Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 3/1 p. 10-15
  • Izu nke Gbanwere Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Izu nke Gbanwere Ụwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Naịsan 8
  • Naịsan 9
  • Naịsan 10
  • Naịsan 11—Ụbọchị Oké Ihe Omume
  • Ka Naịsan 11 Na-abịaru ná Njedebe
  • Naịsan 12
  • Naịsan 13
  • “Oge Awa Abịawo!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Icheta Ụbọchị Ndị Ikpeazụ nke Jisọs n’Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • A7-G Ihe Ndị Mere n’Oge Jizọs Nọ n’Ụwa—Otú Jizọs Si Jee Ozi Ikpeazụ Ya na Jeruselem (Nke 1)
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Ememme Ngabiga Ikpeazụ Jizọs Mere Eruo Nso
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 3/1 p. 10-15

Izu nke Gbanwere Ụwa

“Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị [“Jehovah,” NW].”—MATIU 21:9.

1. Olee ìgwè abụọ dịrịta nnọọ iche ndị ihe ndị mere n’August afọ gara aga metụtara?

“ỤBỌCHỊ ATỌ NKE OKÉ IHE ISI IKE NDỊ MERE KA ỤWA MEE MKPATỤ.” N’August 1991, isiakụkọ ndị yiri nke a mesiri ike eziokwu ahụ nke bụ na a pụrụ ịtụba ụwa dum n’oké ọgba aghara n’ime nanị ụbọchị ole na ole. N’eziokwu, ụbọchị ndị ikpeazụ nke August bụ oge oké ihe omume, ọ bụghị nanị nye ụwa, kamakwa maka ìgwè ndị ahụ ndị Jisọs kwuru banyere ha, sị: “Ha esiteghị n’ụwa.” A maara ìgwè nke a taa dị ka Ndịàmà Jehova.—Jọn 17:14.

2, 3. (a) Olee otú e si mee ka nnwere onwe pụta ìhè na Zagreb n’agbanyeghị iyi egwu nke agha? (b) Olee ụzọ e si kwụọ okwukwe siri ike ụgwọ ọrụ n’Odessa?

2 A kwadebewo ime mgbakọ mba nile mbụ nke Ndịàmà Jehova e metụworo atụmatụ inwe na Yugoslavia n’August 16 ruo 18. Ọ dabakwara na ọ ga-abụ mgbakọ ukwu mbụ nke ndị Jehova n’ime mba nke a nke nọ nso ịmalite agha obodo. Ndịàmà bụ ndị ebe ahụ na ndị ọrụ afọ ofufo sitere ná mba ndị agbata obi ha arụsiwo ọrụ ike ruo ọnwa abụọ iji mee ka amá egwuregwu HAŠK Građanski ahụ dị na Zagreb dịghachi mma ile anya. Ọ dị nnọọ ọcha, n’enweghị ntụpọ ọ bụla, bụ́ ebe kwesịrị ekwesị maka Mgbakọ “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe nke Chineke n’Anya.” Ọtụtụ puku ndị si ala ọzọ emewo atụmatụ ịbịa, gụnyere 600 site na United States. Ka ihe ize ndụ nke agha obodo na-abịa nso, okwu ahụ malitere ịgasasị: “Ndị America agaghị abịa ma ọlị.” Ma ha bịara, tinyere ndị si ọtụtụ ala ndị ọzọ bịa. A tụrụ anya na a ga-enwe 10,000 ndị ga-abịa, ma 14,684 mmadụ nọ n’amá egwuregwu ahụ n’ụbọchị nke ikpeazụ! A gọziri ha nile n’ụba n’ihi na ha ‘ahapụghị nzukọ nke onwe ha.’—Ndị Hibru 10:25.

3 N’ime ụbọchị atọ sochiri mgbakọ ahụ e nwere na Zagreb, e mere mgbalị kụrụ afọ n’ala iweghara ọchịchị mba Soviet Union n’ike. N’otu oge ahụ, ndị hụrụ nnwere onwe nke Chineke n’anya na-eme nkwadebe ikpeazụ maka mgbakọ ha gaje inwe n’Odessa nke dị ná mba Ukraine. A pụrụ inwe mgbakọ ahụ? N’inwe okwukwe siri ike, ụmụnna ahụ mere ihe ndị ikpeazụ dị n’ịrụzisị amá egwuregwu ahụ, ndị ga-abịanụ nọgidekwara na-abịa. Dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’ọrụ ebube, mgbalị mweghara ọchịchị ahụ gwụsịrị. E mere mgbakọ obi ụtọ n’August 24, 25, na-enwe 12,115 ndị bịaranụ, nweekwa 1,943—bụ́ 16 pasenti nke ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịaranụ—ndị e mere baptism! Ndịàmà ọhụrụ ndị a, ha na ndị nọworo ogologo oge n’iguzosi ike n’ezi ihe, ṅụrịrị ọṅụ na ha ji ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ wee bịa mgbakọ ahụ.—Ilu 3:5, 6.

4. Ndịàmà nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe anọwo na-agbaso ihe nlereanya dị aṅaa nke Jisọs setịpụrụ?

4 Ndịàmà ndị a kwesịrị ntụkwasị obi na-agbaso ihe nlereanya nke Onye na-esetịpụrụ anyị ihe nlereanya, bụ́ Jisọs Kraịst, setịpụrụ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o lefuuru anya ije ememe ndị ahụ Jehova nyere iwu ka a na-eme, ọbụna mgbe ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya. Ka ọ na-abịaru Jerusalem maka Ememe Ngabiga ikpeazụ ya, ndị a na-eguzo gburugburu ụlọ ukwu ahụ, na-ajụ, sị: “Gịnị ka unu na-eche? Na ọ gaghị abịa n’ememe a ma ọlị?” (Jọn 11:56) Ma ọ bịara! Nke a kwadebere ụzọ maka otu izu nke jedebere ná mgbanwegharị nke usoro akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ka anyị jee ugbu a, wee tụleghachị ụfọdụ n’isi ihe ndị mere n’izu ahụ—Naịsan 8 ruo 14 na kalenda ndị Juu?

Naịsan 8

5. Gịnị ka Jisọs maara mgbe ọ na-eje Betani na Naịsan 8, 33 O.A.?

5 N’ụbọchị nke a, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya bịarutere Betani. N’ebe a, Jisọs ga-anọ abalị isii n’ụlọ enyi ya ọ hụrụ n’anya bụ Lazarọs, onye ọ kpọlitere n’ọnwụ n’oge na-adịghị anya tupu mgbe ahụ. Betani dị nso na Jerusalem. Na nzuzo, Jisọs agwaworị ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lee! Anyị na-arịgoru Jerusalem, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụaja na ndị odeakwụkwọ, ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ, ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ ka ha mee ya ihe ọchị, pịa ya ihe, kpọgbuokwa ya, n’ụbọchị nke atọ, a ga-emekwa ka o bilite.” (Matiu 20:18, 19, NW) Jisọs maara nke ọma na ọ gaje iche ule ndị siri oké ike ihu. Otú ọ dị, ka oge oké ule ahụ na-abịa nso, ọ laghị azụ ma ọlị n’iji ịhụnanya jeere ụmụnna ya ozi. Mgbe nile, ka anyị ‘nwee otu uche a n’ime onwe anyị nke dịkwa n’ime Kraịst Jisọs.’—Ndị Filipaị 2:1-5; 1 Jọn 3:16.

Naịsan 9

6. N’uhuruchi Naịsan 9, gịnị ka Meri mere, gịkwa ka Jisọs gwara Judas?

6 Mgbe anyanwụ dasịrị, ka Naịsan 9 na-amalite, Jisọs riri nri n’ụlọ onye ahụ bụbu onye ekpenta, bụ́ Saịmọn. Ọ bụ n’ebe a ka nwanne Lazarọs, bụ́ Meri tere Jisọs mmanụ na-esi ísì ụtọ dị oké ọnụ ahịa n’isi na n’ụkwụ ma jiri mweda onwe onye n’ala jiri agịrị isi ya hichasịa ụkwụ Jisọs. Mgbe Judas kwuru okwu megide nke a, Jisọs sịrị: “Hapụ nwanyị a ka o wee debe ya ruo [“n’iburu n’uche,” NW] ụbọchị olili m.” Mgbe ha nụrụ na ọtụtụ ndị Juu na-eje Betani, na-etinyekwa okwukwe n’ebe Jisọs nọ, ndị isi nchụaja mere atụmatụ igbu ya na Lazarọs.—Jọn 12:1-7.

7. N’ụtụtụ Naịsan 9, olee ụzọ e si nye aha Jehova nsọpụrụ, gịnịkwa ka Jisọs buru amụma ya?

7 N’isi ụtụtụ, Jisọs hapụrụ wee jebe Jerusalem. Ọtụtụ ìgwè mmadụ pụrụ izute ya, na-efe igu nkwu, na-etikwa mkpu, sị: “Hosanna: Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], bụ́ eze nke Israel.” Mgbe ahụ, Jisọs mezuru amụma nke Zekaraịa 9:9 site n’ịnọkwasị n’elu ịnyịnya ibu wee banye n’obodo ahụ. Ka ọ na-abịa nso Jerusalem, ọ kwaara ya ákwá, na-ebu amụma na ndị Rom ga-eji ékpè na ị̀gá gbaa ya gburugburu, bibiekwa ya kpam kpam—bụ́ amụma nke ga-enwe mmezu pụtara nnọọ ìhè mgbe 37 afọ gasịrị. (Nke a bụkwa mgbaàmà ihe ọjọọ nye Krisendọm, bụ́ nke dapụworo n’ezi ofufe dị ka Jerusalem oge ochie mere.) Ndị ọchịchị ndị Juu achọghị Jisọs dị ka eze ha. N’iwe, ha tiri mkpu, sị: “Lee, ụwa ejesowo ya n’azụ.”—Jọn 12:13, 19.

Naịsan 10

8. Na Naịsan 10, olee ụzọ Jisọs si gosi nkwanye ùgwù dị omimi maka ụlọ ekpere nke Jehova, gịnịkwa sochiri?

8 Jisọs jekwara n’ụlọ ukwu ahụ ọzọ. Na nke ugbo abụọ ya, ọ chụpụsịrị ndị anya ukwu na-ere ahịa na ndị na-agbanwe ego. Oké azụmahịa—“ịhụ ego n’anya”—ekwesịghị iweghara ọnọdụ n’ụlọ ekpere nke Jehova! (1 Timoti 6:9, 10) Jisọs gaje ịnwụ n’oge na-adịghị anya. O kwuru okwu banyere ọkụkụ nke otu mkpụrụ iji mee ihe atụ nke a. Mkpụrụ nke mbụ ahụ na-anwụ, ma ọ na-epulite iji nwee okporo ọka nke na-amịpụta mkpụrụ hiri nne. N’otu aka ahụ, ọnwụ Jisọs ga-arụpụtara ìgwè mmadụ ndị tinyere okwukwe na ya ndụ ebighị ebi. N’ịbụ onye echiche banyere ọnwụ ya nke na-abịa nso nyere nsogbu, Jisọs kpere ekpere ka e si otú ahụ wetara aha Nna ya otuto. Ná nzaghachi, olu Chineke sitere n’eluigwe dapụta ka égbè eluigwe otú ndị nile nọ n’ebe ahụ ga-anụ ya: “Enyere m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.”—Jọn 12:27, 28.

Naịsan 11—Ụbọchị Oké Ihe Omume

9. (a) N’isi ụtụtụ Naịsan 11, olee ụzọ Jisọs si jiri ihe atụ mee ihe n’ịkatọ ndị Juu ahụ si n’ezi ofufe dapụ? (b) N’ikwekọ n’ilu Jisọs, òle ndị ka otu oké ohere gafenahụworo?

9 Ọzọkwa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ Betani maka ụbọchị zuru ezu nke ihe omume. Jisọs jiri ihe atụ atọ mee ihe igosi ihe mere e ji maa ndị Juu siworo n’ezi ofufe dapụ ikpe. Ọ bụwo otu osisi fig na-adịghị amị mkpụrụ ọnụ, ọnọdụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ ugbu a na-anọchi anya mba ndị Juu na-adịghị amị mkpụrụ, nke na-enweghịkwa okwukwe. Mgbe ọ banyere n’ụlọ ukwu ahụ, ọ kọwara otú ndị na-ekwesịghị ekwesị, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ubi vine nke onye nwe ha si mesịa gbuo ọbụna ọkpara nke bụ onye nketa nke onye ahụ nwe ha—na-ese onyinyo mmebi ndị Juu mebiri ntụkwasị obi Jehova nwere n’ebe ha nọ, bụ́ nke e wetara n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị njọ site n’ogbugbu ha gburu Jisọs. Ọ kọwara otu oriri ọlụlụ nwunye nke otu onye eze—Jehova—kwadebere, onye ndị ọ kpọrọ òkù ịbịa (ndị Juu) ji ịchọ ọdịmma onwe ha nanị rịọ ka a hapụ ha ịbịa. Ya mere, ọkpụkpọ òkù ahụ pụrụ jeere ndị nọ n’èzí—ndị Jentaịl—ndị ụfọdụ n’ime ha naara ya. Ma a tụpụrụ otu nwoke nke a hụrụ na o yighị uwe ndị na-abịa oriri ọlụlụ nwunye. Ọ nọchiri anya ndị Kraịst ụgha nke Krisendọm. A kpọrọ ọtụtụ ndị Juu nke oge Jisọs òkù ịbịa, ‘ma ole na ole ka a họpụtara’ iso na 144,000 ndị ahụ a kara akara, bụ́ ndị ga-eketa Alaeze eluigwe ahụ.—Matiu 22:14; Mkpughe 7:4.

10-12. (a) N’ihi gịnị ka Jisọs ji baara ndị ndú okpukpe ndị Juu mba, oleekwa nkatọ dị ike o kpokwasịrị ndị ihu abụọ ahụ? (b) Olee ụzọ ikpe ọmụma si mesịa bịakwasị ndị Juu ahụ nke dapụworo n’ezi ofufe?

10 Ndị ndú okpukpe ndị Juu nwere ihu abụọ na-achọ ohere ha ga-eji jide Jisọs, ma ọ zara ụfọdụ n’ajụjụ aghụghọ ndị ha jụrụ, wee menye ha ihere n’ihu ndị mmadụ. Oo, lee nnọọ ka ndị okpukpe ndị Juu ahụ si bụrụ ndị dapụworo n’ezi ofufe! Lee nnọọ ka Jisọs si baara ha mba n’ezoghị ọnụ! Ha na-achọ inweta ọnọdụ dị elu, iyi uwe ndị pụrụ iche, na útú aha ndị na-ada oké ụda dị ka “Rabaị” na “Nna,” dị ka ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-eme n’oge anyị a. Jisọs kwuru ihe bụ ụkpụrụ a ga-agbaso: “Onye ọ bụla nke ga-eweli onwe ya elu, a ga-eweda ya; onye ọ bụla nke ga-ewedakwa onwe ya, a ga-eweli ya elu.”—Matiu 23:12.

11 Jisọs katọrọ ndị ndú okpukpe ndị ahụ nkatọ dị ike. Ugbo asaa o tiri mkpu, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu!” na-akpọ ha ndị ndú kpuru ìsì na ndị ihu abụọ. Na nke ọ bụla kwa, o nyere ihe pụtara ìhè nke mere ha ga-eji nweta nkatọ dị otú ahụ. Ha na-anọbichi ụzọ ịbanye n’Alaeze nke eluigwe. Mgbe ha matara onye na-eso ụzọ n’ọnyà, ọ na-aghọ okpukpu abọọ onye a kwadebere maka Gehenna, ma eleghị anya na-abụworị onye na-eche mbibi ihu n’ihi oké ajọ omume ma ọ bụ ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè nke o meworo na mbụ. “Ndị nzuzu na ndị ìsì,” ka Jisọs kpọrọ ha, n’ihi na ndị Farisii na-atụkwasị uche n’ọlaedo nke ụlọ nsọ ahụ kama ịbụ n’ịhụ na ofufe dị ọcha dịgidere n’ebe ahụ. Ha lefuuru ikpe ziri ezi, ebere, na ikwesị ntụkwasị obi anya mgbe ha na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ na-esi ísì ụtọ na anise na cummin, ma na-eleghara ihe ndị ka mkpa dị n’Iwu ahụ anya. Ịsa ahụ dị ka omenala ha si dị adịghị mgbe ọ ga-asachapụ mmetọ nke ime obi ha—ọ bụ nanị obi nke e meworo ka ọ dị ọcha site n’okwukwe e nwere n’àjà Jisọs gaje ịchụ ga-eme nke ahụ. Ihu abụọ na mmebi iwu nke dị n’ime ha na-eme ka ‘otite nzú’ elu ahụ ọ bụla ghara ịdị irè.—Matiu 23:13-29.

12 Ee, ọ bụ ahụhụ n’ezie nye ndị Farisii, ndị bụ n’ezie “ụmụ nke ndị gburu ndị amụma” oge ochie! Ha bụ agwọ, ụmụ ajụala, ndị a maworo ikpe nke Gehenna, n’ihi na ha gaje igbu, ọ bụghị nanị Jisọs kamakwa ndị ahụ o zipụrụ. Nke a bụ ikpe ọmụma nke “ga-abịakwasị ọgbọ a.” Ná mmezu ya, e bibiri Jerusalem kpam kpam mgbe 37 afọ gasịrị.—Matiu 23:30-36.

13. Ihe Jisọs kwuru banyere onyinye ndị a na-atụnye n’ụlọ nsọ ahụ na-apụta ìhè n’ọnọdụ dịgasị aṅaa taa?

13 Tupu ọ hapụ ụlọ ukwu ahụ, Jisọs kwuru okwu ịja mma banyere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye tụnyere mkpụrụ ego nta abụọ n’ebe ndebe akụ ụlọ nsọ ahụ—“ihe nile o nwere nke o ji biri.” Nke a bụ nnọọ ihe dị iche n’ebe ndị ọgaranya ahụ nwere anyaukwu nọ, bụ́ ndị na-atụnye nanị obere onyinye! Dị ka nwanyị ahụ di ya nwụrụ, Ndịàmà Jehova taa na-eji afọ ofufo jiri oge, ume ọrụ, na ego chụọ àjà iji kwadoo, gbasaakwa ọrụ Alaeze ahụ nke zuru ụwa ọnụ. Lee nnọọ ka nke a si dị iche n’ebe ndị okwuchukwu TV ndị ahụ na-eme omume rụrụ arụ nọ, bụ́ ndị na-erigbu ìgwè atụrụ ha ma na-ewulite oké nkwakọba dị iche iche nke akụ onwe onye!—Luk 20:45–21:4.

Ka Naịsan 11 Na-abịaru ná Njedebe

14. Okwu iru újú dị aṅaa ka Jisọs kwuru, oleekwa otú o si zaghachi ajụjụ ndị na-eso ụzọ ya gara n’ihu ịjụ ya?

14 Jisọs kwaara Jerusalem na ndị bi n’ime ya ákwá wee kwuo, sị: “Unu agaghị ahụ m ọzọ site n’ugbu a ma ọlị, ruo mgbe unu ga-asị, Onye a gọziri agọzị ka onye ahụ bụ nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị [“Jehova,” NW].” (Matiu 23:37-39) Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, mgbe ha na-anọdụ n’Ugwu Olive, ndị na-eso ụzọ Jisọs ndị dị ya nso, jụrụ ajụjụ banyere nke a, ná nzaghachi, Jisọs kọwara ihe ịrịba ama nke ga-aka akara ọnụnọ ya n’ike Alaeze na nke ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe Setan.—Matiu 24:1–25:46; Mak 13:1-37; Luk 21:5-36.

15. Ihe ịrịba ama dị aṅaa ka Jisọs nyere banyere ọnụnọ ya maka ikpe ikpe, ọ̀ bụkwa site òle mgbe ka a na-emezu ya?

15 N’izo aka n’ikpe Jehova nke gaje ịbịakwasị ụlọ nsọ ahụ n’isi nso, Jisọs gosiri na nke a sere onyinyo ihe omume mbibi ndị gaje ime n’ọdịnihu n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a dum. Ntiwapụ nke agha, n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ ga-aka akara oge ahụ nke ọnụnọ ya, tinyekwara ụnwụ nri, ala ọma jijiji, na ajọ ọrịa na-efe efe, ha na enweghị ịhụnanya na mmebi iwu. Lee nnọọ ka nke a siworo bụrụ eziokwu banyere ụwa nke narị afọ nke 20 anyị kemgbe 1914!

16, 17. Ihe dịgasị aṅaa ga-eme n’ụwa ka Jisọs kọwara, oleekwa ụzọ ndị Kraịst kwesịrị isi meghachi omume n’amụma ahụ?

16 A ga-eru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’ime ‘mkpagbu ukwu ahụ nke ihe dị ka ya a kadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.’ Ebe ọ bụ na nke a ga-akpata mbibi dị ka Iju Mmiri nke oge Noa, Jisọs dọrọ aka ná ntị megide ịbụ ndị nchụso dị iche iche nke ụwa rikpuru. “Ya mere, na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” Lee nnọọ ka anyị pụrụ isi nwee obi ụtọ na Onyenwe anyị ahọpụtawo “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke e tere mmanụ ikwupụta okwu ịdọ aka ná ntị ahụ na inye nri ime mmụọ bara ụba maka ụbọchị nke a nke ọnụnọ ya!—Matiu 24:21, 42, 45-47.

17 N’ime narị afọ nke 20 anyị a, anyị ahụwo ‘n’elu ụwa mkpagbu nke mba dị iche iche, ndị nọ n’obi abụọ . . . mmadụ na-atụbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi.’ Ma Jisọs na-agwa anyị, sị: “Ma mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.” Ọ dọkwara anyị aka ná ntị, sị: “Na-ezenụ onwe unu [“Lezienụ onwe unu anya,” NW], ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè [“iribiga ihe ókè,” NW], na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà.” Ọ bụ nanị site n’ịmụrụ anya ka anyị pụrụ iguzo dị ka ndị a nwapụtaworo n’ihu Jisọs, bụ́ “Nwa nke mmadụ,” n’oge ọnụnọ ya.—Luk 21:25-28, 34-36.

18. Agbamume dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site n’ihe atụ Jisọs banyere ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke na talent ndị ahụ?

18 N’imechi nkọwa o ji nkà na-akọwa ihe ndị ga-eme n’oge anyị a, Jisọs nyere ihe atụ atọ. Nke mbụ, n’ilu nke ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke, o mesighachiri ya ike mkpa ọ dị ‘ịnọgide na nche.’ E mesịa, n’ihe atụ nke ndị ohu na talent ndị ahụ, o gosiri ụzọ a na-esi enyeghachi ịrụsi ọrụ ike ụgwọ ọrụ site n’ọkpụkpọ òkù nke bụ ‘ịbanye n’ọṅụ nke Onyenwe anyị.’ Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị e sere onyinyo ha n’ilu ndị a, tinyekwara atụrụ ọzọ ahụ pụrụ inweta agbamume dị ukwuu site ná nkọwa ndị a pụtara nnọọ ìhè.—Matiu 25:1-30.

19, 20. Mmekọrịta dị aṅaa nke oge a nke na-enye obi ụtọ ka a hụrụ n’ihe atụ Jisọs banyere atụrụ na ewu?

19 Ihe atụ nke atọ zoro aka n’ọnụnọ Jisọs n’ike Alaeze mgbe ọ bịasịrị inọdụ ala n’ocheeze eluigwe ya dị ebube. Ọ bụ oge maka ikpe mba nile ikpe na ikewapụ ndị bi n’elu ala gaa n’òtù abụọ, ihe mejupụtara otu bụ ndị dị umeala n’obi yiri atụrụ, nke ọzọ bụkwa ndị isi ike yiri ewu. Ndị ahụ bụ atụrụ na-ewepụta onwe ha inye ụmụnna nke Eze ahụ nkwado—bụ́ ndị e tere mmanụ fọdụrụ n’elu ala n’oge a nke ọgwụgwụ ụwa. A ga-eji ndụ enyeghachi atụrụ ndị a ụgwọ ọrụ, ebe ewu ndị ahụ na-egosighi obi ekele ga-apụ baa ná mbibi ebighị ebi.—Matiu 25:31-46.

20 Lee nnọọ mmekọrịta dị ukwuu anyị na-ahụ n’etiti atụru ọzọ ahụ na ụmụnna nke Eze ahụ n’oge ọgwụgwụ nke a nke usoro ihe ndị a! Ọ bụ ezie na ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ buru akụkụ bụ isi nke ọrụ ahụ ná mmalite nke ọnụnọ nke Eze ahụ, ọtụtụ nde ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi mejupụtara ugbu a 99.8 pasenti nke ndị ohu Chineke n’elu ala. (Jọn 10:16) Ha egosipụtawokwa onwe ha ịbụ ndị dị njikere ịtachi obi ‘n’agụụ, akpịrị ịkpọ nkụ, ịgba ọtọ, ọrịa, na ụlọ mkpọrọ’ dị ka ndị ha na ndị ahụ e tere mmanụ na-eguzosi ike n’ezi ihe na-arụkọ ọrụ.a

Naịsan 12

21. Gịnị gasiwanyere ike na Naịsan 12, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

21 Atụmatụ ahụ a na-eme igbu Jisọs na-agawanye n’ihu. Judas ejekwuru ndị isi nchụaja n’ụlọ ukwu ahụ, na-ekwere ịrara Jisọs nye n’aka ha maka 30 mkpụrụ ego ọla ọcha. Ọbụna na e buwo nke a n’amụma.—Zekaraịa 11:12.

Naịsan 13

22. Nkwadebe dị aṅaa ka e mere na Naịsan 13?

22 Jisọs, onye nọgidere na Betani, nke o yikarịrị ka ọ̀ bụ maka ikpe ekpere na ịtụgharị uche, ezije ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem ka ha chọta otu onye aha ya bụ “Onye dị otú a.” N’ụlọ nwoke a, n’otu ọnụ ụlọ buru ibu nke dị n’elu, ha kwadebere Ememe Ngabiga ahụ. (Matiu 26:17-19) Ka anyanwụ na-ada na Naịsan 13, Jisọs jekwuuru ha n’ebe ahụ maka ememe kasị bụrụ oké ihe omume n’akụkọ ihe mere eme dum. Gịnị na-echere ugbu a na Naịsan 14? Isiokwu na-eso nke a ga-agwa anyị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Isiokwu nke na-esonụ kwesịrị inyere anyị aka ịghọtakwu nke ọma karị mmekọrịta chiri anya nke dị n’etiti ìgwè atụrụ nta ahụ e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ.

Ì Ga-esi Aṅaa Chịkọta Ihe Nile?

◻ Ile ndị ọbịa anya na nnabata dị aṅaa ka ụfọdụ ndị nyere Jisọs site na Naịsan 8 ruo 10?

◻ Olee ụzọ Jisọs si kpughee ndị ndú okpukpe nwere ihu abụọ na Naịsan 11?

◻ Oké amụma dị aṅaa ka Jisọs buru, oleekwa ụzọ e si na-emezu ya taa?

◻ Olee ụzọ ihe omume si na-eru nso ngwụsị ha na Naịsan 12 na 13?

[Foto dị na peeji nke 12]

Jisọs jara nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke bụ ogbenye mma, bụ́ onye tụnyere mkpụrụ ego nta abụọ—ihe nile o nwere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya