisọs na-asị na Alaeze Chineke na-achị achị n’ime obi nke ndị na-ejere Chineke ozi. Ma, o doro anya na Alaeze Chineke anọghị n’ime obi nke ndị Farisii ahụ na-ekweghị ekwe, bụ́ ndị Jisọs na-agwa okwu. Ma, ọ nọ n’etiti ha, ebe ọ bụ na Eze ahụ a họpụtara maka Alaeze Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst nọ n’etiti ha.

Ma eleghị anya ọ bụ mgbe ndị Farisii ahụ pụsịrị ka Jisọs gara n’ihu n’isoro ndị na-eso ụzọ ya kwurịta okwu banyere ọbịbịa nke Alaeze ahụ. O bu kpọmkwem ọnụnọ ya n’ike Alaeze nke gaje ịbịa n’ọdịnihu n’uche mgbe ọ na-adọ aka ná ntị, sị: “Ha ga-asịkwa unu, Lee, n’ebe ahụ! Lee, n’ebe a! unu ejela, unu esokwala [ndị Mesaịa ụgha ndị a]: n’ihi na dị ka àmụ̀mà, mgbe ọ na-egbu àmụ̀mà site n’otu akụkụ n’okpuru eluigwe, ọ na-enwu ruo akụkụ ọzọ n’okpuru eluigwe; otú a ka Nwa nke mmadụ ga-adị n’ụbọchị ya.” Otú a, Jisọs na-egosipụta na dị nnọọ ka a na-ahụ àmụ̀mà ruo gburugburu ebe buru ibu, ihe àmà nke ọnụnọ ya n’ike Alaeze ga-apụta ìhè nke ọma nye ndị nile ọ bụ ọchịchọ ha ịhụ ya.

Mgbe ahụ Jisọs tụlere ihe ndị mere n’oge ochie iji gosi ihe àgwà ndị mmadụ ga-abụ n’oge ọnụnọ ya n’ọdịnihu. Ọ kọwara, sị: “Ma dị ka e mere n’ụbọchị Noa, otú a ka ọ ga-adịkwa n’ụbọchị Nwa nke mmadụ . . . Otú ahụ dị ka e mere n’ụbọchị Lọt; ha na-eri ihe, ha na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ha na-azụ, ha na-ere, ha na-akụ ihe n’ubi, ha na-ewu ụlọ; ma n’ụbọchị Lọt siri na Sọdọm pụta ọkụ na brimstone si n’eluigwe zoo, wee laa ha nile n’iyi: n’otu aka ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị a ga-ekpughe Nwa nke mmadụ.”

Jisọs adịghị asị na e bibiri ndị oge Noa na Lot nanị n’ihi na ha chụsoro ihe omume ndị dị mkpa dị ka iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ire ahịa, ịzụta ihe, ịkụ ihe n’ubi, na iwu ụlọ. Ọbụna Noa na Lọt na ezinụlọ ha mere ihe ndị a. Ma ndị ọzọ mere ihe ndị dị otú ahụ a na-eme kwa ụbọchị n’ajụghị ase ọ bụla banyere ihe bụ uche Chineke, ọ bụkwa nke a mere e ji bibie ha. N’ihi otu ihe ahụ, a ga-ebibi ụmụ mmadụ mgbe a ga-ekpughe Kraịst n’oge oké mkpagbu nke ga-abịakwasị usoro ihe dị ugbu a.

N’imesi ike mkpa ọ dị ime ihe ngwa ngwa banyere ihe àmà nke ọnụnọ ya n’ọdịnihu n’ike Alaeze, Jisọs kwukwara, sị: “N’ụbọchị ahụ, onye ga-anọ n’elu ụlọ, ma ihe ya dị n’ime ụlọ, ya ghara ịrịdata ịkwapụ ha: otú ahụ onye nọkwa n’ubi, ya ghara ịlaghachi. Chetanụ nwunye Lọt.”

Mgbe a ga-ahụ ihe àmà nke ọnụnọ Kraịst, ndị mmadụ apụghị ikwere ka itinye uche nke ukwuu n’ihe onwunwe ha gbochie ha ime ihe ozugbo. Mgbe o si na Sọdọm na-apụ, o doro anya na nwunye Lọt lere anya n’azụ n’ụzọ nke inwe ọchịchọ maka ihe ndị ọ hapụrụ, o wee ghọọ ogidi nnú.

N’ịga n’ihu ná nkọwa ọ na-enye banyere ọnọdụ ga-adị n’oge ọnụnọ ya nke dị n’ihu, Jisọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’abalị ahụ mmadụ abụọ ga-adị n’elu otu ihe ndina; a ga-ewere otu n’ime ha, hapụ ibe ya. Ndị inyom abụọ ga na-egwekọ nri n’otu ebe; a ga-ewere otu n’ime ha, ma a ga-ahapụ ibe ya.”

Ịbụ onye e weere kwekọrọ ná mbanye Noa na ezinụlọ ya banyere n’ime ụgbọ ahụ na ndị mmụọ ozi ahụ ịkpọpụ Lot na ezinụlọ ya na Sọdọm. Ọ pụtara nzọpụta. N’aka nke ọzọ, ịbụ onye a hapụrụ pụtara ịbụ onye e bibiri.

Ugba a, ndị na-eso ụzọ ahụ na-ajụ, sị: “Ole ebe, Onyenwe anyị?”

Jisọs zara sị, “Ebe ozu dị, n’ebe ahụ ka udele [“ugo,” NW] ga-ezukọkwa.” Ndị ahụ “a ga-ewere” maka nzọpụta yiri ugo ndị na-ahụ ihe dị n’ebe dị anya n’ihi na ha na-ezukọta “ebe ozu dị.” Ozu ahụ na-ezo aka n’ebe ezi Kraịst ahụ nọ n’oge ọnụnọ ya nke a na-adịghị ahụ anya n’ike Alaeze nakwa n’oké oriri ime mmụọ nke Jehova na-eme. Luk 17:​20-37; Jenesis 19:⁠26.

▪ Ò si aṅaa bụrụ na Alaeze ahụ nọ n’etiti ndị Farisii?

▪ N’ụzọ dị aṅaa ka ọnụnọ Kraịst si yie àmụ̀mà mmiri?

▪ N’ihi gịnị ka a ga-eji bibie ndị mmadụ maka ihe ha metere n’oge ọnụnọ Kraịst?

▪ Gịnị ka ọ pụtara ịbụ onye e weere, na ịbụ onye a hapụrụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya