Ụbọchị Ikpeazụ nke Ndụ Jisọs Dị Ka Mmadụ
Ọ bụ ná mgbede Friday, Nisan 14, 33 O.A. Ìgwè ndị ikom na ndị inyom na-achọ ili otu enyi ha hụrụ n’anya. Otu n’ime ndị ikom ahụ, bụ́ Nikọdimọs, ewetawo ụ́dà ụtọ iji kwadebe ozu ahụ maka olili. Otu nwoke aha ya bụ Josef ewetawo ákwà dị ọcha iji kee ozu ahụ e merụsịrị ahụ nke ukwuu.
OLEE ndị bụ ndị a? Ònyekwa ka ha na-eli? Ihe ndị a nile hà na-emetụta gị? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị laghachi ná mmalite nke ụbọchị ahụ dị oké mkpa.
Uhuruchi Thursday, Nisan 14
Ọnwa gbazuru agbazu nke na-enwu zaa ji nwayọọ nwayọọ na-apụta na Jerusalem. Obodo ahụ mmadụ jupụtara na ya na-adajụlata mgbe a rụsịrị ọrụ ụbọchị. N’uhuruchi a, ikuku jupụtara n’ísì nke nwa atụrụ a na-ahụ n’ọkụ. Ee, ọtụtụ puku ndị mmadụ na-akwadebe maka otu ihe omume pụrụ iche—Ememe Ngabiga nke a na-eme kwa afọ.
N’otu ọnụ ụlọ ndị ọbịa buru ibu, anyị na-ahụ Jisọs Kraịst na ndị ozi 12 ya ka ha nọ gburugburu tebụl a kwadebere akwadebe. Gee ntị! Jisọs na-ekwu okwu. “Agụụ gụsiri m ike iso unu rie oriri ngabiga nke a mgbe Mụ aka-ahụghị ahụhụ,” ka ọ na-ekwu. (Luk 22:15) Jisọs maara na ndị iro ya bụ́ ndị okpukpe na-achọ igbu ya. Ma tupu nke ahụ emee, ihe dị nnọọ ịrịba ama ga-eme n’uhuruchi a.
Mgbe e mesịrị Ememe Ngabiga ahụ, Jisọs kwupụtara, sị: “Otu onye si n’etiti unu pụta ga-arara m nye.” (Matiu 26:21) Nke a mere ka obi ghara iru ndị ozi ahụ ala. Ònye ka ọ pụrụ ịbụ? Mgbe nkwurịta okwu ụfọdụ gasịrị, Jisọs gwara Judas Iskariọt, sị: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.” (Jọn 13:27) Ọ bụ ezie na ndị ọzọ amataghị ya, Judas bụ onye nrafu. O si n’ebe ahụ pụọ iji rụọ ọrụ ọjọọ ya na nkata ahụ a kpara megide Jisọs.
Ememe Pụrụ Iche
Jisọs eguzobe otu ememe ọhụrụ pụrụ nnọọ iche ugbu a—nke a ga-eji na-echeta ọnwụ ya. N’iwere otu ógbè achịcha, Jisọs ekpee ekpere ekele maka ya ma nyawaa ya. “Naranụ, rie,” ka ọ na-atụzi. “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye n’ihi unu: na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” Mgbe nke ọ bụla n’ime ha risịworo ụfọdụ n’ime achịcha ahụ, o weere otu iko mmanya na-acha ọbara ọbara, gọziekwa ya. “Unu nile ṅụọ n’ime ya,” ka Jisọs na-agwa ha, na-akọwa, sị: “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m, bụ́ nke a na-awụsị n’ihi unu.” O nyere ndị ozi 11 kwesịrị ntụkwasị obi fọdụrụnụ ntụziaka, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Matiu 26:26-28; Luk 22:19, 20; 1 Ndị Kọrint 11:24, 25.
N’uhuruchi ahụ Jisọs ji obiọma na-akwadebe ndị ozi ya na-eguzosi ike n’ihe maka ihe dị n’ihu, na-emesikwa ha obi ike banyere ịhụnanya miri emi o nwere n’ebe ha nọ. “Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karịrị nke a ukwuu,” ka ọ na-akọwa, “ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya. Unu onwe unu bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na unu emee ihe Mụ onwe m na-enye unu n’iwu.” (Jọn 15:13-15) Ee, ndị ozi 11 ahụ egosiwo na ha bụ ezi ndị enyi site n’ịnọgide n’akụkụ Jisọs n’oge ọnwụnwa ya nile.
Mgbe oge garala n’uhuruchi ahụ—ikekwe mgbe etiti abalị gaferela—Jisọs kpere ekpere kwesịrị ncheta, mgbe nke ahụ gasịrị ha abụkuo Jehova abụ otuto. Mgbe ahụ, n’ìhè nke ọnwa ahụ gbazuru agbazu, ha si n’obodo ahụ pụọ ma gafee Ndagwurugwu Kidrọn.—Jọn 17:1–18:1.
N’Ogige Getsemane
Nwa oge mgbe e mesịrị, Jisọs na ndị ozi ya rutere ogige Getsemane. N’ịhapụ asatọ n’ime ndị ozi ahụ n’ụzọ mbanye ogige ahụ, Jisọs akpọrọ Pita, Jemes, na Jọn bamikwuo n’ime osisi olive ndị ahụ. “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ruo ọnwụ,” ka ọ na-agwa mmadụ atọ ahụ. “Nọgidenụ n’ebe a, na-echekwanụ nche.”—Mak 14:33, 34.
Ndị ozi atọ ahụ echere ka Jisọs na-abamitụkwu n’ime ogige ahụ ikpe ekpere. O ji ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri na-arịọ, sị: “Nna, ọ bụrụ na ọ dị Gị mma, nara m iko a.” Ibu ọrụ dị ukwuu dị n’ubu Jisọs. Lee ka o si bụrụ onye obi na-erughị ala iche banyere ihe ndị iro Jehova ga-ekwu mgbe a ga-akpọgbu Ọkpara Ọ mụrụ nanị ya dị ka à ga-asị na ọ bụ onye omekome! Ọbụna ihe na-ewute Jisọs karị bụ echiche banyere nkọcha a ga-awụkwasị Nna ya nke eluigwe ọ hụrụ n’anya ma ọ bụrụ na ya adaa ule a na-eweta oké ihe mgbu. Jisọs kpesiri ekpere ike, ọ nọkwa n’oké ihe mgbu nke na ọsụsọ ya ghọrọ ihe dị ka ọkpụrụkpụ ọbara na-ada n’ala.—Luk 22:42, 44.
Jisọs ka kpesịrị nnọọ ekpere nke ugboro atọ. Ndị ikom ji oriọna na ọwa na-abịa ugbu a. Onye nọ n’ihu abụghị onye ọzọ karịa Judas Iskariọt, bụ́ onye na-abịakwute Jisọs kpọmkwem. “Ekele, Rabaị,” ka ọ na-asị, na-esutụ ya ọnụ n’ụzọ dị nro. “Judas,” ka Jisọs na-azaghachi, “ì ji isutụ ọnụ na-arara Nwa nke mmadụ nye?”—Matiu 26:49; Luk 22:47, 48; Jọn 18:3.
Na mberede, ndị ozi ahụ amata ihe na-emenụ. A na-aga ijide Onyenwe ha na ezi enyi ha! N’ihi ya Pita amịrị mma agha ma bepụ ntị nke ohu onyeisi nchụàjà. “Kweenụ ya ruo nke a,” ka Jisọs na-ekwu ozugbo. N’isetịpụ aka ya, ọ gwọrọ ohu ahụ, na-enyekwa Pita iwu, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya: n’ihi na mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Luk 22:50, 51; Matiu 26:52) Ndị isi na ndị agha ahụ ejide Jisọs wee kee ya agbụ. N’ịbụ ndị ụjọ jidere na ndị nwere mgbagwoju anya, ndị ozi ahụ agbahapụ Jisọs wee gbafusịa n’abalị ahụ.—Matiu 26:56; Jọn 18:12.
Ụtụtụ Friday, Nisan 14
Ọ bụ nnọọ n’isi isi ụtụtụ Friday. E bu ụzọ kpọga Jisọs n’ụlọ onye bụbu Onyeisi Nchụàjà bụ́ Anas, bụ́ onye ka nwere ikike dị ukwuu. Anas ajụọ ya ajụjụ ma mesịa mee ka a kpọga ya n’ụlọ Onyeisi Nchụàjà bụ́ Kaịafas bụ́ ebe òtù nnọkọ Sanhedrin zukọtaworo.
Ndị ndú okpukpe ahụ anwazie ịchọta ndị akaebe ịgba àmà ụgha megide Jisọs. Otú ọ dị, ọbụna ndị akaebe ụgha ahụ apụghị ikwekọ n’àmà ha gbara. N’oge ahụ nile, Jisọs ekwughị ihe ọ bụla. N’ịgbanwe ụzọ aghụghọ ya, Kaịafas ekwuo, sị: “Ewere m Chineke dị ndụ gbaa Gị iyi, ka Ị gwa anyị ma Gị onwe gị [ị̀] bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke.” Nke a bụ eziokwu a na-apụghị ịgọpụ agọpụ, n’ihi ya Jisọs ejiri obi ike zaghachi, sị: “Mụ onwe m bụ Ya: unu ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-anọdụ n’aka nri nke ike, na-abịakwa, Ya na ìgwè ojii nile nke eluigwe.”—Matiu 26:63; Mak 14:60-62.
“O kwuluru Chineke,” ka Kaịafas na-ekwu. “Ọ̀ bụ mkpa ndị àmà gịnị na-akpa anyị ọzọ?” Ụfọdụ amazie Jisọs ụra ma bụọ ya ọnụ mmiri. Ndị ọzọ etie ya aka ma kparịa ya nke ukwuu. (Matiu 26:65-68; Mak 14:63-65) N’oge na-adịghị anya mgbe chi bọsịrị na Friday, òtù nnọkọ Sanhedrin ezukọta ọzọ, ikekwe iji mee ka o yie ka a ga-asị na ikpe ahụ megidere iwu nke ha kpere n’abalị nwere nkwado iwu. Ọzọkwa Jisọs ejiri obi ike gosi na ya bụ Kraịst, Ọkpara Chineke.—Luk 22:66-71.
Ọzọkwa, ndị isi nchụàjà na ndị okenye akpụpụ Jisọs ka Pọntiọs Paịlet, bụ́ onye Rom bụ́ gọvanọ nke Judia, kpee ya ikpe. Ha eboo Jisọs ebubo na ọ na-eduhie mba ha, na-egbochi ịtụ ụtụ isi nye Siza, “na-asịkwa na Ya onwe ya bụ Kraịst, bụrụkwa Eze.” (Luk 23:2; tụlee Mak 12:17.) Mgbe ọ jụsịrị Jisọs ajụjụ, Paịlet ekwupụta, sị: “Ahụghị m ihe kwesịrị ahụhụ mmehie n’ahụ Nwoke a.” (Luk 23:4) Mgbe Paịlet nụrụ na Jisọs bụ onye Galili, o zijeere ya Herọd Antipas, bụ́ onye na-achị Galili, bụ́ onye nọ na Jerusalem maka Ememe Ngabiga. Herọd ebughị n’obi ikpe ikpe ziri ezi. Nanị ihe ọ na-achọ bụ ịhụ Jisọs ka ọ na-arụ ọrụ ebube. Ebe ọ bụ na Jisọs emezughị ihe ọ chọrọ, gbachiekwa nkịtị, Herọd na ndị agha ya kwara ya emo wee zighachiri ya Paịlet.
“Onye a mere ihe ọjọọ gịnị?” ka Paịlet na-ajụ ọzọ. “Ahụghị m ihe kwesịrị ịnwụ anwụ n’ahụ Ya: ya mere m ga-adọ Ya aka ná ntị, wee hapụ Ya.” (Luk 23:22) Ya mere o mere ka a pịa Jisọs ụtarị nwere ọtụtụ ogwu bụ́ nke na-adọwasị Jisọs azụ n’ụzọ na-egbu mgbu. E mesịa, usuu ndị agha ahụ ekpukwasị Jisọs okpueze e ji ogwu mee. Ha akwaa ya emo, jiri amị̀ siri ike tie ya, na-ekpumikwu okpueze ahụ e ji ogwu mee n’isi ya. Jisọs nọgidere na-enwe ùgwù na ikike pụtara ìhè ka ọ na-agabiga ihe mgbu na nkọcha ahụ ọnụ na-apụghị ịkọwa.
Paịlet—ikekwe n’olileanya na a ga-emetụrụ Jisọs ebere n’ihi ahụ e merụsịrị ya—akpọpụta ya ọzọ n’ihu ìgwè mmadụ ahụ. “Lee,” ka Paịlet na-ekwu, “ana m ekupụta Ya n’èzí nye unu, ka unu wee mara na ahụghị m ihe kwesịrị ahụhụ mmehie n’ime Ya.” Ma ndị isi nchụàjà ahụ etie, sị: “Kpọgbuo ya! Kpọgbuo ya!” (Jọn 19:4-6, NW) Ka ìgwè mmadụ ahụ na-arụgidesikwu ya ike, Paịlet akwụsị ịnwa ịnapụta Jisọs wee nyefee Jisọs ka a kpọgbuo ya.
Ọnwụ nke Na-egbu Mgbu
Ka ọ dị ugbu a, chi abọchaala nke ọma, ma eleghị anya na-achọ iru oge ehihie. A kpọgara Jisọs ná mpụga Jerusalem n’ebe a na-akpọ Gọlgọta. E ji okpotokpo ntú kụdo aka na ụkwụ Jisọs n’osisi ịta ahụhụ. Ọnụ apụghị ịkọwa ihe mgbu o nwere ka ịdị arọ nke ahụ ya mere ka ahụ ya si n’ebe ndị ahụ a kụgidere ya ntú na-adọwa mgbe e buliri osisi ịta ahụhụ ahụ elu. Ìgwè mmadụ agbakọọ ikiri ka a na-akpọgbu Jisọs na ndị omekome abụọ. Ọtụtụ kwuru okwu mkparị banyere Jisọs. “Ọ zọpụtara ndị ọzọ,” ka ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ na-akwa ya emo, “Ọ pụghị ịzọpụta Onwe ya.” Ọbụna ndị agha ahụ na ndị omekome abụọ a kpọgidere n’elu osisi ịta ahụhụ na-akwa Jisọs emo.—Matiu 27:41-44.
Na mberede n’etiti ehihie, ka Jisọs nọworo n’elu osisi ahụ ruo oge ụfọdụ, ọchịchịrị na-eyi egwu nke sitere n’aka Chineke ekpuchie ala ahụ nile ruo awa atọ.a Ma eleghị anya ọ bụ nke a kpaliri onye ahụ na-emebi iwu ịbara onye nke ọzọ mba. Mgbe ahụ, n’ichigharịkwuru Jisọs, ọ rịọrọ, sị: “Cheta m mgbe ọ bụla Ị ga-aba n’alaeze Gị.” Lee okwukwe dị ịtụnanya nke ahụ bụ n’agbanyeghị ọnwụ ya dị nso! “N’ezie, asị m gị taa,” ka Jisọs na-azaghachi, “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:39-43, NW.
N’ihe dị ka elekere anya atọ nke ehihie, Jisọs nwere mmetụta na ọnwụ ya dị nso. “Akpịrị na-akpọ m nkụ,” ka ọ na-asị. O jizi olu dara ụda tie mkpu, sị: “Chineke m, Chineke m, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka Ị hapụrụ nanị Mụ?” Jisọs pụrụ ịhụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, na Nna ya ewepụwo nchebe nile n’ebe ọ nọ iji kwe ka e tinyezuo nguzosi ike n’ezi ihe ya n’ule, ọ na-ehotakwa okwu Devid. Otu onye atụkwasị sponge e ji suru mmanya gbara ụka n’egbugbere ọnụ Jisọs. N’ịbụ onye detụworo ụfọdụ mmanya ahụ ọnụ, Jisọs sụrụ ude, na-asị: “Ọ gwụwo.” O tipụziri mkpu, sị: “Nna, n’aka Gị ka M na-enye mmụọ m idebe,” wee hulata isi ya, nwụọ.—Jọn 19:28-30; Matiu 27:46; Luk 23:46; Abụ Ọma 22:1.
Ebe ọ bụ n’oge mgbede, e mere nkwadebe ọkụ ọkụ iji lie Jisọs tupu Ụbọchị Izu Ike (Nisan 15) amalite mgbe anyanwụ ga-ada. Josef onye Arimatia, bụ́ onye a ma ama so n’òtù nnọkọ Sanhedrin bụ́ onye na-eso ụzọ Jisọs ná nzuzo, anata ikike ili Jisọs. Nikọdimọs, onye sokwa n’òtù nnọkọ Sanhedrin bụ́ onye kwupụtaworo okwukwe n’ime Jisọs ná nzuzo, ejiri myrrh na aloes ruru kilogram 33 nye aka. N’iji nlezianya, ha adọnye ozu Jisọs n’ili ncheta ọhụrụ dị nso n’ebe ahụ.
Ọ Dịghachi Ndụ!
Chi abọchabeghị n’isi ụtụtụ Sunday mgbe Meri Magdalini na ndị inyom ọzọ bịaruru n’ili Jisọs. Ma lee! E bupụwo nkume dị n’ihu ili ahụ. Leenụ, ili ahụ tọgbọ chakoo! Meri Magdalini agbapụ ịga kọọrọ Pita na Jọn. (Jọn 20:1, 2) Ngwa ngwa ọ hapụsịrị, otu mmụọ ozi apụta n’ihu ndị inyom ndị ọzọ ahụ. Ọ na-asị: “Unu onwe unu atụla egwu.” Ọ na-agbakwa ha ume, sị: “Gaakwanụ ọsọ ọsọ, sị ndị na-eso ụzọ Ya, E mere ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”—Matiu 28:2-7.
Ka ha ji ọsọ na-aga, ònye ka ha zutere ma ọ́ bụghị Jisọs n’onwe ya! “Jeenụ kọọrọ ụmụnna m,” ka ọ na-agwa ha. (Matiu 28:8-10) Mgbe e mesịrị, Meri Magdalini nọ n’ili ahụ na-akwa ákwá mgbe Jisọs pụtara n’ihu ya. Meri ṅụrịgburu onwe ya n’ọṅụ, o wee gbapụ ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ akụkọ ahụ dị ebube. (Jọn 20:11-18) N’ezie, ugboro ise na Sunday ahụ a na-apụghị ichezọ echezọ, Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ dị iche iche, na-eme ka a ghara inwe obi abụọ ọ bụla na n’ezie, ọ dị ndụ ọzọ!
Otú O Si Metụta Gị
Olee otú ihe ndị mere afọ 1,966 gara aga pụrụ isi metụta gị ugbu a a na-abanye na narị afọ nke 21? Onye ji anya ya hụ ihe ndị ahụ merenụ na-akọwa, sị: “N’ime nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ime anyị, na Chineke ewerewo Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya zite n’ụwa, ka anyị wee dị ndụ site n’aka Ya. N’ime nke a ka ịhụnanya dị, ọ bụghị na anyị onwe anyị hụrụ Chineke n’anya, kama ọ bụ na Ya onwe ya hụrụ anyị n’anya, wee zite Ọkpara Ya ka Ọ bụrụ ihe ịjụrụ Ya obi banyere mmehie anyị.”—1 Jọn 4:9, 10.
N’ụzọ dị aṅaa ka ọnwụ Kraịst si bụrụ ‘ihe ịjụrụ obi’? Ọ bụ nke ịjụrụ obi n’ihi na ọ na-eme ka iso Chineke nwee mmekọrịta dị mma kwe omume. Mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam, nupụụrụ Chineke isi, n’ihi ya kwa o nyefere ụmụ ya ihe nketa nke mmehie na ọnwụ. Jisọs, n’aka nke ọzọ, nyere ndụ ya dị ka ihe mgbapụta iji kwụọ ụgwọ maka mmehie na ọnwụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, si otú ahụ na-enye ihe ndabere maka Chineke ime ebere na igosi ihu ọma. (1 Timoti 2:5, 6) Site n’inwe okwukwe n’àjà mkpuchi mmehie Jisọs, a pụrụ ịtọhapụ gị site n’amamikpe i ketara site n’aka Adam onye mmehie. (Ndị Rom 5:12; 6:23) N’aka nke ya, nke a na-emeghe ohere magburu onwe ya nke isoro Nna gị nke eluigwe na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova Chineke, na-enwe mmekọrịta. N’igbu ya nkenke, àjà dị elu nke Jisọs pụrụ iwetara gị ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16; 17:3.
A ga-atụle ihe ndị a na okwu ndị ọzọ metụtara ya n’uhuruchi Thursday, April 1, n’ọtụtụ iri puku ebe gburugburu ụwa mgbe ọtụtụ nde ndị mmadụ ga-agbakọta icheta ọnwụ Jisọs Kraịst. A na-akpọ gị òkù ịnọ ya. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ ịgwa gị ebe na mgbe ị pụrụ ịbịa. Obi abụọ adịghị ya na ịnọ ya ga-eme ka ekele i nwere maka ihe Chineke anyị na-ahụ n’anya na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya mere n’ụbọchị ikpeazụ nke ndụ Jisọs dị ka mmadụ mikwuo emi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ pụghị ịbụworị ihe na-akpata chi ojiji n’ehihie kpatara ọchịchịrị ahụ n’ihi na Jisọs nwụrụ n’oge ọnwa gbazuru agbazu. Chi iji n’ehihie na-anọ nanị minit ole na ole, ọ na-emekwa mgbe ọnwa nọ n’etiti ụwa na anyanwụ n’oge ọnwa ọhụrụ na-apụta.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]
ỌNWỤ NA MBILITE N’ỌNWỤ JISỌS
NISAN 33 O.A. IHE MERE NWOKE KASỊ UKWUU*
14 Uhuruchi Ememe Ngabiga; Jisọs asaa 113, para. nke 2
Thursday ụkwụ ndị ozi; Judas apụọ ruo 117, para. 1
ije rara Jisọs nye; Kraịst
eguzobe Ememe Ncheta ọnwụ
ya (nke a ga-eme n’afọ a na
Thursday, April 1, mgbe
anyanwụ dasịrị); agbamume iji
kwadebe ndị ozi ya maka nhapụ ya
Etiti abalị ruo Mgbe ha kpesịrị ekpere ma 117 ruo 120
isi isi ụtụtụ bụsịa abụ otuto, Jisọs na ndị
ozi ya agaa n’ogige Getsemane;
Jisọs ejiri ịkwa ákwá siri ike
na anya mmiri kpee ekpere; Judas
Iskariọt eduru ìgwè mmadụ buru
ibu bịarute ma rara Jisọs nye;
ndị ozi ya agbalaga ka e kere
Jisọs agbụ ma kpọgara ya Anas;
a kpọga Jisọs na nke Onyeisi
Nchụàjà Kaịafas iji mee ka ọ pụta
n’ihu òtù nnọkọ ikpe Sanhedrin;
a maa ya ikpe ọnwụ; a kparịa ya
ma tie ya ihe; Pita agọnahụ Jisọs
ugboro atọ
Ụtụtụ Friday N’isi ụtụtụ, Jisọs apụta ọzọ 121 ruo 124
n’ihu òtù nnọkọ ikpe Sanhedrin;
a kpọgaara ya Paịlet; a kpọgaara ya
Herọd; a kpọghachiiri ya Paịlet;
a pịa Jisọs ihe, kparịa ya, tie ya
ihe; n’ịbụ onye a rụgidere, Paịlet
enyefee ya maka mkpọgbu; a kpọga ya
na Gọlgọta maka ogbugbu n’owu ụtụtụ
Mmalite ehihie A kpọgbuo ya obere oge tupu elekere 125, 126
ruo etiti ehihie 12:00 ehihie; ọchịchịrị agbaa site
n’elekere 12:00 ehihie ruo ihe dị ka
elekere anya atọ, bụ́ mgbe Jisọs nwụrụ;
oké ala ọma jijiji; ákwà ụlọ nsọ
adọwaa ụzọ abụọ
Ngwụsị ehihie E lie Jisọs n’ili dị n’otu ogige 127, para.
tupu Ụbọchị Izu Ike nke 1-7
15 uhuruchi Ụbọchị Izu Ike amalite
Friday
Saturday Paịlet ekwe ka ndị nche chee ili 127, para.
Jisọs nche nke 8-9
16 Sunday N’isi ụtụtụ, a hụ ili Jisọs ka ọ 127, para.
tọgbọ chakoo; Jisọs e mere ka o si nke 10 ruo
n’ọnwụ bilie apụta n’ihu (1) ìgwè 129, para.
ndị inyom na-eso ụzọ, gụnyere nke 10
Salomi, Joana, na Meri nne Jemes;
(2) Meri Magdalini;
(3) Kleopas na onye ibe ya;
(4) Saịmọn Pita;
(5) mgbakọta nke ndị ozi na
ndị ọzọ na-eso ụzọ
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
Ihe ndị e depụtara ebe a bụ nọmba na-egosi isiakwụkwọ ndị dị n’akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu Nke Dịworo Ndụ. Maka chaatị nwere ntụaka zuru ezu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ maka ozi ikpeazụ Jisọs, lee “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” peji nke 290. Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara akwụkwọ ndị a.