Isi 98
Ndị Na-eso Ụzọ Na-arụ Ụka ka Ọnwụ Jisọs Na-eru Nso
JISỌS na ndị na-eso ụzọ ya nọ nso Osimiri Jọdan, ebe ha gabigara site n’ógbè Perea banye na Judia. Ha na ọtụtụ ndị ọzọ so na-eme njem iga Ememe Ngabiga nke 33 O.A., nke dị nanị ihe dị ka otu izu site na mgbe ahụ.
Jisọs bu ndị na-eso ụzọ ya ụzọ na-aga n’ihu, mkpebi ya siri ike tụkwara ha n’anya. Cheta na n’izu ole na ole gara aga mgbe Lazarọs nwụrụ, Jisọs wee na-akwadokwa isi Perea gaa Judia, Tọmas gbara ndị ọzọ ume, sị: “Ka anyị onwe anyị jeekwa, ka anyị wee soro ya nwụọ.” Chetakwa na mgbe Jisọs kpọlitesịrị Lazarọs n’ọnwụ, nnọkọ ikpe Sanhedrin mere atụmatụ igbu Jisọs. Ka a sịkwa ihe mere egwu ji jide ndị na-eso ụzọ ahụ ka ha na-abanye Judia ọzọ ugbu a.
Iji kwadebe ha maka ihe dị n’ihu, Jisọs kpọpụrụ ndị ozi 12 ahụ iche ma gwa ha, sị: “Lee, anyị na-arịgoro Jerusalem; a ga-ararakwa Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ; ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ, rara ya nye n’aka ndị mba ọzọ: ha ga-emekwa ya ihe ọchị, bụsa ya ọnụ mmiri, pịa ya ihe, gbuo ya: ọ ga-esikwa n’ọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị.”
Nke a bụ nke atọ Jisọs gwaworo ndị na-eso ụzọ ya banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya n’ọnwa ndị na-adịbeghị anya. Ọ bụkwa eziokwu na ha gere ya ntị, ma ha aghọtaghị. Ma eleghị anya ọ bụ n’ihi na ha kwere ná mweghachi nke alaeze Israel n’elu ala, ha na-elepụkwa anya ịmata ụtọ ebube na ùgwù n’alaeze elu ala nke ha na Kraịst.
Salome, bụ́ nne nke ndị ozi bụ Jemes na Jọn so ná ndị njem ahụ na-aga Ememe Ngabiga ahụ. Jisọs akpọwo ndị ikom ndị a “Ụmụ Egbe Eluigwe,” obi abụọ adịghị ya na ọ bụ n’ihi obi dị ọkụ nke ha nwere. Eri oge, mmadụ abụọ ndị a ezobewo ọchịchọ nke ịbụ ndị a ma ama n’Alaeze Kraịst n’ime obi ha, ha emewokwa ka nne ha mara maka ọchịchọ ha. Ugbu a, ọ na-abịakwute Jisọs n’aha ha, na-egbu ikpere n’ala n’ihu ya, ma na-arịọ ka e meere ya ihe.
Jisọs jụrụ, sị “Gịnị ka ị na-achọ?”
Ọ zaghachiri, sị: “Kwuo ka ụmụ m ndị ikom abụọ ndị a nọdụ, otu n’aka nri gị, otu n’aka ekpe gị, n’alaeze gị.”
N’ịghọta ebe arịrịọ ahụ si bịa, Jisọs gwara Jemes na Jọn, sị: “Unu amataghị ihe unu na-arịọ. Ùnu pụrụ ịṅụ iko ahụ nke mụ onwe gaje ịṅụ?”
Ha zara sị, “Anyị pụrụ.” Ọ bụ ezie na Jisọs ka gwasịrị ha na ya na-eche mkpagbu dị ukwuu ihu, e mesịakwa, ọnwụ, o doro anya na ha adịghị aghọta na nke a bụ ihe o bu n’uche mgbe ọ sịrị “iko” nke ya gaje ịṅụ.
Ka o sina dị, Jisọs na-agwa ha, sị: “Iko m ka unu ga-aṅụ n’ezie: ma ịnọdụ n’aka nri m, na n’aka ekpe m, abụghị nke m inye, kama ọ dịịrị ndị Nna m doziwooro ya.”
Ka oge na-aga, ndị ozi iri ndị ọzọ nụrụ ihe Jemes na Jọn rịọrọ, iwe wekwara ha. Ma eleghị anya Jemes na Jọn guzopụtara ìhè n’ịrụ ụka mbụ ndị ozi ahụ nwere n’etiti onwe ha banyere onye kachasị ukwuu. Arịrịọ nke ugbu a na-ekpughe na ha etinyebeghị ndụmọdụ Jisọs nyere ha banyere okwu a n’ọrụ. Ọ bụ ihe mwute na ọchịchọ ha nke ịbụ ndị a ma ama ka siri ike.
Iji dozie esemokwu nke ikpeazụ a na obi ọjọọ nke ọ kpataworo, Jisọs kpọkọtara ndị ozi 12 ahụ. N’iji ịhụnanya dụọ ha ọdụ, ọ sịrị: “Unu amatawo na ndị bụ isi nke mba nile ọzọ na-eme ha dị ka ndị nwe ha: ndị ukwu ha na-achịkwa ha. Ọ bụghị otú a ka ọ ga-adị n’etiti unu: kama onye ọ bụla nke na-achọ ka e mee ya onye ukwu n’etiti unu, ọ ga-abụ onye na-ejere unu ozi; ọzọ, onye ọ bụla nke na-achọ ka ọ bụrụ onye isi n’etiti unu, ọ ga-abụ ohu unu.”
Jisọs esetịpụwo ihe nlereanya ha kwesịrị iṅomi, dị ka ọ kọwara, sị: “Dị ka Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” Ọ bụghị nanị na Jisọs jeere ndị ọzọ ozi kama ọ ga-eme otú ahụ ruo n’ókè nke ịnwụ ọnwụ n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ! Otu ụdị echiche ahụ yiri nke Kraịst nke inwe ọchịchọ ijere ndị ọzọ ozi kama ịbụ ndị a na-ejere ozi na ịbụ ndị dị ala kama ịbụ ndị nọ n’ọnọdụ dị elu dị ndị na-eso ụzọ ahụ mkpa. Matiu 20:17-28; Mak 3:17; 9:33-37; 10:32-45; Luk 18:31-34; Jọn 11:16.
▪ N’ihi gịnị ka egwu ji jide ndị na-eso ụzọ ahụ ugbu a?
▪ Olee otú Jisọs si kwadebe ndị na-eso ụzọ ya maka ihe dị n’ihu?
▪ Gịnị ka a rịọrọ Jisọs, oleekwa ụzọ o si metụta ndị ozi ndị ọzọ?
▪ Olee ụzọ Jisọs si dozie nsogbu ahụ dị n’etiti ndị ozi ya?