“Oge Awa Abịawo!”
“Oge awa Ya abịawo ka O si n’ụwa nke a lakwuru Nna Ya.”—JỌN 13:1.
1. Ka Ememe Ngabiga nke 33 O.A. na-eru nso, nkọ dị aṅaa ka a na-akọ n’ebe nile na Jerusalem, n’ihi gịnịkwa?
MGBE e mere ya baptism na 29 O.A., Jisọs malitere ọrụ nke ga-eduga ‘n’oge awa’ nke ọnwụ, mbilite n’ọnwụ, na mbuli elu ya. Ugbu a, ọ bụ oge opupu ihe ubi nke 33 O.A. Ọ bụ nanị izu ole na ole gaferela kemgbe ụlọikpe dị elu nke ndị Juu, bụ́ Sanhedrin, gbara izu igbu Jisọs. Mgbe Jisọs matara banyere atụmatụ ha, ikekwe site n’ọnụ Nikodimọs, bú onye so n’òtù nnọkọ ikpe Sanhedrin ahụ, bụ́ onye ya na ya bụ enyi, Jisọs hapụrụ Jerusalem ma gaa n’ime ime obodo dị n’ofe Osimiri Jọdan. Ka Ememe Ngabiga na-eru nso, ọtụtụ mmadụ si ná mba ahụ na-abanye na Jerusalem, a nọkwa na-akọ nkọ banyere Jisọs n’ebe nile n’obodo ukwu ahụ. “Gịnị ka unu na-eche?” ka ndị mmadụ na-ajụrịta ibe ha. “Na Ọ gaghị abịa n’ememe a ma ọlị?” Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii tinyekwuru ihe n’oké mkpali ahụ site n’inye iwu ka onye ọ bụla hụrụ Jisọs kọọrọ ha ebe ọ nọ.—Jọn 11:47-57.
2. Olee ihe Meri mere nke kpalitere arụmarụ, azịza Jisọs nyere n’ịgbachitere ya na-egosi gịnị banyere ọmụma ọ maara “oge awa Ya”?
2 Na Nisan 8, ụbọchị isii tupu Ememe Ngabiga ahụ, Jisọs laghachiri n’ógbè Jerusalem. Ọ gaa Betani—obodo nke ndị enyi ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Mata, Meri, na Lazarọs—ebe dị kilomita atọ ná mpụga Jerusalem. Ọ bụ n’uhuruchi Friday, Jisọs nọkwara Ụbọchị Izu Ike n’ebe ahụ. N’uhuruchi echi ya, mgbe Meri jeere ya ozi, na-ete ya mmanụ dị oké ọnụ ahịa bụ́ nke na-esi ísì ụtọ, ndị na-eso ụzọ ya anabataghị ya. Jisọs zaghachiri, sị: “Hapụ nwanyị a ka o wee debe ya ruo ụbọchị olili m. N’ihi na unu nwere ndị ogbenye n’etiti unu mgbe nile; ma unu enweghị Mụ onwe m mgbe nile.” (Jọn 12:1-8; Matiu 26:6-13) Jisọs maara na “oge awa Ya abịawo ka O si n’ụwa nke a lakwuru Nna Ya.” (Jọn 13:1) Ọ fọdụrụ ụbọchị ise ka o “werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mak 10:45) Site n’oge ahụ gawa, echiche nke ịdị ngwa metụtara ihe nile Jisọs mere ma kụzie. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke a na-enye anyị ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-echere ọgwụgwụ nke usoro ihe a! Tụlee ihe mere n’ebe Jisọs nọ kpọmkwem n’echi ya.
Ụbọchị Mbanye Mmeri nke Jisọs
3. (a) Olee otú Jisọs si banye Jerusalem na Sunday, Nisan 9, oleekwa otú ihe ka ọtụtụ ná ndị gbara ya gburugburu si meghachi omume? (b) Azịza dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị Farisii bụ́ ndị mere mkpesa banyere ìgwè mmadụ ahụ?
3 Na Sunday, Nisan 9, Jisọs abata Jerusalem n’ụzọ mmeri. Ka ọ na-erute obodo ahụ—na-anọkwasị ịnyịnya ibu ná mmezu nke Zekaraịa 9:9—ihe ka ọtụtụ n’ime ndị gbakọtaworo gburugburu ya agbasaa uwe elu ha n’okporo ụzọ, ebe ndị ọzọ gbujitere alaka osisi dị iche iche wee gbasaa ha n’okporo ụzọ. “Onye a gọziri agọzi ka Eze Nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị bụ,” ka ha na-eti ná mkpu. Ndị Farisii ụfọdụ so n’ìgwè ahụ achọọ ka Jisọs baara ndị na-eso ụzọ ya mba. Otú ọ dị, Jisọs azaghachi, sị: “Asị m unu na, ọ bụrụ na ndị a ekpuchie ọnụ ha, nkume ga-eti mkpu.”—Luk 19:38-40; Matiu 21:6-9.
4. N’ihi gịnị ka Jerusalem ji mee mkpọtụ mgbe Jisọs banyere n’obodo ahụ?
4 Nanị izu ole na ole tupu mgbe ahụ, ọtụtụ ndị so n’ìgwè ahụ hụrụ ka Jisọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. Ugbu a ndị a nọgidere na-agwa ndị ọzọ banyere ọrụ ebube ahụ. Ya mere mgbe Jisọs na-abata Jerusalem, obodo ahụ nile mere mkpọtụ. “Ònye bụ Nwoke a?” ka ndị mmadụ na-ajụ. Ìgwè mmadụ ahụ anọgidekwa na-ekwu, sị: “Nwoke a bụ Onye amụma ahụ, Jisọs, Nke si na Nazaret nke Galili bịa.” Mgbe ha hụrụ ihe na-emenụ, ndị Farisii akwaa arịrị, sị: “Ụwa ejesowo Ya n’azụ.”—Matiu 21:10, 11; Jọn 12:17-19.
5. Gịnị mere mgbe Jisọs gara ụlọ nsọ?
5 Dị ka ọ na-emekarị mgbe ọ bụla ọ gara Jerusalem, Jisọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ, agaa n’ụlọ nsọ iji zie ihe. N’ebe ahụ, ndị ìsì na ndị ngwụrọ abịakwute ya, ọ gwọọkwa ha. Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ hụrụ nke a ma nụ ka ụmụ okoro nọ n’ụlọ nsọ ahụ na-eti mkpu, sị, “Hosanna dịrị Nwa Devid,” iwe ewee ha. “Ị̀ na-anụ okwu ụmụ ndị a na-ekwu?” ka ha mere mkpesa. “Ee,” ka Jisọs zaghachiri. “Ọ́ dịghị mgbe ọ bụla unu gụrụ, I si n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara mee ka ọjịja zuo okè?” Ka Jisọs gara n’ihu na-ezi ihe, o lere anya nke ọma n’ihe nile na-eme n’ụlọ nsọ ahụ.—Matiu 21:15, 16; Mak 11:11.
6. Olee otú ụzọ Jisọs si eme ihe ugbu a si dị iche n’ụzọ o si emebu, n’ihi gịnịkwa?
6 Lee ụzọ dị iche Jisọs si eme ihe ugbu a karịa otú ọ dị ọnwa isii gara aga! N’oge ahụ, ọ batara na Jerusalem maka Ememe Ụlọikwuu “ọ bụghị n’ihu ọha mmadụ, kama dị ka ọ̀ bụ na nzuzo.” (Jọn 7:10) Ọ na-ahụkwa mgbe nile na ọ gbapụrụ n’emerụghị ahụ mgbe ọ bụla e yiri ndụ ya egwu. Ugbu a, ọ na-abanye n’obodo ahụ n’ezoghị ezo bụ́ ebe e nyeworo iwu ka e jichie ya! Ịkpọsa na ya bụ Mesaịa ahụ abụghịkwa omume e ji mara Jisọs. (Aịsaịa 42:2; Mak 1:40-44) Ọ chọghị ka e jiri oké ụzụ kpọsaa banyere ya ma ọ bụ kọwa akụkọ ndị gbagọrọ agbagọ banyere ya site n’ọnụ otu onye gaa n’ọzọ. Ugbu a, ìgwè mmadụ ahụ na-ekwupụta n’ihu ọha na ọ bụ Eze na Onye Nzọpụta—Mesaịa ahụ—ọ jụkwara arịrịọ ndị ndú okpukpe rịọrọ ka o mee ka ha kpuchie ọnụ! Gịnị mere o ji gbanwee? Ọ bụ n’ihi na “oge awa abịawo, ka e wee nye Nwa nke mmadụ otuto,” dị ka Jisọs kwupụtara kpọmkwem n’echi ya.—Jọn 12:23.
Omume Obi Ike—E Mesịa, Ozizi Ndị Na-azọpụta Ndụ
7, 8. Olee otú ihe ndị Jisọs mere na Nisan 10, 33 O.A., si yie ihe o mere n’ụlọ nsọ ahụ n’oge Ememe Ngabiga nke 30 O.A.?
7 Mgbe ọ bịarutesịrị n’ụlọ nsọ ahụ na Monday, Nisan 10, Jisọs emee ihe banyere ihe ọ hụrụ n’ehihie ụbọchị gara aga. Ọ malite “ịchụpụ ndị na-ere na ndị na-azụ n’ụlọukwu Chineke, O wee kpuo tebụl nile nke ndị na-agbanwe ego ihu, na oche nile nke ndị na-ere nduru; O kweghịkwa ka onye ọ bụla buru ihe gabiga n’etiti ụlọukwu Chineke.” N’ịkatọ ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ, o kwupụtara, sị: “É deghị ya n’akwụkwọ nsọ, sị, A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere mba nile? ma unu onwe unu emewo ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe.”—Mak 11:15-17.
8 Ihe ndị Jisọs mere yiri ihe o mere afọ atọ gara aga mgbe ọ gara n’ụlọ nsọ ahụ n’oge Ememe Ngabiga nke 30 O.A. Otú ọ dị, nkatọ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ n’oge a karị. Na nke ugbu a a kpọrọ ndị azụmahịa ahụ nọ n’ụlọ nsọ ahụ “ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Luk 19:45, 46; Jọn 2:13-16) Ha bụ ya n’ihi na ha na-ana ndị chọrọ ịzụ ụmụ anụmanụ maka ịchụàjà, nnukwu ego. Ndị nchụàjà, ndị odeakwụkwọ, na ndị bụ́ isi n’etiti ndị ahụ, nụrụ banyere ihe Jisọs na-eme, ha amaliteghachikwa ịchọ ụzọ igbu ya. Ma, ha amaghị ụzọ ha ga-esi egbu Jisọs, ebe ọ bụ na ndị mmadụ, n’ịbụ ndị ibobo ozizi ya na-anwụ n’ahụ, na-esogharị ya iji nụrụ ihe ọ na-ekwu.—Mak 11:18; Luk 19:47, 48.
9. Ihe mmụta dị aṅaa ka Jisọs na-akụzi, òkù dịkwa aṅaa ka ọ na-akpọ ndị na-ege ya ntị n’ụlọ nsọ ahụ?
9 Ka Jisọs nọgidere na-ezi ihe n’ụlọ nsọ ahụ, o kwupụta, sị: “Oge awa abịawo, ka e wee nye Nwa nke mmadụ otuto.” Ee, ọ maara na o nwere nanị ụbọchị ole na ole fọdụrụnụ ọ ga-adị ndụ dị ka mmadụ. Mgbe ọ kọsịrị otú mkpụrụ ọka na-aghaghị isi nwụọ iji mịa mkpụrụ—nke kwekọrọ n’ọnwụ ọ ga-anwụ ma ghọọ ụzọ a ga-esi enye ndị ọzọ ndụ ebighị ebi—Jisọs kpọrọ ndị na-ege ya ntị òkù, na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ejere m ozi, ya soo m; ebe Mụ onwe m nọkwa, n’ebe ahụ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa: ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ejere m ozi, ya ka Nna m ga-asọpụrụ.”—Jọn 12:23-26.
10. Olee mmetụta Jisọs na-enwe banyere ọnwụ ga-eweta ihe mgbu na-echere ya?
10 Mgbe Jisọs na-eche banyere ọnwụ ya ga-eweta ihe mgbu bụ́ nke fọdụrụ nanị ụbọchị anọ n’ihu, ọ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ugbu a ka mkpụrụ obi m na-alọ mmiri; gịnị ka M ga-ekwukwa? Nna, zọpụta m n’oge awa nke a.” Ma Jisọs apụghị izere ihe na-echere ya. “Ma,” ka o kwuru, “n’ihi nke a ka M bịaruru oge awa nke a.” N’ezie, Jisọs kwenyere ná ndokwa nile nke Chineke. O kpebisiri ike ikwe ka uche Chineke chịkwaa ihe ndị ọ na-eme ruo n’ọnwụ ịchụàjà ya. (Jọn 12:27) Lee ihe nlereanya ọma o setịpụụrụ anyị—nke ido onwe anyị kpam kpam n’okpuru uche Chineke!
11. Ihe ndị dị aṅaa ka Jisọs kụziiri ìgwè mmadụ ahụ ka nụsịrị olu sitere n’eluigwe?
11 Ebe ọ bụ na Jisọs na-enwe nchegbu miri emi banyere otú ọnwụ ya ga-esi emetụta aha Nna ya, o kpere ekpere, sị: “Nna, nye aha Gị otuto.” N’ijuanya nye ìgwè mmadụ ahụ gbakọtara n’ụlọ nsọ ahụ, olu esi n’eluigwe daa, na-ekwu, sị: “Enyere m ya otuto, M ga-enyekwa Ya otuto ọzọ.” Onye Ozizi Ukwu ahụ ejiri ohere a mee ihe iji gwa ìgwè mmadụ ahụ ihe mere e ji nụ olu ahụ, ihe ga-esi n’ọnwụ ya pụta, na ihe mere o ji dị mkpa ka ha gosipụta okwukwe. (Jọn 12:28-36) Ụbọchị abụọ ndị ikpeazụ ahụ bụ n’ezie ndị jupụtara n’ihe omume nye Jisọs. Ma ụbọchị dị oké mkpa ka dị n’ihu.
Ụbọchị Nkatọ
12. Na Tuesday, Nisan 11, olee otú ndị ndú okpukpe si nwaa ịmata Jisọs n’ọnyà, gịnịkwa si na ya pụta?
12 Na Tuesday, Nisan 11, Jisọs abanyekwa ụlọ nsọ ahụ ọzọ iji zie ihe. Ndị na-enweghị omume enyi nọkwa ya. N’izo aka n’ihe Jisọs mere n’ụbọchị gara aga, ndị isi nchụàjà na ndị okenye nke ndị ahụ ajụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ n’aha ike gịnị ka Ị na-eme ihe ndị a? ònye nyekwara Gị ike a?” Onye Ọkà Ozizi ahụ mere ka ha ghara ịmakwa ihe ha ga-ekwu site n’azịza ya, o nyekwara ihe atụ atọ na-akpali akpali—abụọ n’ime ha bụ banyere ubi vine, otu bụkwa banyere ememe alụmdi na nwunye—nke ahụ kpughere nnọọ otú ndị na-emegide ya dịruru obi ọjọọ. N’ịbụ ndị ihe ha nụrụ were iwe, ndị ndú okpukpe ahụ achọọ ijichi ya. Ma ha na-atụ ìgwè mmadụ ahụ egwu, bụ́ ndị na-ele Jisọs anya dị ka onye amụma. Ya mere ha anwaa iji aghụghọ mee ka o kwuo ihe ha ga-eji maka ya jide ya. Azịza Jisọs nyere enyeghị ha ọnụ okwu.—Matiu 21:23–22:46.
13. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs na-enye ndị na-ege ya ntị banyere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii?
13 Ebe ọ bụ na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-azọrọ na ha na-akụzi Iwu Chineke, Jisọs gbaziri ndị na-ege ya ntị ume, na-asị: “Ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke ha ga-asị unu mee, meenụ ihe ndị a, debekwa ha: ma unu emela dị ka ọrụ nile ha si dị; n’ihi na ha na-ekwu, ma ha adịghị eme.” (Matiu 23:1-3) Lee nkatọ ihu ọha dị ike nke ahụ bụ! Ma Jisọs ekwuchabeghị. Nke a bụ ụbọchị ikpeazụ ọ ga-ezi ihe n’ụlọ nsọ ahụ, o jikwa obi ike na-ekpughe ọtụtụ ihe—site n’otu gaa n’ọzọ dị ka égbè eluigwe.
14, 15. Nkatọ dị aṅaa dị ike ka Jisọs katọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii?
14 “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ,” ka Jisọs kwupụtara ugboro isii. Ahụhụ ga-adịrị ha n’ihi na, dị ka ọ na-akọwa, ha emechinarawo ndị mmadụ ọnụ ụzọ Alaeze eluigwe, n’ekweghị ka ndị na-achọ ịbanye banye. Ndị ihu abụọ a na-ejegharị n’oké osimiri na n’ala kpọrọ nkụ iji mee mmadụ ka o soo ụzọ ha, nanị iji mee ka ọ bụrụ onye ga-enweta mbibi ebighị ebi. Ka ha na-eleghara “ihe ka arọ n’iwu, bụ́ ikpe, na ebere, na okwukwe” anya, ha na-etinye uche nke ukwuu n’inye otu ụzọ n’ụzọ iri. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha na-eme ka “azụ iko na efere dị ọcha, ma n’ime ha jupụtara site n’ịpụnara mmadụ ihe na ejideghị onwe [onye]” nke na ure ha rere n’ime bụ nke ime nsọ nsọ ha zochiri. Tụkwasị na nke ahụ, ha dị njikere iwuru ndị amụma ili ma chọọ ha mma iji dọta uche n’ebe ọrụ ebere ha rụrụ dị, n’agbanyeghị na ha bụ “ụmụ nke ndị gburu ndị amụma.”—Matiu 23:13-15, 23-31.
15 Ka Jisọs na-akatọ omume ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe nke ndị na-emegide ya, o kwuru, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị ndú ìsì.” Ha kpuru ìsì n’ụzọ omume n’ihi na ha ji ọlaedo dị n’ụlọ nsọ ahụ kpọrọ ihe karịa abamuru ime mmụọ nke ebe ofufe ahụ. N’ịga n’ihu, Jisọs kwuru okwu nkatọ ya kasị ike. “Unu agwọ, unu ajụala,” ka ọ na-ekwu, “ùnu ga-esi aṅaa gbanahụ ikpe nke [Gehena, NW]?” Ee, Jisọs na-agwa ha na ha ga-enweta mbibi ebighị ebi n’ihi ịgbaso ụzọ ọjọọ. (Matiu 23:16-22, 33) Ka anyị onwe anyị kwa gosipụta obi ike n’ịkpọsa ozi Alaeze ahụ, ọbụna mgbe ọ gụnyere ikpughe okpukpe ụgha.
16. Mgbe ha nọdụrụ n’Ugwu Olive, amụma dị aṅaa dị mkpa ka Jisọs buuru ndị na-eso ụzọ ya?
16 Jisọs hapụziri ụlọ nsọ ahụ. Ka anwụ ehihie ahụ na-ada, ya na ndị ozi ya arịgoo Ugwu Olive. Ka ha nọdụrụ ala n’ebe ahụ, Jisọs ebuo amụma banyere mbibi nke ụlọ nsọ ahụ na ihe àmà nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe ahụ. Ihe okwu amụma ndị a pụtara rutere n’oge anyị. N’uhuruchi ahụ, Jisọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu matara na mgbe ụbọchị abụọ gasịrị ememe ngabiga na-abịa, a rarakwa Nwa nke mmadụ nye ka a kpọgide Ya [n’osisi ịta ahụhụ, NW].”—Matiu 24:1-14; 26:1, 2.
Jisọs ‘Hụrụ Ndị nke Ya n’Anya Ruo Ọgwụgwụ’
17. (a) N’oge Ememe Ngabiga na Nisan 14, ihe dị aṅaa ka Jisọs kụziiri mmadụ 12 ahụ? (b) Ememe ncheta dị aṅaa ka Jisọs guzobere mgbe ọ chụpụsịrị Judas Iskarịọt?
17 N’ụbọchị abụọ ndị sochirinụ—Nisan 12 na 13—Jisọs egosighị onwe ya n’ihu ọha n’ụlọ nsọ ahụ. Ndị ndú okpukpe na-achọ igbu ya, ọ chọghịkwa ka ihe ọ bụla gbochie ya isoro ndị ozi ya mee Ememe Ngabiga. Ọdịda nke anyanwụ na Thursday malitere Nisan 14—ụbọchị ikpeazụ Jisọs ga-adị ndụ n’ụwa dị ka mmadụ. N’uhuruchi ahụ, Jisọs na ndị ozi ya nọkọrọ n’otu ụlọ dị na Jerusalem bụ́ ebe a kwadebewooro ha ịnọ mee Ememe Ngabiga ahụ. Ka ha na-anụkọ ụtọ Ememe Ngabiga ahụ ọnụ, ọ kụziiri mmadụ 12 ahụ ihe magburu onwe ya banyere ịdị umeala n’obi site n’ịsa ụkwụ ha. Mgbe ọ chụpụsịrị Judas Iskarịọt, bụ́ onye kwetaworo ịrara Onyenwe ya nye maka mkpụrụ ego ọlaọcha 30—ọnụ ego a na-akwụ maka ohu nkịtị dị ka Iwu Mosis si dị—Jisọs guzobere Ememe Ncheta ọnwụ ya.—Ọpụpụ 21:32; Matiu 26:14, 15, 26-29; Jọn 13:2-30.
18. Gịnị ka Jisọs ji ịhụnanya kụzikwuoro ndị ozi ya 11, oleekwa otú o si kwadebe ha maka ọpụpụ ọ na-aga ịpụ?
18 Mgbe e guzobesịrị Ememe Ncheta ahụ, ndị ozi ahụ adaba n’arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ banyere onye n’ime ha kasị ukwuu. Kama ịbakasị ha ahụ, Jisọs ejiri ndidi kụziere ha banyere abamuru nke ijere ndị ọzọ ozi. N’igosipụta ekele na ha anọgidewo n’akụkụ ya n’oge ọnwụnwa ya, ya esoro ha gbaa ndụ maka alaeze. (Luk 22:24-30) Jisọs nyekwara ha iwu ịhụ ibe ha n’anya dị ka ọ hụworo ha. (Jọn 13:34) Ka ọ na-egbu oge n’ọnụ ụlọ ahụ, Jisọs ejiri ịhụnanya kwadebe ha maka ọpụpụ ọ na-aga ịpụ. Ya emesie ha obi ike banyere ọbụbụenyi ha, gbaa ha ume igosipụta okwukwe, kwekwa ha nkwa maka enyemaka nke mmụọ nsọ. (Jọn 14:1-17; 15:15) Tupu Jisọs esi n’ụlọ ahụ pụọ, ọ rịọ Nna ya, sị: “Nna, oge awa abịawo; nye Ọkpara Gị otuto, ka Ọkpara Gị wee nye Gị otuto.” N’ezie, Jisọs akwadebewo ndị ozi ya maka ọpụpụ ya, n’ezie, ọ ‘hụrụ ndị nke Ya n’anya ruo ọgwụgwụ.’—Jọn 13:1; 17:1.
19. N’ihi gịnị ka Jisọs ji nwee ihe mgbu n’ogige Getsemane?
19 Ọ pụrụ ịbụ na ọ gafewo nnọọ etiti abalị mgbe Jisọs na ndị ozi 11 ya kwesịrị ntụkwasị obi ruru ogige Getsemane. Ya na ndị ozi ya na-agakarị ebe ahụ. (Jọn 18:1, 2) N’ime awa ole na ole, Jisọs gaje ịnwụ dị ka a ga-asị na ọ bụ onye omempụ a na-asọ oyi. Ihe mgbu nke ahụmahụ a ọ na-atụ anya inweta na otú ọ pụrụ isi wetara Nna ya nkọcha dị nnọọ ukwuu nke na mgbe Jisọs na-ekpe ekpere, ọsụsọ ya ghọrọ ihe dị ka oké ọkpụrụkpụ ọbara na-ada n’ala. (Luk 22:41-44) “Oge awa nke m eruwo,” ka Jisọs gwara ndị ozi ahụ. “Lee, onye na-arara m nye nọ nso.” Ka ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas Iskarịọt abịaruo nso, oké ìgwè mmadụ ndị ji ihe e ji amụ ọkụ na oriọna na ihe agha dị iche iche sokwa ya. Ha bịara ijide Jisọs. O sighị ọnwụ. “Ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ,” ka ọ na-akọwa, “ga-esikwa aṅaa mezuo, na ọ ghaghị ime otú a?”—Mak 14:41-43; Matiu 26:48-54.
E Nye Nwa nke Mmadụ Otuto!
20. (a) Arụrụala ndị dị aṅaa ka a rụsara Jisọs mgbe e jidesịrị ya? (b) N’oge na-adịghị nnọọ anya tupu ọ nwụọ, n’ihi gịnị ka Jisọs ji tie mkpu, sị: “Ọ gwụwo”?
20 Mgbe e jidesịrị Jisọs, ndị àmà ụgha boro ya ebubo, ndị ikpe mkpegbu ekwuo na ikpe mara ya, Pọntiọs Paịlet amaa ya ikpe, ndị nchụàjà na ìgwè na-eme ihe ike ejiri ya mee ihe ọchị, ndị soja emeekwa ya akaje ma mekpọọ ya ọnụ. (Mak 14:53-65; 15:1, 15; Jọn 19:1-3) Ka ọ na-erule ehihie Friday, a kpọgidere Jisọs n’elu osisi ịta ahụhụ, o nwekwara oké ihe mgbu ka ịdị arọ nke ahụ ya mere ka ahụ ya si n’ebe ahụ a kụgidere ya ntú n’aka na n’ụkwụ na-adọwa. (Jọn 19:17, 18) N’ihe dị ka elekere anya atọ nke ehihie, Jisọs etie mkpu, sị: “Ọ gwụwo.” Ee, o mezuwo ihe nile ọ bịara ime n’ụwa. N’inyefe mmụọ ya n’aka Chineke, o hulatara isi ya wee nwụọ. (Jọn 19:28, 30; Matiu 27:45, 46; Luk 23:46) N’ụbọchị nke atọ mgbe nke ahụ gasịrị, Jehova akpọlite Ọkpara ya n’ọnwụ. (Mak 16:1-6) Ụbọchị 40 mgbe Jisọs bilitesịrị n’ọnwụ, ọ rịgooro n’eluigwe, e nyekwara ya otuto.—Jọn 17:5; Ọrụ 1:3, 9-12; Ndị Filipaị 2:8-11.
21. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jisọs?
21 Olee otú anyị pụrụ isi ‘soo ijeụkwụ Jisọs nile’? (1 Pita 2:21) Dị ka ya, ka anyị tinye mgbalị siri ike n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ ma nwee nkwuwa okwu na obi ike n’ikwu okwu Chineke. (Matiu 24:14; 28:19, 20; Ọrụ 4:29-31; Ndị Filipaị 1:14) Ka anyị ghara ichefu ma ọlị ebe anyị nọ ná ngafe nke oge ma ọ bụ hapụ ịkpasurịta n’ime ibe anyị ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche. (Mak 13:28-33; Ndị Hibru 10:24, 25) Ka anyị kwe ka uche Jehova Chineke na ọmụma anyị maara na anyị na-ebi na “mgbe ọgwụgwụ” na-achịkwa ụzọ nile anyị si eme ihe.—Daniel 12:4.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Ọmụma Jisọs maara na ọnwụ ya dị nso nwere mmetụta dị aṅaa n’ozi ikpeazụ ya n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem?
• Gịnị na-egosi na Jisọs ‘hụrụ ndị nke ya n’anya ruo ọgwụgwụ’?
• Gịnị ka ihe ndị mere n’awa ole na ole ikpeazụ nke ndụ Jisọs na-egosi banyere ya?
• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Kraịst Jisọs n’ozi anyị?
[Foto dị na peeji nke 18]
Jisọs “hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ”