Nkebi nke 20
E Gburu Jizọs Kraịst
Jizọs malitere otu ememme ọhụrụ; a raara ya nye ma kpọgide ya n’osisi
MGBE Jizọs jichara afọ atọ na ọnwa isii kwusaa ozi ọma ma zie ihe, ọ ma na a ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya. Ndị ndú okpukpe ndị Juu nọ na-agba izu igbu ya, ma ha na-atụ ụjọ na nke ahụ nwere ike ịkpata ọgba aghara ebe ọ bụ na ndị mmadụ weere na ọ bụ onye amụma. Ka nke ahụ na-eme, Setan mere ka Judas Iskarịọt, bụ́ otu n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs, rara ya nye. Ndị ndú okpukpe ahụ kwere nkwa inye Judas mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ka ọ rara Jizọs nye n’aka ha.
N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ya na ndịozi ya gbakọtara ime Ememme Ngabiga. Mgbe Jizọs mere ka Judas pụọ, ọ malitere ememme ọhụrụ, nke bụ́ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. O weere otu ogbe achịcha, kpee ekpere ma nye ya ndịozi iri na otu ahụ fọdụrụnụ. Ọ sịrị ha: “Nke a pụtara ahụ́ m nke a gaje inye n’ihi unu. Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” O mekwara iko mmanya otú ahụ, ma kwuo, sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dabeere n’ọbara m.”—Luk 22:19, 20.
E nwere ọtụtụ ihe Jizọs ga-agwa ndịozi ya n’abalị ahụ. O nyere ha iwu ọhụrụ ka ha hụ ibe ha n’anya n’achọghị naanị ọdịmma onwe ha. O kwuru, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) Ọ gwara ha ekwela ka ihe ndị na-agbawa obi na-aga ime mee ka obi lọọ ha mmiri. Jizọs kpesiri ekpere ike maka ha. Ha bụkọrọ abụ ọnụ ma gawa ogige Getsemeni n’abalị ahụ.
N’ogige Getsemeni, Jizọs gburu ikpere n’ala ma kpesie ekpere ike. N’oge na-adịghị anya, ìgwè ndị agha na-eme ihe ike, ndị nchụàjà, na ndị ọzọ bịara ịnwụchi ya. Judas bịaruru nso ma susuo Jizọs ọnụ, nke mere ka ha mara onye ha ga-anwụchi. Ka ndị agha ahụ kere Jizọs agbụ, ndịozi ya gbalagara.
Jizọs guzo n’ihu ụlọikpe ukwu ndị Juu kwuo na ya bụ Ọkpara Chineke. Ụlọikpe ahụ kwuru na ọ na-ekwulu Chineke ma kwesị ọnwụ. A kpụziiri Jizọs gakwuru onye ọchịchị Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet. N’agbanyeghị na Paịlet chọpụtara na e nweghị ihe ọjọọ ọ bụla Jizọs mere, o nyefere ya n’aka ìgwè mmadụ ahụ na-eme ihe ike bụ́ ndị na-eti mkpu ka e gbuo ya.
A kpọgara Jizọs Gọlgọta, bụ́ ebe ndị agha Rom kpọgidere ya n’elu osisi ịta ahụhụ. Chineke mere ka ọchịchịrị gbaa n’ehihie. Jizọs mechara nwụọ n’ehihie ụbọchị ahụ, oké ala ọma jijiji mekwara. E liri ya n’ili dị n’ọgba nkume. N’echi ya, ndị nchụàjà mechiri ili ahụ ma debe ndị nche n’ebe esi abanye ya. Jizọs ọ̀ ga-anọgide n’ime ili ahụ? Mba. A ga-arụ ọrụ ebube kachanụ n’oge na-adịghị anya.
—O si na Matiu isi nke 26 na nke 27; Mak isi nke 14 na nke 15; Luk isi nke 22 na nke 23; Jọn isi nke 12 ruo nke 19.
◼ Olee ememme ọhụrụ Jizọs malitere?
◼ Olee ihe ndị mere tupu e gbuo Jizọs?
Igbe dị na peeji nke 23]
ỌRỤ DỊ MKPA JIZỌS NA-ARỤ
Ọnwụ Jizọs bara ezigbo uru n’imezu nzube Jehova. Ebe ọ bụ mmụọ nsọ Chineke mere ka a tụrụ ime Jizọs, o zuru okè mgbe a mụrụ ya, o kwesịghị ịnwụ. Ma, ọ nwụrụ ka ụmụ mmadụ nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi ma bie ụdị ndụ ụmụ Adam gaara ebi ma a sị na Adam enupụghị isi.a—Matiu 20:28; Luk 1:34, 35; Jọn 3:16, 36; 2 Pita 3:13.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara uru ọnwụ Jizọs bara, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, peeji nke 47-56.
Chaatị dị na peeji nke 23]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu ●
Mak ●
Luk ●
Jọn ●
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs